
Nka sitere n'aka Marcas, e jiri ya site n'ikike o nyere.
Edemede a, nke Daniel Stanley, Marianna Araujo na Diogo Santos dere, ka e bipụtara ebe a site na nkwekọrịta dị n’etiti Instituto Fogo Cruzado na Future Narratives Lab na Global Voices. Maka ozi ndị ọzọ, lee akụkọ a bụ “Ịma Aka Nkọwa Banyere Ime Ihe Ike Ndị Uwe Ojii n’Obodo Favelas.”
N’afọ 2025, ka Instituto Fogo Cruzado, otu ọha mmadụ na-ahụ maka ileba anya n’ime ihe ike eji ngwa agha eme na Brazil, na otu nnyocha dị na United Kingdom, nke aha ya bụ Future Narratives Lab nọ na-emecha nchọpụta banyere ozi a na-ezipụta gbasara ime ihe ike ndị uwe ojii n’obodo favelas, otu ihe omume jọgburu onwe ya mere nke wụrụ anyị akpata oyi. N’otu mwakpo e mere na favela dị na Rio de Janeiro n’ụbọchị nke iri abụọ na asatọ n'ọnwa Ọktoba, ndị uwe ojii Brazil gburu mmadụ otu narị iri abụọ na abụọ, nke a bụ ọrụ ndị uwe ojii kpatara ọnwụ mmadụ kachasị njọ n’akụkọ ihe mere eme obodo ahụ. Nnyocha e mere n’ụbọchị olenaole sochiri mwakpo ahụ gosiri na ọtụtụ ndị mmadụ ka na-akwado ụdị omume a, n’agbanyeghị ihe akaebe dịrịla ogologo oge na-egosi na mwakpo ndị a anaghị enye aka n’ibelata ogo mpụ.
N’afọ 2023, Brazil dekọtara mmadụ puku iri anọ na ise na narị asaa na iri anọ na asaa ndị a kpachaara anya gbuo n’ike — dịka otu n’ime ọnụọgụgụ kasị elu n’ụwa. Dị ka ọtụtụ mba ndị na-agbaso ọchịchị onye kwuo uche ya, mba a anọọla ogologo oge na-eche ihu nsogbu nke ọtụtụ ndị mmadụ na-akwado ime ihe ike nke steeti, nke nyekwarala aka n’ime ka egwu, echiche na ihe ga-adị ga-adị, na enweghịzi mmetụta n’ebe ime ihe ike dị gbasaa n’obodo ahụ. Ịgbanwe ọnọdụ a ga-adị mkpa ịghọta ihe ndị nwere ike inye aka n’ịgbagha ụfọdụ echiche n'ezighi ezi. Nkwado dị ukwuu e nyere mwakpo ndị e mere n’ụbọchị nke iri abụọ na asatọ n'ọnwa Ọktoba, n’agbanyeghị ọnwụ ndị ọ kpatara, gosipụtara mkpa ọ dị ka òtù ndị gbanyere mkpọrọgwụ n’obodo chọpụta ụzọ e si ezipụta ozi nke ga-emetụta ọha mmadụ, karịsịa n’ọnọdụ ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị kewara ekewa dịka nke Brazil.
Ịghọta ihe na-eme ka ndị mmadụ kwadoo ime ihe ike
Otu ọha mmadụ na-arụ ọrụ gbasara okwu ndị na-akpata arụmụka na-eche nsogbu ihu: ọtụtụ ndị ha chọrọ iru na-akwado atụmatụ na omume ndị na-emegide ọdịmma ha, ma o siri ike, dikwa ọnụ ahịa, iru ha maka ebumnuche nchọpụta, karịsịa n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-edoghị anya ma ọ bụ nke kewara ekewa nke ukwuu. Otu ndị dị otu a, karịsịa ndị dị na mba ndịda ụwa, na-enwekarị nsogbu enweghị ego na akụrụngwa ha ga-eji mee ụdị nchọpụta miri emi ndị otu ọha mmadụ dị na mba ugwu ụwa na-eji arụ ọrụ. Òtù mkparịtaụka na ajụjụ ọnụ nke dabere n'ịghọta echiche mmadụ nke ọma bụ ụzọ a na-agbasokarị iji ghọta ihe mere ndị mmadụ ji nwee echiche ha nwere, mana ha na-ewe ogologo oge ma na-achọkwa nnukwu ego, nke na-emekarị ka obere òtù ndị na-arụ ọrụ kachasị mkpa ngwa ngwa ghara inwe ike iji ha.
