Onye nwere ike ikwuchitere ọha? Ụzọ ọhụrụ nke ngagharị iwe na Sahel.

Demonstrations in the Sahel: (left) Mali, (center) Niger, and (right) Burkina Faso.

Ngagharị iwe na Sahel: (n’aka ekpe) Mali, (n’etiti) Niger, na (n’aka nri) Burkina Faso. Foto e setere na vidiyo dị na YouTube.

Edemede a so n’usoro akụkọ pụrụ iche nke Global Voices nke Septemba 2026, “Ngagharị Iwe n’Ọchịchị Onye Kwuo Uche Ya.” Site n’usoro akụkọ a, anyị chọrọ inyocha ụdị ngagharị iwe dị iche iche, ụzọ ndị ọchịchị si eme ka ndị mmadụ ghara ikwenye na ha ma na-egbochi ha, na mmekọrịta dị mgbagwoju anya dị n’etiti ngagharị iwe na ọchịchị onye kwuo uche ya. I nwere ike ịkwado ọrụ mgbasa ozi a site n’inye onyinye ebe a.

N’ime mba ndị dị n’etiti mpaghara Sahel, Mali, Burkina Faso, na Niger, ndị ọchịchị ndị agha na-ewepụta onwe ha dị ka ndị na-ekwupụta mweghachi nke ikike ọchịchị n’aka ndị mmadụ. N’otu oge ahụ, a gbasasịala otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mba atọ ahụ niile, a kwụsịkwara ọrụ nke ihe karịrị otu puku òtù ọha mmadụ na Burkina Faso, ebe ndị otu ndị ọrụ na Niger na-echekwa mwakpo ihu.  Gịnị na-eme ikike ime ngagharị iwe mgbe ndị nọ n’ọchịchị na-ekwu na ha na-anọchite anya kpọmkwem ndị a na-eme ngagharị iwe n’aha ha?

Site n'abalị 28 ruo 29 nke ọnwa Ọgọstụ n’afọ 2026, a nụrụ ụda egbe dị ukwuu na mgbawa na Niamey, Niger.  Ọchịchị General Abdourahamane Tiani, site na nkwado ndị agha Russia, gbochiri mbọ ọchịchị mgbagha nke zubere ịwakpo ụlọọrụ onye isi ala, ọdụ ụgbọelu na ụlọọrụ ihe onyonyon mba ahụ. Ihe a mere bụ ihe ncheta ọzọ na-egosi adịghị ike nke ọchịchị ndị agha na-achị na mpaghara Sahel kemgbe afọ 2020, nakwa otu ọ dị mfe isi jiri ọgbaaghara ọ bụla — ma o sitere n’ime ndị agha ma ọ bụ n’aka otu ọha mmadụ — dịka ihe ngọpụ iji tinyekwuo mmachi n’ọrụ ndị mmadụ na òtù ọha mmadụ na-arụ n’ihu ọha.

Na Juun 30, 2026, Ụlọ Ọrụ Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ikike Mmadụ kwupụtara na ọ ga-emechi ụlọ ọrụ ya dị na Burkina Faso kpamkpam, mgbe ndị ọchịchị obodo ahụ kwụsịrị ọrụ ya na Febrụwarị. Na Julaị 29, 2026, CIVICUS tinyere Burkina Faso na ndepụta mba ụwa nke mba ndị a na-enyocha nke ọma, na-edekọ opekata mpe  òtù ọha mmadụ 1,174 ndị a kwụsịtụrụ ma ọ bụ kagbuo ọrụ ha kemgbe mmalite afọ ahụ.

Mba atọ, otu ụzọ nhazi ụlọọrụ

Tupu ndị agha ewere ọchịchị, ọtụtụ puku ụmụ amaala abanyelarị n’okporo ama na Mali, Burkina Faso, na Niger iji mee ngagharị iwe megide ọchịchị na-adịghị mma, enweghị nchekwa, na nrụrụ aka. Na Mali, ngagharị iwe nke afọ 2020 so n’ihe ndị kpatara ọnọdụ nke ndị agha ji kwatuo Onye isi ala Ibrahim Boubacar Keïta. Na Burkina Faso, ọchịchị mgbagha abụọ e mere n’afọ 2022 mere n’oge iwe na enweghị afọ ojuju gbasara enweghị nchekwa gbasara n’ebe niile. Na Niger, e nwekwara nkwupụta ndị agha kwusịrị ike na ikike mba ahụ nwere ikpebi ihe gbasara onwe ya, mgbe a chụpụrụ Onyeisi ala a họpụtara site na ntuli aka, Mohamed Bazoum, n’ọchịchị na Julaị 2023.

