
Eserese nke Omarela Depablos mere n’afọ 2026. E ji ya mee ihe site n’ikike o nyere.
Edemede a so n'usoro akụkọ pụrụ iche “N’ime Ọdachi Ala Ọma Jijiji nke Venezuela,” ebe anyị na-enyocha ihe ndị mere mgbe ala ọma jijiji ndị ahụ gasịrị, na-ekerịta akụkọ sitere n’ebe ọdachi ahụ mere, ma na-enyochakwa mmetụta ọdachi ndị ahụ nwere n’ahụ mmadụ, mbọ a na-agba iji weghachi ọnọdụ ndụ, na ihe ịma aka ndị obodo ọdachi ndị ahụ metụtara na-eche ihu. A gbanwere aha ụmụaka ndị ahụ iji hụ na e chekwabara ha.
E mepụtara akụkọ a site na nkwado nke Moving Minds Alliance (MMA), sitekwa na ego nkwado akụkọ mgbasa ozi nke Reporters for Early Age Children in Crisis (REACH) Advocacy Stories Fund.
“Gịnị mere ụwa ji eweso ụmụ mmadụ iwe?” ka Elyas, nwa dị afọ ise, jụrụ nne ya ochie, ka o dina n’etiti ọtụtụ akwa ihi ụra e tinyere n’ime ụlọikwuu ọcha n’ebe a na-eme egwuregwu na La Guaira, Venezuela. Ndị ezinaụlọ ya enweghị azịza nye ajụjụ a miri emi.
Ala ọma jijiji abụọ ahụ mere n’ụbọchị June 24 bibiri akụkụ obodo ebe o tolitere. Ọtụtụ ụlọ na ihe owuwu ndị ọ maara nke ọma aghọọla ikpo mkpọmkpọ ebe. Ka ọ dị ugbu a, ụlọ ndị ọzọ ka kwụ ọtọ dịka ọkpụkpụ gbawara agbawa, nwere ike ịda n'ala n'oge ọ bụla.
Ezinaụlọ Elyas na-echegbu onwe ha maka otu o si akọwa n’ụzọ doro anya ma zuo ezu otu mgbidi ụlọelu okpukpu abụọ si dakwasị nna ya n’azụ ma bepu aka nne ya ochie. “Anyị na-agbalị ime ka uche ya pụọ n’ihe ahụ, ma ọ na-amalite ikwu banyere ya n’onwe ya ma na-ajụ ajụjụ banyere ihe niile,” ka nne ya, Sandra, kwuru.
N’usoro ndụ ọhụrụ nwata ahụ na-ebi kwa ụbọchị, mmiri ozuzo abụghịzi naanị mmiri si n’eluigwe na-ezo. Mgbe ọ bụla mmiri zoro nke ukwuu, ọ na-atụ anya ịnụ ịdọ aka na ntị nne ya na-ekwu, sị: “Ala ga-amalitekwa ịma jijiji.” Dị ka nne ya si kwuo, ụda egbe eluigwe na-echetara ya mkpọtụ ahụ nke mere ka ụlọ ha dị na Punta de Mulatos, na La Guaira, gbawaa. Mpaghara a bụ ebe ọdachi ahụ kacha bibie n’ime steeti isii dị n’akụkụ ụsọ oke osimiri ugwu Venezuela nke ala ọma jijiji ndị ahụ metụtara.
“Ọ nụ ụda ụgbọelu, ụjọ a na-atụ ya; ọ nụ ụda egbe eluigwe, ụjọ a na-atụkwa ya […] e nwere otu mmemme e nwere Mickey Mouse na ya, mgbe ha gbawara egbe e ji agbapụ obere mpempe akwụkwọ ndị e ji achọ mma n’emume, ụda ya daa, “Paw!” ozugbo ahụ, ọ malite ịgba ọsọ.
Gụkwuo: Ala ọma jijiji ndị mere na Venezuela na-ekpughe na usoro nchedo ụmụaka adịghị njikere maka ọdachi.
Janet Guerra, onye ọka n'akparamagwa mmadụ na Mahadum Katọlik Andres Bello, nakwa ọkachamara n'ihe gbasara uto ụmụaka, na-akọwa na ọ bụ ezie na ụmụaka nọ n’oge mbụ nke ndụ ha enweghị ike iji ezi uche ghọta ihe omume ndị a, ma ha na-ahapụ akara n'ahụ ha. Site n'afọ efu ruo afọ ise, nke dị oke mkpa maka uto anụ ahụ ha, dịkwa oke mkpa maka mmepe nke mmụọ na uche ha.
“Ọ bụrụ na egwu a akwụsịghị, nwatakịrị ahụ nwere ike ịmalite inwe usoro nke mkpọnwụ ma ọ bụ nwee nsogbu ịchịkwa mmetụta uche ya,” ka Guerra dọrọ aka na ntị. Ọ kọwara na mmetụta nke a nwere ike ịga n’ihu ruo n’oge mmadụ ghọrọ okenye, mgbe ọ ga na-emeghachi omume n'aghọtaghị ebe nsogbu ha si malite.
