Ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ na-ata ahụhụ kachasị njọ n’ihi nsogbu nchekwa na-akawanye njọ na Mali

Protest in Mali against violence towards women. Screenshot from the video “Protests in Mali against violence towards women” on the<a href="https://www.youtube.com/watch?v=ee6jloHZDe0"> VOA Afrique YouTube channel.</a>

Ngagharị iwe na Mali megide ime ihe ike a na-eme ụmụnwanyị. Nseta ihuenyo sitere na vidiyo “Ngagharị iwe na Mali megide ime ihe ike a na-eme ụmụnwanyị” nke dị na ọwa YouTube VOA Afrique.

Kemgbe afọ 2012, Mali anọwo n’ọgba aghara nchekwa n’ihi mpụta na mgbasawanye nke ọtụtụ ndị otu ji ngwa agha na-abụghị nke gọọmentị ma na-agbaso echiche oke: Jamāʿat Nuṣrat al-Islām wal-Muslimīn (JNIM), Al-Qaeda in the Islamic Maghreb (AQMI), Katiba Macina, Al Mourabitoun, na Islamic State Sahel Province (EIGS). Ndị otu a na-achọ nnwere onwe na inye mpaghara ndị dị n’ugwu mba ahụ ikike ịchị onwe ha, ma na-eji mwakpo ime ihe ike a na-ama ụma ahọrọ eme iji mee ka ndị nọ n’ọchịchị daa mbà ma kwatuo ha. Ọnọdụ a ebutela ọgbaaghara nchekwa na-aga n’ihu n’ofe Mali na mba ndị ọzọ dị na Central Sahel.

Taa, ọnọdụ nchekwa na Mali, otu n’ime mba ndị so na Njikọ Mba Sahel (AES), nke si na Economic Community of West African States (ECOWAS) pụọ na Jenụwarị 28, 2024, ejupụtala na ọgụ dị n’etiti ndị agha Mali na ndị ha na ha jikọrọ aka, na ndị otu ji ngwa agha na-abụghị nke gọọmentị. Ọnọdụ a ka na-emetụta ndị nkịtị n’ụzọ gabigara ókè, ọkachasị ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ ndị na-abụkarị ndị e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ.

Dịka Ụlọ Ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ọnụọgụ Ndị Mmadụ (UNFPA) si kwuo n’Akụkọ Ọnọdụ Mali nke ọnwa Mee 2025, mwakpo ndị otu ji ngwa agha na-ebute alụmdi na nwunye mmanye, ma na-egbochikwa nke ukwuu ohere inweta ọrụ ndị dị mkpa gbasara ahụike mmekọahụ na ọmụmụ nwa, nakwa ọrụ nchebe. N’akụkọ nke ọnwa Maachị 2025, UNFPA kọwara, sị:

In March 2025, armed groups intensified their activities, resulting in violent clashes, which led to significant population displacement. Women and girls continue to bear the brunt of this violence, with their rights and safety increasingly at risk.

Na Maachị 2025, ndị otu ji ngwa agha mụbara ọrụ ha, nke butere ọgụ ime ihe ike na nnukwu mbugharị nke ndị mmadụ. Ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ ka na-ata ahụhụ kachasị njọ n’ihi ime ihe ike a, ebe ikike na nchekwa ha na-anọwanye n’ihe ize ndụ.

Nke ka njọ bụ na mbelata ego nkwado Amerịka na-eme ka ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ ndị a nọrọkwuo n’ihe ize ndụ. Akụkọ ahụ gara n’ihu, sị:

However, the sudden termination of U.S. funding has caused the cessation of key humanitarian programmes, leaving thousands stranded without critical life-saving assistance, further exacerbating the vulnerabilities of populations already affected by ongoing conflicts. The impact has been particularly severe on GBV (gender-based violence) services, with over 191,000 people losing access to essential protection, and SRH services, including maternal care and family planning, which has left over 200,000 people at risk.

Otú ọ dị, nkwụsị mgberede nke ego nkwado Amerịka ebutela nkwụsị nke mmemme enyemaka mmadụ ndị dị mkpa, hapụkwa ọtụtụ puku mmadụ n’enweghị enyemaka dị oke mkpa maka ịzọpụta ndụ. Nke a emewanyela adịghị ike nke ndị agha na-aga n’ihu metụtarala. Mmetụta ahụ kacha njọ n’ọrụ gbasara ime ihe ike n’ihi okike (GBV), ebe ihe karịrị mmadụ 191,000 efunahụla ohere inweta nchebe dị mkpa, nakwa n’ọrụ ahụike mmekọahụ na ọmụmụ nwa (SRH), gụnyere nlekọta ndị nne na atụmatụ ezinụlọ, nke tinyela ihe karịrị mmadụ 200,000 n’ihe ize ndụ.

