
Ndị otu Lingua na ọgbakọ mgbasa ozi ụmụ amaala Global Voices na Cebu, Philippines. 2015. Foto nke Jer Clarke. CC BY-NC 2.0
A na-eme ka ọtụtụ ibe ozi asụsụ dị na Global Voices kwe omume site na mmesapụ aka nke ndị ọrụ afọ ofufo nke Lingua, bụ ndị na-enye oge ohere ha iji tụgharịa akụkọ ma si otú ahụ wuo àkwà mmiri n'etiti mba dị iche iche, omenala, asụsụ na ndị mmadụ.
Gịnị kpatara i ji etinye aka na ya?
Ịrụ ọrụ afọ ofufo dị ka onye ntụgharị na ọrụ asụsụ nwere ike ịba uru n'ọtụtụ ụzọ. Ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo na-akọ na ha nwere afọ ojuju na ntụgharị ha na-enye aka dị mma n'ụwa.
Na mgbakwunye, ọrụ Lingua na-enye ndị ntụgharị na-achọsi ike ma ọ bụ ndị ọkachamara ndị ọzọ na-eto eto ohere ịnata nkuzi, wulite nziọrụ na ịzụlite nkà ha ọ bụghị naanị na ntụgharị asụsụ, kamakwa na mmekorita omenala, iche echiche siri ike, imepụta ihe na ngwaọrụ dị ka WordPress.
“Ntụgharị afọ ofufo maka [Global Voices] na-adị ka iji ọchịchọ obi meghere ụwa mgbupu ọhụrụ na nde ihe dị adị.” —Anna Kokkinidou, onye tụgharịworo maka Global Voices na Grik
Ụfọdụ ndị ọrụ afọ ofufo na-enwe mmasị n'otu ihe kpatara ma ọ bụ isiokwu ma jiri nhọrọ nke akụkọ ha mee ntụgharị dịka ụzọ isi kwalite mmata. Ndị ọzọ na-enwe mmasị na usoro ntụgharị asụsụ n'onwe ya – ka iwepụta oge dị ukwuu n'otu akụkọ Global Voices na-agbasa echiche nke onwe ha. Ị na-amụta ihe ọhụrụ na ntụgharị asụsụ ọ bụla!
N'ikpeazụ, site n'ịghọ onye ntụgharị ọrụ afọ ofufo maka ọrụ Lingua, ị na-esonye na òtù nke ndị si n'akụkụ ụwa nile na-arụ ọrụ n'ọtụtụ mba na mpaghara dị iche iche, na-ekerịta ọchịchọ ịmata banyere ụwa na ọchịchọ ime ihe ọma. Maka ọtụtụ ndị ntinye aka, njikọ ndị ha megoro site na òtù Global Voices emeghewo ụzọ maka ohere onwe onye na nke ọkachamara nke ha na-agaraghị enwe.
“Enwere m mmasị n'echiche nke inwe ike ịgwa ndị ọzọ ihe na-eme n'ime ime obodo, nke a na-echefukarị, si otú a na-enyere aka ịkparịta ụka n'etiti ndị bi n'akụkụ anọ nke ụwa.” —Samantha Deman, onye tụgharịrị n'asụsụ French maka Global Voices
Ihe ndị a chọrọ maka nsonye
Enweghị ntozu ntụgharị asụsụ nkịtị ma ọ bụ ahụmịhe kacha nta achọrọ iji debanye. Otu ihe ahụ na-aga maka nka: Ndị ntụgharị asụsụ na-arụ ọrụ na WordPress, yana dị ka nke a, anyị na-achọpụta na ịmara ụfọdụ ihe na WordPress na-enyere aka. Agbanyeghị, ọ dị mma ma ọ bụrụ na ịmaghị – ọ bụrụhaala na ị dị njikere ịmụta, anyị na-enye ọzụzụ na nkwado.
Enwere m ike ịhọrọ akụkọ ndị m chọrọ ịtụgharị?
Ọ bụrụ na ọrụ ahụ dị anya, unu ga-ezute ihu na ihu?
Gịnị kpatara ịtụgharị n'onwe anyị, mgbe ndị mmadụ nwere ike iji ngwa ntụgharị dị ka Google Translate?
Lelee ibe anyị a na-ajụkarị ajụjụ (FAQs) iji mụtakwuo maka òtú na ihe kpatara isonye na ọrụ asụsụ Lingua.
Ị ga-enwerịrị ikike asụsụ siri ike n'asụsụ abụọ opekata mpe. A na-ebipụta ọtụtụ akụkọ Global Voices na mbụ n'asụsụ Bekee ma dịka nke a, ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo na-atụgharị site na Bekee gaa na asụsụ na-abụghị Bekee. Agbanyeghị, n'ọnọdụ ụfọdụ ndị ọrụ afọ ofufo na-atụgharị n'etiti asụsụ abụọ na-abụghị Bekee, ma ọ bụ ha na-atụgharị site n'asụsụ na-abụghị Bekee gaa na Bekee, dabere na ọdịnaya dị.
I nwere ike inye aka dị ka nke masịrị gị. Naanị anyị na-arịọ gị ka gị na onye njikwa ntụgharị asụsụ gị na-ekwurịta okwu, sọpụrụ oge ọ bụla ị nabatara, ma nwee ohere ịmụta na nzaghachi. Ị ga-edezirịrị onwe gị dịka ụkpụrụ omume ọma na mmekpa ahụ òtù Global Voices siri dị.
Tinye akwụkwọ ka ị bụrụ onye ntụgharị afọ ofufo
Ọ bụrụ na i nwere mmasị ịtụgharị n'asụsụ Igbo, biko dejupụta ibe ndebanye dị n'okpuru. Ma ọ bụrụ na ị ga-achọ iwepụta onwe gị dị ka onye ntụgharị asụsụ ọzọ, biko gaa na ibe ọrụ Lingua maka ozi ndị ọzọ.
"*" indicates required fields
