Ajụjụ a na-ajụbeghị n'okwu Epstein: O nwere ndị nwere ihe ịma aka bụ ndị na-enweghị Steeti ọ bụla?

Image by Mawa Rannahr. Used with permission.

Foto si n'aka Mawa Rannahr. A naara ikike tupu egosi ya ebe a.

Edemede a bụ nke Nikolai Levasov dere, site n'ikike nke The Global Movement Against Statelessness (GMAS), onye mmekọ Global Voices n'ịnye ọdịnaya. Edemede a bụ akụkụ nke usoro pụrụ iche nke Global Voices nke ọnwa Julaị 2026 nke isiokwu ya bụ, “Enweghị  Steeti.” Usoro a na-enye nghọta banyere nsogbu nke enweghị steeti na otú o si egbochi nnwere onwe ndị mmadụ ịga ebe ha chọrọ, ohere ha inweta agụmakwụkwọ, ịnweta ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ị nwere ike ịkwado mmbipụta akụkọ a site n'ịnye onyinye ebea.

Ruo ọtụtụ afọ, a na-atụle okwu metụtara Jeffrey Epstein, onye a mụrụ n'America na-ahụ maka ego ma bụrụkwa onye e kpere ikpe maka mpụ metụtara mmekọahụ, onye na-achịkwa otu mba ụwa dị iche iche na-azụ ahịa ụmụ agbọghọ na-erubeghị afọ kwesịrị maka mmegbu mmekọahụ, site n'echiche nke ike na mmetụta. Ihe ndị ọha na-elekwasị anya bụ ndị maara Jeffrey Epstein, ndị gara ụlọ ya, ndị aha ha pụtara n'akwụkwọ ikpe, yana ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị bara ụba, ndị ezinụlọ eze, na ndị ama ama nwere njikọ ya na ha.

Nlebara anya ahụ bụ ihe kwere nghọta. Ọha mmadụ kwesịrị ịma otú nnukwu usoro ịzụ ahịa mmadụ maka mmegbu mmekọahụ si nwee ike ịdị ogologo oge n'etiti ndị nwere nnukwu akụ na ụba na mmetụta. Ma oke mmasị dị n'aha ndị a ma ama emeela ka a ghara ilekwasị anya n'ajụjụ dị mkpa karịa: Ònye ka ndị e metọrọ ahụ́ ha bụ, gịnịkwa bụ ọnọdụ iwu mere ka mmegbu ahụ kwe omume?

Otu akụkụ nke okwu dịka ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a naghị atụle ya ma ọlị bụ enweghị steeti.

Ndị na-enweghị mba bụ ndị mba ọ bụla n'ụwa anaghị ahụta dịka ụmụ amaala ya. N'ihi na ha enweghị mba, ọtụtụ mgbe ha anaghị enwe akwụkwọ njirimara a pụrụ ịdabere na ya, enweghịkwa ohere doro anya ịnweta nchebe iwu, nnwere onwe ịga ebe ha chọrọ, ọrụ, agụmakwụkwọ, na ikike obodo ndị bụ isi. Dị ka UNHCR si kwuo, ndị na-enweghị mba nọ na United States nwere ike iche nnukwu ihe isi ike ihu, gụnyere njichi, ịga na-akọ onwe ha ugboro ugboro n'aka ndị ọchịchị, nsogbu ịnọgide n'ọrụ, nkewa ezinụlọ, na enweghị ohere ịnweta akwụkwọ njirimara ma ọ bụ imepe akaụntụ ụlọ akụ. Ndị ọkachamara ekwuola na  stateless people in the United States can face severe hardships, including detention, reporting requirements, difficulty retaining employment, family separation, and lack of access to identity documents or bank accounts. Experts have estimated that ihe dị ka mmadụ narị puku abụọ  iri na asatọ nọ na United States nwere ike ịbụ ndị na-enweghị mba ma ọ bụ ndị nọ n'ihe ize ndụ nke ịghọ ndị na-enweghị mba.

Eziokwu ahụ kwesịrị ime ka anyị jụọ ajụjụ ndị na-adịghị adị mfe gbasara okwu Epstein.

