
Ndị mmadụ na-eti mkpu ọṅụ n'ihu Ụlọ ọrụ Praịm Minista ka Sheikh Hasina kwụsịrị ịbụ onye isi ọchịchị. Foto sitere na Wikipedia, nke Md Joni Hossain sere. CC BY-SA 4.0.
Edemede a so n'usoro “Ngosipụta” nke Global Voices maka ọnwa Septemba afọ 2026, nke akpọrọ “Ngagharị Iwe n'Ọchịchị Onye Kwuo Uche Ya.” Site n'usoro a, anyị chọrọ inyocha ụdị ngagharị iwe dị iche iche, usoro gọọmentị na-eji eme ka ha ghara inwe nkwado ma ọ bụ kwụsị ha, ya na mmekọrịta dị mgbagwoju anya dị n'etiti ngagharị iwe na ọchịchị onye kwuo uche ya. I nwere ike ịkwado ọrụ mgbasa ozi a site n'inye onyinye ebe a.
N'ụbọchị nke ise n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2024, puku kwuru puku mmadụ juru n'okporo ụzọ Dhaka, dị na Bangladesh, ebe gọọmenti nke chịrị obodo ahụ ihe karịrị afọ iri na ise dara n'etiti nnukwu ngagharị iwe megide ọchịchị aka ike na mkpa ọ dị ka ndị ọchịchị na-aza ajụjụ maka omume ha.
Izu ole na ole tupu mgbe ahụ, ọ dịghị onye gaara eche na ihe dị otu a ga-eme. N’ụbọchị o mere, igwe mmadụ juputara n’okporo ụzọ na-eme emume ọdịda gọọmenti, na-eme emume na e mezuru ọchịchọ ha ka e mee ka ndị ọchịchị na-aza ajụjụ maka omume ha.
Afọ abụọ ka e mesịrị, ajụjụ ọzọ na-esochi mmeri ahụ. Mba ahụ ọ gbanwere naanị ọchịchị, ka ọ bụ na o nwere ike ịgbanwekwa usoro ahụ mere ka ndị mmadụ pụta n'okporo ụzọ na mbụ?
Ọgbaaghara nke Julaị malitere n’ihi mgbanwe a chọrọ ime n’ihe gbasara oke ohere ọrụ gọọmentị, ma mesịa gbasaa ghọọ iwe sara mbara nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta ọha na eze. Ụlọ Ọrụ Kọmishọna Kasị Elu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ (OHCHR) gụtara ihe dị ka mmadụ otu puku na narị anọ nwụrụ n’agbata ụbọchị nke mbụ n'ọnwa Julaị na ụbọchị nke ise n'ọnwa Ọgọstụ, 2024. N'ụbọchị nke ise n'ọnwa Ọgọstụ, Sheikh Hasina gbara arụkwaghịm dị ka praịm minista ma gbapụ n’obodo ahụ.
Gọọmenti ahụ dara, nke ahụ bụkwa ihe a hụrụ anya pụtara ihe. Mana ndị mmadụ mere ngagharị iwe n'ọnwa Julaị chọrọ ihe karịrị nke ahụ: mgbanwe n'usoro ụlọ ọrụ gọọmentị, ịza ajụjụ gbasara otu ọrụ si aga, na iwughachi usoro ọchịchị na ikike site na ntọala ya.
Ihe mgbanwe nke ọnwa Julaị kwere nkwa
Hasnat Abdullah, otu n'ime ndị isi ụmụakwụkwọ pụtara na ngagharị iwe ahụ, gwara BDNews24.com, ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị n’ịntanetị, na ụfọdụ n'ime mgbanwe usoro ndị a tụlere n'oge ngagharị iwe ahụ abụbeghi ihe etinyere n'ọrụ.
N’okwu ya:
People expected reforms across the judiciary, executive and every institution of the state. Instead, the same old structure that repeatedly allows authoritarianism to return has survived.
Ndị mmadụ tụrụ anya mgbanwe n’ụlọ ikpe, n’aka ndị isi ọchịchị, na n’ụlọ ọrụ ọchịchị niile nke steeti a. Kama nke ahụ, otu usoro ochie ahụ nke na-eme ka ọchịchị aka ike na-alọghachi ugboro ugboro ka dịkwa.
