Ụlọ ihe nkiri sịnịma na-enye ohere ịkọ akụkọ nguzogide ka ohere ndị mmadụ nwere isonye n’okwu ọha na eze na-ebelata n’Afrịka

Image from the 4th edition (2025) of the festival, themed “Bridging Divides.” Photo courtesy of the Africa International Human Rights Film Festival

Foto sitere na mbipụta nke anọ (2025) nke mmemme ahụ, nke isiokwu ya bụ “Ijikọ Ndị Esemokwu Kewara.” Foto sitere n’aka Africa International Human Rights Film Festival. E ji ya mee ihe site n’ikike.

N’ofe Afrịka niile, ohere ndị mmadụ nwere isonye n’okwu ọha na eze na-ebelata. Gọọmentị dị iche iche na-ejiwanye usoro iwu, mmechi ịntanetị, na mmachi ozi emechi ọnụ ndị na-emegide ha, gbochie nnwere onwe mgbasa ozi, ma were ọrụ nkwado mgbanwe dịka mpụ. N’ofe kọntinent ahụ, a na-etinye ikike ụmụ amaala nkịtị nwere idekọ ihe, iguzogide mmegbu, na ikwupụta echiche ha n’okpuru nrụgide mgbe niile. N’ọnọdụ a, ndị na-agbachitere ikike mmadụ na-ejiwanye ụzọ nkwado mgbanwe ndị a na-ejikarịghị eme ihe, gụnyere ihe nkiri, iji gafee ndị na-achịkwa ụzọ mgbasa ozi ọdịnala ma ruo ọtụtụ ndị mmadụ.

Mmemme ihe nkiri ò nwere ike ime ihe akụkọ ndị otu na-abụghị nke gọọmentị (NGO), usoro ikpe, na ngagharị iwe na-enweghị ike ime mgbe ụfọdụ: ịgbanwe akụkọ a na-akọ, ime ka ịdị n’otu sikwuo ike, na ime ka ndị nọ n’ọchịchị zaa ajụjụ maka omume ha? Africa International Human Rights Film Festival (AIHRFF), nke nọ ugbu a na mbipụta ya nke ise, egosila na ọ ga-ekwe omume.

Ndị Human Rights Journalists Network Nigeria haziri mmemme ahụ, nke a ga-eme na Disemba 8–10, 2026, n’okpuru isiokwu “Akụkọ Nguzogide.” Mmemme ahụ nọ n’etiti ụzọ dị iche iche esemokwu na-arịwanye elu gbara gburugburu: ịkọ akụkọ na ịkwado mgbanwe; nnwere onwe ndị nchịkọta akụkọ na mmekorita ya na ụlọ ọrụ; nakwa nkwa nke mmetụta ihe nkiri na ajụjụ siri ike karị banyere mgbanwe a pụrụ ịtụ n’ọnụọgụ. Global Voices gwara Onye Isi Nchịkwa, Kehinde Adegboyega, okwu banyere ebumnuche mmemme nke afọ a na ihe ndị nhazi ya ka na-agbalịsi ike imezu.

Jean Sovon (JS): Ka anyị na-abịaru mbipụta nke ise nke mmemme ihe nkiri gbasara ikike mmadụ n’Afrịka nso, gịnị mere AIHRFF ji bụrụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi rụọ ọrụ a? Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka otu ndị nta akụkọ Naịjirịa were ọrụ a n’aka, kama ụlọ ọrụ ihe nkiri ma ọ bụ òtù na-abụghị nke gọọmentị na-ahụ maka ikike mmadụ ndị torola eto ma guzosie ike karị?

Kehinde Adegboyega (KA): The Africa International Human Rights Film Festival (AIHRFF) emerged from a recognition that storytelling, journalism, human rights advocacy, and civic engagement are deeply interconnected. While film institutions excel at promoting cinema and human rights organizations focus on advocacy and service delivery, AIHRFF sits at the intersection of these fields.

The Human Rights Journalists Network Nigeria brings a unique perspective rooted in documentation, public accountability, freedom of expression, and access to information. Our members understand the power of narratives to influence public opinion, policy debates, and social change. AIHRFF was therefore conceived not simply as a film festival, but as a platform where filmmakers, journalists, activists, policymakers, academics, and citizens can engage in dialogue around issues that affect people’s lives.