Ò nwere ndị n'ime ụmụaka a ndị na-erubeghị afọ kwesịrị ndị Epstein metọrọ ahụ́ ha bụ ndị na-enweghị mba ma ọ bụ ndị nọ n'ihe ize ndụ nke ịghọ ndị na-enweghị mba? Ò nwere ndị na-enweghị ike igosi na ha bụ ụmụ amaala mba ọ bụla, ndị na-enweghị paspọtụ, ndị dabeere n'aka ndị ọzọ maka enyemaka gbasara mbata na ọpụpụ, ma ọ bụ ndị na-atụ egwu ịgakwuru ndị ọchịchị n'ihi ọnọdụ iwu ha? Ò nwere ndị nnyocha, ndị ọka iwu gọọmenti, ndị ọka iwu na-agbachitere ndị eboro ebubo, ndị ọka ikpe, ma ọ bụ ndị nta akụkọ nyochara ihe a? Ọ bụrụ na ha emeghị ya, gịnị mere?

Ajụjụ ndị a abụghị naanị echiche efu iji kpalite mmasị. Ha sitere na ụdị usoro maọbụ omume a maara nke ọma n'ịzụ ahịa mmadụ: ndị na-eme mmegbu ga-achọ ndị kachasị mfe ịchịkwa. Onye ka bụ nwata, bụ ogbenye, nọ naanị ya, na-enweghị akwụkwọ iwu, na-enweghị mba, ma ọ bụ dabere n'aka onye ọzọ maka ebe obibi, njem, ma ọ bụ nchebe iwu, na-adị mfe ka e jiri ya mee ihe ma chịkwaa ya. Ndị ọrụ na-ahụ maka mbata na ọpụpụ na United States ekwenyela na ndị na-azụ ahịa mmadụ na ndị na-eme mmegbu mmekọahụ na-ejikarị enweghị ọnọdụ iwu mbata na ọpụpụ nke onye e metọrọ ahụ́ ya eme ihe iji jiri ya chịkwaa ma megbuo ya; Ngalaba Nchekwa Obodo nke United States (DHS) ekwuola kwa na enyemaka gbasara mbata na ọpụpụ bụ ngwá ọrụ dị mkpa n'inyere ndị e metọrọ n'ịzụ ahịa mmadụ aka ka ha nwee mmetụta nchekwa na ntụkwasị obi na mba ha. 

Maka ụmụaka na-enweghị mba, ihe ize ndụ ahụ ka ukwuu. Nwatakịrị na-enweghị mba nwere ike ghara inwe steeti ọ bụla doro anya nke nwere ọrụ ichebe ya. Ha nwere ike ha agaghị ama ebe ha ga-aga ịchọ enyemaka. Ha nwere ike ịtụ egwu ndị uwe ojii, ụlọikpe, ndị ọrụ mbata na ọpụpụ, ma ọ bụ ọbụna ịchụpụ ha n'ike gaa ebe ha na-amaghị. Ha nwekwara ike ịnọ n'okpuru ndị okenye na-achịkwa akwụkwọ njirimara ha, njem ha, ego ha, ohere ha nwere iji asụ asụsụ ha ghọtara, na ọbụna ibi ndụ ha. N'aka ndị na-azụ ahịa mmadụ, enweghị mba nwere ike ịghọ ngwá agha eji eme mmegbu.

N'agbanyeghị nke a, okwu banyere enweghị mba apụtabeghị nke ọma n'okwu ọha gbasara ikpe Epstein. E nwere ọtụtụ ihe kpatara ịgba nkịtị ahụ.

Nke mbụ, a ghaghị ichekwa ihe nzuzo nke ndị e metọrọ ahụ́. A gaghị ekpughe njirimara ma ọ bụ nkọwa onwe onye nke ndị lanarịrị mmetọ, karịsịa ma ọ bụrụ na ha bụ ụmụaka n'oge ihe ahụ mere, naanị iji mejuo ọchịchọ ọha ịmata ya. Ebumnuche nke ịjụ gbasara enweghị mba abụghị ịchọpụta ndị e metọrọ ahụ́, kama ọ bụ ịghọta ma ndị nnyocha na ụlọ ọrụ gọọmenti dị iche iche aghọtara na nke a bụ otu ndị nọ n'oké ihe ize ndụ.

