Alibaba gbara Pentagon akwụkwọ iji jụ ngụkọ ya dịka ụlọ ọrụ ha na ndị agha China nwere njikọ

alibaba

Foto nke Oiwan Lam ji Canva mepụta

Edemede a bụ akụkụ nke usoro Global Voices nke Ọktoba 2026, “Nnukwu Ụlọ Ọrụ Teknụzụ na Ọchịchị Aka Ike .” N’usoro a, anyị na-enyocha otú nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ si akwado ma na-egbochi gọọmentị na omume ọchịchị aka ike, nakwa otú mkpebi ndị a si emetụta Global South. I nwere ike ịkwado ọrụ mgbasa ozi a site n’inye onyinye ebe a.

Ka Ngalaba Nchebe nke Amerịka na-agbasawanye ndepụta Nkebi 1260H nke “ụlọ ọrụ ndị agha China na-arụ ọrụ na Amerịka” na Juun 2026, a kọwara nnukwu ụlọ ọrụ ịntanetị na teknụzụ atọ—Baidu, Alibaba na Tencent (BAT)—dịka ndị na-agbatị ọrụ ọchịchị China, ma tinye ha n’okpuru mmachibido Pentagon nyere gbasara ịzụ ahịa, nke na-ewepụ ha n’usoro ndị na-ebunye Ngalaba Nchebe ngwa ahịa na ọrụ. Itinye ha na ndepụta ahụ na-egosikwa na ihe ize ndụ nke Ngalaba Azụmahịa ma ọ bụ Ngalaba Akụ nke Amerịka ịmanye ha mmachi ndị ọzọ na-abawanye.

Alibaba jụrụ ngụkọ a site n’ịgba Pentagon akwụkwọ n’ụlọ ikpe. N’akwụkwọ ikpe ahụ, Alibaba gọnahụrụ na ya na ndị agha China nwere njikọ ọ bụla ma ọ bụ na o nwere ọrụ ọ bụla na atụmatụ China nke gọọmentị na-edu maka ijikọ ndị agha na ndị nkịtị. Ọ rụrụ ụka na itinye ya na ndepụta ahụ na mmachibido ahụ “enweghị ihe ndabere n’eziokwu ma ọ bụ n’iwu,” nakwa na ha na-anapụ ụlọ ọrụ ahụ ohere azụmahịa ọ ga-enweta n’ọdịnihu. O kwukwara na mkpọsa mgberede ahụ mebiri ikike ụlọ ọrụ ahụ nwere n’okpuru iwu ọchịchị ịkọwa ọnọdụ ya.

E wepụtara Nkebi 1260H n’afọ 2021 iji lebara ihe a na-akpọ atụmatụ ọchịchị China nke “njikọ ndị agha na ndị nkịtị” anya. Atụmatụ a na-eme ka e nwee ike ibufe teknụzụ ma ọ bụ nnyocha nke ụlọ ọrụ teknụzụ azụmahịa gaa n’ụlọ ọrụ nchekwa China. Nkwupụta Ngalaba Nchebe Amerịka kọwara Alibaba dịka ụlọ ọrụ “nwere njikọ n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè na SASAC” (Kọmitii Na-ahụ Maka Nlekọta na Njikwa Akụ Gọọmentị nke Kansụl Steeti nke Mba Ndị China), nakwa dịka “onye na-atụnye ụtụ site na njikọ ndị agha na ndị nkịtị n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe nchekwa China,” n’ihi na o nwere njikọ na Mịnịstrị Ụlọ Ọrụ Mmepụta Ihe na Teknụzụ Nkwukọrịta nke (China Ministry of Industry and Information Technology) (MIIT).

E wezụga arụmụka banyere ikpe nkwụmọtọ n’usoro e si mee mkpebi ahụ, ndekọ ọha—nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ akụkọ mgbasa ozi mba ụwa na nke e bipụtara n’ime China—Ngalaba Nchebe Amerịka nyefere ụlọ ikpe dịka ihe akaebe kwadoro mkpebi ya na-egosikarị ụdị ọchịchị aka ike dị n’otú China si achịkwa nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ. Ha na-akọwapụta etu atụmatụ Alibaba si kwekọọ na atụmatụ gọọmentị China gbasara mmachi ozi, teknụzụ, na mmepe agha.

Iwu na azụmahịa

Site n'ịrụtụ aka na n’akụkọ mgbasa ozi banyere mmachi ozi na China nakwa n’akwụkwọ gọọmentị Alibaba banyere nnukwu ihe ụlọ ọrụ ahụ rụzuru na mmepe teknụzụ. Site na nke a, Ngalaba ahụ na-atụ aro na ụlọ ọrụ ahụ na-ekere òkè pụtara ìhè n’iwulite usoro mmachi ozi China.