Ndị ọzọ na-enyocha ọnọdụ ahụ anaghị ekwenye n’echiche ahụ. Onye nnyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị Kazi Mohammad Mahbubur Rahman kwuru ya otu a mgbe ọ na-agwa BDNews24.com okwu:
জুলাই অভ্যুত্থানের মধ্য দিয়ে বাংলাদেশ ‘কর্তৃত্ববাদ থেকে মুক্তি’ পেয়েছে, ‘অনেক দিন পর’ মানুষ ভোট দিতে পেরেছে, একটি নির্বাচিত সরকার এসেছে।
নির্বাচনের মাধ্যমে গণতন্ত্রের একটা বার্তা আমরা পাচ্ছি, কিন্তু ভবিষ্যৎ বলে দেবে, এটা কতটা টেকসই হল। এখন গণতান্ত্রিক প্রক্রিয়া কার্যকর রাখা এবং এটা সক্রিয় করার ক্ষেত্রে কাজ করতে হবে।
The July uprising won Bangladesh freedom from ‘authoritarian rule,’ and ‘after years without one,’ people got to vote again in an election that brought a government to power democratically.
The election gives a message of democracy. But whether that democracy holds, depends on the works still ahead: keeping the process effective, keeping it active.
Ọgbaaghara nke Julaị mere ka Bangladesh pụọ n’okpuru “ọchịchị aka ike,” ma “mgbe ọtụtụ afọ ndị mmadụ na-enweghị ohere ịtụ vootu gasịrị,” ha nwetara ohere ịtụ vootu ọzọ n’ime ntuli aka nke mere ka gọọmenti bịa n’ọchịchị site n’usoro onye kwuo uche ya.
Ntuli aka ahụ na-ezipụta ozi gbasara ọchịchị onye kwuo uche ya. Ma, ma ọchịchị onye kwuo uche ya ahụ a ga-adịgide ma ọ bụ na ọ gaghị adịgide, dabere n’ihe ndị ka fọdụrụ ime: ime ka usoro ahụ na-arụ ọrụ nke ọma na ime ka ọ nọgide na-arụ ọrụ.
O kwuru na iwulite usoro ọchịchị onye kwuo uche ya zuru oke na-ewe oge. Ya mere, ajụjụ na-ebilite mgbe mgbanwe nke Julaị gasịrị abụghị naanị onye nwere ikike ọchịchị. Ọ bụkwa otu iwu na ụkpụrụ gbasara iji ikike ọchịchị si gbanwee n’ezie.
Ịtụle mgbanwe afọ abụọ ka e mesịrị
Nnyocha e mere na-atụle ọdịiche dị n’etiti ihe ndị mmadụ tụrụ anya ya na ihe ha nwetara.
Nnyocha Pulse nke nwere usoro atọ nke BRAC Institute of Governance and Development (BIGD) mere n’ime afọ 2024 na 2025 na-egosi mbelata nke nchekwube nke na-aga n’ihu. N’ọnwa Ọgọstụ afọ 2024, pasentị iri asaa na otu nke ndị sonyere na nnyocha ahụ kwenyere na mba ahụ na-aga n’ụzọ ziri ezi n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ka ọ na-erule Julaị 2025, ọnụọgụgụ ahụ adaala ruo pasentị iri anọ na abụọ. Ka ọ dị ugbu a, pasentị iri ise na asaa kwuru na mgbanwe n’usoro ndị uwe ojii na ụlọ ikpe so n’ihe ndị kacha mkpa a chọrọ ime ngwa ngwa; ebe pasentị iri atọ na asatọ kwuru na mgbanwe n’usoro ntuli aka na Iwu Kasị elu bụ ihe kacha mkpa.
Ụlọ ọrụ dị iche iche dị mkpa n'anya ụmụ amaala ndị a otu ntuli aka na mgbanwe ọchịchị n'onwe ya si dị mkpa. Ma mgbanwe ndị ahụ ọ ga-adịgide bụ ihe a ka na-ajụ ajụjụ banyere ya.
Al Jazeera kọrọ n'ọnwa Eprel afọ 2026 na opekata mpe iwu iri abụọ na atọ n'ime otu narị na iri atọ na atọ e wepụtara n'okpuru ọchịchị nwa oge (site n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2024 ruo n'ọnwa Febụwarị afọ 2026) ka a kagburu ma ọ bụ hapụ ka ha kwụsị ịdị ire; iwu ndị a metụtara ikike mmadụ, nlekọta usoro ikpe, mbọ a na-agba iji lụso nrụrụ aka ọgụ, na mgbanwe n'usoro ọrụ ndị uwe ojii. Ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emegide otu nọ n'ọchịchị na ụfọdụ ndị nnyocha kpọrọ ya ịlaghachi azụ. Ma ọchịchị ahụ na-akpọ ya ihe ọzọ: usoro nyocha, ebe a na-ewepụ iwu ụfọdụ iji mezie ha ma weghachite ha ọzọ, ọ bụghị ịkagbu mgbanwe ndị ahụ.