Ọ bụrụkwanụ na ngwaọrụ AI nwere ike ibelata ihe mgbochi ndị a ma mee ka obere òtù ndị gbanyere mkpọrọgwụ n’obodo nwee ike ịghọta otu ndị ha chọrọ iru si eche echiche? Ojiji ngwaọrụ AI n’ụzọ sara mbara n’ihe ndị mmadụ na-eme kwa ụbọchị emepụtala ohere ka dị ukwuu iji mụta nkà nchọcha na ịhazi ozi. Mana, dị ka ọ na-adị n’ihe ọhụrụ ọ bụla e mepụtara n’ụzọ nkanụụzụ, e nwere ihe gbasara ụkpụrụ omume kwesịrị ịtụle n’iji ụdị nkanụụzụ dị otu a eme ihe, tinyere ihe ọ pụtara iji ngwaọrụ ndị nnukwu ụlọọrụ teknụzụ mepụtara na nsogbu gburugburu ebe obibi ebe nchekwa data pụrụ ịkpata.
O doro anya na ọ bụghị teknụzụ a pụrụ iji eme ihe n'ebughị ụzọ tụlee ya nke ọma. Ka anyị na-emepụta ngwa ọrụ ahụ, anyị nwere ọtụtụ mkparịtaụka banyere otu anyị ga-esi jiri AI mee ihe n’ụzọ dabara n’echiche na ebumnuche anyị n’ozuzu ha. N’ikpeazụ, anyị kpebiri ịnọgide n’ụzọ anyị hụrụ dịka nke nwere ike inye aka n’ịkwalite mmegharị maka ikike mmadụ, ebe anyị na-eme ihe kpọmkwem iji chekwaa ihe nzuzo ndị ọrụ, na-ebute ụzọ ogbugbo ndị dabere na akụrụngwa mmepụta mepere emepe, ma na-ahazikwa ihe anyị ga-eme n’ọdịnihu iji lebara nchegbu ndị ọzọ anya.
Iji AI chọpụta echiche ndị zoro ezo n’azụ omume mmadụ
Tupu ọrụ a amalite, Future Narratives Lab ewepụtala ngwaọrụ AI Interviewer e mebere kpọmkwem maka òtù dị iche iche nke ọha mmadụ na-achọ ịghọta ndị ha chọrọ iru n'ọrụ ha. Mgbe e mechara nnwale ngwa ọrụ ahụ nke ọma n’ọrụ a na-anwale ozi dị iche iche gbasara usoro ikpe mpụ na United Kingdom, Instituto Fogo Cruzado bịakwutere Future Narratives Lab ka o nyere aka n’iji ngwa ọrụ ahụ rụọ ọrụ ọhụrụ gbasara ime ihe ike steeti na-akwado na Brazil. Ego e jiri kwadoo ọrụ a sitere n’aka International Resource for Impact and Storytelling (IRIS), dịka akụkụ nke emume ha bụ “New Tech, New Rules.”
Isi ihe e ji ngwa ọrụ a mee n’ọrụ a bụ ime nchọpụta sitere n’aka ndị mmadụ n’onwe ha, nke tọrọ ntọala maka imepụta ụzọ ọhụrụ e si ezipụta ozi na imepụta akụkọ ndị na-emegide akụkọ ndị na-achị echiche. A gbara ajụjụ ọnụ miri emi iri abụọ na asatọ nke dabere na nyocha nke echiche na ahụmịhe ndị sonyere, site n’iji ọjụ ajụjụ AI nke dabere na chatbot, ebe onye ọ bụla sonyere nwere ike isonye na mkparịtaụka ahụ site n’iji ngwaọrụ nke ya, site na URL na koodu onye nsonye e nyere ya.
A họpụtara ma kpọọ ndị sonyere n’ọrụ ahụ dabere na njirimara igwe mmadụ nke nchọpụta akwụkwọ e mere na mbụ gosipụtara na ha nwere ike ịkwado ka e nwekwuo ime ihe ike ndị uwe ojii dị ka ụzọ isi belata mpụ: ndị kwuru na ha bụ ndị otu Kraịst (Ndị evangelical ma ọ bụ Roman Catholic), bụ ndị n'agụchabeghị agụmakwụkwọ dị elu, na ndị ego ha na-enweta n’ezinaụlọ erughị BRL 500 (ihe dị ka USD 98).
