Otu atụmatụ ndị a na-eme iji belata ọdịiche dijitalụ dị n’Afrịka si emetụta nnọchite anya Ụmụ Nwanyị.

Africa Wiki women Logo. Used with permission.

Akara njirimara Africa Wiki Women  A natara ikike tupu e gosi ya ebe a.

Na Africa, e nwere ọtụtụ atụmatụ na-agba mbọ ime ka ụmụ nwanyị nwee mpụta ihe ebe ọrụ dijitalụ dị. Africa Wiki Women bụ otu n’ime ọrụ ndị a a na-arụsi ike ịkwalite ntinye aka ụmụ nwanyị Africa n’imepụta na ịkekọrịta ihe ọmụma n’ịntanetị.

Ụmụ nwanyị n’akụkụ dị iche iche nke kọntinent Afrịka ka na-eche ọtụtụ ihe mgbochi ihu n’inweta teknụzụ na itinye aka n’ebe a na-emepụta ma na-ekekọrịta ihe ọmụma dijitalụ. Akụkọ ndị Global Voices bipụtara na mbụ gosiri na mmegbu na iyi egwu a na-eme ụmụ nwanyị n’ịntanetị bụ nnukwu ihe mgbochi na-egbochi ha itinye aka na ime ntinye na gburugburu mmekọ ihe ọnụ dị iche iche yana netwọkụ ozi. Ihe mgbochi ndị a na-ebute enweghị nhatanha n’ihe gbasara nnọchite anya, ebe ihe ndị ụmụ nwanyị Africa  mepụtara bụ nke n’enweghị onye na-ahụ ha ma ọ bụ depụta ha n’ụdị dijitalụ.

Site n’ihe mgbochi mnweta ndị a gbasara ịnweta ohere ka Africa Wiki Women ji malite. Ọ bụ ọrụ njikọ aka nke ụmụ nwanyị atọ: Ruby Damenshie-Brown si Ghana, Bukola James si Nigeria, na Pellagia Njau si Tanzania. Ha jikọtara aka iji nye ụmụ nwanyị ike site n'inye ọzụzụ,  ọgbakọ nkụzi ụmụ nwanyị itinye aka n'ọrụ, na mmemme nsokwunye na ndụmọdụ. Òtù a na-agba ụmụ nwanyị ume idekọ ọtụtụ ihe ndị dị ịrịba ama ụmụ nwanyị Africa mepụtara, ma kwalitekwuo ọdịnaya gbasara ụmụ nwanyị na atụmatụ ha n’ebe dijitalụ ihe ọmụma njikọ aka.

Ebumnuche Africa Wiki Women bụ ibelata ọdịiche dị n’otú ụmụ nwanyị si anọchite anya onwe ha n’ime usoro gburugburu nke Wikimedia ma mee ka ụmụ nwanyị Africa nwekwuo ike itinye aka n’ọrụ ndị dị n’ịntanetị. Site n’ịkwalite mmụta, njikọ aka ọnụ, na nduzi, Africa Wiki Women na-enye aka ime ka a nukwuo olu ụmụ nwanyị ọtụtụ ndị ọzọ karịa n'imepụta ihe ọmụma mepere emepe.

N’ụbọchị Ncheta ụbọchị Ụmụ nwanyị na mba ụwa nke 2026, otu Global Voices gbara Ruby Damenshie-Brown, onye bụ otu n’ime ndị guzobere Africa Wiki Women, ajụjụ ọnụ iji kọwaa usoro otu ahụ si arụ ọrụ na mmetụta ọ na-enwe n’akụkụ dị iche iche nke kọntinent Africa.

Mamisoa Raveloaritiana (MR): Gịnị kpaliri gị iji guzobe Africa Wiki Women?

