Ọha obodo South Korea jụrụ maka nziga ndị agha na Strait nke Hormuz.

anti war rally

Ndị nnọchiteanya sitere n’ọha obodo Korea gara njem ngosi iwe site n’Ụlọ Ọrụ Nnọchiteanya United States ruo Blue House (ụlọ ọrụ onye isi ala na ebe obibi ya) na Seoul. Foto a bụ nke People’s Solidarity for Participatory Democracy nyere na mbipụta mgbasa ozi ya. A natara ikike tupu e gosipụta ya ebe a.

Akụkọ a bụ akụkụ nke usoro Spotlight nke Global Voices nke Septemba 2026, “Protest in Democracy.” Site na Spotlight a, anyị na-achọ inyocha ụdị ngagharị mkpesa dị iche iche, ụzọ ndị ọchịchị si eji eme ka a ghara ịkwanyere mkpesa ndị a ùgwù ma ọ bụ gbochie ha, nakwa mmekọrịta dị mgbagwoju anya dị n’etiti mkpesa na ọchịchị onye kwuo uche ya. Ị nwere ike ịkwado ọrụ mgbasa ozi a site n’ịnye onyinye ebe a.

Mgbe Seoul kwadoro n’izu gara aga atụmatụ ya ime “onyinye bara uru,” nke gụnyere nhọrọ iziga ndị agha ma ha ga-ekere òkè n’ọgụ ma ọ bụ na ha agaghị ekere òkè n’ọgụ, na Strait of Hormuz, njikọ nke otu obodo 601 gbakọtara n’ihu Ụlọ Ọrụ Nnọchiteanya United States n'abalị itoolu n'ọnwa Septemba afọ 2026, wee si ebe ahụ zọrọ njem iwe ruo n’ụlọ ọrụ onye isi ala. Ndị na-eme mkpesa ahụ na-egosipụta mmegide ha nye nsonye South Korea n’agha dị n’Etiti Ọwụwa Anyanwụ, ma na-arụ ụka na mkpebi ahụ ga-emebi iwu ọchịchị na ọbụbụeze obodo ahụ.

Kemgbe United States na Israel malitere ijikọ aka ọnụ n’ọrụ agha megide Iran na mbido afọ 2026, nke mere ka Iran mechie Strait of Hormuz, Onye isi ala United States bụ Donald Trump nọ na-arụgide ndị mmekọ ya nọ n'Europe na Eshia ka ha nye aka mepee Strait ahụ ọzọ site n’inye ha nkwado ndị agha.

Ka ntuli aka etiti oge nke United States nke Nọvemba 2026 na-abịaru nso, nrụgide ịchịkọta nkwado site na mba ụwa ndị ọzọ maka agha a na-adịghị ewu ewu na-arịwanye elu, Trump amalitewokwa ịrụgide ndị mmekọ ya n'ụzọ dị ike karịa. N’izu ole na ole tupu mmega agha atọ nke United States, Japan na South Korea, Trump dere na akaụntụ Truth Social ya na ọ na-ebelata ntinye aka United States na mmega agha ahụ n’ihi enweghị njikere Seoul itinye aka n’agha dị n’etiti ọwụwa anyanwụ.

Washington kwuputakwara na mbido ọnwa Septemba na ọ ga-emejuputa “usoro ụtụ mbubata nke ezubere iche ma jiri nlezianya hazie” maka mbubata semiconductor, nke pụtara n’ụzọ doro anya na ọ na-ezubere Seoul, ebe South Korea bụ nnukwu ebe etiti ụlọ ọrụ semiconductor zuru ụwa ọnụ dị. N’oge na-adịghị anya mgbe e kwupụtara nke a, ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị n’ime South Korea kwuru na onye ọrụ n’ụlọ ọrụ onye isi ala na-ekwu na Seoul na-akwado iziga ndị agha na Hormuz tupu ngwụcha afọ 2026. Ọ bụ ezie na Onye isi ala Lee Jae-myung kwusiri ike na a ka na-enyocha atụmatụ ahụ nakwa na enwebeghị mkpebi ikpeazụ e merela maka ya, Ministry of National Defense zipụrụ otu ndị ọrụ nnyocha ka ha nyochaa ọnọdụ Hormuz nọ na ya n'abalị asaa nke ọnwa Septemba.

Agha nke ndị ọchịchị ukwu na-achịkwa

Kemgbe Onye isi ala Lee Jae-myung kwupụtara nke a n'abalị anọ n'ọnwa Septemba, ọha obodo Korea ewepụtala ọtụtụ nkwupụta ma malitekwa ọtụtụ ngagharị mkpesa. N’ụbọchị ahụ, Korean Confederation of Trade Unions wepụtara nkwupụta nke na-adọ aka na ntị megide iziga ndị agha n'ebe ahụ n'ụdị ọbụla, ma na-arụ ụka na ọ bụrụ na a manye Korea isonye “n’agha nke ndị ọchịchị ukwu na-achịkwa,” ọ ga-etinye nchekwa ndị Korea na ọbụbụeze obodo ahụ n’ihe ize ndụ. Ndị otu ndị ọrụ katọkwara United States maka ịgbalị iji mkparịta ụka gbasara ụtụ mbubata semiconductor mee ihe dị ka ụzọ azụmahịa iji nweta nkwado agha, na-atụ aro na omume ahụ bụ aghụghọ na enweghị ụkpụrụ omume. 