Ọjụ ajụjụ AI ahụ mere mkparịtaụka ahaziri nke ọma ma bụrụ nke a haziri iche maka onye nsonye ọ bụla, ebe ọ na-agbanwekwa dabere n’azịza onye ahụ, ruo ihe dị ka nkeji iri atọ, ọ jụkwara ajụjụ ndị na-esote azịza ndị nsonye ma nyochaa ebe echiche ha na-emegiderịta onwe ha na ihe kpatara ha ji nwee echiche ndị ahụ. Ajụjụ ọnụ ọ bụla dabere n’otu ntuziaka zuru ezu nke kọwara ihe nchọpụta ahụ chọrọ imezu na ihe ndị mere n’oge a na-eme ya, ebe a na-ahazikwa ajụjụ ọnụ ahụ n’ụzọ pụrụ iche dabara n’ebe onye nsonye ọ bụla nọ. Iji gosi otu ajụjụ ọnụ a na-emekarị si aga:
- Ọ na-amalite mgbe niile site n’ajụjụ a: “Gịnị na-abịa gị n’uche mgbe ị nụrụ okwu a ‘ime ihe ike’ na Brazil?” Ndị nsonye na-aza ajụjụ ahụ site n’ikwu ụdị echiche dị iche iche na-abata ha n’uche, ma mgbe ụfọdụ, ha na-akọkwa ahụmịhe ụfọdụ ha nwetụrụla.
- Ọjụụ ajụjụ ahụ ga-ajụzị ajụjụ ndị dabara n’azịza onye nsonye iji mee ka ihe ọ kọwara doo anya ma ọ bụ mee ya ka ọ kọwakwuo ya ebe ọ dị mkpa. A na-enyochakwa isiokwu ndị ọzọ, dịka ndị bụ isi ihe ike dị otu a na-emetụta na onye ọ bụ ọrụ ya ibelata ya.
- Otu n’ime isi ihe dị mkpa bụ igosi ndị nsonye data gọọmentị gosiri na ọnụọgụgụ ndị e gburu egbu adaala, ma rịọ ha ka ha kwuo ihe ha chere banyere ya. Ọtụtụ n’ime ha gosipụtara ihe ijuanya ma ọ bụ njụ na data ahụ bụ eziokwu; e mesịkwara nyochaa azịza ndị ahụ nke ọma iji nweta nkọwa ndị ọzọ.
- Ajụjụ ndị ọzọ lebara akụkụ dị iche iche na nke pere mpe gbasara isiokwu ahụ anya, tinyere echiche ndị nsonye banyere ime ihe ike ndị uwe ojii kpọmkwem, ihe ndị bụ isi na-akpata mpụ, na ihe omume ha tụrụ aro ka e mee iji lebara nsogbu ahụ anya.
Usoro imepụta ozi nke sochiri ya kpughere ọtụtụ nghọta ọhụrụ na ohere dị iche iche nwere ike ime ka ndị mmadụ gbanwee echiche ha.
Ihe ajụjụ ọnụ AI na-eme ka o kwe omume
Ikike ime ọtụtụ ajụjụ ọnụ n’otu oge na n’ebe dị iche iche na-eme ka otu dị iche iche nwee ike ime ka nchọcha ubi nke na-ewekarị ọtụtụ izu mee n’ime naanị ụbọchị olenaole, ebe ego a na-eji eme ya na-adịkwa obere. Maka otu ọha mmadụ na-enweghị ezigbo ego na akụrụngwa zuru ezu n’akụkụ dị iche iche nke ụwa, ngwa ọrụ a na-eweta nnukwu mgbanwe: ọ na-eme ka o kwe omume ime nchọpụta miri emi banyere ihe ndị nwere ike ime ka ndị ha chọrọ iru gbanwee echiche ha.
Otu a, Fogo Cruzado jiri ngwaọrụ ahụ nyochaa ihe ndị na-akpata echiche na nkwenye ndị mmadụ nwere n’ime obi gbasara ime ihe ike ndị uwe ojii. Ajụjụ ọnụ AI ndị ahụ, tinyere ahụmịhe na nka ha nwetara kemgbe ọtụtụ afọ, tụrụ aro mpaghara atọ nwere ike ịbụ ebe ozi e mere n’ụzọ kwesịrị ekwesị nwere ike ime ka ndị na-ejighị n’aka kwenye:
- Enweghị nkwadebe zuru ezu nke ndị uwe ojii na-ebelata ịdị irè nke mwakpo ha
- mwakpo ndị na-eduga n’ọnwụ ndị aka ha dị ọcha site na mgbọ na-efepụ efepụ;
- Enweghị ike mwakpo ndị uwe ojii idozi ihe ndị bụ isi na-akpata mpụ.
Nchọpụta ntọala a dugara ozugbo n’usoro ọzọ nke ọmụmụ ahụ: inyocha ihe karịrị ndị Brazil narị ise sitere n’otu ìgwè mmadụ ndị e chere na ọ ga-esi ike ime ka ha gbanwee echiche ha, site n’iji ụdị nnwale RCT, iji ghọta nke n’ime nhọrọ ozi ndị a nwere ike inye aka n’ibelata nkwado ndị mmadụ na-enye mwakpo ndị uwe ojii.