Ruby D-Brown, CC BY-SA 4.0

Ruby Brown (RB): Lorsque j’ai rejoint la communauté Wikimedia en 2019, j’ai remarqué un écart frappant: la majorité des contributeurs étaient des hommes, et moins de 20 % des biographies sur la version anglophone de Wikipedia étaient consacrées à des femmes. Un grand nombre de ces articles ne comporte même pas d’images. Cela signifie que les histoires et les réalisations des femmes africaines étaient largement absentes sur Wikipedia. Cet écart est devenu encore plus évident lors d’un Edit-a-thon de 24 heures de Wiki Women in Red, où j’ai eu du mal à trouver suffisamment d’informations publiées pour écrire sur des femmes africaines notables. C’était frustrant, mais aussi révélateur: il ne s’agissait pas seulement d’un problème de représentation, mais d’un problème systémique.

La campagne Sheroes of Africa, une initiative qui met en lumière et valorise le rôle des femmes africaines, en avril 2022 a été un moment déterminé dans le développement, la culture, la politique et la transformation sociale du continent durant lequel les hommes dominaient la participation et la reconnaissance. Nous avons même dû réviser les critères du concours afin de pouvoir célébrer la contribution exceptionnelle d’une seule femme. Cette expérience a clairement montré la nécessité de créer un espace dédié où les femmes africaines pourraient être visibles, soutenues et valorisées.

Partant d’expériences similaires dans le mouvement Wikimedia et d’un profond désir de créer un espace qui relie les femmes africaines au-delà des simples campagnes ponctuelles, mes cofondatrices et moi avons créé Africa Wiki Women: une communauté par et pour les femmes africaines, centrée sur le mentorat, la collaboration et une représentation équitable dans tous les aspects de l’écosystème Wikimedia, de la contribution éditoriale à la gouvernance.

L'objectif est de permettre aux femmes africaines de raconter leurs propres histoires, de développer des compétences de leadership grâce au mentorat et de participer activement, en tant que contributrices et dirigeantes, au mouvement Wikimedia. Il s’agit de transformer un manque de visibilité en un changement durable.

Ruby Brown (RB): Mgbe m sonyere Wikimedia n’afọ 2019, achọpụtara m nnukwu ọdịiche. Ọtụtụ n’ime ndị na-eme ntinye bụ ụmụ nwoke, ma ihe na-erughị pasent iri abụọ nke akụkọ ndụ ndị dị na English Wikipedia bụ gbasara ụmụ nwanyị. Ọtụtụ n’ime akụkọ ndụ ndị a enweghịdị foto, nke pụtara na akụkọ ndụ na ihe ndị ụmụ nwanyị Africa mepụtara anaghị adịkarị na Wikipedia. Ọdịiche a bịara pụta ìhè karịa n’oge Ime ntunye nke Wiki Women in Red nke weere awa iri abụọ na anọ, ebe ọ nọ na-esiri m ike ịchọta ozi e bipụtarala zuru oke iji dee gbasara ụmụ nwanyị Africa ndị mepụtara ihe dị ịrịba ama. Ọ kpalirim mmụọ, mana ọ mekwara ka m ghọta ihe nke ọma. Ọ bụghị naanị nsogbu nke nnọchite anya, kama ọ bụ nsogbu dị n’usoro niile.

N’April 2022, mgbe ụmụ nwoke karịrị akarị n’ihe gbasara ime ntinye yana nnabata, agba nkuzi Sheroes of Africa, nke bụ atụmatụ na-amata ma na-eme ka ọrụ ụmụ nwanyị Africa pụta ìhè, ghọrọ oge dị mkpa na mmepe nke kọntinent ahụ, omenala ya, ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, na mgbanwe mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Anyị gararị n'ihu gbanwee ụkpụrụ asọmpi ahụ iji too nke ọma nnukwu ntinye pụrụ iche nke otu nwanyị mere. Ahụmịhe a gosipụtara nke ọma mkpa ọ dị ịmepụta ebe pụrụ iche ebe ụmụ nwanyị Africa nwere ike ịpụta ìhè, nweta nkwado, ma bụrụ ndị a na-akwanyere ùgwù.