Nke abụọ, United States a ka-nwebeghị usoro iwu zuru oke ma sie ike maka ndị na-enweghị mba. Dị ka UNHCR si kwuo, ịnọ n'ọnọdụ enweghị mba na United States adịghị enye mmadụ ọnọdụ iwu pụrụ iche ma ọ bụ uru ọbụla n'okpuru iwu America. Ọ bụ ezie na e nwere ụfọdụ ọganihu n'akụkụ nchịkwa n'afọ 2023, USCIS mechara kagbuo nduzi amụma ya gbasara ndị na-enweghị mba nke e wepụtara na 2023 n'afọ 2025 n'okpuru ọchịchị Onye Isi Ala Donald Trump, nke mere ka ndị na-akwado ikike ndị a nwee nchegbu n'ihi enweghị usoro doro anya.

Nke atọ, nghọta ọha gbasara enweghị mba ka dị ala n'ebe ọ dị ọjọọ. Ọtụtụ ndị nta akụkọ, ndị nnyocha, ndị ọka iwu, ndị ikpe, na ndị na-eme iwu ka na-ele ịbụ onye mba mmadụ anya dịka naanị igbe a na-akanye akara n'akwụkwọ. Ma nye ndị na-enweghị mba, igbe ahụ nwere ike ịnọchite anya ọtụtụ afọ nke ịdị n'ọnọdụ iwu na-edoghị anya, ụjọ, ịda ogbenye, na ịdị ka onye a na-adịghị ahụ anya. Mgbe ụlọ ọrụ gọọmentị dị iche iche anaghị aghọta ihe enweghị mba pụtara, ha nwere ike ghara ịmata ya ọbụna mgbe ọ metụtara mpụ ozugbo.

Nke a bụ ihe mere e ji kwesị ileba ikpe Epstein anya, ọ bụghị naanị dịka nnukwu ihere metụtara ndị ikom nwere ike na mmetụta, kama dịka ịdọ aka ná ntị banyere otu mmadụ nwere ike isi bụrụ onye iwu na ọha na eze na-adịghị ahụ anya. Ajụjụ abụghị naanị onye nwere ohere iru Epstein nso. Ajụjụ ahụ bụkwa onye na-enweghị ohere ọ bụla bara uru ịnweta nchebe.

Ka o doo anya, ihe ndekọ ndị ọha nwere ugbu a egosibeghị mmadụ ole, ma ọ bụrụ na e nwere onye ọbụla, n'ime ndị Epstein metọrọ ahụ́ bụ ndị na-enweghị mba. Nke ahụ n'onwe ya bụ nsogbu. Ndị nta akụkọ nnyocha, ndị ọka iwu, ndị na-akwado ikike mmadụ, na ndị nchọpụta kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ iji nyochaa ma enweghị mba, enweghị amaala, enweghị akwụkwọ njirimara, ma ọ bụ ọnọdụ mbata na ọpụpụ na-adịghị ike ọ pụtara ebe ọ bụla n'ihe ndekọ sara mbara gbasara Epstein. A ghaghị ime nke a n'ụzọ kwesịrị ekwesị, na-ekpugheghị ndị lanarịrị ma ọ bụ imebi ihe nzuzo ha. Ma a ghaghị ime ya.

Ụlọ akwụkwọ mahadum na ndị ọkà mmụta kwesịkwara ịmụ maka njikọ dị n'etiti enweghị mba na mmegbu mmekọahụ nke ọma karịa ka ha na-eme ugbu a. N'ụwa niile, ụmụaka na-enweghị mba so n'ime ndị kacha mfe ileghara anya ma sorokwa na ndị kacha sie ike ichebe. Ọ bụrụ na gọọmenti na ụlọ ọrụ anaghị agụta ha, ndị na-azụ ahịa mmadụ ga-eme ya.