Ihe anyị chọpụtara
Ozi kacha rụọ ọrụ nke ọma esiteghị n’ilekwasị anya n’ebe ndị e mere ihe ike nọ, ọmịiko, ma ọ bụ ikpe na-ezighị ezi nke ahaziri ahazi — bụ ụdị nhazi akụkọ ndị na-akwado mgbanwe na ngalaba a na-agakarị mbụ. Ọ bụ nkatọ dị ire banyere ikike ndị uwe ojii: “A zụbeghị ndị uwe ojii nke ọma ma ọ bụ kwadebe ha nke ọma, ya mere, ime mwakpo n’ime favelas ndị mmadụ juru naanị na-eduga n’ọgụ egbe ndị na ọtụtụ ndị ọzọ na-enweghị ihe ọjọọ ha mere ịbụ ndị e merụrụ ahụ. Ụdị nhazi okwu a sitere kpọmkwem n’ajụjụ ọnụ AI mere, ebe ndị sonyere na ya na-akọwa ndị uwe ojii ugboro ugboro dị ka ndị a kwadebeghị nke ọma karịa ịbụ ndị obi ọjọọ.
Ihe ọzọ dị ịrịba ama bụ na ndị sonyere bụ ndị Evangelical, bụ ndị a na-echekarị na ha na-akwado echiche mgbanwe n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Brazil, karịsịa n’ọnọdụ ebe ụlọ ụka na ndị ọrụ nchekwa na-arụkọkarị ọrụ, adịghị akwado mwakpo ndị uwe ojii nke ukwuu ma e jiri ha tụnyere ndị ọzọ. Azịza ha ha ji aka ha dee kpughere echiche gbasara ụkpụrụ omume nke gbadoro ụkwụ na mgbaghara na ịmalite ndụ ọhụrụ, n’ịkatọ usoro ndị na-akpata nsogbu n’obodo, na n’enweghị ntụkwasị obi n’ebe ndị nọ n’ọkwa dị elu nọ. Ihe ndị a adabaghị nke ọma n’echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ntaramahụhụ a na-ekwukarị na ndị Evangelical na-akwado.
Nnukwu ihe nke dị n'ihu
A na-akọwakarị ndị bi na favela n’ụzọ na-ezighị ezi n’akụkọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke mgbasa ozi, ma n’ime obodo ma n’ụwa niile. Nchọcha anyị na-eme ka a nụ olu ha n’ụzọ a na-adịghị emekarị. Ọ na-eme ka anyị chegharịa echiche banyere ndị na-ege ntị anyị weere na “a pụrụ ime ka ha kwenye.”
Usoro AI nke dị ọnụ ala, ngwa ngwa, ma dịkwa mfe ịnyefe n’ebe ndị ọzọ bụ otu n’ime isi ihe mere anyị ji nwee ike ime nke a, na ebumnuche anyị bụ ka òtù ndị ọzọ gbanyere mkpọrọgwụ n’obodo nwee ike ime otu ihe ahụ. Na mbụ, Fogo Cruzado ekeela ozi gbasara usoro a n’etiti òtù Brazil iri abụọ site n’otu “ogige nkwukọrịta,” tupu ntuliaka izugbe dị mkpa a ga-eme n’Ọktoba 2026, ebe nchekwa ọha mmadụ ga-abụ otu n’ime isi okwu a ga-atụle.
Ka mmetụta AI na-enwe n’obodo na-aghọwanye isiokwu a na-arụ ụka banyere ya nke ukwuu, atụmanya na ibu ọrụ na-abawanye iji hụ na ojiji ya na-atụle ọtụtụ ihe gbasara ụkpụrụ omume dị n’okwu a.
N’etiti otu anyị, anyị chere na anyị nọ n’ọnọdụ siri ike ime nke a — Future Narratives Lab ebiputala ọtụtụ ihe gbasara mmetụta ọjọọ nke iji AI a na-ejikarị eme ihe, ebe Fogo Cruzado nwekwara mmekọrịta chiri anya na obodo ndị gbanyere mkpọrọgwụ n’obodo iji hụ na a na-atụle echiche ha.
A malitelaarị igbaso ụzọ ụfọdụ iji mee ka ọjụ ajụjụ AI pụọ n’iji ụdị AI “frontier” ndị na-achọkarị ịnakọta ma jiri nnukwu data, dịka Claude ma ọ bụ ChatGPT, gaa n’iji ụdị AI ndị na-asọpụrụ nzuzo na nchekwa data, ma na-agbasokwa ụkpụrụ dị elu n’ozuzu ha. N’oge anyị na-ahụ ka echiche populizim na-arị elu n’ụwa niile, ohere nke ịgbanwe echiche mmadụ yiri ihe siri ike ime, ma ebe teknụzụ na-enye anyị ohere izute ndị na-ege ntị n’ebe ha nọ, anyị na-abịaru nso n’iwulite ike nke mmadụ niile ọnụ.






