
Foto isiokwu nke ọkọlọtọ Haiti na aka a chịkọtara ọnụ ma welie elu dịka ihe nnọchianya nguzogide, nke e ji ihe ndị sitere na Canva Pro mepụta.
Mpaghara Etiti nke Haiti (Plateau Central) dị n’etiti mpaghara Ọdịda Anyanwụ na Nnukwu Ugwu nke mba ahụ, ọ gbasara ihe dịka kilomita skwea 3,487 (ihe dịka maịlụ skwea 2,166).
Obodo Saut d’Eau na Mirebalais bụ ndị a ma ama maka nnukwu mmemme okpukpe, mmemme egwu, na nnukwu emume okpukpe. Ndị mmadụ si ebe dị iche iche na-agabu ụlọ ụka Katọlik dị n’ebe ahụ. N’abalị iri na isii nke ọnwa Julaị kwa afọ, Saut d’Eau na-eme emume Notre Dame du Mont Carmel (nke a na-akpọkwa Vyèj Mirak Sodo), ebe nnukwu ihe omume na-amalitekarị n’etiti ọnwa Julaị. Ọtụtụ ndị njem okpukpe na-aga n’ebe ahụ ịsa ahụ na nsụda mmiri e si nweta aha obodo ahụ, ikpe ekpere nye onye nsọ ahụ, isonye na nnukwu emume Vodou, nakwa ịnụ ụtọ mmemme omenala.
Mpaghara ahụ (ógbè) nwere obodo anọ ndị ha na Dominican Republic (DR) nwere otu oke ala: Cerca-la-Source, Thomassique, Belladère, na Savanette. Mpaghara ahụ nwere omenala ọrụ ugbo siri ike, a makwaara ya maka ịzụ ọtụtụ anụ ufe, gụnyere ọkụkọ, toro toro na ọbọgwụ, tinyere anụ ụlọ dịka ehi, ewu na ezi.
Ndị mmadụ na-akọ ugbo n’ala ghere oghe ma na-akọkwa ugbo n’ezinụlọ; a na-ahụkwa anụ ufe n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ogige ezinụlọ ọ bụla. Mpaghara Centre bụ naanị mpaghara dị na Haiti na-enweghị ụsọ oké osimiri; kama nke ahụ, ya na Dominican Republic (DR) nwere ọtụtụ osimiri na ọdọ mmiri. Ọzọkwa, ọnọdụ ya n’ókè mba na-eme ka azụmahịa dị n’etiti mba abụọ ahụ dị mfe, ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ngwaahịa na-esi kpọmkwem n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe ndị dị na Dominican Republic.
Tupu afọ 2023, a maara mpaghara a dịka ebe udo na nchekwa dị—ọkachasị ma e jiri ya tụnyere mpaghara West na Artibonite—n’ihi na ndị otu omempụ ji ngwa agha awakpotụbeghị ya. Otú ọ dị, ọnọdụ ahụ malitere ịgbanwe na Septemba 25, 2023, mgbe ndị otu omempụ ji ngwa agha wakporo Mirebalais University Hospital (HUM) na nke mbụ ya. Zanmi Lasante, ụlọ ọrụ ahụike na-abụghị nke gọọmentị kacha ukwuu na mba ahụ, wuru ụlọ ọgwụ ahụ na mmekorita ya na ndị mmekọ mba ụwa. Ndị uwe ojii na ndị otu obodo na-echebe onwe ha nwere ike ịchụghachi ndị otu ahụ ji ngwa agha, mana tupu mbọ mbata ike a, ọtụtụ ndị na-agbanahụ ime ihe ike na mpaghara mepere emepe Port-au-Prince agbabala ọsọ ndụ na mpaghara a.