Òtù ndị na-ahụ maka ikike mmadụ kwesịrị ịmepụta ụzọ nzuzo na nke na-ebu mmetụta mmerụ ahụ n'uche, ka ndị na-enweghị mba na ndị lanarịrị mmegbu mmekoahụ nwee ike ịkọ banyere mmegbu ha n'enweghị egwu. Ajụjụ ndị e depụtasịrị n'akwụkwọ kesaa, ịgba ajụjụ ọnụ, nnyocha, na ọmụmụ dabeere n'obodo nwere ike inye aka ịchọpụta usoro ndị usoro gọọmenti leghaara anya. Mana ọrụ a ekwesịghị ịmanye ndị lanarịrị ikwu karịa ihe ha dị njikere ikwu.

Ndị omeiwu kwesịkwara ime ihe. United States chọsiri ike usoro doro anya iji kpebie onye bụ onye na-enweghị mba, nchebe iwu maka ndị na-enweghị mba, ohere ịnweta akwụkwọ njirimara, na ụzọ ga-eduga n'inweta ọnọdụ obibi na-adịgide adịgide na ịbụ nwa amaala. Ọ bụ ya mere Congress nke United States kwesịrị iji weghachite ma kwadoo  Stateless Protection Act, ma ọ bụ iwu ọzọ nwere otu nchebe ndị bụ isi. Mgbe eweghachiri iwu ahụ n'afọ 2024, ndị kwadoro ya kọwara ya dịka iwu ga-enye ndị tozuru etozu ma na-enweghị mba nọ na United States ọnọdụ echekwara maọbụ echekwaghị, ikike ibi na-adịgide adịgide, na ụzọ isi bụrụ ụmụ amaala iwu kwadoro. Ịkwado iwu ahụ agaghị abụ naanị akara ngosi; ọ ga-abụ nchebe bara uru megide ịdị ka onye iwu na-adịghị ahụ anya, mmegbu, njichi, na mmetọ. Ma enweghị nchebe dị otu a, ndị na-enweghị mba na-anọgide n'ọnọdụ iwu na-edoghị anya ebe ndị na-azụ ahịa mmadụ, ndị na-eme mmegbu, na ọbụna usoro iwu dara ada nwere ike iji ohere nke enweghị amaala ha mee ihe.

Dịka onye bụbu onye na-enweghị mba na onye na-ahazi ọrụ obodo, ekwere m na ndị na-enweghị mba kwesịkwara ịbụ akụkụ nke mkparịta ụka a. Anyị maara ihe ọ pụtara ibi ndụ na-enweghị nchebe nke ịbụ nwa amaala. Anyị maara otú o si adịrị ọha mmadụ mfe ileghara ndị na-adabaghị n'usoro iwu anya. Mgbe ọ dị nchebe ime otú ahụ, anyị kwesịrị iweli olu anyị ikwu okwu — ọ bụghị n'ihi na ibu ọrụ nke ikpe ziri ezi dị n'ubu ndị e metọrọ ahụ́, kama n'ihi na ịgba nkịtị echebewo ọtụtụ ndị na-eme mmegbu ruo ogologo oge.

Ikpe Epstein tụrụ ụwa n'anya n'ihi na o gosiri otú akụ na ụba na inwe mmetụta pụrụ isi kpuchido mpụ na mmegbu. Ma o kwesịkwara imanye anyị iche eziokwu ọzọ ihu: ndị na-enweghị mba na-abụkarị ndị a na-adịghị ahụ anya. Ndị a na-adịghị ahụ anya na-adịkwa mfe ka e mee ha ihe ọjọọ.

Ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị ụmụaka ole na ole na-enweghị mba ka a dọtara n'ime usoro ịzụ ahịa mmadụ nke Epstein, eziokwu ahụ dị mkpa. Ọ dị mkpa n'iwu. Ọ dị mkpa n'okwu omume ọma. Ọ dịkwa mkpa nye nwatakịrị ọ bụla na-enweghị mba nke ka bi taa n'akụkụ nchebe na-adịghị ezu.

Ụwa etinyela ọtụtụ afọ na-ajụ onye nwere njikọ ya na Epstein. Ugbu a oge eruola ịjụ onye a hapụrụ na-enweghị nchebe — na ma enweghị mba o so nye aka mee ka nke ahụ kwe omume.

 

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.