N’ọnọdụ atọ ndị a niile, ndị agha mechara malite iji nwayọọ nwayọọ na n’usoro mebie usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-enye ohere ka echiche na otu dị iche iche dịrị ma na-arụ ọrụ, bụ usoro ha kwere nkwa ịkpọliteghachi.

Na Mali, na ngwụcha Eprel 2025, nzukọ ndụmọdụ mba nke ọtụtụ ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị jụrụ isonye na ya tụrụ aro ka a kagbuo otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nakwa ka e mee Genaral Assimi Goïta onye isi ala maka afọ ise. A bịanyere aka n’iwu kagburu otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ahụ n’abalị iri na atọ nke ọnwa Mee 2025, n’agbanyeghị ngagharị iwe abụọ ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na òtù ọha mmadụ haziri na Bamako na mbido ọnwa Mee iji megide ya. Dịka akụkọ banyere ọnọdụ mpaghara ahụ si kwuo, ndị a bụ ngagharị iwe mbụ ndị otu mmegide mere na Bamako kemgbe afọ 2020. Ndị ọkachamara nọọrọ onwe ha nke Mba Ndị Dị n’Otu dọrọ aka na ntị na usoro ahụ meghere ụzọ iji were ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị niile dịka mpụ.

Na Julaị 3, 2025, e mere ka oge Goïta ga-anọ n’ọchịchị bụrụ afọ ise, nke a pụrụ imegharị “ugboro ole ọ bụla ọ dị mkpa,” dịka France 24 si kọọ. Kemgbe mbido ọnwa Mee 2026, ndị ọchịchị Mali amụbawokwa mkpagbu ha na-akpagbu ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị mmegide site n’ijide ndị mmadụ n’enweghị ezigbo ihe ndabere iwu. A na-ahụ usoro ịtọrọ mmadụ a na-eme ugboro ugboro, nke a na-ekwu na Ụlọ Ọrụ Mba Maka Nchekwa Steeti na-eme.

Kemgbe Septemba 30, 2022, a kwụsịtụrụ ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Burkina Faso, ma kagbuo otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị niile kpamkpam na Jenụwarị 29, 2026, mkpebi CIVICUS kọwara dịka nke “na-adịgide adịgide.” N’abalị iri na ise nke ọnwa Eprel 2026, a kagburu òtù ọha mmadụ 118 na-arụ ọrụ gbasara ikike mmadụ, ahụike, ma ọ bụ agụmakwụkwọ, n’okpuru iwu Julaị 2025 gbasara nnwere onwe isonye n’òtù. Mgbe a jụrụ Binta Sidibé Gascon, Onyeisi Kisal Observatory, banyere ọnọdụ a, ọ gwara Human Rights Watch, sị:

La dissolution massive des organisations de la société civile n’est que le dernier acte de la junte du Burkina Faso pour faire taire la dissidence et éviter toute analyse de son bilan peu reluisant en matière de droits humains. Cette décision renforce un climat de peur qui paralyse l'activité civique indépendante.

The mass dissolution of civil society organizations is merely the latest move by the Burkina Faso junta to silence dissent and prevent any scrutiny of its dismal human rights record. This decision reinforces a climate of fear that paralyzes independent civic activity.

Nnukwu mkpochapụ a kagburu òtù ọha mmadụ bụ naanị ihe ọhụrụ ọchịchị ndị agha Burkina Faso mere iji mechie ọnụ ndị na-emegide ya ma gbochie nyocha ọ bụla banyere ndekọ ya jọgburu onwe ya n’ihe gbasara ikike mmadụ. Mkpebi a na-eme ka ọnọdụ egwu nke na-egbochi ọrụ ọha mmadụ nọọrọ onwe ya sikwuo ike.

Na Niger, na Maachị 26, 2025, Onyeisi Ala Abdourahamane Tiani bịanyere aka na iwu kagburu otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị niile, bụ́ ndị a kwụsịtụrụla ọrụ ha kemgbe nkwatu ọchịchị nke Julaị 2023. N’ọnwa Ọgọọst 2025, a kagburukwa ọtụtụ òtù ndị ọrụ na-anọchite anya ndị ọkachamara n’iwu. Nke a mere ka Òtù Ndị Ọka Iwu Niger katọọ mkpebi ahụ, ebe ndị ọka iwu mere ngagharị nkwụsị ọrụ izugbe ụbọchị abụọ, dịka Human Rights Watch si kọọ. N’akụkọ ya nke Julaị 2026, HRW depụtara ọtụtụ usoro mmachi ndị ọchịchị agha ahụ tinyere. Ha gụnyere ịkagbu pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị na òtù ndị ọrụ nọọrọ onwe ha, ijide ndị nta akụkọ n’okpuru iwu gbasara mpụ ịntanetị, ịnara ndị mmegide ikike ịbụ ụmụ amaala, ikwupụta atụmatụ ịpụ n’Ụlọikpe Mpụ Mba Ụwa, na ịgbatị oge mgbanwe ọchịchị n’enweghị atụmanya ntuli aka ọ bụla.

