
Ugwu Nanda Devi, nke bụ akụkụ nke nnukwu ugwu Himalaya, a na-ahụ ya site na Landour, India. Ameya Nagarajan sere foto a. E ji ya mee ihe site n’inata ikike.
Mgbe ndị otu Global Voices malitere ịtụ aro na Mee ka anyị dee akụkọ gbasara akụkọ ọma banyere ihu igwe, obi erughị m ala. Echeghị m na akụkọ ọma gbasara gburugburu ebe obibi ga-ezuru n’ụwa ndị ka n’ọtụtụ ka anyị nwee ike imezu ebumnuche anyị nke isiokwu iri, maọ bụkwanụ gafee ya. Nlebanya anyị banyere Echiche Ndị Mmadụ Banyere Amamihe Arụrụ Arụ. Echiche Ndị Mmadụ banyere AI n’ọnwa Eprel karịrị ihe niile anyị tụrụ anya ya, ma n’ọnụọgụ isiokwu anyị nwetara ma n’otú ndị mmadụ si nabata ha, ya mere nchegbu m bịara ka ukwuu.
Ma mgbe ahụ, aro isiokwu malitere ịbata, akụkọ dị iche iche amalitekwara idepụta. Kwa ụbọchị, ahụrụ m ka tebụl anyị ji eso ọrụ na-eto: obodo dị iche iche na-alụ ọgụ iji chekwaa ma weghachite osimiri, ndị mmadụ na-emepụta ụzọ ngwọta dị ịtụnanya iji gbochie mmetụta ụfọdụ kpọmkwem, yana ilekwasị anya n’ịdị mkpa mkpụrụ osisi na mkpụrụ ihe ọkụkụ na mmepụta nri. Kenya, ndí Dominican Republic, Nepal, Mozambique, Tuvalu, Yemen, Brazil — ndị mmadụ na-alụ ọgụ dị mma n’akụkụ niile nke ụwa.
Mgbanwe dị mma na-aganihu
Akụkọ kacha mee ka m ghọta nke ọma mkpa mkpuchi akụkọ a bụ nke gbasara mweghachi akụkụ nke Oké Osimiri Aral dị na etiti Eshia. Adị m n’ihe dị ka afọ iri atọ na ole mgbe mbụ m nụrụ banyere mbibi gburugburu ebe obibi nke Oké Osimiri Aral, ọ wụrụ m akpata oyi ruo ọtụtụ ọnwa. Ọtụtụ mgbe, m na-agwa ndị mmadụ, “Ma unu ma na ọ DỊGHỊZI? Anyị na-esekarị ya na maapụ, ma ọ DỊGHỊZI?!?” Ya mere, ịgụ na a na-eme ka ọ dịghachi ndụ nke ọma bụ n’ezie oge jupụtara n’ịtụnanya. N’afọ (mba, afọ iri) nke akụkọ ọjọọ yiri ka ọ naghị akwụsị akwụsị, ịgụ banyere nke a dị m ka onyinye. Ọzọkwa, o mere n’ógbè a na-eleghara anya nke ukwuu n’akụkọ akụkọ n’ozuzu, ebe ọchịchị mere ihe ma nweta enyemaka site n’aka onye a na-ewerekarị dị ka onye ọjọọ n’akụkọ mgbasa ozi Bekee ndị bụ isi: China.
Nke ahụ bụ kpọmkwem isi ihe mere ịkọ akụkọ ndị a sitere n’aka ndị bi n’ọtụtụ mba nke ụwa, maka ndị bi n’ọtụtụ mba nke ụwa, ji dị mkpa — ọ bụkwa ihe anyị ji kpọrọ ihe nke ukwuu na Global Voices. Ụwa nke oge a, n’agbanyeghị na ọ na-ejikọta anyị n’ụzọ dị ịtụnanya, na-emekwa ka anyị kewapụ onwe anyị.

Nnụnụ mpi nwere ntụpọ nke Eshia ka ọ na-efe n’ogige nchekwa anụ ọhịa Kaziranga, Assam, India. Ameya Nagarajan sere foto a. E ji ya mee ihe site na nnata ikike.