N’ezie, China nwere ihe karịrị iwu na ụkpụrụ iri na abụọ. Dịka ọmụmaatụ, Iwu Nchekwa Ịntanetị (2017) nyere ndị na-ahụ maka netwọkụ iwu ka ha na-enyocha, kwụsị ma hichapụ ọdịnaya a machibidoro iwu; chekwaa ndekọ; ma kọọrọ ndị ọchịchị ihe merenụ. Ụkpụrụ Maka Ịchịkwa Usoro Ọdịnaya Ozi Ịntanetị (2020) kewara ọdịnaya ụzọ atọ bụ́ isi: nke dị mma, nke megidere iwu, na nke na-adịghị mma. Ọ chọkwara ka ndị na-ahụ maka ya kwalite, hichapụ ma ọ bụ gbochie ọdịnaya ndị ahụ dịka otu nke ọ bụla si dị. Iwu ndị metụtara ọgụgụ isi aka mmadụ (AI) machibidoro iji algọridim “metụta echiche ọha mmadụ” ma ọ bụ gbaa mmadụ ume ka ihe rie ya ahụ ma ọ bụ ka o jiri ihe gabiga ókè. Ha na-ahụkwa na ụdị AI na-emepụta ọdịnaya na-agbaso “ụkpụrụ ndị bụ isi nke ọchịchị ndị otu ọhaneze” nke gọọmentị.

Alibaba rụrụ ụka na e kwesịghị ịkọwa nrubeisi ya nye iwu na ụkpụrụ China dịka ihe akaebe na ya na ndị agha nwere njikọ, ebe ọ bụ na ụlọ ọrụ mba ụwa niile na-arụ ọrụ na China, gụnyere ụlọ ọrụ ndị Amerịka, ga-agbasorịrị iwu obodo ahụ.

Otú ọ dị, ndekọ ọha Pentagon tinyere n’akwụkwọ ikpe ahụ na-egosi na Alibaba abụghị naanị na ọ na-agbaso iwu mmachi ọdịnaya n’elu nyiwe ndị ahịa ya, ụdị AI ya na-emepụta ọdịnaya, na ihe nchọgharị ịntanetị maka ekwentị, kama ọ na-emepụtakwa teknụzụ mmachi ọdịnaya dịka Alibaba “Green AI.” Teknụzụ a na-enyocha ma na-egbochi ederede, onyonyo, olu, vidiyo na data a na-agbasa ozugbo n’enweghị enyemaka mmadụ. Alibaba na-eresikwa ndị nrụpụta nọ na China na ná mba ọzọ, ndị na-ere ahịa n’ịntanetị, ụlọ ọrụ mgbasa vidiyo, na nyiwe egwuregwu dijitalụ ngwaọrụ ndị a e ji enyocha ma jikwaa ọdịnaya, ka ha nwee ike ịrụ ọrụ dịka iwu China si chọọ.

Njikọ na ndakọrịta atụmatụ ndị a na-ebo ebubo

E wezụga inye aka na ibupụ teknụzụ mmachi ọdịnaya ná mba ọzọ, nke a na-ejighị eme ihe ndị agha, akwụkwọ Ngalaba Nchebe Amerịka nyefere ụlọ ikpe gụnyekwara akụkọ mgbasa ozi na nkọwa banyere otu onye guzobere Alibaba, Jack Ma, si pụọ n’anya na ngwụcha Nọvemba 2020.

Tupu Jack Ma apụọ n’anya, n’Ọktoba 24, 2020, ọ katọrọ usoro ụlọ akụ China dịka nke merela ochie. Mgbe e mesịrị, na Nọvemba 3, a kwụsịrị atụmatụ Ant Finance nke Alibaba ịbanye n’ahịa ahịa òkè na Shanghai na Hong Kong n’otu oge, nke ọnụ ahịa ya ruru ijeri dọla Amerịka 37. Ọpụpụ ya n’anya dabara n’oge ndị ọchịchị China na-eme nnyocha megide Alibaba maka imebi iwu asọmpi azụmahịa. N’ikpeazụ, a tara ụlọ ọrụ ahụ iwu ịkwụ ijeri dọla Amerịka 2.75 maka ịmanye ndị ahịa ka ha họrọ naanị otu n’ime nyiwe azụmahịa dị iche iche.

