Kedu ihe abụ ọdịnala O Bele sitere n’obodo Tulu dị n’ebe ndịda India nwere ike ịgwa anyị gbasara otu ndị ọrụ ugbo si anọrị oge n'onwe ha mgbe ha na-akụ ihe ọkụkụ? Kedu ihe abụ ọdịnaala Tharu sitere na Nepal nwere ike ime ka anyị ghọta gbasara njem ụmụnwoke na-aga ịchọ ọrụ, nakwa ikekwe banyere otu osimiri? Gịnị ka ngosi Onyenweanyị Shiva nke a na-ezunarị ya n'ohi mgbe ọ na-ehi ụra nwere ike ịkụziri anyị—nke bụ ihe a na-ahụkarị n'ụdị akụkọ na-enye chi agwa mmadụ n'abụ ọdịnaala Angika nke India na Nepal—na-akụziri anyị banyere ọdịiche dị n'etiti otu esi akọwa chi n'akwụkwọ nsọ na otu esi egosipụta ha n'omume ndụ mmadụ kwa ụbọchị? Ma ọ bụ, gịnị ka vidiyo gbasara ọdịnaala nwere ike ịkọwa banyere mmalite nke ndị na-asụ Torwali na Pakistan iguzogide mmebi na ịkpapụ omenaala ha n’akụkụ n’ihi omume okpukperechi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị a ma ama?
Akụkọ ndị a na-akọ n’ọnụ, dị ka egwu ọdịnaala na akụkọ ihe mere eme a na-ebufe n’ọnụ, na-enyocha ndụ na ahụmịhe ndị nkịtị, bụ ndị adịghị elekwasị anya na ha nke ukwuu n’agụmakwụkwọ a na-enyekarị, n’ịkekọrịta ihe ọmụma, na n’usoro mgbasa ozi ọha. Ụzọ e si ekwupụta ha, ya bụ, izisa nkwenkwe na usoro ihe ọmụma ndị a naanị site n’ọnụ, na-emekwa ka a hapụ ha n’akụkụ n’ụwa na-elekwasị anya n’ihe e dere ede. Iji gbaghaa nke a, ndị nkịtị na-echekwa ihe ndekọ eserela vidiyo gbasara omenala ọnụ, bulite ha na Wikimedia Commons, ma na-edegharị ihe e kwuru n’ime ha ka mmadụ niile nwee ike iji ha mee ihe. Ha na-ejikọkwa ha na nyiwe ihe ọmụma mepere emepe dịka Wikisource na Wikipedia, ma na-ede blọọgụ banyere ahụmahụ ha. Ọrụ “Enhancing Indic Oral Culture on Wikimedia Projects” na-enye nduzi na nkwado maka mmemme ndị a. Site na nke a, ndị nkịtị na-echekwa ihe ndekọ sitere n’obodo asụsụ 14 na Ndịda Eshia edekọla abụ ọdịnala, ilu mgbagwoju anya, akụkọ ihe mere eme a na-akọ n’ọnụ, ihe ọmụma ọgwụ, na ihe ndị ọzọ dị 227.
Ọ bụ ezie na isiokwu a na-ekwu maka naanị obodo olenaole dekọrọ omenala ha, vidiyo ọdịnaala ndị e dekọrọ ma chekwaa echekwabala ihe ọmụma sitere n’ọtụtụ ọgbọ, nke nọ ugbu a n’ihe ize ndụ ịla n’iyi n’ihi ime ka omenaala dị iche iche yie otu.