Ọ bụ ihe kwere nghọta na anyị ji ịntanetị na mgbasa ozi mmekọrịta kpọrọ ihe nke ukwuu, n’ihi na ha na-enye anyị ohere ịhụ ma nụ ihe ndị anyị na-agaghị enwe ike ịhụ ma ọ bụ ịnụ ma ọ bụrụ na anyị anọghị n’ịntanetị (dị ka akụkọ Global Voices). Ị gaghị enwe ike ịgụ akwụkwọ akụkọ e biri ebi si Cameroon mgbe ịnọ na Dhaka, ma ị nwere ike ịgụ ya n’ịntanetị. Ma n’otu aka ahụ, ịntanetị na-emekwa ka anyị kewapụ onwe anyị n’ime obere ụwa nke anyị, site n’igosi anyị naanị ihe ọ na-eche na anyị chọrọ ịhụ. Ọ dịkwa ala ịhụ obodo ndị ọzọ na-alụ otu ọgụ anyị na-alụ n’ime mba ndị ka n’ọtụtụ n’ụwa, belụsọ ma anyị jiri aka anyị chọọ ha. Ọ bụ ya mere Global Voices ji kpebie ibute akụkọ ndị e ji aka ọtụtụ mmadụ dekọọ ụzọ. Akụkọ a gbasara mbọ nchekwa gburugburu ebe obibi na-aga nke ọma n’akụkụ dị icheiche nke ụwa chetakwara m ọtụtụ ụzọ anyị niile si ka na-alụ ọgụ a — ma na-emeri ya.
Ọ dịkwa mkpa ịghọta na a na-enwe ọganihu. N’ezie, ndị mmadụ anọghị n’ọnọdụ nke a tụrụ ha mkpọrọ n’ụzọ ga-eduga ha n’ọdachi a na-apụghị izere ezere, ọbụna — karịsịa — n’ime mba ndị ka n’ọtụtụ n’ụwa bụ́ ndị na-enweghị ego na akụrụngwa zuru ezu, nke a na-elegharakwa anya ọtụtụ mgbe. N’ihi na, dịka Sydney Allen, onye nchịkọta akụkọ gbasara ikpe ziri ezi nke ihu igwe anyị, si kwuo n’akwụkwọ nchịkọta akụkọ ya nke Mee, “Ọ dị mkpa ịkekọrịta ihe atụ nke ihe a pụrụ imegharị na ịgbasa gbasara omume ihu igwe na-aga nke ọma, n’ihi na ọ bụ naanị otu a ka a ga-esi jiri atụmatụ ndị a mee ihe n’obodo ndị ọzọ chọrọ ha.”
Ọ bụ ihe doro anya ikwu, mana nlebanya a mere ka m ghọta nke ọma mkpa ọ dị ka anyị gbakọta ọnụ dịka obodo dị icheiche iji lụọ ọgụ anyị ma nwee olileanya imeri ha. Site n’aka ụmụ nwanyị ụmụ amaala na Bolivia ndị na-ahazi onwe ha ịlụso ọkụ ọgụ ruo n’aka ndị Torwali bụ́ ụmụamaala Pakistan na-agba mbọ ịzọpụta Osimiri-na-agba mbọ ịzọpụta Osimiri Swat, nakwa ndị Filipinos gbara akwụkwọ ikpe dị mkpa megide ụlọọrụ mmanụ na ndị Kenya _na-eweghachite ala ha mgbe ndị mmadụ jikọtara aka ọnụ, ha na-emepụta otu nwere ike karịrị ike mpaghara ndị ọzọ.
Ọ bụghị naanị ndị mmadụ — mgbe ụfọdụ ọ bụkwa ọchịchị
Akụkụ ọzọ nke akụkọ ndị a mere ka m mata bụ na gọọmentị, n’ezie, anaghị ele nsogbu nke nsogbu mgbanwe ihu igwe anya kpamkpam. Gọọmentị dị n’akụkụ dị icheiche nke Etiti Eshia na-eme ihe iji zaghachi nsogbu mmetọ ikuku na-emensogbu mmetọ ikuku na-eme kwa afọ (anyị ka na-eche ka nke a mee n’India, ebe kwa afọ na-eme ka ugwu ya ghọọ ebe jupụtara n’uzuzu anwụrụ ọkụ dị egwu), dịka akụkọ sitere n’aka ezigbo ndị mmekọ anyị nọ na Vlast.kz si kọọ.

Osimiri Noa-dihing dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke steeti Arunachal Pradesh, India. Ameya Nagarajan sere foto a. E nyere ikike tupu e ji ya mee ihe.
