
Ikpo akwa kapulana. Wyte Shot sere foto a na Accra, Ghana. Site na Pexels. Ikikere Pexels.
Ụbọchị ole na ole tupu Eprel 7,bụ́ Ụbọchị Ndị Inyom Mozambique, ụmụnwanyị ndị na-eme ngagharị iwe gara n’okporo ama di n’obodo Nampula, na-eme mkpesa banyere ọdịda nke nwunye onyeisi ala Mozambique, Gueta Chapo, emezughị nkwa o kwere ịnye ndị mmadụ kapulana (akwa mara mma nke nwere ọtụtụ agba, nke a ma ama na Mozambique) iji mee emume ụbọchị ahụ.Nke a yiri ngagharị iwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị sochiri ntuli aka izugbe nkafọ 2024, mgbe ndị na-eme ngagharị iwe gara n’okporo ámá, ụmụ nwanyị — ọtụtụ n’ime ha yi kapulana — pụtara ìhè n’etiti esemokwu na ndị uwe ojii na-abawanye na mgbochi okporo ụzọ.Ụdị ngagharị iwe yiri nke a mere na Anchilo mgbe nwunye onyeisi ala ahụ kwupụtara na ya enweghị kapulana ọ ga-enye. Mmadụ abụọ merụrụ ahụ n’oge esemokwu ahụ n'ihi Mgbọ.
Capulana: Site n’ihe nnọchiteanya ọdịbendị ruo n’ihe eji eguzogide ọchịchị
Capulana bụ akụkụ dị mkpa nke njirimara ọdịbendị ndị Mozambique, ọ bụkwa uwe ụmụnwanyị ọtụtụ ndị na-eyi kwa ụbọchị. Otú ọ dị, uwe a nwetara ihe ọhụrụ ọ pụtara n’oge ngagharị iwe ndị mmadụ mere na Nampula.Karịa ịbụ naanị uwe, ndị sonyere na ngagharị iwe ji ya kpuchie onwe ha ma chebe onwe ha pụọ n’ọkụ na anwụrụ anya mmiri. Ọ ghọkwara ihe a na-ahụ anya nke gosipụtara ịdịnotu na iguzogide mmegbu. Ihe a wulitere n’akụkọ ihe mere eme nke capulana banyere òkè ụmụnwanyị nyere n’ọgụ maka nnwere onwe mba ahụ, ma tinyekwara onyinyo Josina Machel,
Ojiji ihe ndị nwere nnukwu mkpa n’ọdịbendị n’oge ngagharị iwe abụghị n’oge ngagharị iwe abụghị ihe ọhụrụ. Nnyocha e mere n’ọnọdụ dị iche iche n’Afrịka gosiri otú akwa ọdịnala na akara ọdịbendị nwere ike isi nweta nnukwu mkpa ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’oge nsogbu na ngagharị iwe.
Ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị na-esonye n’ngagharị iwe na-arịwanye elu, nke na-egosikwa mmụba n’òtù ụmụ nwanyị na-ekere òkè n’ihe gbasara ndụ obodo na Mozambique.
Òtù dị icheiche dị ka Òtù Amụma Maka Ikike Mmadụ na Na-ahụ Maka Ikike Mmadụ bụ Amnesty International na Human Rights Watch edekọla ihe egwu ndị na-eche ndị na-eme ngagharị iwe ihu, gụnyere iji ike gabiga ókè, ijide ndị mmadụ n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya, na iyi egwu ma ọ bụ ịtụ ndị mmadụ ụjọ — nke mmetụta ha na-enwe na-adịgasị iche n’etiti ụmụnwanyị na ndị ntorobịa.Otu onye na-akwado ngagharị iwe, onye rịọrọ ka a ghara ikpughe aha ya, gwara Global Voices, “Ụmụnwanyị abụghịzi naanị ndị na-ekiri ihe na-eme. Ha bụ ndị nsonye na ngagharị a.”
Ọgba aghara n'ogo mba
Ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya na Nampula nwere njikọ na ọgbaghara sara mbara nke sochiri ntuli aka izugbe nke afọ 2024. Dịka otu ngalaba a na-akpọ platform Decide si kwuo, e jidere ọtụtụ puku mmadụ, ebe ọtụtụ narị mmadụ nwụrụ n’ihe omume ndị metụtara ntuli aka ahụ. Ọzọkwa, òtù dị iche iche, dịka Ebe Maka Iguzosi Ike n’Ezi Omume Ọha bụ Center for Public Integrity, adọla aka ná ntị banyere mmebi iwu ndị metụtara ntuli aka na enweghị nghọta zuru oke n’usoro ntuli aka ahụ.
Oghere dijitalụ na mpụta ihe mkpesa
Ọtụtụ n’ime ihe ndekọ banyere mkpesa ndị mere na Nampula bụ ndị e kesara n’ịntanetị. Nke a na-egosi etu mgbasa ozi mmekọrịta si bụrụ ngwa ọrụ dị mkpa maka ịkọ akụkọ banyere mmegbu, ịchịkọta ụmụ amaala, na ikesa ihe akaebe ozugbo ka ihe na-eme. Otú ọ dị, òtù dị ka Access Now na CIPESA Òtù Nweta Ugbu (Mmekọrịta Maka Atụmatụ Ịntanetị n’ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda Afrịka) adọla aka ná ntị banyere ihe ize ndụ dị n’igbochi nnweta ịntanetị n’oge ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ọ bụ ezie na Mozambique egbochibeghị nnweta ịntanetị ruo ugbu a, mgbe a kwadoro Iwu Nọmba 48/2025 n’abalị iri na isii nke ọnwa Disemba afọ 2025, ndị ọrụ gọọmenti guzobere usoro nchịkwa nke ga-enye ha ohere igbochi nnweta netwọkụ nkwukọrịta nke mba ahụ. Ndị ọrụ gọọmenti atụpụtakwala Iwu ọhụrụ megide ndochi Ụgbọala na Ụzọ nke ga-ata ndị na-egbochi ụzọ ọha n’oge mkpesa ahụhụ. E mere ka akwụkwọ iwu ahụ dịrị ọha mmadụ ka ha nwee ike ịgụ ya ma kwuo echiche ha.
Ọnọdụ a na-ebute ọtụtụ ụzọ e si enyocha ya na ọtụtụ ajụjụ, dịka: Kedu ka iji mgbasa ozi mmekọrịta si na-agbanwe mmemme ngagharị n’ụwa dijitalụ na ụzọ ụmụ amaala si ede ma chekwaa ihe ndekọ n’ime Mozambique, ọkachasị n’oge mkpesa na esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Kedu ohere dị maka ịba ụba nke ụdị ọhụrụ nke ịchịkọta ụmụamaala site n’ụwa dijitalụ, ikesa ozi n’ebe dị icheiche, na iji ikpo okwu ozi ezoro ezo n’oge ọchịchị na-abawanye njikwa ya? Kedu ụdị ntụnyere a pụrụ ime na mba Afrịka ndị ọzọ ebe a na-egbochi ịntanetị n’oge mkpesa, ntuliaka, ma ọ bụ nsogbu.