Otu mmepe ọgbara ọhụrụ si eme ka abụ ọdịnala ọrụ ugbo ndị Tulu na-ala n’iyi
N’asụsụ Tulu, egwu ọdịnaala O bele pardhana bụ akụkọ banyere Daiva (mmụọ ndị a na-asọpụrụ n’ogbe dị n’akụkụ osimiri Tulunadu) nke ndị ọrụ ugbo na-abụ n’ubi n’oge ịkụ ihe ọkụkụ na owuwe ihe ubi iji mee onwe ha obi ụtọ. Dịka ịma atụ, egwu O Bele na-akọ maka njem otu nwa agbọghọ site n’oge ọ bụ nwata ruo n’oge ọ lụrụ di—otu onye na-abụ nkwe abụ ndị ahụ, ebe ndị ọzọ na-esonyere ya site n’ ikwughachi “O Bele.” A na-akpọ ha “kabithe” (uri) n'ogbe ahụ, ndị ọrụ ugbo na-abụkọkarị ụdị abụ ndị a ọnụ mgbe ha nọ n'ọrụ, ebe ha na-anọdụ n'ahịrị ma na-abụ ya n'otu n'otu ka ha na-akụ mkpụrụ.
Kavitha Ganesh, otu n’ime ụmụ amaala Tulu na-edebe ihe ndekọ chịkọtara egwu ọdịnaala, ihe ọmụma banyere ọgwụ ọdịnaala, akụkọ ihe mere eme a na-ebufe n’ọnụ, wdg., n’oge e mere ya ajụjụ ọnụ n’ekwentị, na-atụgharị uche banyere ịla n’iyi nke egwu ọdịnaala ọrụ ugbo ndị Tulu, bụ nke na-egosi mgbanwe n’ụzọ ndụ ha n’ihi nrụgide sitere n’ihe isi ike akụnaụba na-eche ọrụ ugbo ihu:
The singer in the video showed us the crop field in which they used to sing together. But old people no longer practice farming and don't remember these songs very well. Machines are replacing people, young people aren’t practicing farming, so they are not learning these songs either. They would rather become sweepers in malls as field work is quite hard and does not pay enough to even buy oil and spices. People are moving from grains to areca farming, it requires less investment.
Onye na-agụ abụ ahụ na vidiyo ahụ gosiri anyị ubi a na-akụ ihe ọkụkụ ebe ha na-anọbu na-abụkọ abụ ọnụ. Ma ndị okenye anaghịzi arụ ọrụ ugbo, ha anaghịkwa echeta egwu ndị a nke ọma. Igwe na-anọchi anya ndị mmadụ, ebe ndị na-eto eto anaghịzi arụ ọrụ ugbo, ya mere ha anaghị amụkwa egwu ndị a. Ha ga-ahọrọ ịrụ ọrụ ịza ihe n’ụlọ ahịa ukwu karịa, n’ihi na ọrụ ugbo siri ike nke ukwuu, ọ naghịkwa akwụ ụgwọ ga-ezu iji zụta mmanụ nri na ngwa nri. Ndị mmadụ na-esi n'ịkọ mkpụrụ ọka na-aga n’ịkụ nkwụ areca, n’ihi na ịkụ ya na-achọ obere ego itinye ya n’ọrụ.
Idekọ ihe ndị a bụ ịgba ọsọ megide oge, n’ihi na n’asụsụ Angika, nne m na-echeta na abụ ọdịnala ọrụ ugbo, ndị juru ebe niile n’oge ọ bụ nwata, apụọla kpamkpam ugbu a.
Onyonyo chi na-adịchaghị egwu n’abụ ọdịnala Angika nke ndị e kewapụrụ n’akụkụ ọha mmadụ
N’ime ihe dị ka abụ ọdịnala Angika 80 m chịkọtara ma nyochaa, ọtụtụ n’ime ha bụ abụ okpukpe ụmụnwanyị Dalit na-abụ. N’abụ ndị ahụ, a na-egosikarị chi dịka ndị okenye ezinụlọ karịa dịka ndị nwere ike niile; mgbe ụfọdụkwa, a na-ahụ chi nwanyị dịka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ nke e ji ọla chọọ mma. Dịka ọmụmaatụ, n’otu n’ime abụ Shibguru, e zuru ihe Onyenweanyị Shiva mgbe ọ na-arahụ ụra n’ụlọ nsọ n’otu ehihie oge ọkọchị. Okwu mmalite abụ ahụ bụ:
“बिना नयन के सुतल छै सिबगुरु
मंदिर म घुस गेलै चोरवा”
‘Onyenweanyị Shiva na-ehi ụra n’ejighị anya nke atọ ya, ndị ohi jiri ohere ahụ tibata n’ụlọ nsọ.’