Ọ bụghị naanị na mgbanwe n’usoro ọchịchị steeti na-aga nwayọọ ka ndị mmadụ na-eme mkpesa ya. Dị ka akụkọ mgbasa ozi si kwuo, ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emegide ndị nọ n'ọchịchị na ndị na-akwado ikike mmadụ na-arụtụ aka na omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị ochie na-amalitekwa ịpụta ọzọ n’okpuru aha ọhụrụ. Nhọpụta ndị dabere na nkwekọrịta alọghachitela n’ụlọ ọrụ ọchịchị ndị dị mkpa. Ndị Rapid Action Battalion, nke a gbasasịrị n'ihi ebubo mmegbu, nwere onye nọchiri ha a na-akpọ SRB. Ndị nkatọ na-ajụ ajụjụ doro anya: ịgbanwe aha nsogbu ọ na-edozi ya?
Iwu gbasara ịntanetị na ikike inwere onwe ikwu okwu bụ ọgụ ọhụrụ na-aga n’ihu. Dịka akụkọ OHCHR siri gosi, njikwa ọchịchị steeti n’otu esi ekwu okwu n’ịntanetị pụtara ihe n'oge ngagharị iwe nke afọ 2024, nke gụnyere itinye mgbochi na Facebook na imechi ịntanetị kpamkpam. Gọọmentị na-agbachitere mgbanwe ndị ọ chọrọ ime na Iwu Nchekwa Ịntanetị, na-ekwu na ha dị mkpa iji lụso mpụ a na-eme n’ịntanetị, ozi ụgha, na ndịna AI mepụtara ọgụ. Ndị nkatọ nụrụ ihe ọzọ: usoro ochie maka imechi ndị na-emegiderịta onwe ha, nke e wughachiri.
Ọdịnihu nke July Charter, nke ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị bụ isi, gụnyere Bangladesh Nationalist Party (BNP), bịnyere aka na ya, na-ebulikwa otu ajụjụ ahụ. O kwere nkwa mgbanwe n’usoro ụlọ ọrụ ọchịchị niile: usoro nlele na nguzozi nke ikike, nnwere onwe nke ụlọ ikpe, usoro ntuli aka, ndị uwe ojii, na usoro mgbochi nrụrụ aka. Afọ abụọ ka e mesịrị, ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka na-enwe nghọtahie banyere ogo mgbanwe ndị ahụ kwesịrị iru na etu a ga-esi mee ha ngwa ngwa.

Otu nwaanyị sonyere na ngagharị iwe ji ihe ngosi e dere মানবে না হার এই গণজোয়ার (“Igwe mmadụ a agaghị ada mba”) Foto sitere na Wikipedia, nke Wasiul Bahar sere. CC BY-SA 4.0.
Gịnị ga-eme mgbe ngagharị iwe ndị a gasịrị?
Ngagharị iwe nwere ike ikwatu ọchịchị ngwa ngwa. Mana, iwughachi ụlọ ọrụ, idegharị iwu, na ikesa ikike n’ụzọ ọhụrụ—ọrụ ndị a na-ewe ọtụtụ afọ, ọ bụghị izu ole na ole. Ọchịchị onye kwuo uche ya ọhụrụ bụ ihe a na-ahụ anya n'ọdịnihu. Mana ọchịchị onye kwuo uche ya na-arụ ọrụ nke ọma na-egosipụta onwe ya n’ebe ọzọ: n’ụlọ ọrụ ọchịchị, n’ịza ajụjụ gbasara etu ọrụ si aga, n’usoro nlele na nguzozi nke ikike, n'ihe gbasara ikike mmadụ, ha nwere ike iji mee ihe n’ezie.
Ọgbaaghara nke Julaị 2024 gosipụtara na ngagharị iwe nwere ike iwepụ ikike ọchịchị n’aka ndị nọ n’ọchịchị. Afọ abụọ ka e mesịrị, ule ahụ dị iche: Ole n’ime ihe ndị mmadụ tụrụ anya ya site na ngagharị iwe ahụ ka e tinyere n'omume ugbu a?
Ajụjụ Hasnat Abdullah abụghị naanị maka ndị isi ngagharị ahụ. Ọ bụkwa ajụjụ ndị buuru ndị merụrụ ahụ gaa n’ụlọ ọgwụ, ndị kesara nri na mmiri, na ndị kwadoro ngagharị iwe ahụ site n’ebe ọ bụla ha nọ kwesịrị ịza.
Ọchịchị gọọment gbanwere. Onye ọ bụla nwere ike ịhụ nke ahụ. Ma nkwa ndị Julaị kwere ọ gbanyere mgbọrọgwụ n’ụlọ ọrụ ọchịchị na usoro ike dị n’okpuru ya, ịza ajụjụ banyere nke ahụ agwụbeghi.