N’ịdabere n’ahụmịhe ndị yiri nke a n’ime Wikimedia na ọchịchọ siri ike ịmepụta ebe ga-ejikọta ụmụ nwanyị Africa karịa naanị n'oge mkpọsa na-eme naanị otu ugboro, mụ na ndị ọzọ mụ na ha so guzobere Africa Wiki Women. Nke a bụ obodo ụmụ nwanyị Africa guzobere ma bụrụkwa nke ụmụ nwanyị Africa, nke dabere na ndụmọdụ na nlekọta, imekọ ihe ọnụ, na nnọchite anya dị nhatanha n’akụkụ niile nke usoro Wikimedia, site n’onyinye ime ndezi na ntinye ọdịnaya ruo n’ịchịkwa obodo.

Ebumnuche ya bụ ime ka ụmụ nwanyị Africa nwee ike ịkọ akụkọ nke ha, zụlite ikike nduzi site na ndụmọdụ na nlekọta, yana site n’itinye aka n’ọrụ dịka ndị na-eme ntinye na ndị ndu n’ime Wikimedia. Nke a pụtara ịgbanwe enweghị nhụta ka ọ bụrụ mgbanwe ga-adịgide adịgide.

RM: Gịnị mere o ji dị mkpa ka ụmụ nwanyị Africa nwee nnọchite anya n’ebe dijitalụ dịka Wikipedia?

RB: La représentation est essentielle, car la connaissance façonne le pouvoir. Wikipedia est souvent le premier point de référence pour des millions de personnes à travers le monde. Lorsque les femmes africaines sont absentes, cela envoie un message implicite: leurs expériences, leurs contributions et leur leadership seraient moins importants.

La représentation sur Wikipedia permet de corriger les déséquilibres historiques en documentant les réalisations de femmes qui ont souvent été négligées, et inspire les jeunes générations.

Elle joue aussi un rôle important dans l’information des décisions et des politiques publiques. Lorsque les contributions des femmes sont visibles et documentées, elles peuvent être utilisées par les chercheurs, les journalistes et les décideurs. En somme, la représentation n’est pas seulement symbolique, elle est structurelle: elle garantit que le récit mondial reflète la réalité et que l’expertise et le leadership des femmes africaines soient reconnus et valorisés.

RB: Nnọchite anya dị oke mkpa, n’ihi na ihe ọmụma na-ahazi ike. Wikipedia na-abụkarị ebe mbụ ọtụtụ nde ndị mmadụ na gburugburu ụwa na-aga ịchọta ozi. Mgbe akụkọ ụmụ nwanyị Africa na-adịghị ebe ahụ, ọ na-ezipụ ozi n’ụzọ na-apụtaghị ìhè na ahụmịhe ha, onyinye ha, na nduzi ha adịghị mkpa nke ukwuu.

Nnọchite anya ha na Wikipedia na-enye aka idozi enweghị nhatanha dị n'akụkọ ihe mere eme site n’idekọ ihe ụmụ nwanyị a na-elegharakarị anya rụzuru, ma na-akpali ọgbọ ndị na-eto eto.

Ọ na-arụkwa ọrụ dị mkpa n’inye ozi a na-eji eme mkpebi na iwu ọha. Mgbe a na-ahụ ma na-edekọ ntinye ụmụ nwanyị, ndị nnyocha, ndị nta akụkọ, na ndị na-eme mkpebi nwere ike iji ozi ndị ahụ. N’ezie, nnọchite anya abụghị naanị ihe atụ; ọ bụkwa akụkụ nke usoro. Ọ na-ahụ na akụkọ na echiche ụwa gbasara ụmụ nwanyị bụ ka o si dị n’ezie nakwa na a na-amata ma na-akwanyere nka na nduzi ụmụ nwanyị Africa ùgwù.

RM: Kedu mmetụta Africa Wiki Women nwerela ruo ugbu a?

RB: Depuis sa création, Africa Wiki Women a commencé à réduire l’écart de visibilité de manière significative. Plus de 500 femmes provenant de plusieurs pays africains ont été formées à la contribution sur Wikipedia et aux plateformes Wikimedia.