Over four editions, the festival has demonstrated its ability to convene diverse stakeholders, foster difficult conversations, and create opportunities for learning, advocacy, and collaboration. Rather than competing with film institutions or NGOs, AIHRFF complements their work by providing a space where storytelling becomes a catalyst for civic engagement and social reflection.

 

Kehinde Adegboyega (KA): E guzobere Africa International Human Rights Film Festival (AIHRFF) site na nghọta na ịkọ akụkọ, ọrụ nta akụkọ, nkwado ikike mmadụ, na isonye n’ihe gbasara ọha na eze nwere njikọ miri emi. Ọ bụ ezie na ụlọ ọrụ ihe nkiri maara nke ọma n’ịkwalite sinima, ebe òtù na-ahụ maka ikike mmadụ na-elekwasị anya n’ịkwado mgbanwe na inye ọrụ, AIHRFF na-ejikọta ngalaba ndị a.

Human Rights Journalists Network Nigeria na-enye echiche pụrụ iche nke gbadoro ụkwụ n’idekọ ihe, ime ka ndị ọchịchị zaa ajụjụ n’ihu ọha, nnwere onwe ikwupụta echiche, na ohere inweta ozi. Ndị otu anyị ghọtara ike akụkọ nwere n’ịgbanwe echiche ọha na eze, arụmụka gbasara atumatu, na mgbanwe ọha mmadụ. N’ihi ya, e chepụtara AIHRFF ọ bụghị naanị dịka mmemme ihe nkiri, kama dịka ebe ndị na-emepụta ihe nkiri, ndị nta akụkọ, ndị na-akwado mgbanwe, ndị na-eme atumatu, ndị ọkammụta, na ụmụ amaala nwere ike ịkparịta ụka banyere okwu ndị na-emetụta ndụ ndị mmadụ.

N’ime mbipụta anọ gara aga, mmemme ahụ egosila ikike ya ịkpọkọta ndị nwere mmasị na ọrụ dị iche iche, ịkwalite mkparịta ụka ndị siri ike, na imepụta ohere maka mmụta, nkwado mgbanwe, na imekọ ihe ọnụ. Kama ịsọrịta mpi na ụlọ ọrụ ihe nkiri ma ọ bụ òtù na-abụghị nke gọọmentị, AIHRFF na-agbakwunye n’ọrụ ha site n’inye ohere ebe ịkọ akụkọ na-akpali ndị mmadụ isonye n’ihe gbasara ọha na eze ma tụgharịa uche banyere ọnọdụ obodo.

JS: E wezụga igosi ihe nkiri, i nwere ike ịkọ otu ihe atụ doro anya ebe ihe nkiri e gosiri na AIHRFF nyere aka iweta mgbanwe a pụrụ ịtụ ma gosipụta?

KA: AIHRFF does not claim that a single screening directly results in a policy change or legal outcome. Social and political change is usually the product of sustained efforts by many actors over time.

However, the festival has consistently served as a convening platform that connects filmmakers, advocates, policymakers, journalists, and affected communities. For example, screenings on gender-based violence, digital rights, and civic freedoms have been followed by structured discussions and partnerships with advocacy organizations that have used the films as educational and mobilization tools beyond the festival.

Our impact is best understood as contributing to awareness, agenda-setting, coalition-building, and public engagement. We continue to strengthen our monitoring and evaluation framework so that future editions can better document downstream outcomes and policy influence.

 

KA: AIHRFF anaghị ekwu na igosi otu ihe nkiri na-eweta mgbanwe atụmatụ ma ọ bụ nsonaazụ ikpe ozugbo. Mgbanwe ọha mmadụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-abụkarị ihe sitere na mbọ ọtụtụ ndị na-agba ogologo oge.

Otú ọ dị, mmemme ahụ anọgidewo na-abụ ebe na-akpọkọta ma na-ejikọta ndị na-emepụta ihe nkiri, ndị na-akwado mgbanwe, ndị na-eme atumatu, ndị nta akụkọ, na obodo ndị ihe ndị a metụtara. Dịka ọmụmaatụ, mgbe e gosichara ihe nkiri gbasara ime ihe ike n’ihi okike, ikike dijitalụ, na nnwere onwe ụmụ amaala, a na-enwe mkparịta ụka a haziri ahazi na mmekorita ya na òtù ndị na-akwado mgbanwe. Òtù ndị a ejirila ihe nkiri ahụ dịka ngwa nkuzi na nke ịkpọkọta ndị mmadụ ka ha mee ihe, ọbụna mgbe mmemme ahụ gasịrị.