Dị ka UNICEF si kwuo, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụaka nde 3.9 bi n’ogbe ala ọma jijiji ndị ahụ metụtara, ebe ọtụtụ narị puku n’ime ha chọrọ enyemaka ngwa ngwa gbasara ebe obibi, nri, na nkwado gbasara ahụike uche.
Mmetụta nke ụmụaka enweghị ike ịkpọ aha
N’ekwentị, Elyas na nne ya na-ekiri foto na vidiyo ndị na-egosi otu ndụ ha dị tupu ọdachi ahụ emee: nri abalị ha n'ekeresimesi gara aga, emume ncheta ọmụmụ nwanne ya dị afọ iri na ise, na oge ha tere ụlọ ahụ ha na-atụ ụjọ ịlaghachi na ya ugbu a agba. Ọ na-esiri Elyas ike ịnọ otu ebe. N’oge na-adịghị anya, o bilie, malite ịkwagharị oche nkwagharị nna ya, ma soro ụmụaka ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị ọzọ gbaa ọsọ n’elu ahịhịa a rụrụ arụ.
Kemgbe ọ bịarutere ogige a, enweghi ezumike na obi ọjọọ ya akawanyela njọ. Mgbe ụfọdụ, dị ka nne na nna ya si kwuo, “ọ naghị ege ntị ma ọlị.” Dị ka ndị ọkachamara a gbara ajụjụ ọnụ si kwuo, omume a bụ naanị otu n’ime ụzọ ụmụaka si egosipụta mmetụta uche ha na-enweghị ike ịkọwa ma ọ bụ na-amaghị otu e si akpọ aha ya.
N’ebe obibi dị iche iche gbasasịrị na Caracas na La Guaira, ụfọdụ ndị nne, nna na ndị na-elekọta ụmụaka na-ekwu na ụmụ ha “amaghị” ma ọ bụ “aghọtaghị” ihe na-eme n’ihi na “ha ka dị obere nke ukwuu.” Otu ọ dị, Argelia Escalona, onye ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya na Cecodap, kọwara na echiche a abụghị eziokwu: “Ha na-aghọta ihe na-eme, ha na-enwe mmetụta, ha na-atakwa ahụhụ — ọbụladị ndị kacha pee mpe, ndị dị site n’agbata afọ efu ruo afọ abụọ.” Ha na-amịkọrọ nchekasị dị na gburugburu ha ma na-egosipụta ya site n’omume ha. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka a na-elebara omume ha anya nke ọma, nakwa ka ndị na-elekọta ha na-elekọtakwa onwe ha.
Mmetụta ọjọọ ndị anaghị ahụ anya nke ịkwụsị usoro ihe omume marala mmadụ ahụ
N’ebe dị mita olenaole site n’ebe Elyas nọ, ụmụnne nwanyị abụọ — Daniela dị afọ isii na Albany dị otu afọ — nọ ọdụ n’elu akwa dị gịrịgịrị nke na-enweghị akwa e ji ekpuchi ya, na-ebe ákwá n’otu oge. Nwatakịrị nwaanyị nke kacha okenye anaghị ewepụ anya ya n’aka ya; egwuregwu aghụghọ e ji obere karama ịnya mee emeela ka aka ya na-acha ọbara ọbara ma na-enye ya nsogbu. O siiri ike karịa ịghọta ihe mere nwa ọhụrụ ahụ ji na-ebe ákwá.
Mgbe nne ha jiri mmiri na ude tee aka Daniela iji belata ihe mgbu ọ na-enwe, nne ha, Claudia, nyere Albany ara iji gbalịa ime ka obi dajụọ ya. Ma n’ime sekọnd ole na ole, nwa ọhụrụ ahụ kwụsịrị ịṅụ ara, malitekwa ibe ákwá ọzọ. Ahụ erughị ala ọ na-enwe sitere n’enweghị ihe bụ isi o ji eri nri: karama ya.
Gụkwuo: Ihe karịrị otu ọnwa ka ala ọma jijiji ndị mere na Venezuela gasịrị: ‘Agaghị m esi ebe a pụọ ruo mgbe a chọtara nwa m nwoke’
“Ebe a, ọ naghị enweta mmiri ara ya, ọka a kwọkọrọ nke a na-enye ya ka ọ ṅụọ, ma ọ bụ fororo [ihe ọṅụṅụ e ji ọka mee]. Mgbe ụfọdụ, ana m enye ya ara, mgbe ụfọdụkwa, ana m enye ya nri si n’ụlọ ebe a na-enye ndị mmadụ nri. Ma nri ndị a na-esi ike ịmara ya ahụ. Ọ bụ ya mere o ji dị otu a, na-ebe ákwá mgbe niile,” ka o kwuru.
Dị ka Marianella Herrera, onye ọkachamara n’ihe gbasara nri na-edozi ahụ na Bengoa Foundation, si kwuo, nke a bụ mmeghachi omume a na-atụ anya ya mgbe a kwụsịrị usoro ihe omume marala nwata ahụ ahụ. N’oge ihe mgberede, ebe obibi nke mba na-adịru nwa oge na ogige ndị a na-edobe ndị ọdachi metụtara na-adabere n’ihe enyemaka dị, nke pụtara na a na-ebute ụzọ n’inye nri ndị a na-esikarị n'usekwu ọha, dị ka osikapa, agwa ojii, ma ọ bụ arepa, kama ilekwasị anya n’ihe oriri pụrụ iche maka oge mbụ nke ndụ ụmụaka.