Na mgbakwunye ime ihe ike ahụ, Mali atawokwa ahụhụ n’ihi nnukwu ọgbaaghara akụ na ụba na nke ọha mmadụ, nke nnukwu mbugharị ndị mmadụ so kpata. Ọ bụ ezie na nsogbu ndị a na-emetụta ụmụnwanyị na ụmụaka, a naghị akọwakarị mmetụta ha na-enwe nke ọma n’akụkọ gọọmentị.

 

Ime ihe ike mmekọahụ a na-eleghara anya nke ukwuu

Na Mali, n’ọnwa Juun 2025, a chụpụrụ ihe karịrị mmadụ 402,000 n’ebe obibi ha, ebe pasent 58 n’ime ha bụ ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ. Akụkọ odeakwụkwọ ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu nke afọ 2024 banyere ime ihe ike mmekọahụ metụtara agha dekọrọ ikpe idina mmadụ n’ike, alụmdi na nwunye mmanye, ịtọrọ mmadụ, na ịgba mmadụ ohu mmekọahụ nke ndị otu ji ngwa agha mere na mpaghara Gao, Ménaka (etiti ọwụwa anyanwụ), Kayes (ndịda ọdịda anyanwụ), Mopti, Ségou (etiti ndịda), na Tombouctou (ugwu). Nke a na-egosi etu mmebi ikike ndị a hà na ịdị njọ ha.

N’ime ime obodo na ogige ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha n’ime mba ahụ, akaebe banyere iji mmadụ eme ihe n’ụzọ mmekọahụ, iyi egwu mmekọahụ, na alụmdi na nwunye mmanye na-arịwanye elu. Ndị otu ji ngwa agha na-abụghị nke gọọmentị na-erigbu obodo ndị na-adịghị ike, ma na-akwalite ọnọdụ egwu na nrubeisi. Ụlọ ọrụ mba ụwa ekwuola na nsogbu enyemaka mmadụ a na-emetụta ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ nke ukwuu.

N’afọ 2025, Amadou, onye otu ọha mmadụ na Mali, bụ onye ndị ji ngwa agha zuru ohi n’ike, hụkwara ka ndị ikom ji ngwa agha na-edina ụmụnwanyị n’ike. Ọ gwara Global Voices, sị:

C'état un vendredi soir, vers 19h, des bandits armés ont pris d’assaut notre bus, sans qu’aucun secours n’arrive. Nous avons tout de suite compris qu’il s’agissait d’un braquage. Nous avons été tous dépouillés, et une dizaine de femmes ont été violées. La terreur et le désespoir de cette nuit resteront à jamais gravés dans ma mémoire. Je n’oublierai jamais leurs cris, leurs larmes, et ce sentiment d’impuissance totale. Cette nuit m’a montré combien il est urgent de protéger les femmes et de briser le silence face à la violence.

It was around 7 pm on a Friday evening when armed men stormed our bus, and no help came. We immediately realized this was an armed robbery. They robbed us of everything and raped ten or so women. The terror and despair on that night will be forever etched in my mind. I will never forget their screams, their tears, or that feeling of complete helplessness. That night showed me how urgent it is to protect women and break the silence on this violence.

Ọ bụ ihe dịka elekere asaa nke mgbede Fraịde mgbe ndị ikom ji ngwa agha wakporo ụgbọala anyị, ma enyemaka ọ bụla abịaghị. Anyị ghọtara ozugbo na ọ bụ izu ohi e ji ngwa agha eme. Ha napụrụ anyị ihe niile ma dinaa ihe dịka ụmụnwanyị iri n’ike. Ụjọ na obi nkoropụ nke abalị ahụ ga-adịgide n’uche m ruo mgbe ebighị ebi. Agaghị m echefu mkpu ha, anya mmiri ha, ma ọ bụ mmetụta ahụ nke enweghị ike inyere ha aka. Abalị ahụ gosiri m mkpa ọ dị ngwa ngwa ichebe ụmụnwanyị na ịkwụsị ịgbachi nkịtị banyere ime ihe ike a.