Ụzọ kacha mma isi ghọta mmetụta anyị bụ ịhụ ya dịka onyinye nye ịkwalite mmata, iwepụta isiokwu ndị dị mkpa ka a tụlee, iwulite njikọ aka, na ime ka ọha na eze sonye. Anyị na-aga n’ihu ime ka usoro nlekota na ntule anyị sikwuo ike, ka mbipụta ndị na-abịa nwee ike idekọ nke ọma nsonaazụ ndị ga-esochi na mmetụta mmemme ahụ nwere n’atụmatu.

JS: Isiokwu nke afọ a bụ “Akụkọ Nguzogide.” Nguzogide megide onye kpọmkwem? Ụfọdụ gọọmentị Afrịka nwere ike iche na a na-elekwasị ha anya kpọmkwem. Olee otu AIHRFF si edozi mmekọrịta dị n’etiti nnwere onwe nchịkọta akụkọ na mmachi metụtara mmekọrịta mba na mba n’ime mba ndị na-anabata mmemme ahụ?

KA: For AIHRFF, ‘Stories of Resistance’ refers broadly to the human capacity to respond to injustice, exclusion, discrimination, violence, censorship, environmental degradation, inequality, and other threats to human dignity.

Resistance is not directed at any particular government, institution, or political actor. It encompasses the experiences of individuals and communities who seek peaceful and lawful ways to defend rights, preserve culture, strengthen democracy, and improve social conditions.

The festival is committed to editorial independence while maintaining a constructive and inclusive approach. We encourage dialogue rather than polarization. Our objective is to create spaces where diverse perspectives can be heard and discussed responsibly, in line with international human rights principles and democratic values.

 

KA: Nye AIHRFF, “Akụkọ Nguzogide” na-ezo n’ụzọ sara mbara n’ikike mmadụ nwere imeghachi omume megide ikpe na-ezighị ezi, mwepu, ịkpa ókè, ime ihe ike, mmachi ozi, mmebi gburugburu ebe obibi, ahaghị nhata, na ihe iyi egwu ndị ọzọ megide ugwu mmadụ.
Nguzogide ahụ anaghị elekwasị anya n’otu gọọmentị, ụlọ ọrụ, ma ọ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla. Ọ gụnyere ahụmahụ ndị mmadụ n’otu n’otu na nke obodo ndị na-achọ ụzọ udo na nke iwu kwadoro iji chebe ikike, debe omenala, mee ka ọchịchị onye kwuo uche ya sikwuo ike, ma kwalite ọnọdụ ọha mmadụ.
Mmemme ahụ kpebisiri ike ichekwa nnwere onwe nchịkọta akụkọ ma na-agbasokwa usoro na-ewuli elu ma na-anabata mmadụ niile. Anyị na-akwado mkparịta ụka kama nkewa. Ebumnuche anyị bụ imepụta ohere ebe a pụrụ ịnụ echiche dị iche iche ma tụlee ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị, dịka ụkpụrụ ikike mmadụ nke mba ụwa na ụkpụrụ ọchịchị onye kwuo uche ya si dị.

JS: Ndị na-emepụta ihe nkiri si n’ụwa niile nwere ike isonye na mmemme ahụ. N’ezie, òkè ole n’ime ihe nkiri ndị a họọrọ si n’Afrịka? Ọ̀ ga-ekwe omume na mmemme ahụ ga na-egosi Afrịka site n’anya ndị si ná mpụga kọntinent ahụ, kama ịkwalite olu ndị Afrịka n’ezie?

KA: African voices remain at the heart of AIHRFF. While we welcome submissions from around the world because human rights challenges are global, our programming intentionally prioritizes African stories, African filmmakers, and issues affecting African communities.

International films provide opportunities for comparative learning and solidarity across regions, but they do not define the festival’s identity. Our curatorial approach seeks to ensure that African perspectives are not merely represented but centered.

As the festival grows, we are increasingly investing in emerging African filmmakers, youth storytellers, and underrepresented voices from across the continent. Our long-term ambition is to strengthen African storytelling ecosystems while maintaining global engagement.