Ọnọdụ ahụ kawanyere njọ n’agbata Maachị 30 na Eprel 3, 2025, mgbe ndị otu omempụ na-arụ ọrụ n’isi obodo na gburugburu ya malitere nnukwu mwakpo ngwa agha megide Mpaghara Centre, karịchaa Mirebalais na Saut d’Eau. Jeff Larose (onye a makwaara dịka Jeff Gwo Lwa) nke otu omempụ Canaan Taliban, na Wilson Joseph (onye a maara dịka Lanmò Sanjou) nke otu omempụ 400 Mawozo, duziri ndị otu a. Otu abụọ a so na njikọ aka ndị omempụ a maara dịka Viv Ansanm (“Ibikọ Ọnụ” n’asụsụ Bekee). Tupu ndị mwakpo ahụ agbaa ụlọ na ugbo ọkụ, ha ji usoro zuru ihe onwe onye na akụ ụlọ nke ndị bi n’ebe ahụ. Ha bibiri ọdụ ndị uwe ojii, tọhapụ ndị mkpọrọ, gbaa ụlọ ahịa ọkụ, gbaa ndị mmadụ egbe, ma kwakọrọ ihe n’ụlọ ọgwụ ahụ.
Ọtụtụ mmadụ nwụrụ na mwakpo ndị a, dịka akụkọ Òtù Mba Ụwa Maka Mbugharị (IOM), Ụlọ Ọrụ Njikọta nke Mba Ndị Dị n’Otu na Haiti (BINUH), na Ụlọ Ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ịhazi Enyemaka Ọdachi (OCHA) si kwuo. Ime ihe ike ahụ manyere ọtụtụ puku mmadụ ịgbapụ n’ụlọ ha ma chọọ ebe mgbaba n’obodo ndị ọzọ dị n’ime mpaghara ahụ, gụnyere Hinche, Belladère, na Maissade. Dịka IOM si kwuo, ihe dịka mmadụ 147,000 a chụpụrụ n’ebe obibi ha gbapụrụ ịchọ ebe nchekwa.
Kemgbe oge ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị bi n’obodo dịka Mirebalais na Saut d’Eau aghaghị ịkwaga n’ebe ndị gbara ha gburugburu ma biri n’ebe ọha na eze dịka ụlọ akwụkwọ, bụ́ ndị ha ji dịka ebe mgbaba. Ọnọdụ ibi ndụ n’ebe ndị ahụ siri ezigbo ike n’ihi mmadụ karịrị akarị na enweghị ezi ịdị ọcha.
N’abalị ise nke ọnwa Juun afọ a, Òtù Mba Ụwa Maka Mbugharị (IOM), na mmekorita ya na ụlọ ọrụ nchekwa ndị nkịtị nke ugwu Haiti, nakwa site na nkwado Ụlọ Ọrụ Nnọchiteanya Amerịka dị na Port-au-Prince, guzobere mmemme ibughari mmadụ. Mmemme ahụ nyere ihe karịrị ezinụlọ 350 a chụpụrụ n’ebe obibi ha ohere isi n’ebe mgbaba abụọ dị n’ụlọ akwụkwọ na Hinche kwaga n’ebe nnabata nwa oge ọhụrụ. Tupu atụmatụ a amalite, ezinụlọ ndị a na ihe ruru ezinụlọ 15 ndị ọzọ na-ebikọ n’otu ime ụlọ, ebe ihe ruru mmadụ 70 na-anọkọ n’otu ọnụ ụlọ.
Ugbu a, e wezụga inwekwu ohere na nzuzo, ha nwekwara ohere ka mma inweta mmiri, ebe mposi, na ọrụ ịdị ọcha. Nkwaga ahụ ga-eme ka ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 1,000 nwee ike ịlaghachi n’ime ụlọ akwụkwụ ha na mbido afọ agụmakwụkwọ ọhụrụ n’ọnwa Septemba a.
Otu nwanyị a chụpụrụ n’ebe obibi ya, Marie Christiane, kwuru na mgbe mbụ o rutere Hinche, o chere na ya ga-anwụ: “Ahapụrụ m ụlọ m, ebe m bi n’ọnọdụ dị mma, gaa n’ụlọ akwụkwọ ebe m na-ehi ụra n’elu tebụl ụmụ akwụkwọ na ụgbọ nzu ndị anyị tọgbọọrọ n’ala. O wutere m nke ukwuu. Mmiri na-asọghị asọ na-eju n’ime ụlọ akwụkwọ ahụ, isi ya adịghịkwa ekwe mmadụ nọrịa. Ụmụ anyị na-arịa ọrịa ugboro ugboro; anwụnta na-atakwa ha mgbe niile. Nke ahụ abụghị ndụ […]; n’ebe a, enwere m ike ikuru ikuku dị ọcha. Ọ dị nnọọ iche n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ebe m nọ n’ihe ize ndụ siri ike nke ibute ọrịa.”
