
Foto nke onye odee na Canva Pro.
Ụbọchị itoolu fọdụrụ naanị—ụbọchị itoolu tupu oge e nyere agafee, tupu iwu ahụ kwụsị, ma ọtụtụ afọ nke mgbalị malitekwa ọzọ site na mbido. Ma n’ụbọchị iri nke ọnwa Juun, afọ 2026, Ụlọ Omeiwu Ukpuru nke Kọlọmbịa mezuru ntuli aka ma kwado iwu ahụ, nke mere ka Kọlọmbịa bụrụ mba mbụ n’Amerịka Latịn machibidoro ibi ụmụ agbọghọ úgwù. Iwu nke narị anọ na iri anọ nke afọ 2025, nke a maara dị ka “ “Niñas sin Ablación” (Ụmụ Nwanyị Na-emeghị Ibi Úgwù),” bụ iwu a na-amụtaghị n’ụlọ ndị omeiwu, kama ọ sitere n’etiti obodo ndị kacha chọọ ya.
N’ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Maachị, afọ 2007, ụmụagbọghọ atọ a mụrụ ọhụrụ sitere n’obodo Emberá Chamí nwụrụ n’ihi ọrịa ha butere site n’ibi ha úgwù. Nke a bụ ikpe mbụ e dekọrọ n’akwụkwọ gọọmenti, n’agbanyeghị na a kwenyere na ọ bụghị ya bụ nke mbụ mere.
Kemgbe ahụ, Columbia ka bụ naanị mba dị na Amerịka Latịn kwupụtara n’ihu ọha na a ka na-eme ibi ụmụagbọghọ úgwù n’ime ókèala ya. Kama ka nkwupụta ahụ bụrụ ihe ihere, ọ nyere gọọmenti ohere ịmalite ime ihe ma nyere aka tinye mkpochapụ ibi ụmụ agbọghọ úgwù n’usoro ebumnuche mmepe na-adigide nke ụwa — Ma afọ iri abụọ gachara, n’enweghị iwu ga-akwado mgbalị ndị ahụ, nnabata naanị ya ezughị iji chebe onye ọbụla.
Ibi ụmụagbọghọ úgwù (nke ụfọdụ obodo na-akpọ “ịgwọ ọrịa,” “imezi,” maọbụ “ọrụ”) bụ iwepụ akụkụ maọbụ akụkụ niile nke akụkụ ahụ nwanyị dị n’èzí, n’enweghị ihe kpatara ya n’ihe gbasara ahụike. Na Columbia , a na-eme ya ụmụ nwanyị sitere n’ụbọchị iri na asaa a mụrụ ha ruo mgbe ha dị afọ iri na abụọ. Dị ka òtù mba ụwa na-ahụ maka ahụike si kwuo, ihe ọjọọ ọ na-ebute anaghị akwụsị akwụsị: ọbara ọgbụgba siri ike, ọrịa na-adịgide adịgide, nsogbu n’oge ọmụmụ nwa, mmerụ uche, nsogbu omume, nchekasị, ịda mba n’obi, na n’ọnọdụ kachasị njọ, ọnwụ.
Iwu sitere n’aka ndị lanarịrị ahụhụ, nke ihe ndekọ kwadoro
Ọnụọgụgụ gọọmenti na-egosi naanị akụkụ nke nsogbu ahụ. Gọọmenti na-amakarị ikpe ndị a mgbe ụmụ agbọghọ rutere n’ụlọ ọgwụ n’ihi nsogbu sitere na ibi ha úgwù, ma ọtụtụ obodo ndị ahụ dị ọtụtụ awa site n’ụlọ ọgwụ kacha nso. Ihe a na-edekọ na-adịkarị obere karịa ihe na-eme n’eziokwu.
N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndekọ dị ugbu a ezuru igosi ịdị ukwuu nke nsogbu ahụ. Ụlọ Ọrụ Ahụike nke Kọlọmbịa kọọrọ ikpe iri itoolu na otu n’afọ 2023 na ikpe iri ise na anọ n’afọ 2024, ọ bụ ezie na e nweghị ndekọ mba niile jikọtara ọnụ, n’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-eme n’obodo ndị dịpụrụ adịpụ na-enweghị ohere iru usoro nlekọta ahụike. N’etiti afọ 2020 na 2025, ỤlọỌrụ Mba Maka Ahụike dekọrọ ikpe narị abụọ na anọ, nke narị otu na iri asaa na asaa n’ime ha metụtara ụmụagbọghọ amaala, ọkachasị n’ógbè Risaralda na Chocó.
