Itule ihe mgbagwoju anya ndọrọ ndọrọ ọchịchị metụtara ogbugbu ndị a na-eme na Benue, Naịjirịa

Nigerian soldiers

Ndị agha Naịjirịa na-eme ọzụzụ agha nke e ji ezigbo mgbọ eme. Foto sitere n’aka USAFRICOM site na Wikimedia Commons. Ikikere: CC BY 2.0 Deed.

Site n'aka Jude Onuzurike

Steeti Benue dị na Naịjirịa, bụ mpaghara ala dị n’etiti mpaghara Middle Belt na-enwe ọgbaghara, nke dị n’agbata ugwu ndị Alakụba na ndịda nke Ndị  otu Kraịst ka juputa na ya, aghọọla ebe isi nsogbu okpukperechi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị. Ọ bụ ezie na nsogbu a amalitela kemgbe ọtụtụ iri afọ, ọ kawanyela njọ kemgbe afọ 2015 ma banye n’oge ọhụrụ nke ọgbaghara karịa n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya, na-etinye ndụ ụmụ amaala Benue n’ihe egwu nke ịdị adị.

Mwakpo ọgbaghara aghọọla ihe a na-ahụkarị nke ukwuu, ebe ndị otu ndị omekome egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri kemgbe onye isi ala Bola Tinubu malitere ọchịchị ya n’afọ 2023. Benue bụ steeti kacha nwee mmetụta ọjọọ site na mwakpo ndị a, ebe ihe karịrị mmadụ puku asaa anwụọla ruo ugbu a, dịka akụkọ Amnesty International si kwuo.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ okpukperechi na-akpali ọgbaghara a, ebe Open Doors, otu òtù Ndị Kraịst na-ahụ maka ileba anya n’ọnọdụ ha, kpọpụtara Naịjirịa dịka obodo kacha eme ihe ike megide ndị otu Kraịst ogologo afọ asatọ n’usoro.

Mwakpo mere n’ọnwa Juun afọ 2025, nke a na-akpọzi Ogbugbu Ọtụtụ Mmadụ na Yelwata, gosipụtara nnukwu mgbanwe n’ụdị ọgbaghara a na-aga n’ihu. Mwakpo ahụ mere n’ime abalị, ebe e gburu ihe karịrị ụmụ amaala obodo ahụ narị abụọ ka ha na-ehi ụra n’obodo Yelwata, nke mere ka Pope Leo VI kwuo okwu banyere ya, kpọọ ya ogbugbu dị egwu. Okwu Pope ahụ dọtara mmasị mba ụwa ma kpalie gọọmenti Naịjirịa — nke na-enwebeghị nnukwu ihe ha mere ịkwụsị ọgbaghara ahụ — maka ileba okwu a anya.

Mgbagwoju anya na ọtụtụ akụkụ dị iche iche nke nsogbu a

Benue, nke a na-akpọ “nkata nri nke mba,” bụ ebe ndị ọrụ ugbo bi nke ukwuu, ma na-arụkwa ọrụ dị oke mkpa n’ịmepụta na ikesa nri n’ala Naịjirịa niile; Otu ọ dị ugbu a, ọ na-agba mbọ ịnagide ọnụọgụgụ buru ibu nke ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha n’ime obodo, ma na-echekwa nsogbu nchekwa ndị ọzọ ihu.

Ọtụtụ n’ime ọgbaghara dị na steeti Benue sitere n’aka ndị otu ndị Alakụba ji ngwa agha, bụ ndị na-agbasa site na Sahel na-agbada n’ebe ndịda ruo na mpaghara Middle Belt. Ọtụtụ n’ime ndị na-eme mwakpo a bụ ndị na-azụ anụmanụ na-akwagharị site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ, ndị a maara dị ka ndị na-azụ ehi Fulani, nsogbu ihu igwe emeela ka ha kwaga n’ebe ndịda, n’ihi na ala anụmanụ ha na-ata ahịhịa akpọnwụọla, isi mmiri dị iche iche ataala n’akụkụ mpaghara ahụ.