Onye na-ekwuchitere ọha mmadụ?

Ọchịchị ndị agha atọ ahụ ji otu ụdị okwu kwadoo usoro ndị a: ọbụbụeze mba, ime ka mba dị ọhụrụ, na ọgụ megide nnyonye anya mba ọzọ. Amnesty International kwadoro nchọpụta a n’okwu o nyere Kọmitii Ikike Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu: na Mali, Niger, na Burkina Faso, ọchịchị ndị agha ji nwayọọ nwayọọ na-amachi nnwere onwe n’aha ọgụ megide ọchịchị alaeze ukwu na ichebe ọbụbụeze mba, ebe a na-eji iwu ndị isi agha nyere amanye iwu n’enweghị nlekọta ndị omeiwu ma ọ bụ nyocha nke iwu ọchịchị.

Ọnọdụ a na-ebute otu ajụjụ dị mfe nke a na-anaghị ajụkarị n’ụzọ doro anya: Ọ bụrụ na akụkụ ụfọdụ nke ndị mmadụ na-akwado ndị ọchịchị ọhụrụ ahụ, ọ̀ pụtara na ndị na-akatọ ha esoghịzi na ndị mmadụ?

Nke a bụ ọnọdụ ndị nta akụkọ ole na ole ka na-arụ ọrụ na mba atọ ahụ na-eche ihu. Amnesty International chịkọtara akaebe sitere n’aka ha atọ, ma jiri aha nzuzo dochie aha ha, n’akụkọ e bipụtara na Eprel 30, 2026. Otu n’ime ha, onye a kpọrọ Mohamed C., kwenyere na:

I think the crackdown is most severe in Burkina Faso, but in all three countries, there’s been a major setback. Quality media outlets, with history and tradition, are at risk of disappearing (…).

Echere m na mkpagbu ahụ kacha njọ na Burkina Faso, mana nnukwu ndaghachi azụ emeela na mba atọ ahụ niile. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị na-ebipụta akụkọ dị mma, ndị nwere ogologo akụkọ ihe mere eme na ọdịnala, nọ n’ihe ize ndụ nke ịla n’iyi (…).

Otu akụkọ ahụ kwuru na Amnesty edekọbuola mkpagbu a na-akpagbu ụlọ ọrụ mgbasa ozi na Niger n’akụkọ ya nke Maachị 2025, tupu o malite mkpọsa n’ọnwa Ọktoba 2025 banyere ọnọdụ ndị na-akwado mgbanwe na ndị nta akụkọ nọ na mba atọ ahụ.

Mgbe otu ndọrọndọrọ ọchịchị na otu ndị ọrụ kwụsịrị ịdị.

Mwepụ nke òtù ndị a haziri ahazi apụtaghị na mmegide akwụsịla. Kama, ọ na-agbanwe ụdị na ókè ya.

Na Burkina Faso, na Mee 26, 2026, njide Imam Mohamed Ishaq Kindo, onye katọrọ atụmatụ iwu na-achịkwa omume okpukpe, kpalitere iwe n’etiti ndị na-eso ụzọ ya. Ha mere ngagharị iwe n’isi obodo Ouagadougou, tupu ndị ọrụ nchekwa achụsasịa ha. Nke a na-egosi na n’okpuru ọnọdụ ụfọdụ, okporo ámá ka bụ ebe ndị mmadụ pụrụ igosipụta mmegide, ọ bụ ezie na nke a na-eme naanị mgbe ụfọdụ ma nwee nnukwu ihe ize ndụ na mba ebe pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị adịghịzi. Na Niger, ọ bụ ndị ọka iwu, site n’òtù ọrụ ha, duziri ngagharị mmegide mgbe a kagburu òtù ndị ọrụ ikpe n’afọ 2025. Nke a bụ ụdị nguzogide sitere n’ụlọ ọrụ kama ịbụ ngagharị iwe n’okporo ámá, dịka HRW siri dekọọ.

