Sonyere Anyị!

Screen grab from a video taken on January 25, 2015 at the Global Voices 2015 Summit in Cebu, Philippines. Video by Global Voices and PR Works.

Ndị otu Ọgbakọ Global Voices na Jenụwarị 25, 2015 na ọgbakọ Global Voices 2015 na Cebu, Philippines. ihe Onyonyo a bụ nke enwetere na vidiyo sitere na Global Voices na ọrụ PR.

Ike anyị gbadoro ụkwụ na otu Ọgbakọ anyị si arụ ọrụ. Weta mgbanwe na mkparịtaụka zuru ụwa ọnụ site na isonye na otu anyị dị ka Odee  ma ọ bụ onye ntụgharị asụsụ afọ ofufo.  Ọ bụrụ na Ị bụ ọgbakọ, tụlee nsonye na Global Voices dị ka onye mmekọ.

Ndị Odee

Anyị nwere ọtụtụ narị ndị Odee afọ ofufo nọ n'ihe karịrị mba otu nari na iri isi gburugburu ụwa. Ị bụ onye nnyocha nwere nka  mgbasa ozi pụrụ iche, ma  ọ bụ ebe mgbasa ozi nọọrọ onwe ya ma ọ bụ blọọgụ gbasara mpaghara nke mgbasa ozi ọdịnala eleghara anya ma ọ bụ kọwahie?  Biko zite akwụkwọ ka ị sonyere otu ndị odee afọ ofufo anyị site na idejupụta fọm a.

Debanye aha ka inwee ike ide ihe!

Ndị Ntụgharị Asụsụ

Ọrụ asụsụ bụ’ The Lingua project’ na-arụ ọrụ iwetu ihe n'egbochi nnweta nghọta site n'ịtụgharị akụkọ Global Voices n'ọtụtụ asụsụ. Ụfọdụ n'ime ndị ọrụ afọ ofufo anyị bụ ndị ntụgharị ọkachamara, ma ọtụtụ abụghị nke a. Ọ bụrụhaala na ị nwere mmasị ịmụta ma nwee ezi omụma nke opekata mpe asụsụ abụọ, anyị na-akpọ gị òkù ka ị tinye akwụkwọ isonyere otu anyị.

Debanye aha ka inwee ike ime ntụgharị!

Ndị mmekọ

Kemgbe afọ 2004, anyị na ọtụtụ òtù dị iche iche emekọrịtara ihe ọnụ iji kwalite mkparịtaụka zuru ụwa ọnụ.Ụfọdụ ndị mmekọ anyị ugbu a gụnyere The Guardian, PRI.org, Deutsche Welle, Slate, La Stampa, Meedan, 350.org, Witness, na Syria Deeply.N'oge gara aga, anyị na BBC, Reuters na The Economist jikọrọ aka imepụta ihe. Gukwuo maka ozi ndị ọzọ ebe a.

Ngwa enyemaka Onye ntinye aka