Mgbasa ozi n'ụbọchị nke ano n'ọnwa Ọgọstụ: Okwu gbasara ikike ndị obodo – Kedu ndị a na-akọ akụkọ ha n'usoro mgbasa ozi dị iche iche?

 

Insights flyer

A na-akọkarị akụkọ gbasara ikike ndị obodo ụmụ amaala, mana a naghị akọkarị akụkọ ndị a site n’ọnụ ndị obodo ụmụ amaala n’onwe ha, ndị na-agbasi mbọ ike iji nweta ma ọ bụ chekwaa ikike ha, ma ọ̀ bụ gbasara ala ha, ohere ha nwere iji nweta akụ na ụba na ihe ndị dị mkpa, asụsụ na omenala ha, maọbụ ikike ha nwere ikwu okwu n’enweghị mgbochi na inweta ozi.

Soro anyị na mmemme mkparịtaụka ịntanetị nke Global Voices Insights ka anyị nyochaa otú e si ahazi ma gosipụta akụkọ gbasara ikike ụmụamaala n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị a ma ama na n’usoro mgbasa ozi dijitalụ n’akụkụ dị icheiche nke ụwa, nakwa ihe mere o ji dị mkpa ka ha nwee ikike ịkọ akụkọ nke ha ma kọwaa okwu ndị metụtara ha n’ụzọ nke ha. Mmemme a ga-abụ akụkụ nke mmemme pụrụ iche nke ọnwa Ọgọst nke Global Voices gbasara ikike  ụmụ amaala, nke na-enyocha ụzọ dị iche iche ụmụ amaala n’ụwa niile si achọ ịkwado ma kwupụta ikike ha, gụnyere ịga n’ụlọikpe iji maa iwu aka, ịhazi obodo na ime mgbasa ozi maka ihe ha kwenyere na ya, nakwa ụzọ ndị ọzọ ha si eji echiche ọhụrụ emegide mmegbu.

Anyị ga-anụ echiche ndị ọkachamara bụ ndị si n’obodo ụmụamaala dị icheiche, ndị nwere nghọta banyere ọnọdụ obodo ha na mkparịtaụka ndị a. Ha ga-akọwa otú e si ekwu ma gosipụta okwu gbasara ikike ndị obodo ụmụamaala n’usoro mgbasa ozi nke obodo, nke mba, na nke ụwa, nakwa ọrụ ha n’ịkwalite ohere ka ndị obodo ụmụamaala nwee ike ịnọchite anya onwe ha nke ọma site n’ịkọ akụkọ, ime akwụkwọ akụkọ, ịkwado ihe ha kwenyere na ya, na ịkụziri ndị mmadụ otú e si aghọta ma jiri mgbasa ozi mee ihe nke ọma.

Soro anyị na YouTube n’ụbọchị nke anọ n’ọnwa Ọgọstụ, n’elekere otu nke ehihie dịka oge ụwa si dị (elekere anọ nke ehihie na Kenya / elekere anọ nke ehihie na Latvia / elekere isii na nkeji iri anọ na ise nke mgbede na Nepal) maka mkparịta ụka a, nke ndị a ga-esonye na ya:

Lucas Kasosi bụ onye nta akụkọ Maasai nke ụmụ amaala obodo na onye ọkachamara n’ihe gbasara nkwukọrịta ozi si Kenya. Ọrụ ya gbadoro ụkwụ n’ikike ụmụamaala obodo, nnọchite onwe ha, ihe ọmụma ọdịnala, ikpe ziri ezi gbasara gburugburu ebe obibi, na ịkọ akụkọ nke obodo n’onwe ya na-achịkwa. Site n’ọrụ nta akụkọ na mgbasa ozi ụmụ amaala obodo, Lucas na-arụ ọrụ iji mee ka olu ndị obodo dịkwuo elu ma maa akụkọ na nkọwa banyere ụmụ amaala obodo aka, ọkachasị ndị a na-emepụta n’enweghị itinye aka ha. Ndị Cultural Survival na nyiwe ndị ọzọ e bipụtala ọrụ ya  , ebe ọ na-ede banyere ikike ụmụamaala obodo, ikpe ziri ezi gbasara mgbanwe ihu igwe, nchekwa gburugburu ebe obibi, na njirimara ọdịbendị.

