
Ndị na-eme ngagharị iwe nke EndSARS na Lagos, Naịjirịa. Foto site n'aka Kaizenify site na Wikimedia Commons. License: CC BY-SA 4.0
Edemede a nke Cali-Dibang Nshua dere bụ akụkụ nke usoro pụrụ iche nke Global Voices’ maka ọnwa Septemba 2026, nke akpọrọ “Ngagharị Iwe n'ime Ọchịchị onye kwuo uche ya.” Site na usoro a, anyi chọrọ inyocha ụdị ngagharị iwe di iche iche, usoro gọọmentị na-eji eme ka ha ghara inwe nkwado ma ọ bụ gbochie ha, yana mmekọrịta dị mgbagwoju anya dị n'etiti ngagharị iwe na ọchịchị onye kwuo uche ya. I nwere ike ịkwado ọrụ a site n'inye onyinye ebe a.
N'ọnwa Ọktoba afọ 2020, ọtụtụ puku ndị ntorobịa Naijiria pụtara n'okporo ámá na-achọ ka a kwụsị ime ihe ike nke ndị uwe ojii.
Ihe malitere dịka mkpọsa megide Ngalaba Pụrụ Iche Na-alụso Izu Ohi Ọgụ (SARS) gbanwere ngwa ngwa ghọọ ihe ka ukwuu. Ndị ntorobịa Naịjirịa achọghị naanị ka mmegbu ndị uwe ojii kwụsị; ha na-egosipụtakwa iwe ha kpakọbara kemgbe ọtụtụ afọ n’ihi enweghị ọrụ, enweghị nchekwa, ọchịchị na-adịghị mma, ihe isi ike akụ na ụba, na ịhapụ ha n’èzí usoro mkpebi ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Nye ọgbọ a na-akọwakarị dịka ndị na-anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, #EndSARS ghọrọ oge iteta n'ụra.
Mana afọ isii ka e mesịrị, ihe nketa ya dị mgbagwoju anya.
Ngagharị iwe ahụ mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa Naịjirịa ghọtakwuo ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma gbaa ha ume isonye karịa na ntuli aka, ọchịchị, na ọrụ nkwado mgbanwe. Mana nye ndị ọzọ, ahụmahụ ahụ kpatara egwu, enweghị ntụkwasị obi, na ndakpọ olileanya. Ụfọdụ malitere ịchọ ohere na ọdịnihu n’èzí Naịjirịa—ihe ha chere na ha agaghị enwe ike iwulite n’ala nna ha.
Otu ngagharị ahụ gwara ndị ntorobịa Naịjirịa, “Unu kwesịrị isonye,” nwekwara ike ime ka ndị ọzọ chee, “Aghaghị m ịpụ.”
Ka Naịjirịa na-eru nso ntuli aka izugbe ọzọ n’afọ 2027, ajụjụ abụghịzi naanị ihe mere n’oge #EndSARS. Kama, ọ bụ: Gịnị ka #EndSARS hapụrụ?
Oge otu ọgbọ chọpụtara olu ya
Tupu #EndSARS, a na-akọwakarị ndị ntorobịa Naịjirịa dịka ndị na-adịghị etinyecha aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị gọọmentị. A na-agba ha ume ịtụ vootu, mana ọtụtụ n’ime ha ka nọgidere na-anọpụ iche n’otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụlọ ọrụ ọchịchị. Ngagharị iwe ahụ gbanwere akụkọ a.
Site na ọwa ozi ọha na eze na ịchịkọta ndị mmadụ n’ebe a na-eme ngagharị, ndị ntorobịa Naịjirịa gosipụtara ikike ha nwere ịhazi onwe ha n’abụghị usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọdịnala. Ha chịkọtara ego, hazie enyemaka ahụike, kesaa ozi, ma wulite netwọkụ ndị gafere ókèala Naịjirịa.
Ngagharị ahụ gosikwara ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oghere dijitalụ. Ọwa ozi ọha nyere ndị ntorobịa ohere idekọ mmegbu ndị uwe ojii na ịkparịta ụka n’etiti onwe ha n’adabereghị kpamkpam n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọdịnala ma ọ bụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Nye ọtụtụ ndị sonyere, ahụmahụ ahụ gbanwere nghọta ha banyere ịbụ nwa amaala. Ha abụghịzi naanị ndị na-ekiri ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa n’akụkụ; ha ghọrọ ndị na-etinye aka na ya.
N’otu nnyocha e mere n’afọ 2025 nke metụtara mmadụ 400, ọkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị Solomon Temitope Omotayo nyochara mmekọrịta dị n’etiti ngagharị iwe EndSARS na nsonye ndị ntorobịa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nnyocha ya chọpụtara na e nwere mmekọrịta dị mma nke pụtara ìhè n’ọnụọgụ n’etiti isonye na ngagharị iwe ahụ na itinyekwu aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe e mesịrị. Ihe karịrị ọkara ndị zara ajụjụ kwuru na ha tinyekwuuru aka na ntuli aka na ọchịchị mgbe ngagharị iwe ahụ gasịrị.