Ngalaba DoD tụkwara aro na Alibaba nwere “njikọ na-apụtachaghị ìhè” na SASAC, nakwa na o nwere njikọ ndị agha site na mmekorita azụmahịa ya na ụlọ ọrụ ndị ọzọ. Nke kacha pụta ìhè bụ mmekorita ya na Norinco Group, ụlọ ọrụ ndị agha nke gọọmentị China nwe nke Ngalaba Akụ Amerịka tinyere mmachi, iji guzobe Qianxun Intelligence. Ụlọ ọrụ a na-emepụta AI ọgụgụ isi gbasara ọnọdụ ebe, nke na-eji Usoro Satịlaịtị Nduzi Beidou na ọdụ ndị dị n’elu ala enye ụgbọala ọgbara ọhụrụ, dron na ngwaọrụ mkpanaka ozi ziri ezi banyere ebe ha nọ. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Dị na Mbara Igwe nke China nwe Beidou ma na-ahụ maka ọrụ ya.

Ọ bụ ezie na Alibaba hapụrụ òkè pasent 50 o nwere na Qianxun Intelligence n’afọ 2018, a na-ebo ebubo na ndị isi ụlọ ọrụ ahụ ka na-achịkwa nnukwu òkè na ya, nakwa na Alibaba ka na-adabere na AI nke Qianxun maka ngwaahịa azụmahịa ya.

DoD

kwukwara na Alibaba na China Mobile, ụlọ ọrụ gọọmentị China nwe, jikọrọ aka wuo ebe nchekwa data maka kọmpụta igwe ojii na AI. Ka Alibaba na-abawanye ego ọ na-etinye na ngalaba ndị a, o yikarịrị ka mmekorita a ọ̀ ga-esikwu ike, n’ihi na teknụzụ ndị dị otu a na-adabere nke ukwuu n’ebe nchekwa data na teknụzụ gbasara ọnọdụ ala—ndị a niile bụ ngalaba dị mkpa n’atụmatụ nchekwa mba gọọmentị China.

Kemgbe 2026, Alibaba abanyela na mmekorita ọhụrụ maka ụlọ ọrụ ọkụ eletrik n’obodo Ningbo dị n’ụsọ oké osimiri, ya na China National Nuclear Power Co., nke gọọmentị nwe, iji nweta ọkụ eletrik na-adịgide adịgide maka mkpa ebe nchekwa data ya n’ọdịnihu. N’ọnwa gara aga, o nwetakwara òkè na Shanghai Spacecom Satellite Technology, nke gọọmentị nwe, iji mepụta Qianfan Constellation (千帆星座), usorọ satịlaịtị brọdband na-agba n’ebe dị ala gburugburu ụwa, nke yiri Starlink nke SpaceX, maka ngwaahịa ya ndị na-achọpụta ọnọdụ ebe.

Dịka ụlọ ọrụ nkeonwe e debanyere n’ahịa ahịa òkè Amerịka na Hong Kong, Alibaba anọghị n’okpuru nlekọta SASAC. Otú ọ dị, n’etiti asọmpi teknụzụ China na Amerịka, itinye ego Alibaba aghaghị ịbanye na ngalaba ndị dị mkpa n’atụmatụ mba, bụ́ ndị chọrọ ka ya na ụlọ ọrụ gọọmentị nwe rụkọọ ọrụ. DoD na-arụ ụka na njikọ ndị a gụnyere njikọ na-apụtachaghị ìhè na SASAC, ma na-akwalite atụmatụ China nke ijikọ teknụzụ ndị nkịtị na nke ndị agha.

Ọzọkwa, ụfọdụ ụlọ ọrụ ndị dị n’okpuru Alibaba, gụnyere Youku Film and Television dị na Shanghai (nke na-agbasa vidio n’ịntanetị) na Guangzhou Lujiao Information Technology Co., Ltd., nwere usoro “golden shares” ha na ụlọ ọrụ gọọmentị nwe nke China Internet Investment Fund (CIIF) na-akwado. Cyberspace Administration of China (CAC) guzobere CIIF iji mee ka ikike gọọmentị nwere n’ọkwa bọọdụ nchịkwa nke nyiwe ọdịnaya Alibaba sikwuo ike.

DoD zoro aka n’itinye ndị nnọchi anya nọ n’ọkwa dị elu sitere na nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ China, gụnyere Alibaba, Baidu, Huawei na Tencent, na Kọmitii Teknụzụ China Maka Ịhazigharị Ụkpụrụ AI, nke dị n’okpuru MIIT, dịka ihe akaebe na-egosi na Alibaba na gọọmentị China nwere njikọ kpọmkwem.

