
Sanjib Chaudhary ka ọ na-asụ asụsụ ya, Eastern (Saptariya) Tharu. Subhashish Panigrahi sere foto a, e jiri ya mee ihe n’okpuru ikikere CC BY-SA 4.0.
Edemede a bụ akụkụ nke usoro Global Voices nke Mee 2026, “Nsogbu zuru ụwa ọnụ, ụzọ ngwọta nke obodo.” Usoro a ga-eweta akụkọ banyere iguzogide nsogbu na ihe ndị e mere nke ọma n’ihe gbasara ime ihe megide mgbanwe ihu igwe, nghọta banyere otu obodo ndị dị na Global South si alụso nsogbu a ọgụ, nyocha banyere ihe nke a nwere ike ịpụta maka ọgbọ ndị ga-abịa, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. I nwere ike ịkwado ọrụ mgbasa ozi a site n’inye onyinye ebe a.
Ọtụtụ n’ime ihe ndị obodo Tharu maara banyere ọgwụ na omenaala ha n’ala dị larịị dị n’ọdịda anyanwụ na ndịda Nepal nakwa n’ebe ugwu India, ka e si n’ọnụ na-ebufe site n’aka onye na-agwọ ọrịa fere n’aka onye na-agwọ ọrịa ọzọ, site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ. Ma n’agbanyeghị nke a, a naghị ahụkarị ihe ọmụma a ka dị ndụ n’ebe a na-edobe ma na-echekwa ihe ndekọ n’ụzọ na-enye olu ndị obodo ahụ na nkwenye ha ọnọdụ dị mkpa.
OpenSpeaks Archives, nke a malitere n’afọ 2024 nke Wikimedia Foundation na-elekọta, bụ ebe nchekwa asụsụ n'usoro dijitalụ nke na-akwado ndị na-edobe ihe ochie n'obodo n'idekọ, ndepụta, na ibipụta asụsụ ndị obodo na-enweghi ọtụtụ ihe e ji akwado ha sitere na India, Nepal, na Sri Lanka. Dị ka akụkụ nke ọrụ a, Sanjib Chaudhary na-edekọ usoro ọgwụgwọ ọdịnaala na ihe ọmụma ọdịnaala nke obodo ya site n’iji usoro ndekọ vidiyo na ọdịyo. Ọ bụ onye nyerela Global Voices aka kemgbe ọtụtụ afọ, onye ode akwụkwọ, na onye na-akwado asụsụ ndị Tharu bi n'akụkụ ọwụwa anyanwụ (Saptariya).
Ọ bụ Subhashish Panigrahi gbara ajụjụ ọnụ a n'aha Rising Voices na OpenSpeaks Archives site na oku ịntanetị.
Rising Voices (RV): Ị na-edekọ ma na-echekwa ihe ọmụma ọdịnaala nke obodo gị. I nwere ike inye nkenke nkọwa banyere ọrụ a na ihe ị tụrụ anya na ọ ga-arụpụta?
Sanjib Chaudhary (SC): As part of this project, I am interviewing Tharu traditional healers and documenting their practices in Eastern (Saptariya) Tharu.I have started with two healers from Saptari District in Madhesh Province, eastern Nepal, and I plan to reach more healers in Dang District in western Nepal and in Chitwan District in central Nepal.
I want people to see how Tharu healing systems work across this east — west geography — how the plants, remedies, and rituals change from place to place, and what they have in common. These healers prepare many important decoctions and concoctions from local medicinal plants. I hope the documentation will be useful not only to my community but also to those working in Ayurveda and other traditional systems of medicine.
Sanji Chaudhary (SC): Dị ka akụkụ nke ọrụ a, ana m agba ndị na-agwọ ọrịa ọdịnaala na Tharu ajụjụ ọnụ ma na-edekọ usoro ọrụ ha n’asụsụ Eastern (Saptariya) Tharu. Amalitere m n'ebe ndị na-agwọ ọrịa abụọ si na mpaghara Saptari dị na Madhesh Province, n’ebe ọwụwa anyanwụ Nepal, ana m eme atụmatụ iru ndị na-agwọ ọrịa ndị ọzọ nọ na mpaghara Dang dị n’ebe ọdịda anyanwụ Nepal na mpaghara Chitwan dị n’etiti Nepal.