Tupu ala ọma jijiji ahụ emee, ọnọdụ nchekwa nri ụmụaka na Venezuela adịlarị njọ nke ukwuu, ebe erighị nri na-edozi ahụ n'etiti ụmụaka malitekwara ịba ụba ngwa ngwa n’afọ 2016 n’ihi nsogbu enyemaka mmadụ chere ihu na mba ahụ. Akụkọ kachasị ọhụrụ nke Cáritas Venezuela wepụtara site n’ọnwa Maachị 2024 na-egosi na n’ime pasentị 67 nke obodo ndị a na-enyocha ọnọdụ ha na mba ahụ, ọnụọgụgụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise ndị na-arịa ọrịa erighị nri na-edozi ahụ nke na-akawanye njọ, ma ọ dị n’ogo etiti ma ọ bụ dị oke njọ, akarịala ọkwa ịdọ aka na ntị gbasara ahụike.
Ọdachi ala ọma jijiji abụọ ahụ mekwara ka a chọpụta na ụlọọrụ gọọmentị na-ahụ maka nchedo ụmụaka adịla “n’ọnọdụ adịghị ike nke ukwuu, n’enweghịkwa akụrụngwa zuru ezu […] ha enweghị atụmatụ mmefu ego, ụgbọ njem, ma ọ bụ ndị ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ha,” ka Gloria Perdomo nke Redhnna katọrọ. Mbelata enyemaka mba ụwa na mmachi gọọmentị Venezuela nyere òtù ndị na-abụghị nke gọọmentị na-eme ka oghere a dịkwuo njọ.
N’ihi ya, karama nke na-abịabu n’oge a kapịrị ọnụ na-adaberezi n’otú e si enweta ma kesaa ihe enyemaka n’ogige ọ bụla ezinaụlọ ọ bụla bi na ya. Nke a na-emetụta usoro nwa ọ bụla si eji nwayọọ nwayọọ amalite iri nri siri ike. “Ọ bụrụ na nwata nwoke ma ọ bụ nwaanyị erubeghị ogo iso ezinaụlọ ya na-eri otu nri ha na-erikọ ọnụ, ọnọdụ nri ya na-aghọ ihe dị oke egwu mgbe ọ na-agaghị ekwe omume inye ya nri ahaziri kpọmkwem maka ya n’oge a na-enye ọtụtụ mmadụ enyemaka nri.” Ka Herrera kọwara.
Guerra gbakwụnyere na ụdị mgbanwe a na-emetụtakwa obi iru ala nwata ahụ, n’ihi ọ na-emebi usoro ihe omume ndị na-emebu nke na-enye uche ya usoro na udo.
Claudia ku nwa ya n’aka ma na-efegharị ya nwayọọ ka ọ na-eche n’ahịrị iji nweta akpa nri. O lere anya gburugburu ma sụọ ude nke enweghị ntụkwasị obi, sị: “Ha kwuru na ha na-enye ndị mmadụ ụlọ na Caracas. Ọ dị ezigbo anya, ma anyị chọrọ ịga ebe ahụ.” Ka ọ dị ugbu a, ya na ezinaụlọ ya na-adabere n’ogige ebe obibi nwa oge ahụ maka enyemaka, n’ihi na ịla n’iyi nke ụlọ ha metụtara ohere nwa ya nwaanyị nwere inweta nri dị mma ga-ezuru ya. Ihe kacha njọ nwere ike ime bụ na nwa ọhụrụ ya ga-erikwa nri na-adịghị edozi ahụ nke ọma, dị ka o mere nwa ya nwanyị nke tọrọ ya, bụ onye si n’afọ mbụ nke ndụ ya na-enwe mgbanwe dị iche iche n’ịdị arọ na n’ịdị ogologo ya.
Claudia na-ele nri ndị dị n’ime akpa ahụ ọ ka natara. O wepụtara nri mkpụrụ osisi e gweriri nke ọma, bisikiiti, na achịcha dị mbadamba e ji ọka mee, tinyere ihe ndị ọzọ, ma mmiri ara, mmiri ara ehi a kwadebere maka ụmụ ọhụrụ, na ọka a kwọkọrọ nke a na-enye ka ọ ṅụọ adịghị n’ime ya. O kwenyere na ka ụbọchị na-aga, na nri a na-enye n’ogige ahụ ma ọ bụ ịṅụ ara ga-eji nwayọọ nwayọọ mara nwa ọhụrụ ahụ ahụ. N’akụkụ ya, Daniela ji ịnụ ụtọ na-ata bisikiiti ma jụọ mgbe ụgbọala gwongworo ahụ ga-abịa buru ha gaa Caracas. Dị ka nne ya, o kwenyere na n’ebe obibi ọhụrụ, ha ga-enwe ohere ịchọta ụlọ ọhụrụ.