Ebe ọ bụ na alụmdi na nwunye mmanye gbanyere mgbọrọgwụ n’ọdịnala, ọ juru ebe niile, karịchaa n’ebe ịda ogbenye na enweghị nchekwa na-egbochi ohere. Na mba a, otu nwa agbọghọ n’ime mmadụ abụọ na-alụ di tupu ọ gbaa afọ 18. Omume a nwere nnukwu nsonaazụ: ịkwụsị agụmakwụkwọ, ịtụrụ ime n’oge, mmụba nke ime ihe ike n’ezinụlọ, na mmebi ahụike anụ ahụ na nke uche ụmụagbọghọ.

Gụọ: Ndị bi n’ime ime obodo Mali na-agbakọta imegide alụmdi na nwunye ụmụaka iji chebe ọdịnihu ụmụagbọghọ.

Nkwụsi ike ụmụnwaanyị n’oge ihe isi ike

N’agbanyeghị ọnọdụ ndị a siri ike, ọtụtụ ụmụnwanyị Mali na-ezukọta n’obodo ha iji kwụsị ịgbachi nkịtị. Òtù ụmụnwanyị dị iche iche n’obodo emepụtala ebe nchekwa, hazie mkpọsa ime ka ndị mmadụ mata nsogbu ahụ, ma na-akwado ndị lanarịrị ime ihe ike. Atụmatụ ndị a bụ ụdị nguzogide na nkwụsi ike n’ihu ime ihe ike gbanyere mgbọrọgwụ n’usoro obodo.

Otú ọ dị, òtù obodo ndị a enweghị ego na akụrụngwa zuru ezu, ọrụ ha ka nwekwara ọtụtụ adịghị ike n’ihi oke mkpa dị. Alimata Traore, Onyeisi Convergence of Rural Women for Food Sovereignty (COFERSA) na Mali, kọwara, sị:

Les femmes restent le premier groupe social discriminé. Elles ont moins accès à la représentation politique, aux postes de pouvoir économique, à l’éducation et elles sont surtout les premières victimes de la pauvreté.

Women remain the most discriminated against social group. They have less access to education, political representation, positions of economic power, and are the primary victims of poverty.

Ụmụnwanyị ka bụ otu ọha mmadụ a na-akpa ókè kachasị. Ha anaghị enweta ohere zuru ezu n’agụmakwụkwọ, nnọchite anya ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ọkwá ndị nwere ikike n’akụ na ụba, ha bụkwa ndị ịda ogbenye kacha emetụta.

Ikpochapụ ime ihe ike, ohere inweta ọrụ ahụike ọmụmụ nwa, ikpe ziri ezi nye ndị e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ, na agụmakwụkwọ ụmụagbọghọ ka bụ ihe ndị dị oke mkpa.

Ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ Mali nọ n’etiti nsogbu ndị a. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị agha ha na-enweghị ihe ha mere kpatara metụtara, ha bụkwa ihe nnọchianya nke olileanya na mgbanwe. Amadou gbakwụnyere, sị:

Certes, nous avons été dépouillés, mais ce sont les femmes qui ont survécu à l’horreur et dont la sécurité et la dignité restent profondément mises en péril. Il est urgent que les initiatives locales soient soutenues, et que les autorités écoutent les voix des femmes et leur donne les moyens d’agir pour se protéger.

Of course, the bandits robbed us, but the women are the ones who survived these horrors and whose security and dignity remain deeply threatened. It is imperative that local initiatives be supported and that the authorities listen to women and empower them to protect themselves.

N’ezie, ndị ohi ahụ zuru ihe anyị, mana ọ bụ ụmụnwanyị lanarịrị ajọ ihe ndị a, ebe nchekwa na ugwu ha ka nọkwa n’ihe ize ndụ dị ukwuu. Ọ dị oke mkpa ịkwado atụmatụ obodo, nakwa ka ndị ọchịchị gee ụmụnwanyị ntị ma nye ha ike ichebe onwe ha.

Ichebe ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ ekwesịghị ịbụ ihe a na-ahọrọ ime ma ọ bụ ghara ime; ọ ga-abụrịrị ihe kacha mkpa iji nweta udo na-adịgide adịgide na Mali.

Gụọ akụkọ pụrụ iche anyị: Mali: Mwughachi mba n’okpuru ọchịchị ndị agha

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.