Barsha Lekhi na-arụ ọrụ n’etiti mgbanwe ihu igwe, nchekwa ụdị ndụ dị iche iche dị n’ụwa, na ụmụ amaala obodo. O nwere ihe karịrị afọ asaa nke ahụmịhe n’ọrụ ya na UNESCO, UNDP, na òtù ụmụ amaala obodo dị na Nepal na n’ofe Eshia. Ugbu a, ọ bụ onye ọrụ ọrụ na ọkachamara n’ịrụkọ ọrụ na ụmụ amaala obodo na UNESCO Nepal. Ọ na-eduzi Mmemme Usoro Ihe Ọmụma Obodo na nke Ụmụ Amaala Obodo, na-arụkọkwa ọrụ na ministri gọọmentị, òtù obodo, na obodo ụmụ amaala. Ọrụ ya emeela ka ọ gaa site n’ịkpọkọta echiche ndị obodo na Nepal ruo n’ịsonye na mkparịta ụka mba ụwa gbasara mgbanwe ihu igwe n’okpuru Nzukọ Mba ndị dị n’otu Maka Mgbanwe Ihu Igwe na UNFCCC COP na Egypt, Dubai, na Baku. O nwere akara ugo mmụta nke nna ukwu n’ihe ọmụmụ gburugburu ebe obibi site na Mahadum Jawaharlal Nehru dị n’India. O nwekwara nkwenye siri ike n’onwe ya na ọ dịghị onye kwesịrị ịbụ onye e leghaara anya—ọ bụghị n’usoro iwu gbasara ihu igwe na ụdị ndụ dị iche iche, ọ bụghị n’usoro atụmatụ mmepe, nakwa ọ bụghị n’akparịta ụka ndị na-akpụzi ọdịnihu anyị niile.

Valts Ernštreits bụ onye nnyocha ụmụ amaala obodo, onye na-ede abụ, na onye na-ese ihe osise. O jirila ọtụtụ iri afọ rụọ ọrụ n’etiti ịmaliteghachi asụsụ, nnọchite onwe onye na nke obodo, na ịkwado ikike ụmụ amaala obodo maka obere obodo ụmụ amaala Livonian dị na Latvia. Ọ rụpụtala ebe ndị mmadụ nwere ike iji asụsụ Livonian, mụta ya, ma mee ka ọ pụta ìhè n’ụwa dijitalụ na n’usoro mgbasa ozi. Ọ na-akwalitekwa mmegharị obodo nke gbadoro ụkwụ n’echiche na mkpa ndị obodo n’onwe ha.Ọrụ ya gụnyekwara ịkụziri ọha mmadụ sara mbara ihe gbasara isiokwu na ihe nketa Livonian, yana ịkwalite ha n’ọkwa niile nke usoro agụmakwụkwọ, mgbasa ozi, na amụma gọọmentị. Ọ na-arụsi ọrụ ike n’ịkwado ikike na ịkekọrịta ihe ọmụma n’akụkụ abụọ nke mkparịta ụka ahụ—ọ na-arụ ọrụ site n’ime obodo ụmụamaala ya, ebe n’otu oge ahụ ọ na-eje ozi na kansụl na ụlọọrụ ndị na-emepụta amụma mgbasa ozi gọọmentị ma na-enyocha mmejuputa ya. N’ihi nke a, echiche ya na-enye nghọta sitere n’ahụmịhe kpọmkwem banyere mgbagwoju anya nke ọnọdụ ndị a, dịka akụkụ abụọ nke mmekọrịta dị n’etiti obodo si ahụ ya.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.