Atụmatụ ọhụrụ maka udo, enwere ike idozi nsogbu nchekwa nke Naịjiria?

Nigerian policewoman

ACC H. O. Idoko, onye nnọchi anya Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC), ka ọ na-ekwu okwu na nyocha Amụma Udo Mba na Abuja, Ọgọst 4–6, 2026. Foto nke Triple Peace Africa sere. E ji ya mee ihe site n’ikike ha.

Ụwa na-emefu ego n’agha na nchekwa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Dịka Stockholm International Peace Research Institute (SIPRI) si kwuo, mmefu ego agha zuru ụwa ọnụ ruru ndekọ ọhụrụ nke ijeri dọla Amerịka 2.7 n’afọ 2024, ebe gọọmentị dị iche iche mụbara mmefu ha n’ihi agha na Europe na Eshia Ọdịda Anyanwụ, tinyere mmụba nke esemokwu nchekwa n’ebe ndị ọzọ.

Afrịka sokwa n’usoro ahụ. Mmefu ego agha na kọntinent a mụbara site na pasentị asatọ na ntụpọ ise n’afọ 2025 ruo ijeri dọla US iri ise na asatọ na ntụpọ abụọ. Dị ka SIPRI si kwuo, mmefu Naịjiria mụbara nke ukwuu karịa nke ahụ, site na pasentị iri ise na ise ruo ijeri dọla US abụọ na otu ntụpọ. 

N’agbanyeghị nke ahụ, na Naịjirịa, nnukwu mmefu ego nchekwa edozibeghị nsogbu na-akawanye njọ. Mba ahụ na-eche nnupụisi ndị ji ngwa agha, mwakpo ndị ohi, ịtọrọ ọtụtụ mmadụ, ime ihe ike n’etiti obodo, na mmụba nke mpụ a haziri ahazi ihu, ebe ụdị nsogbu ndị a dịgasị nnọọ iche site n’otu mpaghara ruo n’ọzọ. N’agbata Julaị 2025 na Juun 2026, a tọọrọ ma ọ dịkarịa ala mmadụ 7,825 n’ime ihe omume ịtọrọ mmadụ 1,713 n’akụkụ dị iche iche nke mba ahụ, ma gbuokwa ma ọ dịkarịa ala mmadụ 1,142. Na Julaị, Onyeisi Ala Bola Tinubu kwadoro iweta ndị agha ọhụrụ 28,000 na iguzobe ngalaba ndị agha ọhụrụ, nke bụ usoro kachasị ọhụrụ n’ime ọtụtụ mbọ e mere iji mụbaa ndị ọrụ nchekwa mba ahụ.

Ọnọdụ a na-akpali nnyocha a na-eme n’Atụmatụ Udo nke Mba, nke bụ usoro e bu n’obi ime ka nhazi ọrụ igbochi esemokwu na iwulite udo ka mma, ma na-elebakwa anya n’ụfọdụ ọnọdụ ndị na-eme ka ime ihe ike gbanye mgbọrọgwụ ma na-emeghachi ugboro ugboro.

Nigerian woman

Dr. Sanda Julie, Onye isi nchịkwa Ụlọ Ọrụ na-ahụ maka Iwulite udo na Steeti Plateau (Plateau State Peacebuilding Agency), na-ekwu okwu n’oge nzukọ nnyocha Atụmatụ Udo nke Mba e mere na Abuja, Naịjiria, site n’ụbọchị nke anọ ruo na nke isii n’ọnwa Ọgọstụ nke afọ 2026. Foto nke Triple Peace Africa sere. Ejiri ya site n’ikike ha nyere.

