Njem otu nwaokorọbịa Rohingya site na mgbukpọ agbụrụ ruo n’ịlanarị na olileanya

 

Mohammed Asem

Mohammed Asem. Photo courtesy of the author, used with permission. Mohammed Asem. Foto sitere n’aka onye dere edemede a, e jikwa ya mee ihe site n’ikike ya.

Ọ bụ Mohammed Asem dere edemede a, site n’ikike nke The Global Movement Against Statelessness (GMAS), ndí mmekọ Global Voices n’ihe gbasara ọdịnaya. Edemede a bụ akụkụ nke usoro Global Voices nke Julaị 2026, “Enweghị Obodo.” Usoro ederede a na-enye nghọta banyere okwu gbasara enweghị obodo na otu ọnọdụ a si egbochi nnwere onwe ndị mmadụ ịkwaga ebe dị iche iche, ohere ha nwere inweta agụmakwụkwọ, isonye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. I nwere ike ịkwado ọrụ mgbasa ozi a site n’ịnye onyinye ebe a.

Tupu m gbapụ n’ala nna m, enwere m ebe m na-akpọ ebe obibi, nwekwaa nrọ nke iwulite ọdịnihu m na Arakan, Myanmar. Ma, a na-enwekarị ihe ịkpa oke megide anyị: anyị enweghị ike ịgagharị n’enweghị mgbochi, nweta agụmakwụkwọ ọha, gaa mahadum, ma ọ bụ sonye na ntuliaka.

Tupu e wepụta Iwu gbasara ịbụ nwa amaala nke afọ 1982, ndị Rohingya bi na Myanmar nwere ikike ịbụ ụmụ amaala, gụnyere nnabata dị ka ụmụ amaala Myanmar. Mgbe e mechara Iwu nke afọ 1982, a napụrụ ndị Rohingya ikike ịbụ ụmụ amaala kpamkpam, nke metụtara ikike ha ibi ndụ nwere nsọpụrụ na nchekwa. N’ihi nke a, a manyere ọnụọgụgụ buru ibu nke ndị Rohingya—ihe dị ka Otu nde na narị puku mmadụ abụọ, dị ka atụmatụ UNHCR si dị—ịghọ ndị gbara ọsọ ndụ n’obodo agbataobi ha bụ Bangladesh. Abụ m otu n’ime ha.

Mgbe mụ na ezinaụlọ m gbapụrụ n’afọ 2017, mgbe m dị afọ iri, anyị hụrụ ka a na-agbagbu ndị mmadụ ka ha na-agbalị ịgafe Osimiri Naf, bụ osimiri na-arụ ọrụ dịka akara ókèala dị n’etiti ndịda ọwụwa anyanwụ Bangladesh na ugwu ọdịda anyanwụ Myanmar. A hụrụ m ọtụtụ ụmụaka Rohingya ka ha na-ese n’elu mmiri mgbe ha nwụsịrị n’ihi Ogbugba egbe ndị ọchịchị ndị agha Myanmar. A gbakwara anyị égbè ka anyị na-agbalị iru n’Ọwara Bengal site n’ịgafe osimiri ahụ dị nso n’ime obodo anyị dị na Myanmar, ma n'ihi na Chi anyị mụ anya, anyị jisiri ike gafee n’akụkụ nke ọzọ.

Demonstraters call for greater rights for refugees in Bangladesh. Image courtesy of Mohammed Asem, used with permission.

Ndị ngagharị iwe na-akpọ maka ka e nyekwuo ndị gbara ọsọ ndụ nọ na Bangladesh ikike. Foto sitere n’aka Mohammed Asem, ejiri ya site n’ikike  o nyere.

A kpagbuola ndị Rohingya na Myanmar kemgbe opekata mpe afọ 1970, ebe mkpagbu ahụ ruru n’isi n’agbata Ọgọst 2016 na Jenụwarị 2017, mgbe ndị agha malitere mwakpo ime ihe ike nke butere ogbugbu ọtụtụ mmadụ na mpụ megide mmadụ niile. Ụlọ ọrụ dị iche iche nke Mba Ndị Dị n’Otu, ndị ọrụ Ụlọikpe Mpụ Mba Niile, gọọmentị dị iche iche, na ọtụtụ otu na-ahụ maka ikike mmadụ boro ndị agha ebubo ịrụ mkpochapụ agbụrụ, ime mpụ agha, na ime mpụ mgbukpọ agbụrụ.