Naanị n’obodo Pueblo Rico, e dekọrọ ikpe iri anọ na isii n’etiti afọ 2013 na 2014: iri atọ na abụọ metụtara ụmụ ọhụrụ na-erubeghị otu afọ, ebe iri na otu metụtara ụmụaka dị n’agbata otu afọ na afọ abụọ. Ihe ndekọ sitere n’aka Òtù National Indigenous Organization, Colombia, nke United Nations Population Fund (UNFPA) kwadoro, na-egosi na n’ime ụmụnwaanyị Emberá atọ, mmadụ abụọ emela ibi úgwù. Ndị ọchịchị achọpụtakwala ikpe n’etiti ndị Afro-Kọlọmbịa, ndị Raizal, ndị Palenquero, na ndị si mba ọzọ kwabata.
Anyị anaghị ekwu maka ndị toro eto. Ihe anyị na-ekwu, nke ka ukwuu, bụ ụmụ ọhụrụ.
Ọ bụ eziokwu a kpọmkwem kpaliri ụmụnwaanyị Emberá n’onwe ha—ọtụtụ n’ime ha bụ ndị lanarịrị ahụhụ ahụ—ka ha kwụsị ichere ma bido iwulite ngwọta sitere n’ime obodo ha. Iwu ahụ sitere n’ọtụtụ afọ nke mkparịta ụka ha n’ obodo ndị nsogbu ahụ metụtara, ndị na-arịọ ngwaọrụ doro anya ga-echebe ụmụ ha nwanyị.
Usoro iwu a esiteghị n’ịta ndị mmadụ ahụhụ, nke a bụ nhọrọ e mere n’uche. Ime ka nne ochie na ndị na-amụ ụmụ n’ụzọ ọdịnala bụrụ ndị omekome ga-eme naanị ka ezinụlọ ghara ibuga ụmụ agbọghọ n’ụlọ ọgwụ mgbe nsogbu bilitere. N’ihi ya, ọtụtụ ụmụaka ga-anwụ karịa ka a ga-azọpụta.
Iwu ahụ guzobere kọmitii jikọtara ụlọ ọrụ dị iche iche nke gọọmenti, Ụlọ Ọrụ Maka Ọdịmma Ụmụaka na Ezinụlọ bụ Colombian Family Welfare Institute (ICBF) , òtù obodo, na ndị nnọchi anya obodo ndị nsogbu ahụ metụtara. Ọ na-ahazi ụzọ nlekọta, na-eme ka usoro nlekọta ahụike bụrụ iwu a ga-agbaso, na-ewusi usoro nchịkọta ihe ndekọ ike, ma na-agbasokwa ụzọ na-asọpụrụ omenala dị iche iche, nke na-amata mgbagwoju anya nke nsogbu ahụ n’enweghị iji ya bụrụ ihe ngọpụ maka ịghara ime ihe.
Alejandrina Guasorna: Akaebe nke onye lanarịrị ibi ugwu
N’ajụjụ ọnụ ya na El País, Alejandrina Guasorna chetara mgbe ọ dị afọ iri asaa na anọ, nwanne ya nwanyị kwadoro ihe a na-anụ kemgbe ogologo oge: n’ụbọchị a mụrụ ya, mmadụ wepụrụ akụkụ dị mkpa n’akụkụ ahụ nwanyị ya. E ji mma agụba, ntu e kpooro ọkụ, n’ime ụlọ mechiri emechi, ma mesịa bụrụ nkịtị.
Ọ dịghị onye gwara ya nke a. Ọ bụghị nne ya, ọ bụghịkwa ụmụnwaanyị ndị ọzọ nọ n’obodo Emberá ya dị na Pueblo Rico, Risaralda. O tolitere n’amaghị ihe ahụ, bie ndụ ya n’amaghị ya, ọbụna ghọọ onye na-amụ ụmụ n’ụzọ ọdịnala n’amaghị, na-enyere ụmụagbọghọ ndị ọzọ aka ịmụ nwa, ndị ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ na ha tara ahụhụ otu ahụ.
Ihe kacha dị arọ n’akụkọ ya abụghị oge ọ na-echetaghị; kama ọ bụ ihe niile ọ na-echeta: ụmụagbọghọ nwụrụ, ọbara ọgbụgba, ọrịa, na obere ahụ ụmụaka ndị na-enweghị ike ịlanarị.
