
Ndị enyi anọ ji kọmputa nta na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-ese foto onwe ha n’ihu ihe ncheta dị na Cotonou, Benin. Iwaria sere foto a site na Pexels. Enwere ike iji ya n’efu.
Akụkọ a Dan Campbell dere bụ nke ụlọ ọrụ Peace News Network bipụtara nke mbụ na Julaị 20, 2026. A na-ebipụtagharị ụdị nke e dezigharịrị n’akwụkwọ Global Voices n’okpuru nkwekọrịta mmekọrịta gbasara ọdịnaya.
Kedu ka ndị ntorobịa Afrịka si eji ọgụgụ isi AI arụ ọrụ iji wulite udo? Kedu ụfọdụ n’ime nsogbu ndị na-esite n’iji ọgụgụ isi AI arụ ọrụ maka udo?
Ọtụtụ mgbe, akụkọ ndị na-apụta n’isi akwụkwọ akụkọ na-elekwasị anya n’ihe egwu na iji ọgụgụ isi mmadụ eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma: mgbasa ozi ụgha, iledo ndị mmadụ, mfu ọrụ, na vidio maobụ ihe onyonyo e ji teknụzụ gbanwee nke na-eme ka ihe ụgha yie eziokwu. A naghị elebara akụkọ ọzọ na-eme n’akụkụ dị icheiche nke Afrịka anya nke ukwuu. Ndị ntorobịa na-eji teknụzụ dijitalụ achọpụta esemokwu tupu ha etolite, gbochie okwu ịkpọasị, ma mee ka ike obodo na ikike ya iguzogide nsogbu sie ike.
Otu akwụkwọ nkọwa gbasara iwu nke ỤlọỌrụ Maka Ọmụmụ Nchekwa bụ Institute for Security Studies (ISS Africa) bipụtara n’oge na-adịbeghị anya na-arụ ụka na ndị ntorobịa Afrịka abụghị naanị ndị na-amụta iji ọgụgụisi AI arụ ọrụ. Ha na-enyekwa aka n’ịkpụzi otú e si eji teknụzụ dijitalụ arụ ọrụ maka iwulite udo. N’otu oge ahụ, akụkọ ahụ dọrọ aka ná ntị na iwu na-adabaghịzi n’oge a, akụrụngwa dijitalụ na-adịghị ike, na ahaghị nhata na-aga n’ihu nwere ike igbochi mmezu nke ikike ahụ.
Gọọmentị Afrịka, òtù mpaghara dị iche iche, na òtù ndị obodo amalitela ịmepụta usoro iwu na ụkpụrụ ga-achịkwa ọgụgụisi mmadụ, nke ga-emetụta otú e si eji teknụzụ ndị a eme ihe n’ọtụtụ afọ ndị na-abịa. Otu n’ime isi ozi akụkọ ahụ bụ na e kwesịghị ịkpọ ndị ntorobịa ka ha nye echiche naanị mgbe e dechara usoro iwu ndị a. Ha kwesịrị isonye n’ichepụta ha site ná mmalite.
Echiche ahụ kwesịrị ka e lebara ya anya nke ọma.
Ike kachasị dị n’akụkọ ahụ bụ na ọ naghị egosi ndị ntorobịa Afrịka dịka ndị na-anata teknụzụ n’enweghị ike ime ihe. Kama nke ahụ, ọ na-egosi ha dịka ndị na-emepụta ihe ọmụma, ndị na-achịkọta ma na-emepụta ozi, ndị na-ewu ngwaọrụ dijitalụ, ma na-akpụzi mkparịtaụka ọha mmadụ gbasara esemokwu. Nke a bụ mgbanwe dị mkpa. Mkparịtaụka gbasara ndị ntorobịa, udo na nchekwa na-elekwasịkarị anya n’isonyere na ịnọchite anya ndị mmadụ. N’ebe a, ihe a na-elekwasị anya bụ nka na ihe ọmụma. Ndị ntorobịa na-arụ ọrụ iwulite udo na-emepụta data, ihe ọmụma sitere n’obodo ha, na ihe ọhụrụ dijitalụ nke na-abawanye n’iji ha akwado mbọ igbochi esemokwu tupu ọ amalite.