Ngalaba Nchebe Amerịka zoro aka na nyocha sitere n’akwụkwọ akụkọ otu Chinese Communist Party (CCP), Qiushi (求是), nakwa nke ndị ọkachamara dị iche iche si mba Ọdịda Anyanwụ na-enyocha China. Arụmụka ya bụ na itinye ego na atụmatụ mmepe Alibaba kwekọrọ n’usoro atụmatụ gọọmentị China, nke gụnyere itinye teknụzụ AI n’akụrụngwa agha ya, idowe ebe nchekwa data na mpaghara ọdịda anyanwụ, iwulite akụrụngwa kọmpụta na mbara igwe, na ihe ndị ọzọ.

N’ezie, ọ bụghị naanị na gọọmentị na-achịkwa nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ dịka Alibaba; mkpebi mgberede ndị na-achịkwa iwu na China mere ịkwụsị Facebook ịzụta Manus, ụlọ ọrụ AI ọhụrụ nke China, na mbido afọ a, na-egosikwa otú China siri kpebisie ike ichekwa na ịchịkwa ngalaba teknụzụ ya.

Usoro China si achịkwa nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ ya

Usoro China ji achịkwa nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ ya ugbu a sitere n’ahụmahụ ọtụtụ iri afọ o nwere n’ịchịkwa nkwụsi ike, nke ebumnuche ya bụ ichekwa ọchịchị otu pati site na mmachi ozi, nnyocha na nlekota, iwulite pati, na ịchịkwa echiche ndị mmadụ. Ọ bụ ezie na mmepe AI akpalitela nchegbu na mba Ọdịda Anyanwụ banyere mpụ akpaaka, dịka iji AI abanye n’usoro kọmputa n’enweghị ikike, nakwa maka enweghị ọrụ, China na-ele AI anya naanị dịka ngwaọrụ a pụrụ ịchịkwa. Dịka ọmụmaatụ, n’ịzaghachi ọtụtụ ngagharị nkwụsị ọrụ ndị ọrụ nnyefe mere n’afọ ndị na-adịbeghị anya megide nrụgide sitere na AI, ndị na-ahụ maka iwu kpọrọkwa ndị nnọchi anya nnukwu nyiwe, gụnyere Jingdong, Meituan na Taobao, n’otu oge ahụ ndị ọchịchị na-akpagbu ma na-ejide ndị ọrụ ahụ. Ha nyere nyiwe ndị ahụ iwu ka ha gbanwee algọridim ha, kwụsị ntaramahụhụ maka nnyefe n'oge, wepụta oge ezumike, ma kwalite mkparịta ụka n’etiti ndị ọrụ na nyiwe ndị ahụ.

Ka ọ dị ugbu a, Taobao, nyiwe ịzụ ahịa Alibaba maka ndị nọ n’ime China, eguzobela ihe karịrị ngalaba pati 300 maka ndị ọrụ nnyefe Taobao 300,000. Site na ngalaba ndị a, ọ na-enye ndị ọrụ ọzụzụ n’ebe ọrụ, ebe obibi dị ọnụ ala, na nri maka ndị chọrọ enyemaka. N’ezie, nke a bụ uru nye ndị otu na-arụ ọrụ.

N’ikpe ahụ ka na-aga n’ihu, Alibaba jụrụ ebubo DoD, na-ekwu na ụlọ ọrụ ahụ na-agbaso ma iwu China ma nke Amerịka, nakwa na bọọdụ ndị nduzi nwere onwe ha, ndị na-enweghị njikọ ọ bụla na ndị agha, na-elekọta ya. Ọ mesikwara ike na ọrụ azụmahịa ya ndị bụ isi—gụnyere ọrụ kọmpụta igwe ojii, azụmahịa n’ịntanetị, na ọrụ mbupu na nnyefe—na-ejere ụlọ ọrụ azụmahịa na ndị ahịa n’otu n’otu ozi, ọ bụghị ngalaba ndị agha.

N'okwu ikpe na-aga n'ihu, Alibaba na-arụ ụka megide ebubo DoD, na-ekwu na ụlọ ọrụ ahụ na-agbaso iwu China na nke U.S. nakwa na ọ bụ bọọdụ ndị nduzi nwere onwe ha na-enweghị njikọ na ndị agha na-achịkwa ya. O kwusiri ike na isi azụmahịa ya, gụnyere ọrụ igwe ojii, azụmaahịa eletrọnịkị, na nhazi, na-ejere azụmaahịa nke ọha na ndị na-azụ ahịa n'otu n'otu ozi kama ngalaba ndị agha.  

Ikpe a ga-anwale ọnọdụ gọọmentị Amerịka banyere usoro China si achịkwa nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ ya. Tencent na Baidu etinyebeghị akwụkwọ mkpesa ọ bụla ka e wepụ ha na ndepụta mmachi 1260H nke DoD.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.