Nwunye ya, bụ chi nwanyị Parvati, na-eme mkpesa banyere nsogbu ọla ya e zuru kpatara ya, dịka nwanyị ọ bụla lụrụ di ma na-asụ asụsụ Angika ga-eme n'ebe di ya nọ.
Nkọwa a banyere chi dị iche n’otú e si akọwakarị ha dịka ndị dị ebube n’akwụkwọ nsọ. N’ebe a, Shiva na-arahụ ụra dịka mmadụ nkịtị, na-enweghị anya ya nke atọ nwere ike ibibi ihe, ndị ohi nwekwara ike izuru ya ihe. N’abụ ọzọ, a kọwara Shiva ka ọ na-akụ poppy n’akụkụ Osimiri Ganga. Nke a na-egosi na omenala ọnụ a, nke ndị Dalit—ndị usoro nkewa ọha dabere n’agbụrụ kewapụrụ n’akụkụ ọha mmadụ—na-emekarị, echepụtala ụdị chi ndị na-anọghị iche n’ebe mmadụ nọ, kama ndị ha na ha na-ebi ụdị ndụ yiri otu. Ndụ kwa ụbọchị nke di na nwunye chi ahụ bi n’ime ọhịa dịpụrụ adịpụ nke Kailash adịghị nnọọ iche na nke onye ọrụ ugbo bi n’ala okwute nke otu obodo dị na Banka, Bihar; a na-echekwa na chi ndị ahụ bi n’ụlọ nsọ e wuru maka ha n’ebe ahụ.

Ndekọ abụ Janapada. Foto sitere na Wikipedia, nke Santhosh Notagar99 sere. CC0.
Ime omenala ọnụ dịka nzaghachi nye mmegbu njirimara mmadụ
Torwali, asụsụ nọ n’ihe ize ndụ nke ịla n’iyi, nke a machibidoro igosipụta njirimara ya n’ihi ọdịdị agbụrụ na egwu ya, nwetara ume ọhụrụ site n’emume Simam nke afọ 2011. Mbọ a nke Idara Baraye Taleem-o-Taraqi (IBT) gbara bụ nyocha na nchekwa omenaala n’omume, nke e mere iji chebe njirimara ha pụọ n’aka ndị na-akwado okpukperechi siri ike nke na-amanye ndị mmadụ ime ihe n’ụzọ gabigara oke, bụ ndị gbochiri obere obodo a ime omenala ha. Onye guzobere IBT emeela ka ọtụtụ vidiyo ọhụrụ na nke ochie dị na Commons.
Akụkọ pụrụ iche banyere Osimiri Kosi nke na-agbanwe ụzọ ya mgbe niile
Kemgbe Sanjib Chaudhary dekọtara otu abụ ọdịnaala n’asụsụ obodo ya, Eastern Tharu (asụsụ a na-asụ na Nepal), gbasara otu nwoke ga-agafe nnukwu osimiri iji kwaga n’obodo ọzọ, nke a akpaliela mmasị na ọchịchọ ya ịmata banyere njikọ dị n’etiti abụ ahụ na akụkọ ihe mere eme nke osimiri Kosi. Ọ na-agbalị ịchọpụta njikọ dị n’etiti abụ ọdịnaala a, nke e si n’ọnụ na-ebufe site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ, na otu o nwere ike isi metụta mgbanwe n’ụzọ osimiri si agba. Ọ sịrị:
This Tharu folk song details seasonal migration from Saptari to Morang describes a man needing to cross a dangerous Sursari/Saptari river (सुरसरी धारे); the singer, his beloved, warns him to stay. This ancient song, shared across four districts, omits mention of the much larger Kosi River, now on the same route. This absence is surprising, so I am doing research aimed at understanding Kosi's diversion history to see if Sursari was once the dominant river.