 

KA: Olu ndị Afrịka ka bụ isi AIHRFF. Ọ bụ ezie na anyị na-anabata ihe nkiri ndị e si n’akụkụ ụwa niile ziga, n’ihi na nsogbu ndị metụtara ikike mmadụ zuru ụwa ọnụ, usoro mmemme anyị na-ama ụma ebute akụkọ ndị Afrịka, ndị na-emepụta ihe nkiri n’Afrịka, na nsogbu ndị na-emetụta obodo Afrịka ụzọ.

Ihe nkiri mba ụwa na-enye ohere maka ịmụ ihe site n’ịtụnyere ahụmahụ na iwulite ịdị n’otu n’etiti mpaghara dị iche iche, mana ọ bụghị ha na-akọwapụta njirimara mmemme ahụ. Usoro anyị ji ahọpụta ihe nkiri na-achọ ịhụ na ọ bụghị naanị na a nọchitere anya echiche ndị Afrịka, kama na e mere ha isi sekpụ ntị.

Ka mmemme ahụ na-eto, anyị na-etinyekwu ego n’ịkwado ndị Afrịka na-emepụta ihe nkiri ọhụrụ, ndị ntorobịa na-akọ akụkọ, na olu ndị a na-anaghị anụkarị site n’akụkụ kọntinent ahụ niile. Ebumnuche anyị n’ọdịnihu bụ ime ka usoro ndị na-akwado ịkọ akụkọ ndị Afrịka sikwuo ike, ma nọgidekwa na-emekọrịta ihe n’ọkwa ụwa.

JS: Mmemme ahụ depụtara ikike dijitalụ dịka otu n’ime isiokwu ya. Ma ọtụtụ gọọmentị Afrịka, gụnyere Naịjirịa, emechiela ịntanetị ma na-eme nlekota zuru ebe niile. Olee otu mmemme ahụ si elebara mmebi ikike nke gọọmentị ndị ya na ha na-emekọrịta ihe ma ọ bụ ndị na-anabata ya na-eme anya?

KA: AIHRFF approaches digital rights from a rights-based perspective that is independent of governments, corporations, and political interests.

The festival provides space for discussions on internet freedom, privacy, surveillance, online safety, digital inclusion, and freedom of expression regardless of where violations occur. These conversations often include civil society actors, researchers, journalists, policymakers, and technical experts.

Partnerships with institutions do not determine the content of discussions or the themes selected for the festival. We believe that constructive engagement requires the ability to discuss difficult issues openly and respectfully, including challenges within our own societies.

 

KA: AIHRFF na-ele ikike dijitalụ anya site n’usoro gbadoro ụkwụ n’ikike mmadụ, nke na-anọghị n’okpuru ọchịchị gọọmentị, ụlọ ọrụ azụmahịa, ma ọ bụ ọdịmma ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Mmemme ahụ na-enye ohere maka mkparịta ụka banyere nnwere onwe ịntanetị, nzuzo, nlekota, nchekwa n’ịntanetị, isonye n’ụwa dijitalụ, na nnwere onwe ikwupụta echiche, n’agbanyeghị ebe mmebi ikike ndị ahụ mere. Ndị na-esonye na mkparịta ụka ndị a na-agụnyekarị ndị otu ọha mmadụ, ndị nchọpụta, ndị nta akụkọ, ndị na-eme atumatu, na ndị ọkachamara na teknụzụ.
Mmekorita anyị na ụlọ ọrụ dị iche iche anaghị ekpebi ihe a ga-atụle ma ọ bụ isiokwu ndị a ga-ahọrọ maka mmemme ahụ. Anyị kwenyere na mmekọrịta na-ewuli elu chọrọ ka e nwee ike ịtụle okwu ndị siri ike n’ihu ọha na n’ụzọ nkwanye ùgwù, gụnyere nsogbu ndị dị n’obodo anyị.

JS: Ònye na-enye AIHRFF ego nkwado? Olee otú ịdabere n’ego nkwado ahụ nwere ike isi chekwaa—ma ọ bụ tinye n’ihe ize ndụ—nnwere onwe nchịkọta akụkọ n’ịhọrọ ihe nkiri unu?

KA: AIHRFF operates through a diversified partnership model that has included support from international organizations, cultural institutions, civil society partners, foundations, and private sector actors.

