
Pilru, ngwa egwu e ji ụrọ terracotta mee nke ndị Tharu na Kumhar bi na mbara ala ndịda Nepal na-emepụta. Foto nke Sanjib Chaudhary sere. E ji ya mee ihe site n’ikike ya.
Pilru, ngwa egwu terracotta yiri nnụnụ nke obodo ụmụ amaala Tharu na Kumhar bi na mbara ala ndịda Nepal na-emepụta, siri n’otu obodo nta dị n’Ọdịda Anyanwụ Nepal ruo n’ụlọ ahịa nka dị na Ndagwurugwu Kathmandu. Nke a mere site na atụmatụ nka nke onye nka Tharu, Lavkant Chaudhary, duziri.
Ruo ọtụtụ ọgbọ, ndị obodo ụmụ amaala ejirila ngwa egwu e ji ụrọ mee n’emume, nnọkọ ọha, na mmemme dị iche iche. Ọ bụghị naanị iji mee ka ndị bịara nnọkọ nwee obi ụtọ, kama ọ bụkwa iji kparịta ụka ma jikọọ na chi na mmụọ.
Pilru – Egwu Nguzogide
“Pilru — Egwu Nguzogide bụ atụmatụ ndị obodo na-eduzi, nke e hiwere iji dekọọ, chekwaa, ma weghachite Pilru, otu ngwa egwu e ji aka rụọ, nke ndị obodo Adivasi Tharu na Kumhar bi na mpaghara Tarai bufere site n'otu ọgbọ gaa na nke ọzọ,” dịka onye na-ese ihe bụ Lavkant Chaudhary kwuru n'okwu ya.
“Atụmatụ ahụ na-edekọ akụkọ ihe mere eme a na-akọ n’ọnụ, abụ, na usoro nka e si emepụta ya. Ọ na-etinye olu obodo n’etiti ọrụ ahụ ma na-akwado na Pilru bụ omenala dị ndụ, ọ bụghị naanị ejiji na-agafe agafe.”

Roinu Chaudhary si Dang, bụ distrikti dị n’ebe ọdịda anyanwụ Nepal, na-akpọ Pilru n’emume a haziri na Kathmandu. Foto Sanjib Chaudhary sere. E jiri ya mee ihe site n’ikike o nyere.
“A mụtara m ịkpọ na ịrụ Pilru mgbe m ka bụ nwata,” ka Roinu Chaudhary, bụ nwoke dị afọ iri asaa si Deukhar nke Lamahi dị n'ebe ọdịda anyanwụ Nepal, kwuru n'ajụjụ ọnụ ya na Global Voices. E toro ya maka ntunye ya n’ichekwa omenaala Pilru n’emume ahụ e mere na Kathmandu. “Anyị na-akpọ ya mgbe anyị na-enye ehi nri na mgbe anyị na-aga n’ọhịa.”
“Ahụbeghị m onye ọzọ na-abụghị ndị Tharu na-eji ngwa egwu a,” ka Chhabilal Kopila, onye ode akwụkwọ na onye na-akwado ọdịbendị Tharu, kwuru n’emume ahụ. “Ọ bụ ihe na-enye nchegbu na ọgbọ ndị na-eto eto enweghị mmasị na ngwa egwu a.”
Dị ka Kopila si kwuo, Santu Chaudhary si Dang dị n’ebe ọdịda anyanwụ Nepal bụ otu n’ime ndị maara ịkpọ Pilru nke ọma. O nwere ike iji ngwa egwu a mepụta egwu maka ụdị abụ ọ bụla.
Nke a bụ obere vidiyo nke Santu Chaudhary ebe ọ na-akpọ Pilru:
Xutuli, ngwa egwu yiri ya nke a na-eji ụrọ ma ọ bụ osisi achara eme, bụ nke a na-eji eme ihe n’emume Bihu na Assam, India. A na-emepụta ya ka ọ dị n’ụdị nnụnụ, ma dị ka omenaala ndị Assamese si kwuo, ndị mmadụ kwenyere na ụda Xutuli na-akpọku mmiri ozuzo.
Iji ihe ọmụma ọdịnaala eme ihe n'ụzọ na-ezighị ezi
“Lavkant Chaudhary kwuru sị: “Atụmatụ ahụ na-agbaghakwa iwere omenala ndị ọzọ dịka nke onwe, nke ụlọ ọrụ ndị na-abụghị nke obodo ụmụ amaala na-eme mgbe ha na-emepụtagharị ma na-ere nka a, na-ewepụkwa ihe ọ pụtara, ya n’enweghị inye ndị mepụtara ya ugwu.”
Ọtụtụ ụlọ ọrụ anọọla na-emepụtaghachi ma na-ere nka na ngwaahịa omenaala ndị obodo ụmụ amaala n’enweghị ịgwa obodo ndị ahụ ihe banyere ya ma ọ bụ kwupụta ha, ma ya fọdụzie Pilru.
“Ụdị ngosipụta omenala ọdịnala (TCEs) na ihe ọmụma ọdịnala (TK) metụtara akụkụ ndị dị mkpa nke omenaala na ọdịnaala ndị obodo ụmụ amaala, bụ ndị kwesịrị inwe ikike igbochi ma ọ bụ kwe ka e jiri ihe ọmụma ndị a mee ihe,” ka Esther Aburto Olague, onye ọka iwu na OZM Legal & Business Consulting Services, Mexico, dere. “Ndị ọzọ na-abụghị ndị obodo ahụ iji ihe ndị a eme ihe nwere ike bụrụ mmejọ megide ihe nketa omenaala nke obodo ndị a bụ ụmụ amaala.”
N’ịkwado okwu Lavkant, Kopila dere na Facebook sị, “Ka obodo Tharu na Kumhar na-aga n’ihu n’ịgbasi mbọ ike ka a mata ha ma kwanyere ha ugwu, ọ dị oke mkpa itinye onye mepụtara ọrụ ahụ, ugwu mmadụ, na ikpe ziri ezi n’ihe gbasara omenaala n’isi.”
Ụmụ amaala na-echekwa TCEs na TK ga-enweta otuto na uru kwesịrị ekwesị naanị mgbe iwu obodo kwadoro na ha bụ ndị nwere ikike n’ebe ọrụ ndị ahụ dị, n’agbanyeghị ụdị ọrụ ọ bụla, ebe a na-egosipụta ihe gbasara omenaala na njirimara ha, dịka ọ dị na Mexico.






