
Akwụkwọ mgbasa ozi nke ihe nkiri China a ma ama, Be Yourself (機智的上半場 2023), nke gosiri ụmụnwanyị anọ nwere onwe ha ka ha na-etolite na China nke oge a. E si na akaụntụ Weibo gọọmentị nke ihe nkiri ahụ nweta foto a. E jiri ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi.
Grace zara ekwentị n’elekere 10:30 nke abalị, oge Beijing, mgbe ọ rụchara ọrụ awa 12 ọzọ.
“Enweghị m ike ịdabere n'ebe onye ọzọ nọ,” ka ọ gwara m.
Okwu ya fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ahịrị sitere na “Be Yourself,” ihe nkiri China na-ewu ewu gbasara ụmụ agbọghọ anọ na-eto eto na-agbalị ibi ndụ ọrụ, mmekọrịta na ndụ ndị torola eto dịka ha si chọọ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, akụkọ banyere ụmụnwanyị nwere onwe ha apụtawanyela ìhè n’omenala ntụrụndụ China. Akụkọ ndị a metụtara ndụ otu ọgbọ ụmụnwanyị ndị ohere sara mbara ha nwetara n’agụmakwụkwọ, n’ọrụ aka, na n’ịgagharị agagharị kpụrụ ụzọ ndụ ha.
Otu izu ka e mesịrị, Scarlett nọ ọdụ n’otu ebe ezumike na Manhattan na-aṅụ tii mkpụrụ osisi na-ekpo ọkụ. Mgbe ọ hapụsịrị ọrụ na ngalaba ego na Hong Kong maka ụlọ akwụkwọ gụsịrị akwụkwọ na New York, ọ kọwara nnwere onwe n'ụzọ dị iche.
“Enwere m ike ịpụ n'oge ọ bụla”.
Nwanyị ọzọ m gbara ajụjụ ọnụ, Iris, nọ na Hawaii, na-egbu oge ruo mgbe ọrụ ọhụrụ ya ga-amalite.
Ụmụ nwanyị atọ a niile bụ akụkụ nke ọgbọ otu nwa nke China. Onye ọ bụla n’ime ha bụ naanị otu nwa nne na nna ya mụrụ. Ha niile tolitere n’okpuru nnukwu nlekọta na nkwado ndị mụrụ ha, nakwa nrụgide siri ike ka ha nwee ihe ịga nke ọma. Ọ bụ ezie na ndụ ha dị iche iche, e nwere otu ihe ha niile ketara: a zụlitere ha ka ha were onwe ha dị ka ndị isi na-ekpebi ụzọ ndụ ha ga-esi aga.
Akụkọ ha na-egosi nnukwu ihe na-emegiderịta onwe ya nke dị n’etiti arụmụka China gbasara ọnụọgụ ndị bi na ya.
A na-ekwukarị maka mbelata ọnụọgụ ọmụmụ ụmụaka na China dịka ihe sitere na nsogbu akụ na ụba, mgbanwe n’echiche gbasara alụmdi na nwunye, ma ọ bụ ịrị elu nke ego ịzụ ụmụ. Ma nkọwa ndị a anaghị elebara mgbanwe miri emi ka ukwuu anya. Ụmụnwanyị China na-atụ anya ugbu a na ha ga-alụ di n’oge ma mụọ ọtụtụ ụmụ bụkwa ndị ahụ mba ahụ ji ọtụtụ iri afọ na-agba ume ka ha gbasoo agụmakwụkwọ, nweta ihe ịga nke ọma, nwee ike ịkwaga ebe dị iche iche, ma nwee onwe ha—nke mere ka nhọrọ ndụ ha gbasaa nke ukwuu karịa atụmanya ọdịnala.
Ọ dịghị ebe ihe ndị a na-emegiderịta onwe ha pụtara ìhè karịa n’etiti ụmụnwanyị ndị bụ naanị otu nwa nne na nna ha mụrụ na China.
