Ecuador jidere onye bụbu minista José Serrano ka e si na U.S. chụghachita ya

Foto e sere site na vidiyo YouTube nke na-egosi José Serrano ka ọ na-abanye n'ụlọ mkpọrọ El Encuentro mgbe a chụpụrụ ya na United States,” site na TVC Noticias; ojiji ziri ezi.

Foto ihuenyo e si na vidio YouTube “José Serrano banyere n’ụlọ mkpọrọ El Encuentro mgbe e si United States chụghachite ya,” nke TVC Noticias mere; e jiri ya mee ihe n’ụzọ iwu kwadoro.

Mgbe usoro mbata na ọpụpụ nke United States jụrụ inye onye bụbu Minista na-ahụ maka ihe gbasara ime obodo José Serrano Salgado ebe mgbaba ndọrọ ndọrọ ọchịchị, e mere ndokwa ịchụpụ ya gaa Ecuador n'okpuru usoro nchekwa kacha sie ike.

Serrano na-eche ọtụtụ nyocha ihu site n'aka Ụlọ Ọrụ Ọkaiwu nke Ecuador, gbasara oge ọ nọ n'ọrụ gọọmentị n'okpuru onye bụbu Onyeisiala, Rafael Correa , yana ebubo na ọ bụ ya haziri ma duzie ogbugbu e gburu onye nta akụkọ na onye bụbu onye na-azọ ọkwa onye isi ala, Fernando Villavicencio . N'okwu nke ikpeazụ, dịka ụlọ ọrụ onye ọkaiwu si kwuo, Ndị ọkaikpe nyere iwu ka e jide ya tupu ikpe amalite, nakwa ka e bufee ya n'ụlọ mkpọrọ EL Encuentro (nke a na-akpọ n'ihu ọha, Santa Elena No. 1 Detention Center), nke dị na mpaghara dị n'ụsọ oké osimiri nke Santa Elena.

Na Ọgọst 7, 2025, ụlọ ọrụ Immigration and Customs Enforcement (ICE) nke mba US jidere Serrano n'ihi mmebi iwu mbata na ọpụpụ nke sitere n'ịnọrọ na mba ahụ karịa oge e kwere ya. E bu ụzọ jide ya na Miami, wee gaa n'ebe a na-ejide ndị mbịarambịa na Mississippi ruo ụbọchị iri abụọ na asatọ n'ọnwa Ọgọstụ, afọ 2026.

Serrano banyere na United States na Mee 2021 mgbe ọ rụchara ọrụ ya dịka onye omeiwu. N’otu afọ ahụ, ọ rịọrọ mgbaba ndọrọ ndọrọ ọchịchị na United States. Na Mee 13, 2026, Ọkaikpe Romy Lerner jụrụ arịrịọ mgbaba ya, ma nye ya nchebe n’okpuru Nkwekọrịta Megide Ịta Mmadụ Ahụhụ (CAT), nke mere ka nlọghachi ya Ecuador gbuo oge.

Dị ka The New York Times si kwuo, naanị nkeji iri na ise ka ụgbọelu a kpọrọ ibu Serrano gaa Ecuador biliri, Onyeisi Ala Daniel Noboa kwupụtara na akaụntụ X ya na Serrano na-achọ ịbata n’ala Ecuador. Foto gosiri ndị ọrụ ICE ka ha na-eduga ya, ebe e ji agbụ kee ya n’aka na n’ụkwụ. Mgbe ọ bịarutere Ecuador, a hụrụ ya ka o yi uwe na-egbochi mgbọ na okpu agha.

Onye bụ José Serrano?

Serrano rụrụ ọrụ n’ọkwa ọchịchị dị iche iche na Ecuador n’oge ọchịchị Correa na mgbe ọ gachara. Ọ bụ Minista na-ahụ Maka Ihe Ndị Dị n’Ime Obodo site na 2011 ruo 2016; tupu nke ahụ, ọ bụ Odeakwụkwọ na-ahụ Maka Nghọta Ọha n’afọ 2009, ma n’afọ 2010, ọ ghọrọ onyeisi Ministri Ikpe Ziri Ezi, Ikike Mmadụ na Okpukpe.

N’oge ọ bụ Minista na-ahụ Maka Ihe Ndị Dị n’Ime Obodo, ihe ndị pụtara ìhè ọ rụpụtara gụnyere ịhazigharị usoro ndị uwe ojii n’ụzọ zuru ezu, iguzobe ụlọ nyocha sayensị maka ndị uwe ojii, imezi ụgbọala nchegharị, nakwa ịkwalite Ngalaba Ndị Uwe Ojii Obodo na Ngalaba Nlekọta gburugburu mba ahụ.

Ọrụ ya n’ịlụso azụmahịa ọgwụ ọjọọ ọgụ dị nnọọ mkpa, ma na Juun 6, 2016, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịlụso Ọgwụ Ọjọọ Ọgụ (DEA) na Ngalaba Ikpe Ziri Ezi nke United States na Washington nyere ya ihe nrite iji kwanyere mbọ ya ùgwù. Otú ọ dị, oge ọ nọ n’ọkwa ahụ jupụtara n’esemokwu gbasara ịzụta ihe na ọrụ maka ọha, gụnyere nkwekọrịta mgberede, ịzụta ịnyịnya na nkịta, imezigharị ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, uwe ndị uwe ojii, na ọrụ nhicha.