Achọrọ m ka ndị mmadụ hụ otu usoro ọgwụgwọ Tharu si arụ ọrụ n’ofe mpaghara ndị dị n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ—otu osisi ọgwụ, ọgwụgwọ, na emume si agbanwe site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ, nakwa ihe ndị ha nwekọrọ. Ndị na-agwọ ọrịa a na-eji ọtụtụ osisi ọgwụ ndị dị n’ogbe ha akwadebe ọgwụ mmiri na ngwakọta ọgwụ dị mkpa.
RV: Gịnị mere i ji họrọ idekọ ihe n'ụdị na-ejikọta ụda na onyonyo kama idekọ ya naanị n'ụdị ederede?
SC: Earlier, through another grant, I had written about Tharu traditional healers in text form, but I increasingly felt that it was not enough. When we write, we lose so much: tone, rhythm, body language, and the emotion in the healer’s voice.
Many people also do not have the time or habit to read long articles; they skim. With audio and video, they can hear the healer’s voice directly instead of reading my description of them. That creates trust and credibility — people see that these are real community members speaking about their own practices, not someone speaking on their behalf.
SC: Na mbụ, site n’enyemaka ego ọzọ m nwetara, edeela m banyere ndị na-agwọ ọrịa ọdịnaala na Tharu n’ụdị ederede, mana ka oge na-aga, ọ bịara na-adị m ka nke ahụ ezughi. Mgbe anyị na-ede ihe, ọtụtụ ihe na-efunahụ anyị: ụda olu, usoro mkpọpụta okwu, asụsụ ahụ mmadụ, na mmetụta dị n’olu onye na-agwọ ọrịa.
Ọtụtụ ndị mmadụ anaghị enwekwa oge ma ọ bụ omume ịgụ ogologo edemede; ha na-agụ ya ọsọ ọsọ. Site n’ọdịyo na vidiyo, ha nwere ike ịnụ olu onye na-agwọ ọrịa ahụ kpọmkwem kama ịgụ nkọwa m banyere ya. Nke a na-eweta ntụkwasị obi—ndị mmadụ na-ahụ na ọ bụ ndị obodo ahụ n’ezie na-ekwu banyere emume ha n’onwe ha, ọ bụghị onye ọzọ na-ekwu n’aha ha.
RV: Taa, ọtụtụ ndị mmadụ na-ebuputa akụkọ ọdịnaala na ajụjụ ọnụ ha na YouTube. Kedu ka ọrụ gị si dị iche n’itinye vidiyo naanị na YouTube?
SC: YouTube is important because many people use it, but in its current form it adds more credibility. We follow specific documentation protocols; the documentation is directly from the field and is not for commercial use but for researchers, educators, and community members. This infrastructure gives the content a different kind of credibility and longevity.
SC: YouTube dị mkpa n’ihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ya, mana n’ụdị ya ugbu a, ọ na-enyekwu ndịna ahụ ntụkwasị obi. Anyị na-agbaso usoro a kapịrị ọnụ maka idekọ na ichekwa ihe ndekọ; a na-eme ndekọ ndị a kpọmkwem n’ebe a na-eme ihe, ọ bụghị maka ebumnuche azụmahịa, kama maka ndị nchọpụta, ndị nkuzi, na ndị otu obodo. Usoro nhazi a na-enye ndịna ahụ ụdị ntụkwasị obi pụrụ iche ma na-enyekwa aka ime ka ọ dịgide ruo ogologo oge.
RV: Kedu ka ngwa ọrụ na usoro anyị mepụtara maka itinye ndepụta okwu n’okpuru vidiyo, usoro ọrụ idekọ na ịchekwa ihe anatara, na ntuziaka gbasara idekọ asụsụ nwere ike isi baara gị na ndị ọzọ na-edekọ ma na-echekwa ihe ọmụma Tharu n’obodo ha uru? Kedu ka i si akwado iji ha?