Ike kasị ukwuu nke akụkọ a bụ na ọ jụrụ igosi ndị ntorobịa Afrịka dị ka ndị na-anata teknụzụ naanị n’enweghị ike ime ihe ọ bụla. Kama nke ahụ, ọ na-egosi ha dị ka ndị na-emepụta ihe ọmụma, ndị na-emepụta ozi, ndị na-ewulite ngwa dijitalụ, ma na-akpụzi mkparịtaụka ọha mmadụ banyere esemokwu. Nke a bụ mgbanwe dị mkpa. Mkparịtaụka gbasara ndị ntorobịa, udo na nchekwa na-elekwasịkarị anya n’itinye ha n’ihe omume ma ọ bụ n’ịhụ na a nọchitere anya ha. Ma n’ebe a, ihe a na-elekwasị anya na ya bụ nka na ihe ọmụma ha nwere. Ndị ntorobịa na-arụ ọrụ iwulite udo na-emepụta data, ihe ọmụma sitere n’obodo ha, na ihe ọhụrụ dijitalụ ndị na-abawanye uru n’ịgbochi esemokwu.
Ihe atụ ndị a na-egosi nke a nke ọma.Usoro Ushahidi nke Kenya gosipụtara, mgbe ime ihe ike sochiri ntuliaka nke afọ 2007 ruo 2008, otu ụmụamaala nwere ike isi chịkọta ma kesaa akụkọ sitere n’aka ọtụtụ mmadụ n’oge nsogbu. Atụmatụ ndị ọhụrụ dịka iVerify, nke a malitere na Zambia n’afọ 2021, na-azụ ndị nta akụkọ na-eto eto ka ha mata ma kwụsị ozi ụgha tupu ọ gbasaa karịa. A na-eji Iverify ugbua na Sierra Leone na Liberia dịka ngwa ọha mmadụ nwere ike iji, ebe a na-azụ ndị nta akụkọ na-eto eto n’ịlele ma kwado eziokwu nke ozi. Ọrụ ndị ọzọ nke ndị ntorobịa na-edu na-ejikọta mmụta igwe, nchịkọta ozi sitere n’ebe ọha na eze dị, na ịkọ akụkọ sitere n’obodo iji nyochaa ntuliaka, mata ihe nwere ike ibute esemokwu, ma gbaghaa akụkọ ụghaa na-agbasa n’Ịntanet.
Ikekwe ihe kacha mkpa bụ na akụkọ a anaghị ele teknụzụ anya dịka ihe ga-anọchi mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ọtụtụ n’ime ihe atụ ya kacha baa uru na-ejikọta ikpo okwu dijitalụ na mkparịta ụka ihu na ihu, ịhazi ọrụ obodo, redio obodo, na mmụta maka udo. Ngwa dijitalụ na-adị irè n’ihi na ha na-ewusi njikọ dị n’etiti ndị mmadụ ike kama ịnọchi ha.
Akụkọ a na-emekwa ka o doo anya nke ọma banyere ihe mgbochi ndị ka na-emetụta ọdịnihu dijitalụ nke Afrịka.
Ịnweta ịntanetị ka bụ ihe na-ahaghị nhata nke ukwuu n’ofe kọntinent ahụ, ọkachasị n’ime ime obodo na mpaghara agha ma ọ bụ esemokwu metụtara. Ụmụnwanyị ka na-eche nnukwu ihe mgbochi ihu n’itinye aka n’ihe gbasara teknụzụ dijitalụ. Asụsụ ndị Africa ka amachaghị nke ọma n’ọtụtụ usoro ọgụgụisi mmadụ, nke na-egbochi ikike ngwa ọrụ akpaaka ịghọta ọnọdụ obodo nke ọma ma ọ bụ ịchọpụta ọdịnaya na-emerụ ahụ n’ụzọ ziri ezi. Usoro ọgụgụ isi AI ndị a zụrụkarị n’asụsụ Bekee ma ọ bụ asụsụ ndị ọzọ nke mba ọdịda anyanwụ nwere ike ghara ịchọpụta ọdịnaya na-emerụ ahụ nke ọma mgbe ọ dị n’asụsụ ndị Africa. Ihe ndị a abụghị naanị adịghị ike n’ihe gbasara teknụzụ. Ha metụtara itinye mmadụ niile n’ọrụ, ntụkwasị obi na izi ezi, yana onye a na-anụ olu ya.
Mkparịta ụka gbasara asụsụ dị ezigbo mkpa. Ịwulite udo na-adabere n’ịghọta akụkọ obodo na ihe na-eme n’etiti ndị obodo.