Na ntuli aka izugbe Ecuador nke Febụwarị 2017, ọ bụ ya nwetara vootu kacha elu n’etiti ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị omeiwu. N’ihi nke a, ọ ghọrọ Onyeisi Ụlọ Omebe Iwu Mba ruo Maachị 9, 2018, mgbe e wepụrụ ya n’ọkwa n’ihi na e wepụtara n’ihu ọha ndekọ ụda mkparịta ụka dị n’etiti ya na onye bụbu Onye Nnyocha Akaụntụ Gọọmentị, Carlos Pólit, onye na-agbanahụ ikpe n’okwu Odebrecht. Nke a kpughere otú e si eji ndọrọ ndọrọ ọchịchị emetụta usoro ikpe ziri ezi nke Ecuador.

Mgbe ọ rụchara ọrụ ya dịka onye omeiwu (2017–2021), ọ hapụrụ ọrụ ọha ma biri na United States. N’ebe ahụ, ọ rịọrọ ụlọikpe mbata na ọpụpụ ka e nye ya mgbaba ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-ekwu na a na-akpagbu ya n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa na ndụ ya nọ n’ihe egwu.

Nnyocha gbasara mpụ na Ecuador

Nlọghachi Serrano n’ala nna ya meghere isiakwụkwọ ọhụrụ n’ọrụ ya nke ọtụtụ nnyocha mpụ jikọrọ ya na ya. Ụlọ Ọrụ Ọkaiwu Gọọmentị na-enyocha ikpe dị iche iche: ebubo na o sonyere n’ogbugbu Villavicencio; mkpesa gbasara iji ọkwa ya emetụta mkpebi na iri ngarị, ndị jikọtara na ozi e kpughere n’oge ikpe Pólit na United States; ebubo ịnwa igbu mmadụ nke ọkaiwu Luggi García gbara; ebubo ọzọ gbasara nsonye ya a na-enyo enyo n’ịtọrọ Fernando Balda na Colombia; nakwa mkpesa nke afọ 2019 boro ya ebubo na ọ na-achọ ka ndị ọrụ Ministri na-ahụ Maka Ihe Ndị Dị n’Ime Obodo nye ya akụkụ n’ụgwọ ọnwa ha.

Ikpe nke nwere mmetụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị kacha ukwuu bụ ebubo gbasara ogbugbu Villavicencio. Ụlọ Ọrụ Ọkaiwu Gọọmentị na-ekwu na Serrano nwere ike ịbụ onye jikọtara ndị metụtara okwu ahụ ma sonyekwa n’iledo Villavicencio. Ndị ọkaiwu na-agbachitere ya jụrụ echiche ahụ, na-ekwu na ihe akaebe ezughị iji jikọta ya na ogbugbu ahụ, nakwa na ebubo ahụ dabere karịsịa n’ihe otu onye akaebe e nyere nchebe kwuru.

Mgbe a tụrụ Serrano mkpọrọ n’El Encuentro n’Ọgọst 28 nke afọ a, o kwuru site n’akaụntụ X ya na “a naghị emeso ya n’ụzọ kwekọrọ n’ugwu mmadụ” n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ. Nwa ya nwanyị, Véronica, kwughachiri ebubo a ma kwuo na gọọmentị Ecuador ga-aza ajụjụ ma ihe ọ bụla emee ndụ nna ya.

Echiche gọọmentị

Nlọghachi Serrano ghọrọ ngwa ngwa okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ebe ọchịchị Noboa kọwara ịchụghachite ya na ịtụ ya mkpọrọ dịka akụkụ nke mmejuputa mkpebi ụlọikpe. Mgbe Noboa na-ekwupụta ọbịbịa Serrano, ọ dọkwara onye bụbu Onyeisi Ala Correa aka ná ntị, na-agwa ya n’ụzọ doro anya na oge ya na-abịa n’oge na-adịghị anya.

Ka ọ dị ugbu a, Minista na-ahụ Maka Ihe Ndị Dị n’Ime Obodo, John Reimberg, kwuru na “ọ dịghị onye karịrị iwu.” Minista Nathaly Morillo kọwara nchụghachi Serrano dịka mmeri nye gọọmentị ma kwuo banyere nlọghachi ya, na-akpọ ya “otu n’ime ndị kacha njọ n’oge ‘afọ iri nke izu ohi,’” ma gbakwụnye, “Nke nta nke nta, eziokwu na-aga n’ihu na-apụta ìhè.”

Ewezuga esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ, ikpe a na-ewelite ajụjụ dị mkpa: ruo ókè hà aṅaa ka gọọmentị pụrụ iru n’ịchụso mpụ ndị dị njọ n’emebighị ikike iwu kwadoro ọ ga-asọpụrụ, ọbụna nke ndị e boro ebubo kacha njọ? Mkpọrọ Serrano na-eme ka ikpe ya bụrụ ọ bụghị naanị ule nke ọgụ megide enweghị ntaramahụhụ, kama ọ bụkwa ule nke irube isi n’usoro ikpe ziri ezi na ọchịchị iwu na Ecuador.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.