SC: They are very useful for community-based documenters. I am not only creating new recordings. I am also integrating them into various Wikipedia articles, enriching them with authentic audio-visual evidence from the community. This improves both the depth and credibility of those articles. I also contribute those materials to Wikisource and Wikidata. Subtitling in Eastern Tharu, Nepali, and English makes the content accessible to my own community as well as to people who do not speak Tharu but are interested in the knowledge. I call this the “media multiplier” effect—a single recording on one platform multiplies its impact across several platforms.
SC: Ha bara nnukwu uru nye ndị na-edekọ ma na-echekwa ihe ọmụma n’obodo ha. Ọ bụghị naanị na m na-emepụta ndekọ ọhụrụ; ana m etinyekwa ha n’edemede dị iche iche dị na Wikipedia, si otu ahụ mee ka edemede ndị ahụ baa ụba site n’iji ezigbo ihe akaebe ọdịyo na vidiyo sitere n’obodo ahụ. Nke a na-eme ka edemede ndị ahụ baa ụba ma mee ka ha nwekwuo ntụkwasị obi. Ana m etinyekwa ihe ndị a na Wikisource na Wikidata. Inye ndepụta okwu n’asụsụ Eastern Tharu, Nepali, na Bekee na-eme ka ndịna ahụ dịrị ndị obodo m mfe ịghọta, tinyekwara ndị na-adịghị asụ Tharu mana ha nwere mmasị n’ihe ọmụma ndị a. Ana m akpọ nke a mmetụta “media multiplier” — otu ndekọ e tinyere n’otu ikpo okwu na-eme ka mmetụta ya gbasaa ma mụbaa n’ọtụtụ ikpo okwu ndị ọzọ.
RV: Ọrụ Wikimedia na-ezerekarị “nchọcha mbụ.” Ma idekọ ihe ọmụma a na-akọ n’ọnụ dị ka nke gị na-enwekarị ihe ọmụma bụ isi nke a na-edeghị ebe ọ bụla ọzọ. Kedu ka i si ele uru dị n’ihe ndekọ ndị a anya n’ihe gbasara ịtụ aka n’ihe ndekọ ndị a n’akwụkwọ agụmakwụkwọ na imekọ ihe ọnụ na GLAM??
SC: Often, when audio or video is uploaded to Wikimedia Commons, it only says this is the language spoken in this clip. But the actual knowledge spoken in the clip matters. I hope we archive the material properly and credit the documenters, so that future writers and researchers can use and cite such knowledge. If community members know their work will be cited and recognized, they are more likely to spend time documenting, transcribing, and annotating. It also means that the community’s own interpretations and explanations enter the record, not just the interpretations of external researchers.
SC: Ọtụtụ mgbe, mgbe a na-etinye ndekọ ọdịyo ma ọ bụ vidio na Wikimedia Commons, naanị ihe a na-ekwu bụ na nke a bụ asụsụ a na-asụ n’ime ndekọ ahụ. Ma ihe ọmụma a na-ekwu n’ezie n’ime ndekọ ahụ dịkwa mkpa. Enwere m olileanya na anyị ga-echekwa ihe ndekọ ndị a nke ọma ma kwuputa aha ndị mere ya bụ ndekọ, ka ndị ode akwụkwọ na ndị nchọpụta n’ọdịnihu nwee ike iji ihe ọmụma dị otu a ma kwuputa ebe ha si nweta ya. Ọ bụrụ na ndị obodo mara na a ga-ekwupụta aha ha ma kwanyere ọrụ ha ugwu mgbe a na-eji ya eme ihe, ọ yikarịrị ka ha ga-ewepụta oge idekọ, idegharị n’akwụkwọ, na ịkọwa ihe ndekọ ndị ahụ. Nke a pụtakwara na nkọwa na nghọta nke ndị obodo n’onwe ha ga-abata n’ime ihe ndekọ ahụ, ọ bụghị naanị nkọwa nke ndị nchọpụta si n’ezi.