Madelene, onye sokwa n’ime ndị ihe ike ndị otu omempụ metụtara, gosiri afọ ojuju ya banyere nkwaga ahụ, sị: “M na-ehikarị ụra n’ụzọ mbata ghere oghe, ebe oyi na-atụ m. Ịbịa ebe a bụ mmalite nke ngwọta nye anyị. N’ikpeazụ, anyị enwetala ebe dị mma anyị ga-ehi ụra. N’ụlọ akwụkwọ ahụ, enweghịdị m ohere zuru ezu iji gbanwee uwe m. M ga-ehulata naanị ka m nwee ike ịbanye ma pụta. Obi dị m ezigbo ụtọ na m nọ ebe a, nakwa na n’ikpeazụ enwere m ike izu ike n’ụzọ na-echekwa ugwu m.”
Loukas Garanis, onye ọrụ IOM na-ahụ maka ọnọdụ mgberede n’ihu ọrụ, kwuru na ebe ọhụrụ ahụ “nwere nnukwu ụlọ 20, nke ọ bụla nwere ọnụ ụlọ 14 e kewapụrụ iche. E nwere ngalaba ịdị ọcha asatọ, nke ọ bụla nwere ụlọ mposi atọ na ụlọ ịsa ahụ atọ. E nwekwara ogige ghere oghe ebe ụmụaka nwere ike igwu egwu n’enweghị ihe ize ndụ. E nwere ihe dịka oriọna ndị na-eji ike anyanwụ arụ ọrụ 80 iji nyere aka belata ihe ize ndụ metụtara nchekwa, tinyere nnukwu tankị mmiri isii, nke ọ bụla na-ebu galọn 1,000. E nwekwara nnukwu ebe usekwu nri nke ndị niile na-ejikọta ọnụ, nke nwere ebe isi nri na ebe nchekwa echekwara nke ọma.”
N’agbanyeghị mmezi ndị a, ndị otu omempụ ji ngwa agha ka na-achịkwa akụkụ ụfọdụ nke Mpaghara Centre. Ha na-aga n’ihu ịnapụ ndị mmadụ ego site n’ịtọ ọdụ nyocha na-akwadoghị iwu, inyocha njirimara mmadụ, ịnapụ ụgbọala na-ebu ngwongwo, na ịtọrọ mmadụ, idina ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ n’ike, nakwa imetọ ha n’ụzọ mmekọahụ. Ha na-elekwasị anya n’ebe ndị ha na-enyo enyo na ha na ndị uwe ojii na-arụkọ ọrụ dịka ndị na-enye ozi, ndị otu nchedo onwe obodo, nakwa ndị nta akụkọ ma ọ bụ ndị nwere mmetụta n’ịntanetị na-ekpughe omume ọjọọ ha. N’ọtụtụ ọnọdụ, mgbe ha jidere onye ha na-enyo enyo ma ọ bụ onye mebiri iwu ha, ha na-egbu ya. Mgbe ụfọdụ, ọbụna ụfọdụ ndị so n’otu omempụ ha anaghị agbanahụ ime ihe ike a.
Ọ bụ ezie na ndị otu omempụ ndị a ka na-eyi ndị mmadụ egwu, njikọ aka nke ndị otu nchedo onwe ha ji ngwa agha, Ndị Uwe Ojii Mba Haiti (PNH), ndị otu Brigade for the Security of Protected Areas (BSAP), na Ndị Agha Haiti (FAd’H) na-achịkwa ebe ndị dị mkpa na mpaghara ahụ. Ka ọ dị ugbu a, nke a egbochila ndị otu omempụ ahụ iweghara mpaghara ahụ dum.







2 okwu ntinye
Hi Constance ,
Congratulation for your translation work , I appreciate it .
Thank you so much
Hi,Jude
Thank you so much for your kind message!I am glad you liked the translation work.