Nchọpụta Omotayo na-egosi na nye ọtụtụ ndị ntorobịa Naịjirịa, #EndSARS karịrị ịbụ naanị ngagharị iwe megide arụrụala ndị uwe ojii. Ọ ghọrọ ụzọ ha si malite ịghọta ma tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Nnyocha ọhụrụ nke Toyin Segun Onayinka, Omolola Oluwasola, na Obasanjo Joseph Oyedele mere mere ka arụmụka a gbasaa karịa. Nnyocha ha nke afọ 2026 nyochara EndSARS na ngagharị “Obidient” nke mechara soro ya dịka ụdị ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị a na-eme site na usoro mgbasa ozi.
Ndị nyocha ahụ chọpụtara na e nwere mmekọrịta pụtara ìhè n’etiti ọrụ nkwado a na-eme na ọwa ozi ọha na ebumnuche ndị ntorobịa ịtụ vootu na ịzọ ọkwa ọchịchị.
N’agbanyeghị nke ahụ, nchọpụta ha nwere otu mgbagha dị mkpa: Mmụba n’ịchịkọta ndị mmadụ maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị agbanweghị ozugbo ghọọ inweta ike ọchịchị.
Ịchịkọta ọtụtụ mmadụ maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị anaghị ekwe nkwa mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị
Ọrụ nkwado mgbanwe nke nnyocha ahụ nyochara agbanweghị nsonaazụ ntuli aka onyeisi ala nke afọ 2023. Ọdịiche a dị mkpa.
Ngagharị nwere ike ịgbanwe otú otu ọgbọ si aghọta ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ gbanweghị ozugbo ndị ji ike ọchịchị ma ọ bụ otú ụlọ ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị si arụ ọrụ.
Ọzọkwa, ihe ike gbara ngagharị iwe ahụ gburugburu, ọkachasị ihe mere na Ịkwa Mgbọ Egbe Lekki nke afọ 2020, ghọrọ ncheta dị mkpa nye ọtụtụ ndị sonyere. Ọtụtụ ndị ntorobịa Naịjirịa kwenyere na ime ngagharị iwe bụ ụzọ iwu kwadoro isi chọọ mgbanwe n’ọchịchị onye kwuo uche ya. Mana ahụmahụ ha n’oge ngagharị iwe #EndSARS na mgbe ọ gasịrị mere ka ha ghọta na iji ikike ọchịchị onye kwuo uche ya ahụ eme ihe nwere ike ịkpatara ha nnukwu nsogbu n’onwe ha.
Nnyocha Khadijah Sanusi Gumbi na Yahaya T. Baba mere chọpụtara ihe akaebe nke enweghị ntụkwasị obi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihe gbasara ngagharị iwe #EndSARS, ọkachasị banyere ịza ajụjụ nke gọọmentị, nghọta n’ọrụ ọchịchị, na omume ndị uwe ojii. Olatunde Olayinka Ayinde, Oluwasemiloore Peace Atere, Ugonna Ibeawuchi, na ndị ha na ha rụkọrọ ọrụ chọpụtakwara na ndị sonyere na ngagharị iwe nwere oke nsogbu uche, ịda mbà n’obi, nchekasị, na nsogbu uche na-esochi ahụmahụ mwute (PTSD) karịa ndị na-esonyeghị.
Otu ahụmahụ ahụ kpaliri ụfọdụ ndị ntorobịa sonyere na ngagharị iwe itinyekwu aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma mee ka ndị ọzọ na-ajụ ma usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ọ̀ ga-agbanwe n’ezie.
Nye ụfọdụ, ọ ghọrọ ihe mere ha ji nọgide na-etinye aka site n’ịhazi ndị mmadụ, ịtụ vootu, ma ọ bụ ịtụle ịzọ ọkwa ọchịchị.
Ndị ọzọ dara mbà n’obi ma tụfuo olileanya. Mmechu ihu, ejighị ihe n’aka, na nkụda mmụọ mere ka ụfọdụ hapụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ebe ndị ọzọ malitere ịtụle ụzọ ọzọ: ịhapụ Naịjirịa kpamkpam.
Nsonaazụ ya bụ otu ọgbọ na-azaghachi otu oge ahụ gbanwere ndụ ha n’ụzọ dịgasị iche iche.
Site na ngagharị iwe gafee na “Japa”
Afọ ndị sochiri #EndSARS dabakwara n’oge “Japa” ghọrọ okwu a ma ama. Ọ bụ okwu Yoruba pụtara ịgbapụ ma ọ bụ ịgba ọsọ, nke a na-ejikarị akọwa ịhapụ Naịjirịa, ọkachasị n’etiti ndị ntorobịa na-achọ ohere ka mma ná mba ọzọ.
Ọ ga-abụ ime ka okwu ahụ dị mfe gabiga ókè ma ọ bụrụ na e kwuo na #EndSARS mere ka ndị ntorobịa Naịjirịa kwaga mba ọzọ.