E wezụga igbu mmadụ n’enweghị usoro ikpe ziri ezi, ndina n’ike nke ọtụtụ mmadụ, igbu mmadụ n’ụzọ ikpe ọnwụ, ịgba ụlọ na ihe onwunwe ọkụ, igbu ụmụ ọhụrụ, mkpagbu na-adịghị akwụsị akwụsị, na ịnapụ ndị mmadụ ikike ha, omume ndị agha mere ka  a chụpụ ọnụọgụgụ mmadụ buru ibu n’ebe ha bi, ọtụtụ n’ime ha gbara ọsọ gafee ókèala banye Bangladesh.

Mgbe anyị gabigachara ihe isi ike niile dị n’ime njem ahụ, anyị rutere n’ókèala ahụ—agwaetiti Shah Porir Dwip nke Bangladesh—ma ndị nche ókèala Bangladesh ekweghị ka anyị banye n’obodo ahụ, anyị nọrọ otu abalị n’agwaetiti ahụ, na-agbasi mbọ ike ibi ndụ n’enweghị ihe ndị bụ isi e ji ebi ndụ. Ka anyị nọchara otu abalị ebe ahụ, e mechara kwe ka mụ na ezinaụlọ m banye Bangladesh.

Ma akụkọ a akwụsịghị ebe ahụ. Mgbe anyị gbalịsịrị ike ịgbapụ gaa n’ebe nwere nchekwa, ihe ịma aka ọzọ bịara—ịbụ ndị na-enweghị obodo mgbe anyị rutere Kutupalong, Cox’s Bazar, Bangladesh, bụ ebe obibi na ogige ndị gbara ọsọ ndụ kasị ukwuu n’ụwa.

Mgbe anyị rutere n’ogige ndị Rohingya dị na Kutupalong, anyị nwere obere ihe enyemaka anyị nwere ike inweta — uwe, nri, ọgwụ na ihe ndị dị mkpa maka ịdị ọcha dị obere— anyị bikwa n’ụlọ obibi nwa oge na-adịchaghị mma. Ka anyị na-agbapụ na Myanmar, anyị chere ọrịa dị iche iche na mmerụ ahụ ihu, ma anyị enwetaghị ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị. Otu n’ime ụmụnne m nwoke fọrọ obere ka ọ nwụọ n’ihi enweghị ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị. Ka m chọchara enyemaka mkpụrụ ụbọchị olenaole, e mechara m chọtara nwanne m nwoke obere ọgwụgwọ bụ isi, nke na ọnọdụ ya ji nwayọọ nwayọọ dịwa mma.

A child in Cox’s Bazar refugee camp in Bangladesh.

Nwatakịrị nọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na Cox’s Bazar, Bangladesh. Foto nke Mohammed Asem sere, ejiri ya site n’ikike o nyere.

Ibi n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị nchebe karịa ndụ anyị gbapụrụ na ya, mana ọ bụghị ndụ nkịtị mmadụ na-ebi. Na ndụ nkịtị, ihe ga na-eche m uche m bụ ihe m ga-amụ, otu m ga-esi wulite ọrụ m, na otu m ga-esi mee nke ọma. Ma n’ogige ahụ, enweghị m ohere ịgụ akwụkwọ, mgbe m dị naanị afọ iri na otu, olileanya m nwere maka ịga n'ihu n'agụmakwụkwọ m fọzịrị obere. N’afọ 2019, a nabatara m n’ụlọ mmụta nke otu NGO hiwere maka agụmakwụkwọ na-abụghị nke usoro ụlọakwụkwọ nkịtị, mana usoro mmụta ahụ adabaghị na usoro ọmụmụ ụlọ akwụkwọ nkịtị, ọ kwadoghịkwa m ịnwale ịga n'ihu n’ogo agụmakwụkwọ dị elu.

