Global Voice

Gịnị bụ Global Voices(What is Global Voice)

Global Voices (Olu Mba Ụwa) bụ blọgụ na-ahụ maka asụsụ mba ụwa niile, ndịntaakụkọ, ndịntụgharị, nakwa ndị na-ekwuchitere ndị mmadụ.  N'ijikọọ ọnụ, anyị ga-ejiri igwemgbasaozi (ịntaneeti) mee ka nghọta dị n’etiti ọtụtụ mba ụwa. kedụ ka anyị ga-esi me nke a?

Akụkọ( Report) : Òtù na-ahụ maka mgbasaozi n'asụsụ dị icheiche ga-ekwuchitere ndị enweghị ọnụ na-ekwuru ha ma kọpụta ahụmiihe ha n’igwemgbasaozi.

Tụgharịa( Translate) Ndị na-atụgharịrị anyị asụsụ n'efu ga-akọpụta akụkọ anyị n’asụsụ dị icheiche iji hụ na asụsụ agaghị abụrụ anyị ogbochi na nghọta.