Nke a emeela ka ndị Fulani na-azụ ehi na-achọsiwanye ike inweta ala dị mma mala ihe ọkụkụ, nke a na-ebute nnukwu ọgbaghara n’etiti ha na ndị ọrụ ugbo bi n’otu ebe na Benue na steeti ndị ọzọ dị na mpaghara Middle Belt. N’agbanyeghị nke ahụ, mmekọrịta ndọrọ ndọrọ ọchịchị dịrịla ogologo oge na-emetụtakwa mwakpo ndị a — ọzọkwa, ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-eme akatọọla gọọmentị Naịjirịa nke ukwuu n’ihi na nzaghachi ya n’ọgbaghara a adịchaghị ike ma ọ bụ sie ike dịka a tụrụ anya ya.

Pasentị iri iteghete na asatọ nke ndị bi na Benue bụ Ndị  otu Kraịst, nke mere ka ọtụtụ ndị chee na mwakpo ndị a sitere n’ọchịchọ okpukperechi, mana nke a na-eme ka ọdịdị ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị mgbagwoju anya na ọtụtụ akụkụ nke nsogbu a dị mfe karịa otú ọ dị n’ezie.

N'ụbọchị nke iri na asaa n'ọnwa Juun nke afọ 2025, Onyeisi ndị agha Naịjirịa n’oge ahụ, General Christopher Gwabin Musa, kwuru n’oge nnọkọ ya na ndị nta akụkọ na esemokwu banyere ala, ehi ịta ahịhịa n’enweghị oke ọ bụla ma ọ bụ n'ụzọ na-ekwesighi ekwesi na ịzụ anụmanụ bụ isi ihe na-akpata ogbugbu ndị mmadụ na Benue. Ọtụtụ ndị Naịjirịa nwekwara otu echiche a, na-ekwu na ogbugbu ọha mmadụ ndị a sitere na omume ịnapụ ndị ọzọ ala ha nke e kpuchiri n’ụdị esemokwu okpukperechi.

Gọvanọ Steeti Benue, Hyacinth Alia, kwuru n’otu ụbọchị ahụ na mpaghara ọchịchị ime obodo iri na asaa n’ime iri abụọ na atọ dị na Steeti Benue nọ n’okpuru mwakpo nke na-eme mgbe niile, ma kwuo na enyemaka gọọmentị etiti na-enye na-enyere aka ibelata ọnụọgụgụ ahụ. Otu ọ dị, mwakpo ndị a maliteghachiri na 2026 na mpaghara ọchịchị ime obodo Agatu, Gwer West na Guma na-egosi na ndị ọchịchị achọtabeghi ogbugbo ga-adịgide adịgide nye nsogbu a.

Ka otu izu gasịrị, n’oge nnọkọ zuru ezu nke Ụlọ Ndị Nnọchiteanya Naịjirịa, Terseer Ugbor, onye otu na-anọchite anya Federal Constituency Kwande/Ushongo, tiri mkpu na ndị Fulani na-azụ anụ ewerela pasent iri anọ nke ala dị na Steeti Benue, ka ha na-achụpụ ọtụtụ puku ụmụ amaala obodo ahụ n’ebe obibi ha. N’agbanyeghị oke egwu mwakpo ndị a na-etinye n’ịdị adị nke ụmụ amaala, nzaghachi agha na-enye n’ihe gbasara nchekwa adịghị abịa ngwa ngwa ma ọ bụ bụrụ nke siri ike ma kwụsie ike, nke na-ebute ajụjụ gbasara ma aka ndị nọ n’ọkwa dị iche iche n’ime ndị agha ọ dị n’ihe na-eme.