Ndụmọdụ ndị ahụ bara uru ma kwekọọ nke ọma n’ihe akaebe e gosipụtara. Ha na-akpọ oku ka njikọ aka dị n’etiti ụlọ ọrụ Njikọ Afrịka bụ African Union (AU) na-ahụ maka udo na teknụzụ sie ike karị, ka e tinyekwuo ego n’ịkụziri ndị mmadụ nka dijitalụ na ime ka ịnweta ịntanetị dị mfe, ka nlekọta ụkpụrụ omume nke ọgụgụ isi AI sie ike, nakwa ka e guzobe usoro doro anya nke ga-eme ka ndị ntorobịa nwee ike isonye ozugbo n’ime imepụta iwu na mkpebi gbasara udo na nchekwa.
N’agbanyeghị nke a, ụfọdụ ajụjụ ka azaghị.
Akwụkwọ akụkọ ahụ gosipụtara ọtụtụ atụmatụ na-enye olileanya, mana o nyere obere ihe akaebe gbasara mmetụta ha na-adịte aka. Kedu ụzọ e si eji teknụzụ dijitalụ arụ ọrụ udo nke belatara ime ihe ike n’ụzọ a tụrụ ma gosipụta nke ọma? Kedu ndị mere ka ntụkwasị obi dị n’etiti obodo dị iche iche sie ike? Kedu ndị siri ike ịgafe n’ọkwa nnwale gaa n’ọrụ na-adịgide adịgide? Ka gọọmentị na ndị na-enye ego na-etinyekwu ego n’iji ọgụgụ isi AI n’ arụ ọrụ maka iwulite udo, ajụjụ ndị a na-adịwanye mkpa.
Akwụkwọ ahụ nwekwara ike ịkọwa nke ọma karị esemokwu dị n’etiti ihe ọma ọgụgụ isi mmadụ nwere ike ime na ohere e nwere iji ya mee ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Teknụzụ e mepụtara maka ịdọ aka ná ntị tupu esemokwu amalite ma ọ bụ maka ilekọta esemokwu nwere ike ime ka nlekọta nzuzo nke gọọmentị gbasaa ma ọ bụ mee ka ohere ụmụ amaala nwere ikwu okwu na ime ihe belata ma ọ bụrụ na ejighị nlekọta bara uru mee ya. Usoro nchịkwa siri ike na-aghọ ihe dị mkpa, ọ bụghị naanị n’ihi na ọgụgụ isi AI nwere nnukwu ike, kama n’ihi na ike n’onwe ya chọrọ ka a na-aza ajụjụ maka otu e si eji ya.
Otú ọ dị, adịghị ike ndị a anaghị ebelata nnukwu uru akwụkwọ ahụ bara. Kama nke ahụ, ha na-egosi ụzọ ọmụmụ ọhụrụ a ga-achọ ka ọrụ iwulite udo site na teknụzụ dijitalụ na-aga n’ihu ma na-eto n’ofe kọntinent ahụ.
N’isi ya, akwụkwọ nkọwa gbasara iwu a na-enye anyị ihe ncheta bara uru na iwulite udo abụghị naanị gbasara teknụzụ. Ọ bụ gbasara ndị mmadụ. Ọgụgụ isi AI nwere ike ime ka usoro ịdọ aka ná ntị tupu esemokwu amalite ka mma, mee ka ịchọpụta ozi ụgha dị ngwa, ma ọ bụ nyere aka n’ime nyocha esemokwu ka mma. Ma ọ dịghị otu n’ime ọganihu ndị a ga-eweta udo na-adịgide adịgide ma ọ bụrụ na ha anaghị egosipụta ihe ọmụma obodo, ihe ndị obodo na-ebute ụzọ, na ntụkwasị obi ọha mmadụ.
N’ofe Africa, ndị ntorobịa na-egosilarị ihe ọdịnihu dị otú ahụ nwere ike ịdị. Ihe ịma aka dị ugbu a bụ ma ụlọ ọrụ ga-amata ha dịka ndị mmekọ hà nhata n’ịkpụzi ọdịnihu ahụ.
Maka ndị na-eme iwu, òtù ndị na-arụ ọrụ maka ọdịmma ọha mmadụ, na ndị mmekọ mba ụwa, ozi ahụ doro anya: Itinye ego n’iwulite udo site na teknụzụ dijitalụ pụtara itinye ego n’ime ndị mmadụ kacha ghọta obodo ha. Ọdịnihu Africa n’ihe gbasara ọgụgụ isi AI ga-esi sie ike karị, ọ bụghị mgbe teknụzụ dochiri ndị ndu obodo, kama mgbe ọ na-enye ha ike ma na-eme ka olu na nduzi ha pụta ìhè karịa.