Ọganihu ahụ dị na Kazakhstan bụ gọọmentị na-akwalite ya, otu ahụkwa ka ọtụtụ n’ime usoro ndị a na-eme na Barbados iji gbanwee ụlọọrụ ịkụ azụ si dị. Usoro ndị a gụnyere ịkwado iwu, itinye atụmatụ mweghachi n’ọrụ, na ịnakọta data. Obodo Tuvalu, bụ́ mba agwaetiti dị na Pacific nke na-eche ezigbo ihe ize ndụ ihu na ọ nwere ike tufuo ala ya niile n’ihi ịrị elu oke osimiri, amalitela iwulite usoro iji ghọọ “mba dijitalụ” — ụfọdụ nwere ike ịkpọ nke a aghụghọ, mana ikekwe ọ bụ naanị ụzọ a pụrụ isi chekwaa njirimara mba n’ihu nzaghachi na-ezughị ezu nye nsogbu zuru ụwa ọnụ a.
Ụmụnwanyị nọ n’ihu n’ọrụ a
Ihe ọzọ pụtara ìhè nye m bụ ọnụọgụgụ dị ukwuu nke otu ụmụnwanyị, obodo dị iche iche, na ndị otu jikọtara ọnụ na-etinye aka n’ọrụ mweghachi a. N’ozuzu, ụmụnwanyị na-enwekarị ihe ọjọọ kachasị site na mmetụta ọjọọ nke mgbanwe ihu igwe. A na-enyekwa ụmụnwanyịkarị ọrụ ilekọta na ịkwado obodo, ebe ọ bụ ụdị ọrụ metụtara mmetụta uche, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na ọrụ ụlọ. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ụmụnwanyị nọ n’ihu n’ọgụ a. N’ezie, onye France bụ́ ọkà n’ihe gbasara ụmụnwanyị na gburugburu ebe obibi, Françoise d’Eaubonne, “kwuru na mmegbu a na-emegbu ụmụnwanyị na mmegbu a na-emegbu okike sitere n’usoro nke gbanyere mkpọrọgwụ n’ụkpụrụ ọchịchị ụmụ nwoke.”
Ana m efota Samanta Azpurua, onye nchịkọta akụkọ anyị na-ahụ maka nnyocha akụkọ, bụ́ onye nyochara njem ụmụ nwanyị na nchekwa gburugburu ebe obibi na Uganda, na-enyocha echiche bụ na “Ụmụnwanyị dị oke mkpa n’omume Uganda banyere ihu igwe” n’isiokwu ya nke ọnwa a. Site n’iji usoro nnyocha nke Civic Media Observatory, ọ gosipụtara ụfọdụ nkọwa dị mkpa banyere akụkọ ihe mere eme nke njem ụmụnwanyị na njem nchekwa gburugburu ebe obibi na Uganda. Isiokwu ahụ bụ ihe m na-akpọ ezigbo akụkọ GV: ọ na-eme ka ọ ghara ikwe omume ileghara njikọ dị ukwuu dị n’etiti akụkụ dị iche iche nke ndụ n’ime mba ndị ka n’ọtụtụ n’ụwa anya. Ihu igwe, ikike ụmụ nwanyị, ihe ọmụma ụmụ amaala, teknụzụ a na-eji egbochi ikike, ọchịchị ikike, na ọnọdụ mgbe ọchịchị ndị mba ọzọ kwụsịrị — ihe ndị a niile nwere ọrụ ha.
Anyị na-esikwuwanye ike mgbe anyị jikọtara aka
N’ikpeazụ, ọ bụ ndị bi n’ime mba ndị ka n’ọtụtụ n’ụwa bụ ndị nsogbu mgbanwe ihu igwe ga-akụsi aka ike ugbu a na n’ọdịnihu. Ọ bụkwa anyị bụ ndị na-erite uru kachasị site na nkwukọrịta na njikọ aka dị n’etiti mba ndị ka n’ọtụtụ n’ụwa na otu ndị obodo. Anyị nwere ahụmịhe, ihe ọmụma e ketara n’aka ndị nna nna, na ụzọ dị iche iche e si eme ihe ndị na-esikarị ike ka mba ndị dị n’ebe ugwu ụwa ghọta. Ka anyị na-anụkwu akụkọ ndị ibe anyị, ka ohere anyị nwere ịlanarị nsogbu mgbanwe ihu igwe na-abawanye.