Iji chebe onwe ha, ndị obodo Benue kpebiziri imewe ihe niile n'onwe ha, site n’ikepụta otu ndị nche obodo iji gbalịa iguzogide mwakpo ndị a na-eme n’enweghị nkwụsị. Otu ọ dị, akụrụngwa ndị otu ndị nche obodo nwere ezughị oke n'ebe ọ dị ukwuu, ha nọkwa n’ọnọdụ adịghị mma nke ukwuu n’ihi na ndị na-awakpo ha nwere ngwa agha ọgbara ọhụrụ, tinyekwara na ha nwere ụzọ ha si enweta ozi nzuzo banyere ha site n’aka ndị ha na ha nwere njikọ. Nke a bụ n’ezie ọnọdụ dịka iji mma gaa n’ọgụ eji egbe alụ, ya mere, ndị otu ndị nche obodo na ndị obodo ndị ahụ n’onwe ha, bụ ndị ha na-anọchite anya, nọkarị n’aka ebere ndị na-awakpo ha.

Nzaghachi gọọmentị nye mwakpo ndị mere n’oge na-adịbeghị anya

Mgbe Pope kpọchara oku ka e mee ihe, ndị ọrụ gọọmentị Naịjirịa malitere ileba anya n’okwu gbasara ọgbaghara dị na Benue. Ka ụbọchị atọ ka ogbugbu e gburu ndị mmadụ na Yelwata gasịrị, Onyeisi ala Naịjirịa, ya na ndị isi ndị ọrụ nchekwa ya, gara Benue ịkasi ndị ihe ahụ metụtara obi ma kwupụta ọmịiko ha. N’ebe ahụ, James Ayatse, bụ onye ọchịchị ọdịnaala kachasị elu nke ndị Tiv bụ ụmụ amaala obodo ahụ, ji okwu siri ike nabata ha, na-ekwusi ike banyere ozi ụgha na ụzọ na-ezighi ezi e si egosi ọnọdụ ọgbaaghara nchekwa dị na Steeti Benue. O kwuru, sị:

It is not herder/farmer clashes, it is not communal clashes, it is not reprisal attacks, or skirmishes. What we are dealing with here in Benue is a calculated, well planned, full-scale genocidal invasion and land grabbing campaign by Herder terrorists and bandits, which has been ongoing for decades and is worsening every year.

Ọ bụghị ọgụ dị n’etiti ndị na-azụ anụmanụ na ndị ọrụ ugbo ka anyị na-ekwu maka ya, ọ bụghịkwa ọgụ dị n’etiti ime obodo dị iche iche, ọ bụghịkwa mwakpo mmegwara ma ọ bụ obere ọgụ. Ihe anyị na-eche ihu ebe a na Benue bụ mwakpo dị ukwu e mere n’ụzọ doro anya nke ọma, nke ndị na-eyi ọha egwu na ndị ohi na-azụ anụmanụ haziri nke ọma iji kpochapụ ndị mmadụ ma weghara ala ha. Ọgbaaghara a adịla kemgbe ọtụtụ iri afọ, ọ na-akawanye njọ kwa afọ.

Nleta ahụ mechiri mgbe onye isi ala jụrụ Onye isi ndị Uweojii ihe mere na e jidebeghị onye ọ bụla kemgbe mwakpo ahụ. N’oge ahụ, ọ nataghị azịza doro anya nke nwere ezi nkọwa. E jidere ụfọdụ ndị n’ụbọchị ndị sochiri mwakpo ahụ, mana mgbe e bipụtara isiokwu a, ọnwa asatọ ka mwakpo ahụ gasịrị, e kpebeghị ikpe ma ọ bụ maa onye ọ bụla n’ime ndị mere ihe ahụ ikpe.