Mgbe ahụ ka okwu kacha ewute obi pụtara: “Ha na-ebutere anyị ụmụagbọghọ nwụrụ anwụ mgbe niile. Anyị chere na ọ bụ ihe nkịtị.” Nke a abụghị n’ihi amaghị ihe. Ọ bụ nsonaazụ nke ọtụtụ ọgbọ a zụlitere ka ha ghara ịhụ, ghara ikwu okwu, kama lie ụmụ ha nwanyị ma gaa n’ihu ndụ.
Guasorna na-ajụ otu n’ime ihe ndị a na-ejikarị akwado ịghara ime ihe: na nke a bụ omenala ochie nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. N’adịghị ka n’ụfọdụ mba Afrịka, ọ bụghị mgbe niile ka ndị na-amụ ụmụ n’ụzọ ọdịnala na-eme ya. Kama nke ahụ, ọ bụ omume e bufere site n’otu ọgbọ gaa n’ọzọ n’obodo ndị a hapụrụ azụ, ebe ohere agụmakwụkwọ pere mpe, gọọmenti adịghịkwa ahụkebe, ebe ọ dịghị onye kọwara ha na ihe a na-eme n’ahụ ha abụghị ihe nkịtị maọbụ ihe dị mkpa.
Ụzọ nke fọrọ nke nta ka ọ kwụsị tupu ọ malite
Ịkwado iwu ahụ adịghị mfe ma ọlị. Iwu ahụ gafere mkparịta ụka abụọ n’Ụlọ Ndị Nnọchi Anya n’afọ 2025, ma e mesịa Kọmitii Mbụ nke Ụlọ Omeiwu Ukpuru kwadoo ya n’otu olu. Ma ruo ọtụtụ izu, mkparịta ụka ikpeazụ—nke bụ naanị ihe fọdụrụ tupu e mechaa ya—nọgidere n’ọnọdụ nke iri na abụọ ma ọ bụ iri na atọ n’usoro ihe ndị a ga-atụle, n’azụ okwu dịka enyemaka maka agụmakwụkwọ na nkwado ego njem.
Ụbọchị ikpeazụ e nyere bụ ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Juun. Ntuli aka ikpeazụ maka ịhọpụta onye isi ala ga-eme n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun. Ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị achọghị ime ka ọnọdụ ahụ sie ike.
Na e mere ntuli aka ahụ n’onwe ya, n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị Colombia, bụ nnukwu ihe. Ọ bụ nsonaazụ ọtụtụ afọ nke mgbalị na nrụgide sitere n’aka ụmụnwaanyị ndị na-enweghị uru ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha ga-enweta, ma ndị nwere ọtụtụ ihe ha ga-erite n’ime ndụ ha.
A na-eme ibi ụmụagbọghọ úgwù n’ọ dịkarịa ala mba iri itoolu na anọ, ọ na-emetụtakwa ihe karịrị nde ụmụagbọghọ na ụmụnwaanyị narị abụọ na iri atọ n’ụwa niile. N’ime mba iri itoolu na anọ ndị e chọpụtara na a na-eme omume a, naanị mba iri ise na itoolu nwere iwu kpọmkwem machibidoro ya, ebe ọtụtụ n’ime iwu ndị ahụ dị na Afrịka, Europe na Ugwu Amerịka.
Ruo mgbe a kwadoro iwu a pụrụ iche, ọ dịghị mba ọbụla n’Amerịka Latịn nwere ụdị iwu a.
Leandra Becerra, onye ndụmọdụ n’iwu maka otu Equality Now na Amerịka Latịn, kọwara mkpa nke oge a mgbe a kwadoro iwu ahụ:
“Mmeri a bụ mkpụrụ nke ọtụtụ afọ nke ọrụ ọnụ nke ndị lanarịrị ahụhụ, ndị na-alụ ọgụ maka ikike mmadụ, na ndị omeiwu. Ihe ịma aka dị ugbu a bụ ịhụ na e tinyere iwu a n’ọrụ nke ọma, site n’ịga n’ihu inwe ọchịchọ ndọrọndọrọ ọchịchị na akụrụngwa zuru ezu, ka o wee bụrụ na ọ dịghị nwaagbọghọ ọ bụla na Kọlọmbịa ga-ata ahụhụ ibi úgwù ọzọ.”
Onye isi ala Gustavo Petro ka ga-ebinye aka n’iwu ahụ ka ọ bụrụ iwu zuru oke, ma akụkụ kacha sie ike emechaala. Kọlọmbịa ekpebiela na ibi ụmụagbọghọ úgwù agaghịzi aga n’ihu.