Elles ont créé et amélioré des centaines d’articles, des profils de femmes leaders, des pages consacrées à des organisations et initiatives dirigées par des femmes.

Au-delà des chiffres, l’impact est aussi personnel et transformateur. Nombreuses d'entre elles témoignent que leur implication leur a permis d'avoir une confiance en elles, de se reconnaître comme expertes dans leurs domaines et de défendre les histoires de leurs communautés.

L'initiative ne se limite pas à produire du contenu: elle vise aussi le renforcement des capacités et l’autonomisation. Chaque contribution représente à la fois un enrichissement du savoir et un pas vers plus de visibilité et de reconnaissance.

RB: Kemgbe e guzobere ya, Africa Wiki Women amalitela ibelata ọdịiche dị na nhụta ụmụ nwanyị nke ukwuu. Ihe karịrị ụmụ nwanyị narị ise sitere na mba Africa dị iche iche enwetala ọzụzụ banyere otu esi eme ntinye na Wikipedia na n’elu ikpo okwu Wikimedia.

Ha edepụtala ma ma deziekwa ọtụtụ narị isiokwu, profaịlụ ụmụ nwanyị bụ ndị ndu, na peeji gbasara òtù na atụmatụ dị iche iche ụmụ nwanyị na-edu.

Karịa ọnụ ọgụgụ ndị ahụ, mmetụta ya bụkwa nke na-eru n'onwe onye ma na-agbanwe ndụ. Ọtụtụ n’ime ha na-akọ otú itinye aka ha si nyere ha aka inwekwu ntụkwasị obi n’onwe ha, ịmata onwe ha dịka ndị ọkachamara n’ọrụ ha, na ịkọ akụkọ obodo ha.

Atụmatụ a ejedebeghị naanị n’ịmejupụta ọdịnaya. Ọ na-achọkwa ịkwalite nka na nnwere onwe. Ntinye ọbụla na-anọchite anya mmepe ihe ọmụma n’otu oge, ma bụrụkwa nzọụkwụ ọzọ n’ịbawanye ọhụ́ na nnabata.

RM: Gịnị bụ isi ihe mgbochi na-egbochi ụmụ nwanyị Africa ime ntinye n’elu ikpo okwu ihe ọmụma ndị dị n’ịntanetị?

RB: Plusieurs obstacles rendent la participation des femmes africaines à la création de savoir numérique plus difficile. L’un des premiers est l’accès à la technologie: toutes les femmes ne disposent pas d’un accès fiable à Internet ou à des appareils adaptés pour contribuer efficacement en ligne.

Il y a également la question de la littérature numérique. Même lorsque l’accès existe, certaines femmes manquent de confiance ou de compétences pour naviguer sur les plateformes comme Wikipedia ou Wikimedia Commons.

Les contraintes de temps constituent un autre défi important. Beaucoup de femmes doivent concilier responsabilités familiales et travail, ce qui leur laisse peu de temps pour contribuer à des projets de connaissance ouverte.

À cela s’ajoute le manque de représentation et de mentorat. Sans modèles visibles ou accompagnement, il peut être difficile pour les femmes de se percevoir comme contributrices ou expertes. Enfin, des barrières culturelles et systémiques persistent dans certaines communautés où le travail et le savoir des femmes sont moins reconnus ou moins documentés, ce qui complique la recherche de sources fiables nécessaires pour créer des articles.

Pour lever ces obstacles, nous combinons formation, mentorat, mise à disposition de ressources et plaidoyer afin de rendre la participation plus accessible et significative. Dans cette optique, nous avons lancé plusieurs programmes communautaires visant à renforcer les compétences et à accroître la participation des femmes.

RB: E nwere ọtụtụ ihe mgbochi na-eme ka itinye aka ụmụ nwanyị Africa n’imepụta ihe ọmụma dijitalụ sie ike. Otu n’ime ndị bụ isi bụ ịnweta teknụzụ. Ọ bụghị ụmụ nwanyị niile nwere ike inweta ịntanetị a pụrụ ịdabere na ya ma ọ bụ ngwaọrụ kwesịrị ekwesị ha ga-eji mee ntinye nke ọma n’ịntanetị.