Ichegharị ụzọ Naịjirịa si achọ udo

Mbọ mbụ Naịjiria gbara imepụta Atụmatụ Udo nke Mba malitere n’afọ 2012, mgbe Otu na-ahụ maka Udo na Ndozi Esemokwu (Institute for Peace and Conflict Resolution — IPCR) duziri usoro ahụ ma mepụta akwụkwọ atụmatụ mbụ. E nweghị mgbe gọọmentị nakweere atụmatụ ahụ n’ụzọ iwu ma ọ bụ tinye ya n’ọrụ. Naịjiria, nke ọnụọgụgụ ndị bi na ya karịrị nde mmadụ narị abụọ na iri anọ na ọtụtụ narị agbụrụ na asụsụ dị iche iche. Naịjiria bụ otu n’ime obodo ndị nwere ụdị dị iche iche karịa n’ụwa. Ụdị dị iche iche a n’onwe ya abụghị ihe na-akpata esemokwu. Mana asọmpi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, esemokwu banyere ala na akụrụngwa, esemokwu n’etiti obodo, adịghị ike nke ụlọ ọrụ ọchịchị, na echiche na a na-ewepụ ụfọdụ ndị n’usoro ọchịchị na-ejikọkarị ọnụ n’ime obodo ahụ, na-eme ka mkpesa ndị obodo dị n’ogbe ụfọdụ ghọọ ime ihe ike.

Site n’ọnwa Ọgọstụ, ụlọ ọrụ gọọmentị, otu ndị na-arụ ọrụ iwulite udo, ndị mmekọ mmepe, na ndị ọkachamara n’ihe gbasara teknụzụ zukọrọ na Abuja na mpaghara atọ dị iche iche — Kano, Enugwu na Legọọsụ — iji nyochaa atụmatụ ochie ahụ ma hazie atụmatụ ọhụrụ nke ga-ejikọta ndị na-arụ ọrụ n’ọkwa gọọmentị etiti, steeti, na nke ime obodo.

Chris Ngwodo, onye isi nchịkwa nke ụlọ ọrụ Naịjirịa na-ahụ maka nkwadebe atụmatụ na ike iguzogide ihe ịma aka (OSPRE), mgbe ya na Global Voices na-ekwurịta okwu n'Abuja, Naịjirịa, kwuru na ebumnuche ya bụ itinye usoro igbochi esemokwu n'ime usoro nchekwa sara mbara nke mba ahụ, ma lekwasị anya ọ bụghị naanị n'ime ihe ike a na-ahụ anya nke sitere n'esemokwu eji ngwa agha mee, kamakwa n'ịchọpụta ọnọdụ ndị na-akpata ya.  

“E nwere ọtụtụ ụdị ime ihe ike ndị na-abụghị ime ihe ike a na-ahụ anya,” ka o kwuru, na-akọwapụta ahaghị nhata dị n’usoro ọhanaeze, ọdịda dị n’usoro ikpe ziri ezi, ileghara anya nke gọọmentị, na enweghị ohere dịka ihe ndị na-adị jụụ ma na-akpata esemokwu n’ụzọ na-emebi ihe n’otu aka ahụ.

Ngwodo na-ewulite atụmatụ ahụ site n’echiche a ma ama nke bụ na udo abụghị naanị enweghị esemokwu, kama ọ bụkwa ịdị adị nke ikpe ziri ezi.

“A naghị ahụ ime ihe ike n'usoro. Ọ dịghị onye pụrụ ịhụ ya, mana ọ dị ugbu a,” ka o kwuru. “Ime ihe ike a na-ahụ anya bụ ihe na-eme mgbe ndị mmadụ malitere ịlụ ọgụ.” O kọwara na e bu n’obi ka atụmatụ ọhụrụ ahụ lebara ụdị ime ihe ike abụọ a anya site n’ịdabere n’ikpe ziri ezi na-eweghachi ihe e mebiri, ikpe ziri ezi na-enye ntaramahụhụ, na ikpe ziri ezi na-ekesa ihe na ohere n’ụzọ ziri ezi, nakwa site n’ime ka ohere dịrị mmadụ niile. 

Mgbe a jụrụ ma atụmatụ ọhụrụ a ga-edozi nsogbu nchekwa Naịjiria, Ngwodo zara ajụjụ ahụ n’egbughị oge: “Ọ gaghị edozi ya.” O kwusiri ike na ihe akwụkwọ atụmatụ ahụ nwere ike ime bụ ịgbanwe ụzọ mba a si eme ihe, site n’ịzaghachi naanị mgbe ime ihe ike malitere na ịnwa ịkwụsị ya ozugbo, gaa n’ịmepụta usoro na-enyere aka ibu ụzọ mata ma kwadebe maka ihe ize ndụ, site n’ịjụ ọ bụghị naanị otu a ga-esi meghachi omume n’ime ihe ike, kama ihe kpatara ụfọdụ ebe ji adịkarị mfe ime ihe ike na ihe kpatara o ji na-emeghachi ugboro ugboro.