Mgbe m nọrọ ọnwa isii n’ogige ahụ, esonyere m n’otu ụlọ akwụkwọ obodo ndị Rohingya, ebe ndị nkuzi bi n’ogige ahụ na-akụzi ihe, a mụrụ m usoro ọmụmụ Myanmar dịka m gaara amụ ya n’ụlọ akwụkwọ dị na Myanmar. Enwere m olileanya na mgbe m hapụrụ ogige ahụ, na m ga-enwe ike isonye n’usoro agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ nkịtị.

N’afọ 2023, enwetara m ohere ịga gụọ akwụkwọ na Turkey, mana ekwesiri m inwe paspọtụ, nke m enweghi ike inweta, n’ihi na ndị Rohingya enweghị ikike ịbụ ụmụ amaala ma na Myanmar ma na Bangladesh. Enweela m asambodo nke Ministri Mmụta Myanmar (MMOE) nyere m iji gosi na m gụsịrị akwụkwọ sekọndrị; mana kọmitii na-enyocha ndị na-achọ inweta nkwado agụmakwụkwọ anabataghị ya n’ihi ọnọdụ m dị ka onye na-enweghị obodo. Agbalịrị m nke ukwuu iji nweta ohere ahụ, mana enweghị m ike iwere ya.

Ịbụ onye a hụtara dị ka onye na-enweghị obodo na onye a chụpụrụ n’ebe obibi ya n’ike aghọọla nnukwu ihe mgbochi na-adịte aka n’inweta ohere agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọrụ ọ bụla a na-enye n’ụzọ iwu kwadoro. Ka oge na-aga, nke a mere ka m bụrụ onye na-arụsi ọrụ ike n’ịkwado ọdịmma ndị mmadụ, onye na-akwado ndị ntorobịa, na onye na-akwado ikike mmadụ.

N’ọnwa Julaị afọ 2025, eguzobere m otu a kpọrọ “Arakani Youth Innovation”, iji mee ka ndị ntorobịa Rohingya nwee ike, chekwaa omenala anyị, ma kpalie mmepụta echiche ọhụrụ. Anyị na-akpọkọta ụmụagbọghọ na ụmụokorobịa ka ha bịa n’otu mkparịtaụka udo, ebe anyị nwere ike ileba anya n’ihe ịma aka ndị Rohingya na-eche ihu n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, ma chọta ogbugbo nye ya site n'imekọ ihe ọnụ na ikpebi ihe ọnụ.

A meeting of the Arakani Youth Innovation group. Image courtesy of Mohammed Asem. Used with permission.

Nzukọ nke otu Arakani Youth Innovation. Foto sitere n’aka Mohammed Asem, ejiri ya site n’ikike o nyere.

Ọtụtụ ndị ntorobịa Rohingya dị ka m na-eche maka ịbụ ndị ndu n’ọdịnihu, bụrụkwa ndị na-akwalite mmepe n’obodo ha, mana anyị na-echekarị ihe mgbochi nke ịbụ ndị akpọrọ “ndị na-enweghị obodo” ihu.

Ọnọdụ dị na Myanmar edochabeghi anya ma mgbe mgbukpọ agbụrụ nke ndị Rohingya gasịrị.

Mgbe nnupuisi ndị agha mere n'afọ 2021, ndị ọchịchị junta weghaara ọchịchị Myanmar naanị awa olenaole ka nzukọ omeiwu zukọchara, ma jide ndị isi ọchịchị nkịtị, Aung San Suu Kyi na Win Myint. Ma kemgbe ndị agha nyefere ikike ọchịchị n’aka onye ndu ọchịchị ndị agha, Min Aung Hlaing, n’afọ 2021, ọnọdụ dị na Myanmar akawanyela njọ, esemokwu agha obodo abawanyekwala; ndị obodo Myanmar amalitela ịlụ ọgụ megide ndị agha.

N’afọ 2024, otu ndị nnupụisi Buddha ji ngwa agha, ndị Arakan Army, weghaara ihe ka ukwuu na Steeti Rakhine (Arakan). Otu a emewokwa ndị Rohingya arụrụala na mmegbu n’ụzọ sara mbara.

Olileanya ndị Rohingya nwere ịlaghachi n’ala nna ha nwetaghachi ikike ha adịla ntakịrị karịa ka ọ dị na mbụ

Mohammed Asem bụ onye na-akwado ndị ntorobịa Rohingya, onye na-agbachitere ikike mmadụ, na onye guzobere Arakani Youth Innovation.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.