N’ebe ndị ọzọ, ngagharị mmegide agbagala n’ebe ndị a na-anaghị ahụkarị: ebe mgbasa ozi mmekọrịta, ọdịnaya e ji eme akaja, otu mkparịta ụka nkeonwe, na mkpọsa ndị si mba ọzọ na-edu. N’ihi ụdị ha, ọ na-esikarị ike ịmata etu ha hà ma si otú ahụ sie ike ikpochapụ ha kpamkpam. Ma ikike ha nwere iwulite usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adịgide adịgide pere mpe.

Nchekwa dịka ihe mgbochi nye ngagharị iwe

Nnyocha ọ bụla gbasara ngagharị iwe na Sahel aghaghị iburu n’uche otu ihe mere ọnọdụ mpaghara ahụ ji dị iche na nke ọchịchị aka ike ndị ọzọ: agha. Mali, Burkina Faso na Niger na-alụso ndị otu ji ngwa agha ọgụ, bụ́ ndị nwere njikọ na Al-Qaeda (JNIM) na Islamic State. Ndị nkịtị bụ ndị kacha ata ahụhụ: Na Burkina Faso, Amnesty International dekọrọ na n’agbata abalị 10 na 11 nke ọnwa Maachị 2026, ndị agha na ndị enyemaka ha nke VDP gburu ma ọ dịkarịa ala ndị nkịtị 58 na-ejighị ngwa agha n’ụzọ megidere iwu na Solenzo na gburugburu ya.

Ọnọdụ enweghị nchekwa a na-abụkarị ihe ngọpụ e ji amachi ohere ụmụ amaala nwere isonye n’ihe gbasara ọha na eze. HRW kwuru na na mba atọ ahụ niile, gọọmentị anọgidewo na-amachi nnwere onwe ikwupụta echiche, igosipụta mmegide, na ọrụ mgbasa ozi, ebe ha na-aga n’ihu ịpụ n’òtù mpaghara na nke mba ụwa—gụnyere ịpụ kpamkpam na Economic Community of West African States (ECOWAS) na mba atọ ahụ niile ịpụ n’Ụlọikpe Mpụ Mba Ụwa.

Nye ndị na-enyocha ọnọdụ Central Sahel, nnukwu ihe ịma aka bụ ịchọpụta ebe ezi mbọ ichebe ndị mmadụ kwụsịrị na ebe iji egwu ghọgbuo ndị mmadụ iji mechie ọnụ ndị mmegide malitere.

Ọchịchị onye kwuo uche ya o nwere ike ịdị ma ọ bụrụ na-enweghi ikike ịjụ n'ikwenye n’ihe a na-ekwu?

Ọ bụ ezie na mba atọ ahụ nọ n’otu ụdị ọnọdụ, ha esoghị otu ụzọ kpọmkwem. Ọkwa nkwado ndị mmadụ na-enye ndị ọchịchị dịgasị iche, dịkwa ka etu agha ahụ siri sie ike. Mana otu ihe pụtara ìhè n’akụkọ ndị e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya: a na-eji usoro doro anya na-ebelata ohere ụmụ amaala nwere isonye n’ihe gbasara ọha na eze, mgbe ihe na-erubeghị otu afọ gachara kemgbe ọchịchị ndị agha ahụ kwere nkwa inye ndị mmadụ olu.

Nwa amaala nwere ike ịkwado ịkwụsị ịdabere n’aka mba ndị chịrị ha n’oge gara aga ma, n’otu oge ahụ, chọọ ka ndị ọchịchị ọhụrụ zaa ajụjụ maka omume ha. O nwere ike ịbụ na ọ kwadoro nkwatu ọchịchị, ma ugbu a ọ na-ajụ ihe mere e ji machibido pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị iwu, ihe mere e ji kagbuo òtù ndị ọrụ, nakwa ihe mere e ji agba ndị nta akụkọ akwụkwọ n’ụlọ ikpe. Site n’echiche nlekota ụmụ amaala n’omume gọọmentị, echiche ndị a na-akwado ibe ha kama imegide ibe ha: Ịbụ otu n’ime ndị mmadụ apụtaghị ikwenye n’ihe niile ndị na-achị n’aha ha na-eme.

Ọ bụ ezie na ọnọdụ ọhụrụ a na Central Sahel na-egosi ndị ọchịchị agha dịka ndị na-ekwu okwu n’aha ndị mmadụ, ọ na-ewelite otu n’ime ajụjụ kachasị mkpa gbasara ọchịchị onye kwuo uche ya na mpaghara ahụ: Ndị na-achị n’aha ndị mmadụ hà ka dị njikere ịnụ ka ụfọdụ n’ime ndị ahụ si n’okporo ámá ma ọ bụ n’ebe ha gbara ọsọ ndụ na mba ọzọ zaghachi ha, sị, “Anyị ekwenyeghị”?

 

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.