“Ọ bụghị n’ihi na ime ihe ike dị n’ọbara ha ka ndị mmadụ ji alụ ọgụ,” ka o kwuru. Dị ka o si kọwaa ya, ihe ndị na-akpata ya n’ezie na-abụkarị ọdịda n’usoro ọchịchị, adịghị ike n’usoro ikpe ziri ezi, mkpesa ndị gbadoro ụkwụ n’akụkọ ogologo oge, ileghara anya, na enweghị ohere zuru ezu.

Kemgbe mgbalị ikpeazụ e mere maka atụmatụ ahụ, usoro iwulite udo na Naịjiria etoola nke ukwuu. OSPRE n’onwe ya adịghị n’afọ 2012, nke kọmitii udo steeti ndị na-arụ ọrụ ugbu a n’ofe mba a ji adị. Dị ka Ngwodo si kwuo, ọrụ dị ugbu a bụ ime ka usoro na ụlọ ọrụ ndị a kwekọọ n’otu, ma gbasaa ọrụ ha.

Nigerian men

Site n’aka ekpe ruo n’aka nri: Onye isi nchịkwa nke Ụlọ Ọrụ  na-ahụ maka Udo na Ndozi Esemokwu (Institute of Peace and Conflict Resolution — IPCR), Dr Joseph Ochogwu; Onye isi Kọmitii Ụlọ Ndị Nnọchiteanya na-ahụ maka iwulite udo na ịdị n’otu n’obodo, Sadiq Tafida; Onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Onye isi ala Naịjiria maka nchekwa ala nna, Maj Gen Adeyinka Famadewa (Rt); na Onye isi nchịkwa nke Ụlọ Ọrụ na-ahụ maka Nkwadebe Atụmatụ na Ikike Ịnagide Ihe Ịma Aka (Office for Strategic Preparedness and Resilience — OSPRE), Chris Ngwodo, n’oge nzukọ ndị metụtara nnyocha Atụmatụ Udo nke Mba e mere na Abuja, Naịjiria. Foto nke Triple Peace Africa sere. Ejiri ya site n’ikike ha nyere.

Gafee Nzaghachi Ndị Agha

Kemgbe ọtụtụ afọ, Naịjirịa na-enye aka n’ichekwa udo mpaghara site na Otu Ọchịchị na Akụnaụba nke Mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka (Economic Community of West African States – ECOWAS), nakwa site n’iziga ndị agha na ndị nnọchi anya ọchịchị mba ọzọ na Liberia, Sierra Leone, Guinea-Bissau, Sudan, na Côte d’Ivoire. Mana n’ime Naịjirịa, gọọmentị adaberela nke ukwuu n’ebe ndị agha nọ iji zaghachi nsogbu enweghị nchekwa.

Na nzukọ e mere n'Abuja, onye ndụmọdụ Onye isi ala maka nchekwa ala nna, Maj General Adeyinka Famadewa (Rt), kwuru na Naịjiria enweghị ike “iji mgbọ dozie nsogbu nchekwa ya.” Ọ gbakwụnyere na n’agbanyeghị na ọrụ ndị agha nwere ike ịgbasasị otu ndị ji ngwa agha ma weghachite mpaghara ha weghaara, ha adịghị akwado nke ọma idozi ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụnaụba, na mmekọrịta mmadụ na ibe ya ndị na-eme ka ime ihe ike laghachi mgbe ọrụ agha ahụ kwụsịrị.

Chijioke Iwuamadi, onye nnọchi anya GIZ African Union Office, bụ ụlọ ọrụ mmepe nke Germany, kwupụtakwara echiche yiri nke a banyere igbochi nsogbu tupu ha amalite, na-ekwu na itinye ego n’ọrụ igbochi nsogbu na iwulite udo ogologo oge nwere ike ịdị ire karịa ma ghara ịdị oke ọnụ karịa ịzaghachi nsogbu ugboro ugboro mgbe ha dapụtara.

Naịjiria o nwere ike iwepụta ego maka igbochi ime ihe ike?