Nzaghachi a na-adịchaghị ike na-egosikwa ọzọ na enweghị nha dị n’usoro ikpe ziri ezi na Naịjirịa. Ihe akaebe na-egosi na agbụrụ mmadụ si nwere ike ime ka e soro ihe iwu kwuru ma ọ bụ ka eleghara ya anya. Ọ bụghị nke mbụ gọọmentị dị na Abuja na-eleghara Central Nigeria anya. N’ihi ọnọdụ ala Benue na agbụrụ dị iche iche bi na ya, a na-ewere Steeti Benue dị ka mpaghara ndị pere mpe, nke mere ka a na-ele ya anya dị ka ebe a pụrụ ileghara anya n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ihi nke a, ọ na-adaba n’aka ebere nke ndị agbụrụ ndị ọzọ buru ibu, bụ ndị nwere nnukwu ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

N’ihi nke a, nnukwu esemokwu dị n’etiti ndị Benue na mgbasawanye ndị Fulani na-aga n’ihu. Nke a bụ otu n’ime ihe ndị butere ogbugbu ndị yiri ka ha agaghị akwụsị akwụsị na Benue.

Ịdịkọ ọnụ n’ọnọdụ na-esighị ike.

E nwere ọtụtụ ihe atụ e dekọrọ nke na-egosi na gọọmentị Naịjirịa na-egosi ọmịiko n’ebe ndị na-azụ anụmanụ nọ karịa n’ebe ndị mwakpo ndị a metụtara nọ. Dị ka ihe atụ, Femi Adesina, onye bụbu Onye ndụmọdụ Onye isi ala Naịjirịa pụrụ iche n’ihe gbasara mgbasa ozi na nkwupụta ọha, kwuru mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu:

Villagers should willingly give up their ancestral lands for ranching because they can only have ancestral attachments if they are alive.

Ndị obodo kwesiri iji aka ha kwenye ịhapụ ala ndị nna nna ha hapụrụ ha ka e jiri ya zụọ ehi n’ogige, n’ihi na ha nwere ike inwe njikọ pụrụ iche n'ebe ala ndị nna nna ha dị naanị ma ọ bụrụ na ha dị ndụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ okwu o kwuru n’ihu ndị nta akụkọ nke ukwuu, nke sokwa mebie aha na ọchịchị Onye isi ala nwụrụ anwụ, bụ Muhammadu Buhari.

Ọzọkwa, tupu ọ ghọọ onye isi ala, Onye isi ala Bola Tinubu kwukwara n’ihu ọha na ọ bụrụ na enweghị ehi a hụrụ n’ebe mwakpo mere, a gaghị ata ndị na-azụ ehi Fulani ụta maka mwakpo ahụ. Okwu a butere esemokwu ndị ọzọ.

Okwu ndị a kpatara esemokwu, tinyere ọtụtụ okwu ndị ọzọ ndị isi ọchịchị kwuru bụ́ ndị yiri ka ha na-ata ndị ihe ọjọọ ahụ metụtara ụta, emebiela ntụkwasị obi dị n’etiti ndị obodo Benue na gọọmentị Naịjirịa, ma mee ka ha jụọkwa ajụjụ banyere otu ndị si n’agbụrụ na okpukperechi dị iche iche na Naịjirịa ga-esi nwee ike ịga n’ihu ibikọ ọnụ. Ha na-emekwa ka ebubo na-ekwu na gọọmentị Naịjirịa na ndị ọzọ nwere ọdịmma pụrụ iche n’ime ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa nwere mmekọrịta nzuzo sie ike karịa.

Ụdị okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a nke na-akwado otu akụkụ na-eme ka esemokwu na-akawanye njọ n’ọnọdụ mmekọrịta ọhanaeze na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-esilarị ike ma dịkwa mfe ịkpata ọgbaghara, kama ịkwalite udo na ịdị jụụ, ọ na-akwalite ọgbaghara. Ọ bụ kpọmkwem ụdị okwu a ka ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwere nnukwu mmetụta kwesịrị ịgbalị igbochi, n’ihi na ịga n’ihu n’okwu dị otu a ga-eme ka ọ sie ike ịmalite ịchọta ihe ngwọta ga-adịgide adịgide maka ime ihe ike na-enweghị isi a na-eme megide ndị Benue.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.