Ruo ọtụtụ iri afọ, atụmatụ China iji mee ka mba ahụ bụrụ nke ọgbara ọhụrụ dabeere n’ịgbasawanye ohere. N’ezinụlọ ndị bi n’obodo mepere emepe, ndị iwu otu nwa (1979–2015)—nke gbochiri ọtụtụ ezinụlọ China ịmụ karịa otu nwa—metụtara, ụmụnwanyị ghọrọ ndị nne na nna ha lekwasịrị anya nke ukwuu. Ndị nne na nna tinyere nnukwu ego na agụmakwụkwọ ha, ọzụzụ ha na-enweta n’èzí ụlọ akwụkwọ, na ihe ịga nke ọma ha n’agụmakwụkwọ. Ọtụtụ n’ime ha gbara ụmụ ha nwanyị ume ịchụso ndụ nwere ohere karịa nke ụmụnwanyị ọgbọ ndị gara aga nwere.
Dịka usoro ndị a na-ejikarị atụ ihe si dị, atụmatụ a gara nke ọma.
Ugbu a, ụmụnwanyị karịrị ọkara nke ụmụ akwụkwọ mahadum na China, ha abanyekwala n’ọrụ ndị a na-akwanyere ugwu n’ọnụọgụ a na-ahụtụbeghị mbụ. Ruo ọtụtụ afọ, a na-eme mmemme maka mgbanwe a dịka ihe akaebe nke ọganihu ọha mmadụ.
Ma ihe ịga nke ọma a ewetakwala nsogbu a na-atụghị anya ya.
Àgwà ndị a zụlitere na mbụ dịka ihe bara uru—oke ọchịchọ inwe ihe ịga nke ọma, agụmakwụkwọ, nnwere onwe, na ikike ịkwaga ebe dị iche iche—ka a na-ekwuwanye ugbu a na ha bụ ihe mgbochi nye alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ. Okwu ndị e ji akọwa ịbụ nwanyị agbanweela. Kama ịtụle ụmụnwanyị dịka ụmụ akwụkwọ, ndị ọkachamara, ma ọ bụ ndị mmadụ n’onwe ha, a na-elezi ha anya dịka ndị a tụrụ anya na ha ga-amụ ụmụ iji dozie nsogbu mbelata ọmụmụ ụmụaka.
Ụmụnwanyị mụ na ha kwurịtara okwu anaghị akọwakarị mkpebi ha dịka ihe sitere n’echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha na-ekwu maka nnwere onwe ịhọrọ ụzọ ndụ ha, ọrụ nwere uru, na ọjụjụ ha jụrụ ịhazi ndụ ha kpamkpam dịka atụmanya ndị ọzọ si dị.
N’akụkọ ha, nnwere onwe pụtara ihe dị iche iche: Nye Grace, ibu ọrụ ya na-akpụzi mbọ ọ na-agba ibi ndụ; nye Scarlett, inwe ike ime mgbanwe n’ọnọdụ ego ya na-enye ya nchebe; ebe nye Iris, ikike ịkwaga ebe dị iche iche na amaghị ihe ga-eme n’ọdịnihu na-enye ndụ ya nzube.
Akụkọ Iris na-enyere aka ịkọwa ebe atụmanya a nke mmadụ iji aka ya duzie ndụ ya si malite.
N’oge ọ bụ nwata, o ji oge ya na-amụ ịkpọ piano na igwu mmiri, ma na-esokwa na mmemme mmụta ndị e mere iji gbasawanye ohere ọ ga-enwe n’ọdịnihu. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, ọ malitere ịghọta mbọ ndị ahụ n’ụzọ dị iche. Ọ bụghị nanị nkà ka nne ya na-akwụ ụgwọ ka ọ mụta. Ọ na-etinye ego n’ikike Iris ịchụso ohere n’ebe ọ bụla ha pụtara.
Dịka ọtụtụ ndị nne na nna bi n’obodo ukwu n’oge akụ na ụba China na-eto ngwa ngwa, nne Iris kwenyere na e nwere ike iwulite ọdịnihu ka mma site na nhazi, agụmakwụkwọ na ịrụsi ọrụ ike. Ịga mba ọzọ mụọ ihe, inwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ, na ịkwaga ebe dị iche iche abụghị nrọ ndị dị anya; ha bụ ebumnuche ndị a ga-agbasi mbọ ike iji nweta.