Naịjiria enweghị naanị otu ọgbaaghara. O nwere ọtụtụ ọgbaaghara na-ejikọta ibe ha ma dịkwa iche site n’otu mpaghara ruo n’ọzọ. Ọgụ nnupụisi dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ ka na-aga kemgbe ihe karịrị afọ iri, ebe ime ihe ike nke ndị ohi na ịtọrọ mmadụ n’ọnụọgụgụ dị ukwuu emebiela ịdị jụụ nke obodo ndị dị n’ime ime na mpaghara ugwu ọdịda anyanwụ na n’ebe ndị ọzọ. Ime ihe ike n’etiti obodo na mpụ a haziri ahazi na-agbaso usoro na ihe ndị na-akpata ha dị iche iche.

Ihe ndị a na-akpata esemokwu na-ejikọta ma na-emetụta ibe ha. Okpukperechi na agbụrụ nwere mmetụta. Esemokwu ala na-aghọ esemokwu obodo. Asọmpi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-eme ka mkpesa ndị dịbu adị dịkwuo njọ, ebe mbugharị, mgbanwe n’ọnụọgụgụ na nhazi ndị mmadụ, na mgbasa ozi mmekọrịta mmadụ na ibe ya, bụ nke nwere ike ime ka ozi ụgha na akụkọ ndị na-akpalite iwe gbasaa, na-eme ka nsogbu ndị dịrị na mbụ sikwuo ike. Ọ bụ n’ihi ọdịiche ndị a dị n’etiti mpaghara ka e ji mee nnyocha Atụmatụ site n’ịkpọ nzukọ n’ogbe dị iche iche, iji gbalịa ịtụle ọdịiche dị n’ogbe ọ bụla ma ka nwee ike imeputa atụmatụ nke ga-arụ ọrụ n’ogo mba niile.

Dị ka Onye isi nchịkwa nke Otu na-ahụ maka Udo na Ndozi Esemokwu, Joseph Ochogwu si kwuo, inwe usoro nhazi ọrụ nke ụlọ ọrụ dị iche iche ga-agbaso n’usoro iwu, tinyere atụmatụ doro anya nke na-akọwapụta usoro a ga-agbaso n’ịgba mbọ iwulite udo n’ọrụ n’ofe mpaghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na akụnaụba dị iche iche nke mba ahụ, ga-enyere aka izere ịrụ otu ọrụ ugboro abụọ, ịla n’iyi nke akụrụngwa, asọmpi n’etiti ụlọ ọrụ, na ọnọdụ ebe ụfọdụ obodo na-enweghị onye na-elekọta mkpa ha.

Naịjiria o nwere ike iwepụta ego maka igbochi ime ihe ike?

Naịjiria na-emefu nnukwu ego ugbua n’ịzaghachi enweghị nchekwa. Ego a na-emefu n'ọrụ ndị agha mụbara nke ukwuu ruo n’afọ 2025, ma ọ dịghị ihe na-emegide ibe ya n’ịkwalite ikike ndị agha na itinye ego n’ọrụ igbochi nsogbu tupu ha amalite. Mana ha abụọ na-arụ ọrụ n’ogo dị iche iche n’usoro ime ihe ike. Otu na-azaghachi ihe iyi egwu, ebe nke ọzọ na-agbalị ibelata ọnọdụ ndị na-ebute ihe iyi egwu ndị ahụ. Naịjiria ga-ekpebi otu ọ ga-esi kesaa nlebara anya na akụrụngwa ya n’etiti ha abụọ.

Ihe karịrị afọ iri agafeela kemgbe e mere mgbalị mbụ imepụta atụmatụ ahụ, ma ọnọdụ nchekwa Naịjiria agbanweela. Ugbu a, mba ahụ na-eche ụdị enweghị nchekwa dị iche iche ihu, ebe ụlọ ọrụ gọọmentị, kọmitii udo, na otu ndị obodo nwere ọtụtụ ụzọ dị iche iche ha si azaghachi nsogbu ndị a. Ma nhazi ọrụ ahụ ha ga-eme ka ọgbaaghara belata ma gbochie ndị dị adị ịlaghachi ga-adabere n’ihe ga-eme mgbe nzukọ nnyocha ndị a gachara.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.