Abụ ọdịnaala Tharu a na-akọwa njem oge ụfọdụ site na Saptari gaa Morang, ma na-akọ banyere otu nwoke kwesịrị ịgafe osimiri Sursari/Saptari bụ ebe ihe egwu dị (सुरसरी धारे); onye na-agụ abụ ahụ, bụ onye ọ hụrụ n’anya, na-adọ ya aka na ntị ka ọ nọrọ. Abụ ochie a, nke a na-ekerịta n’ofe mpaghara anọ, ekwughị banyere nnukwu osimiri Kosi, nke dị ugbu a n’otu ụzọ ahụ. Ọ bụ ihe ijuanya na a kpọghị Kosi aha, ya mere ana m eme nchọcha iji ghọta akụkọ ihe mere eme banyere mgbanwe ụzọ osimiri Kosi si agba, iji hụ ma Sursari bụbu osimiri kacha pụta ihe.
Vidiyo: “Abụ ọdịnala Morangesari nke Eastern Tharu,” nke Sanjib Chaudhary mere, n’okpuru ikikere CC BY-SA 4.0.
Ahụmahụ Sanjib bụ ihe atụ nke otu omenala ọnụ, dịka abụ ọdịnala, akụkọ ihe mere eme a na-akọ n’ọnụ, na ihe ndị ọzọ, pụrụ isi bụrụ ụdị ihe ọmụma dị ndụ nke na-ewulite njirimara mmadụ, mmetụta nke ịbụ onye obodo, na ọchịchọ ịmatakwu omenala mmadụ.
N’omume: Ikike obodo ndị a na-anọchiteghị anya nke ọma nwere ịchịkwa otu e si egosipụta omenala ha
Omenala ọnụ jikọrọ ya na ihe ndị mmadụ na-ahụ kwa ụbọchị, malite na nsogbu mmekọrịta ọha na akụ na ụba na ihe ndị mere n’akụkọ ihe mere eme ruo na mgbanwe n’ụzọ ndụ. A na-ebulite vidiyo ndị a na nyiwe ihe ọmụma mepere emepe dịka Wikimedia Commons na Wikisource, ma jikọtakwa ha na edemede Wikipedia. Dịka ọmụmaatụ, e tinyere akụkọ a gụrụ n’ọnụ banyere ndị dike ọdịnala Tulu, Koti na Chennayya, na edemede Wikipedia a. Nke a bụ ihe atụ nke otu e si etinye ihe ọmụma ndị a, nke a na-ebunyebu naanị site n’ọnụ, na nyiwe ihe ọmụma ndị a ma ama.
Idekọ akụkọ ndị a site n’aka ụmụ amaala ndị na-edebe ihe ndekọ bụ ndị na-asụ asụsụ ndị ahụ dịka asụsụ obodo ha na-eme ka a ghara ịhapụ ha n’ụdị ihe ọmụma ndị bụ isi dị n’ịntanetị, si otu ahụ na-akwado ikpe ziri ezi n’ihe ọmụma na ikpe ziri ezi n’obodo. Na mgbakwunye, nke a na-ebelata ohere nke nchịkọta data n’ụzọ na-ezighi ezi, n’ihi na ha na-esonye kpọmkwem n’ịhọrọ, idekọ, na ịkekọrịta ya. Iji ekwentị nwere igwe foto dekọọ ma chekwaa omenaala ọnụ ndị a emeela ka usoro idekọ ihe ọmụma dịrị ndị na-eme omenaala ndị a mfe ịnweta, ma mekwaa ka ndị na-asụ asụsụ ndị a nwee ike ịnweta ndịna ahụ.