Ma mgbe ohere ndị ahụ ghọrọ ihe a pụrụ ime eme, ọtụtụ ndị nne na nna malitere ịla azụ. Otu ezinụlọ ndị ahụ gbara ụmụ ha nwanyị ume ịga chọpụta ụwa na-atụkarị anya na n’ikpeazụ, ha ga-anọ nso n’ụlọ, lụọ di n’oge ndị ezinụlọ ha tụrụ anya ya, ma nyere aka mee ka usoro ezinụlọ gaa n’ihu.
N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọtụtụ ụmụnwanyị ndị bụ naanị otu nwa nne na nna ha mụrụ gbasoro ihe a kụziiri ha. Ihe na-akpata esemokwu ahụ bụ na ihe ndị ahụ a kụziiri ha duru ha ruo ebe ndị mụrụ ha, nakwa ikekwe gọọmentị n’onwe ya, na-atụghị anya ya nke ọma.
Ihe na-adịkarị ụkọ n’arụmụka gbasara mbelata ọmụmụ ụmụaka na China bụ nghọta banyere etu ụmụnwanyị sirila nabata nke ọma atụmanya nke iji aka ha duzie ndụ ha. Ọ bụghị naanị na agụmakwụkwọ gbasawanyere ha ohere; ọ gbasawanyekwara ụdị ndụ dị iche iche ha pụrụ iche n’echiche. Nke a mere ka alụmdi na nwunye na ịbụ nne kwụsị ịbụ ihe a na-ewere na ọ ga-abụrịrị njedebe ndụ nwanyị, kama ha ghọrọ nhọrọ ụmụnwanyị nwere ike iji aka ha tụlee. Ka ụmụnwanyị na-enwetakwu nnwere onwe n’agụmakwụkwọ, n’akụ na ụba, na n’ọha mmadụ, ịbụ nne nwere ike ghara ịbụzi ọrụ a tụrụ anya na nwanyị ga-arụ, kama ọ bụrụ mkpebi nke onwe ya na akụkụ nke ikike ịmụ nwa. Nnyocha Mahadum Hong Kong mere n’oge na-adịbeghị anya banyere echiche ụmụnwanyị China gbasara alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ gosikwara na e nwere nnukwu mgbanwe nke mere na a naghịzi ewere alụmdi na nwunye dịka ihe dị mkpa nwanyị ga-ebu ụzọ mee tupu o nwee ike iwulite ezinụlọ.
Ruo ọtụtụ iri afọ, ọ dị ka e nwere nkwekọrịta a na-ekwughị ekwu: A ga-etinye ego na ohere a na-ahụtụbeghị mbụ n’ụmụnwanyị, ebe a na-atụ anya na alụmdi na nwunye na ilekọta ezinụlọ ga-esochi n’ikpeazụ.
Ma akụkụ mbụ nke nkwekọrịta ahụ gbanwere ụmụnwanyị n’ụzọ miri emi karịa ka ọtụtụ ndị tụrụ anya ya.
Ụmụnwanyị m gbara ajụjụ ọnụ ajụghị alụmdi na nwunye ma ọ bụ ịbụ nne. Ọtụtụ n’ime ha ka na-eche na ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ akụkụ nke ọdịnihu ha. Ihe ha na-ajụ bụ echiche na alụmdi na nwunye na ịbụ nne kwesịrị ibute ebumnuche ha ndị ọzọ niile ụzọ n’enweghị ntụle.
Ụmụnwanyị China ndị bụ naanị otu nwa nne na nna ha mụrụ ajụghị ọdịnihu e nyere ha.
Ha nabatara ya ma banye n’ime ya.
Nsogbu mbelata ọmụmụ ụmụaka na mba ahụ nwere ike ịbụ otu n’ime ihe akaebe kacha doo anya na ha gara nke ọma.