E nwekwara okwu gbasara ịma nka dijitalụ. Ọbụna mgbe ha nwere ohere ịntanetị, ụfọdụ ụmụ nwanyị enweghị ntụkwasị obi ma ọ bụ nka zuru oke ime ntinye na ikpo okwu ndị dịka Wikipedia ma ọ bụ Wikimedia Commons.

Enweghị oge zuru ezu dịịrị ha bụkwa nnukwu nsogbu ọzọ. Ọtụtụ ụmụ nwanyị ga-ejikọtarịrị ọrụ ezinụlọ yana ọrụ ha, nke na-ahapụrụ ha obere oge iji mee ntinye n’ọrụ ihe ọmụma mepere emepe.

A na-agbakwunyekwa na nke a enweghị nnọchiteanya na ndụmọdụ ma ọ bụ nlekọta. Mgbe a na-enweghị ndị nlereanya a na-ahụ anya ma ọ bụ nkwado, ọ nwere ike isiri ụmụ nwanyị ike ịhụ onwe ha dịka ndị ga-emenwu ntinye ma ọ bụ ndị ọkachamara. Ọzọkwa, ihe mgbochi omenala na nke usoro ka dị n’ụfọdụ obodo ebe a naghị amata ma ọ bụ dekọọ ọrụ na ihe ọmụma ụmụ nwanyị nke ọma, nke na-eme ka ịchọta edensibịa ndị a pụrụ ịdabere na ha iji dee isiokwu dị iche iche sie ike.

Iji merie ihe mgbochi ndị a, anyị na-ejikọta ọzụzụ, ndụmọdụ na nlekọta, inye akụrụngwa, na ịkwado mgbanwe iji mee ka itinye aka bụrụ ihe bara uru nye ha karị. Maka nke a, anyị malitere ọtụtụ mmemme obodo iji kwalite nka ụmụ nwanyị ma mee ka ha nwekwuo ike ime ntinye.

RM: N’ọdịnihu, mgbanwe ndị dị aṅaa ka a ga-achọ iji belata ọdịiche dijitalụ dị n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị n’Africa?

RB: Réduire l’écart numérique entre les genres en Afrique nécessite des interventions structurelles et systémiques, et pas seulement une prise de conscience. Le soutien institutionnel et politique est essentiel : l’intégration de la participation numérique et de la contribution au savoir ouvert dans les programmes éducatifs, les initiatives d’ONG et les projets civiques peut contribuer à ancrer durablement ces pratiques. Il s’agit de s’assurer que les voix des femmes africaines soient documentées, amplifiées et valorisées, afin que les générations futures héritent d’un écosystème de connaissance plus inclusif, plus juste et plus représentatif.

RB: Ibelata ọdịiche dijitalụ dị n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị n’Africa chọrọ mgbanwe ndị metụtara usoro na nhazi obodo, ọ bụghị naanị ịmata ma ọ bụ ịkwanyere ndị mmadụ ugwu. Nkwado sitere n’ụlọ ọrụ dị iche iche na ndị ọchịchị dị oke mkpa. Mgbakwunye nke ntsonye na dijitalụ na ime ntinye n’ihe ọmụma mepere emepe n’ime usoro agụmakwụkwọ, atụmatụ ndị NGO, na ọrụ obodo nwere ike inye aka mee ka omume ndị a guzosie ike ruo ogologo oge.

Nke a pụtara ịhụ na a na-edekọ olu ụmụ nwanyị Africa, na-eme ka a nụkwuo ya, ma na-akwanyere ya ùgwù, ka ọgbọ ndị ga-abịa nwee ike iketa usoro ihe ọmụma nke ziri ezi, nke na-anabata mmadụ niile, ma na-anọchite anya mmadụ n’ụzọ ka mma.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.