Kwadoo usoro akụkọ pụrụ iche nke Global Voices: Nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ na ọchịchị aka ike

E ji Canva Pro mepụta foto a. Foto niile sitere na Canva ma ọ bụ dị n’ebe ọhanaeze nwere ike iji ha eme ihe.
Teknụzụ nwere njikọ chiri anya n'ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ niile nke ndụ n’oge a. Ọtụtụ n’ime teknụzụ ndị a nwere opekata mpe ikike iweta ezigbo mgbanwe n’ịkwalite mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ime ka ọchịchị onye kwuo uche ya gbasaa; N’ezie, e hiwere Global Voices n’echiche bụ na anyị nwere ike iji njikọ dijitalụ nke ịntanetị kesaa akụkọ, kwalite ọmịiko, ma wulite otu jikọtara ọnụ n’agbanyeghị ebe dị anya n’anụ ahụ na ọdịiche dị n’asụsụ na omenaala.
Ma, otu usoro ahụ na-eme ka ike na akụnaụba gbakọta n’ebe ụfọdụ nọ n’ụwa emeela ka e nwee nnukwu nchịkọta akụ na ike n’aka nnukwu ụlọọrụ teknụzụ. Ụlọọrụ ndị a buru ibu nke ukwuu, na-arụ ọrụ n'ọtụtụ mba, ma jikọta ọrụ ha nke ukwuu na ịrụ ọrụ nke ihe ndị anyị na-ewere ugbu a dị ka ọrụ nkwukọrịta ndị dị mkpa na ndụ—site n’ụlọọrụ nkwukọrịta na ndị na-enye ịntanetị ruo n’ọwa mgbasa ozi mmekọrịta mmadụ na ibe ya na nyiwe nkwukọrịta ndị ọzọ. N’ihi nke a, ha nwere ikike na mmetụta buru ibu n’ebe gọọmentị nọ, nakwa n’ebe ndụ, nlebara anya na ego ndị mmadụ n’otu n’otu dị.
Otu n’ime isi ihe na-akpalite ọrụ Global Voices kemgbe ogologo oge bụ ajụjụ gbasara ọchịchị aka ike dijitalụ, ma ọ bụ otu ụlọọrụ ndị a si eme ka mmegbu kwe omume, na-enye ya ike, ma na-etinye ya n’ọrụ n’ụwa dijitalụ nakwa n’ezi ya. N’usoro akụkọ pụrụ iche nke ọnwa Ọktoba, “Nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ na ọchịchị aka ike,” anyị chọrọ imelite ma mee ka akụkọ anyị gbasara ọnọdụ a sikwuo ike site n’akụkọ na nghọta sitere na mpaghara niile anyị na-arụ ọrụ na ha.
Site n’akụkọ ndị a, anyị bu n’obi iwepụ ihe mkpuchi nke nnukwu ụlọọrụ teknụzụ na-eji ezochi njikọ ha na gọọmentị ndị na-eme mmegbu, nakwa ime ka a mata ihe atụ nke ọchịchị aka ike site na teknụzụ—na nguzogide a na-eguzogide ya—n’akụkụ dị iche iche nke ụwa.
Mụtakwuo maka usoro akụkọ pụrụ iche nke Global Voices.
Nye onyinye iji kwadoo usoro akụkọ pụrụ iche anyị gbasara nnukwu ụlọọrụ teknụzụ na ọchịchị aka ike, ma nweta ọtụtụ akụkọ ndị ọzọ gbasara isiokwu ndị ị ji kpọrọ ihe!
Ihe nrite
Onye ọ bụla nyere onyinye ruru $15 ma ọ bụ karịa tupu ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba ga-enweta akwụkwọ dijitalụ (e-book) nke usoro akụkọ pụrụ iche ahụ n’uju, ozugbo e mechara ya.
Ebumnuche mgbakwunye (nchịkọta ọnụ)
$1,000: Mgbakwunye Kolum Undertone ọzọ na-enyocha usoro akụkọ – anyị nwere ọtụtụ echiche maka nkọwa nnyocha akụkọ na-adọrọ mmasị karịa nke anyị nwere ike ịmepụta na atụmatụ mmefu ego anyị nwere ugbu a; nyere anyị aka ịgbakwunye ọzọ!
$1,500: Mgbakwunye otu mkparịtaụka a ga-eme n’ịntanetị, nke ga-achịkọta ndị ọkachamara, ndị nta akụkọ, na ndị nnyocha ka ha nwee mkparịtaụka maka otu akụkụ nke isiokwu a!
$3,000: Otu pọdkast ga-agụnye ajụjụ ọnụ na-esote a ga-eme ndị ndezi na ndị nyere aka n’ịmepụta akụkọ, iji mee ka a mata ụfọdụ n’ime akụkọ kacha adọrọ mmasị dị na usoro akụkọ pụrụ iche ahụ.
$10,000: Mgbakwunye akụkọ ọzọ sitere na mpaghara ọ bụla anyị na-arụ ọrụ na ya. Ọtụtụ n’ime ndị ndezi anyị nwere ọtụtụ echiche maka akụkọ gbasara isiokwu a, karịa nke ha nwere ike imecha n’ime oge ọrụ a na-akwụ ha ụgwọ. Nyere anyị aka ịkwụ ha ụgwọ dị ukwuu, ka unu wee nwetakwuo akụkọ na nghọta ndị na-adọrọ mmasị gbasara ikike ụmụ amaala!
$15,000: Ihe ijuanya! Dabere n’isiokwu a na ihe anyị mụtara gbasara ya ruo ugbu a, anyị ga-ahọrọ ihe mgbakwunye anyị chere na ọ ga-enye aka nke ukwuu n’ime ka nghọta anyị banyere isiokwu usoro akụkọ pụrụ iche a mikwuo emi.
A ka ga-eji ego niile a chịkọtara, ọbụlagodi ma ọ bụrụ na ha erughị ego e debere maka ebumnuche mgbakwunye, kwadoo ụlọọrụ mgbasa ozi Global Voices!
I nwekwara ike ịkwado ka a na-atụgharịkwu akụkọ anyị niile gaa n’asụsụ ndị ọzọ site n’inye Lingua onyinye.