RV: Ị kpọtụrụ nchegbu banyere otu e si eji ihe ọmụma obodo eme ihe. Kedu ụdị nchekwa ma ọ bụ nkwanye ugwu dị mkpa iji dekọọ ma kesaa ihe ọmụma nke obodo Tharu??
SC: When we publish deep community knowledge—especially about medicinal practices, rituals, or other sensitive areas—we have to think carefully about where and how it is stored. The knowledge belongs to the community as a whole.
Ideally, the documentation should clearly state that this is Tharu community knowledge, recorded with consent, and that the community retains rights over reuses. If someone in the future uses our recordings, they should acknowledge that the material comes from the Tharu community and from specific healers, and follow the permissions the community has given.
SC: Mgbe anyị na-ebipụta ihe ọmụma miri emi nke obodo—karịsịa banyere usoro ọgwụgwọ, emume, ma ọ bụ akụkụ ndị ọzọ nwere mmetụta pụrụ iche—anyị ga-akpachara anya chebaa echiche ime maka otu a ga-esi echekwa ya . Ihe ọmụma ahụ bụ nke obodo niile.
N’ezie, ihe ndekọ ahụ kwesịrị ịkọwa nke ọma na nke a bụ ihe ọmụma nke obodo Tharu, na e dekọrọ ya site n’inweta nkwenye ha, nakwa na obodo ahụ ka nwere ikike n’otu a ga-esi jiri ya ọzọ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ọdịnihu jiri ihe ndekọ anyị mee ihe, o kwesiri ịnakwere n’ụzọ doro anya na ihe ndị ahụ sitere n’obodo Tharu na n’aka ndị na-agwọ ọrịa ndị a kpọmkwem, ma gbasoo ikike na nkwenye obodo ahụ nyere.
RV: Ka anyị na-ele anya n’ọdịnihu, kedụ uru i chere na idekọ ihe ọmụma a ga-ewetara obodo Tharu n’ogologo oge?
SC: Many of our resource persons — our healers, singers, and storytellers — are growing older. Younger people in the community are often not fully aware of how rich our Indigenous culture and knowledge are. When these elders pass away without their knowledge being documented, we lose songs, healing practices, and ways of seeing the world forever. If we document these practices now, the recordings will hold knowledge for future generations. Maybe my son, or my grandchild, or any young Tharu who becomes curious about our traditions can go back to these archives and learn directly from the elders’ voices. This is not just a repository. It is a living body of knowledge kept for future generations.
SC: Ọtụtụ n’ime ndị anyị na-enweta ihe ọmụma n’aka ha—ndị na-agwọ ọrịa, ndị na-agụ egwu, na ndị na-akọ akụkọ—akawala nka. Ọtụtụ mgbe, ndị na-eto eto nọ n’obodo ahụ anaghị ama nke ọma etu omenaala na ihe ọmụma ụmụ amaala anyị si baa ụba. Mgbe ndị okenye a nwụrụ n’enweghị ebe edekọrọ ihe ọmụma ha, anyị na-atụfu egwu, usoro ọgwụgwọ, na ụzọ ha si ele ụwa anya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị edekọọ usoro ndị a ugbu a, ihe ndekọ ndị ahụ ga-echekwa ihe ọmụma a maka ọgbọ ndị ga-abịa. Eleghị anya nwa m nwoke, ma ọ bụ nwa nwa m, ma ọ bụ onye Tharu ọ bụla na-eto eto nke nwere mmasị ịmata banyere omenaala anyị, nwere ike ịlaghachi n’ihe ndekọ ndị a ma mụta ihe ozugbo site n’olu ndị okenye. Nke a abụghị naanị ebe a na-echekwa ihe ndekọ. Ọ bụ nnukwu ebe nchekwa ihe ọmụma dị ndụ a na-echekwa maka ọgbọ ndị ga-abịa.