The festival’s editorial decisions are guided by its mission and curatorial principles rather than by the preferences of individual sponsors or partners. We deliberately seek a diversity of funding sources to reduce dependence on any single institution.

Editorial independence is essential to the credibility of the festival. Our partnerships are built around shared commitments to human rights, dialogue, creativity, and public engagement, while programming decisions remain the responsibility of the festival organizers and curatorial team.*

 

KA: AIHRFF na-arụ ọrụ site n’usoro mmekorita dịgasị iche iche, nke gụnyere nkwado sitere n’aka òtù mba ụwa, ụlọ ọrụ omenala, ndị mmekọ n’otu ọha mmadụ, ntọala ọrụ ebere, na ụlọ ọrụ azụmahịa nkeonwe.
Ọ bụ ebumnuche mmemme ahụ na ụkpụrụ e ji ahọpụta ihe nkiri na-eduzi mkpebi nchịkọta akụkọ ya, ọ bụghị mmasị nke otu onye ma ọ bụ ụlọ ọrụ na-enye ego nkwado. Anyị na-ama ụma achọ ebe ego nkwado dị iche iche si abịa iji belata ịdabere n’otu ụlọ ọrụ.
Nnwere onwe nchịkọta akụkọ dị mkpa iji mee ka ndị mmadụ tụkwasị mmemme ahụ obi. Mmekorita anyị gbadoro ụkwụ na mkpebi anyị na ndị mmekọ anyị nwere ọnụ maka ikike mmadụ, mkparịta ụka, imepụta ihe, na isonye n’ihe gbasara ọha na eze. Otú ọ dị, ọ bụ ndị nhazi mmemme na ndị otu na-ahọpụta ihe nkiri ka nwere ọrụ ime mkpebi gbasara usoro mmemme ahụ.

JS: Gịnị na-eme ihe nkiri ndị a mgbe emechiri mmemme ahụ? È nwere usoro e ji hụ na a na-aga n’ihu igosi ha n’obodo ndị na-enweghị ụlọ sinima, ma ọ bụ mee ka ha ruo n’ụlọ ikpe, nzuko omeiwu, na ụlọ akwụkwọ ebe ha nwere ike ịkpali ezigbo mgbanwe?

 

KA: This is an important question and one we continue to develop.

The festival is not intended to be a stand-alone event but part of a broader ecosystem of engagement. Beyond the festival, we seek opportunities to collaborate with schools, universities, civil society organizations, media outlets, and community groups to extend the reach of selected films.

We are also exploring the development of year-round screening initiatives, educational partnerships, digital engagement campaigns, and thematic outreach activities that bring films into classrooms, community spaces, and policy discussions.

Our vision is for AIHRFF to evolve from an annual festival into a sustained platform for human rights education, storytelling, and civic dialogue that remains active throughout the year.

 

KA: Nke a bụ ajụjụ dị mkpa, bụrụkwa nke anyị ka na-arụ ọrụ iji zụlite azịza ya.
Ebughị n’obi ka mmemme ahụ bụrụ ihe omume kwụụrụ onwe ya, kama ka ọ bụrụ akụkụ nke usoro sara mbara nke isonye na mmekọrịta ọha na eze. Mgbe mmemme ahụ gasịrị, anyị na-achọ ohere anyị na ụlọ akwụkwọ, mahadum, òtù ọha mmadụ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi, na otu ndị obodo ga-esi rụkọọ ọrụ iji mee ka ihe nkiri ndị a họọrọ ruo ọtụtụ ndị ọzọ.
Anyị na-enyochakwa ụzọ isi mepụta atụmatụ igosi ihe nkiri n’afọ niile, mmekọrịta agụmakwụkwọ, mgbasa ozi dijitalụ iji mee ka ndị mmadụ sonye, na ọrụ mgbasa ozi gbadoro ụkwụ n’isiokwu dị iche iche, bụ́ ndị ga-eweta ihe nkiri n’ụlọ akwụkwọ, ebe ndị obodo na-ezukọ, na mkparịta ụka gbasara atumatu.
Ọhụụ anyị bụ ka AIHRFF si n’ịbụ mmemme a na-eme kwa afọ tolite bụrụ nyiwe na-adịgide adịgide maka mmụta gbasara ikike mmadụ, ịkọ akụkọ, na mkparịta ụka ụmụ amaala, nke na-arụ ọrụ n’afọ niile.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.