Ọtụtụ ihe na-emetụta mkpebi ịkwaga mba ọzọ: enweghị ọrụ, ịrị elu ọnụ ahịa ihe, enweghị nchekwa, agụmakwụkwọ, akụrụngwa na-adịghị mma, ohere dị ụkọ, na ọchịchọ ibi ndụ ka mma.
Mana ahụmahụ #EndSARS nwere ike ịbụ akụkụ nke nnukwu akụkọ banyere otú ụfọdụ ndị ntorobịa Naịjirịa si malite ile ọdịnihu ha anya.
Na nnyocha ya banyere ihe a na-akpọ Japa, ọkà mmụta gbasara mmadụ Jing Jing Liu gbara ndị ntorobịa Naịjirịa ajụjụ ọnụ banyere ahụmahụ ha n’ịkwaga mba ọzọ. Nchọpụta ya na-egosi na ọ bụghị mgbe niile ka a na-ele ịhapụ Naịjirịa anya dịka naanị mkpebi gbasara akụ na ụba. Nye ụfọdụ, a na-akọwa ịkwaga mba ọzọ dịka ụzọ mgbapụ na ịzọpụta ndụ.
Na nnyocha ya nke afọ 2024, Ndị Ntorobịa Nọ N’ogo Akụ na Ụba Etiti Na-agbapụ na Naịjirịa: Ichegharị Nkwagharị Maka Ịlanarị n’Afrịka Site n’Ihe A Na-akpọ Japa, Liu gbara ndị ntorobịa Naịjirịa 21, ndị nọ n’agbata afọ 20 na 35, ajụjụ ọnụ ma nyochaa ihe mere mkpebi ha ịpụ ji dị ha ngwa ngwa.
Nnyocha ya na-egosi na ọdịda akụ na ụba, ejighị ihe n’aka na-adịte aka, na nkụda mmụọ banyere ụzọ Naịjirịa si aga nwere ike ime ka mmadụ chee na ịpụ bụ ihe dị mkpa, ọ bụghị naanị nhọrọ.
N’edemede ọzọ, “Japa, ma ọ bụ ịgbapụ ma ọ bụ ịgba ọsọ: Ndị ntorobịa Naịjirịa na mkpa ọ dị ịpụ ngwa ngwa,” Liu nyochara ihe okwu ahụ n’onwe ya pụtara. Ojiji a na-eji “Japa” na-egosi ihe karịrị naanị isi n’otu mba kwaga mba ọzọ. Ọ pụrụ igosipụta mkpa ọ dị ịgbapụ ngwa ngwa n’ọnọdụ ndị ntorobịa chere na ha enweghịzi ike ịnagide.
Ndị nyocha ndị ọzọ—Faith Adeyanju, Bukola Alao, Oyedamade Opakunbi, na Toluwalase Ajibade—nyochakwara “Japa” dịka ụzọ isi lanarị. Nnyocha ha kọwara enweghị ọrụ, enweghị nchekwa, olileanya ndị na-emezughị, na mmepe akụ na ụba na-esighị ike dịka ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpali ndị ntorobịa Naịjirịa ịkwaga mba ọzọ.
Nnyocha ndị a na-egosi ihe mere ndị ntorobịa Naịjirịa ji akwaga mba ọzọ. Ha egosighị na #EndSARS kpatara mkpagharị ha ozugbo.
E kwesịrị inyochakwu mmekọrịta ahụ site n’akụkọ nke ndị ahụ n’onwe ha.
Ikekwe ihe kacha adọrọ mmasị #EndSARS hapụrụ bụ na ndị ntorobịa Naịjirịa azaghachighị ahụmahụ ahụ n’otu ụzọ.
Otu onye ntorobịa nwere ike isi na ngagharị iwe ahụ pụta na-eche, sị: “Ekwesịrị m itinyekwu aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.”
Onye ọzọ nwekwara ike kpebie, sị: “Agaghị m enwe ike iwulite ọdịnihu m n’ebe a.”
Ụfọdụ mekwara ha abụọ: ha hapụrụ Naịjirịa ma nọgide na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya site ná mba ọzọ. Nke a na-eme ka echiche na ịkwaga mba ọzọ pụtara ịkwụsị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụrụ ihe mgbagwoju anya. Nwa Naịjirịa nwere ike ịhapụ mba ahụ n’ahapụghị mkparịta ụka gbasara ya.
Afọ isii ka e mesịrị, #EndSARS ka bụ ihe karịrị ngagharị iwe a na-echeta naanị maka ihe mere n’afọ 2020. Ọ gbanwere otú ọtụtụ ndị ntorobịa Naịjirịa si aghọta ịbụ nwa amaala, imekọ ihe ọnụ, na mmekọrịta ha na ndị ji ikike ọchịchị. Ọ bụ ezie na ọ dozighị nsogbu ndị mere ka ndị mmadụ pụta n’okporo ámá, ọ hapụrụ ọgbọ dị njikere karịa ịjụ ajụjụ, ịhazi onwe ha, na ịchọ ka ndị ọchịchị zaa ajụjụ.