Lee Mu-jin, Onye isi Kọmitii Executive nke Seoul Candlelight Action, njikọ ndị otu obodo nke nwere agmnihu na nchịkọta ndị mmadụ maka ịchụ onye bụbu onye isi ala Yoon Suk Yeol n’ọkwa, kwukwara megide nrụgide n'ụzọ akụ na ụba nke United States n’ọgbakọ ọha e mere n'abalị ise nke ọnwa Septemba , na-agba ndị ọrụ gọọmentị ume ịgbachitere ọbụbụeze obodo ahụ site n’ịjụ ihe Trump na-achọ. 

Ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị wepụtara nkwupụta siri ike yiri nke a megide mbọ United States na-agba ịdọbanye Seoul n’agha ya na Iran. Ma Green Party na Justice Party kpọrọ Trump “onye na-akpalite agha,” ebe Justice party jụrụ ajụjụ a na nkwupụta o bipụtara na X: 

미국 내에서조차 트럼프의 소수 측근만이 옹호하는 이 군사작전에 왜 한국의 시민들이, 청년들이 방패막이가 되어야 하는가. 호르무즈 파병동의안은 “전쟁광 호위동의안”이다.

Gịnị mere a ga-eji jiri ụmụ amaala South Korea na ndị ntorobịa ya mere ndị mgbochi mmekpahụ nke ọrụ agha a, ebe ọ bụ na n’ime United States, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ndị enyemaka Trump kacha nso na-akwado agha ahụ? Atụmatụ ịkwado iziga ndị agha na Strait of Hormuz ga-abụ “nkwekọrịta ịkwado onye a na-akpalite agha.”

A hụrụ obere ngagharị mkpesa n’ebe dị iche iche n’ime ngwụcha izu ahụ. N'abalị ise nke ọnwa Septemba, People in Solidarity with Palestinians, otu obodo nke ụmụ akwụkwọ na ndị ọrụ enyemaka mmadụ mejupụtara, haziri ngagharị mkpesa mberede megide iziga ndị agha e nwere ike ime.

“이재명 정부는 호르무즈에 한국군 파병 말라!”

“한국군 호르무즈 파병 반대한다!”
“No War! No Troops!”
https://t.co/3AR1kVUKa2 pic.twitter.com/XmMTTqH5Ev

— 팔레스타인인들과 연대하는 사람들(팔연사) (@ppl4pal_kr) September 5, 2026

“Anyị na-emegide iziga ndị agha Korea na Hormuz!”

“Gọọmentị Lee Jae-myung ga-ajụrịrị iziga ndị agha Korea na Hormuz!”

https://t.co/3AR1kVUKa2

pic.twitter.com/XmMTTqH5Ev

“Ọ dịghị agha! Ọ dịghị ndị agha a ga-eziga!”

Ọtụtụ ngagharị mkpesa na mmemme udo mere n’ogige mahadum dị iche iche na etiti obodo Seoul n'abalị asaa n'ọnwa Septemba.

Ka ọ dị ugbu a, onye na-ekwuchitere Ministry of Foreign Affairs nke Iran, Esmaeil Baqaei, dere n’asụsụ Korea na X, na-atụ aro na ọnụnọ ndị agha South Korea na Hormuz ga-ebute “nsonaazụ dị njọ,” tinyere foto nke nwere okwu sị “nhọrọ ndị dị ize ndụ na-enwe ọnụ ahịa ya na ya na-eso.”

N'abalị itoolu n'ọnwa Septemba, njikọ nke otu obodo 601, Joint Action Against War of Aggression and Troop Deployment, haziri mmemme ha jikọrọ aka ọnụ mee iji katọọ nrụgide ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke United States. Na nkwupụta ha, njikọ ahụ kọwara mwakpo United States na Israel wakporo Iran dịka “agha mwakpo megidere iwu” nke na-emebi iwu mba ụwa, ma kwuo na iziga ndị agha na Middle East ga-emebi Iwu Ọchịchị South Korea, n’ihi na dịka Nkeji edemede nke ise n'iwu ahụ si kwuo, obodo ahụ kwesịrị “ịjụ agha mwakpo.” Njikọ ahụ kwusiri ike: 

우리의 청년들을 부당한 침략전쟁의 희생양으로 내어줄 수는 없다. 

Anyị enweghị ike ikwe ka ndị ntorobịa anyị chụọ ndụ ha dịka aja ma bụrụ ndị a ga-emegbu n’agha mwakpo na-ezighị ezi.

Mgbe ha kwupụtachara ebe ha kwụ n’ihu Ụlọ Ọrụ Nnọchiteanya United States, ndị nnọchiteanya sitere na njikọ ndị otu obodo ahụ gara n’ije ruo Blue House, bụ ụlọ ọrụ onye isi ala na ebe obibi ya.

Gọọmentị Seoul na-ewere njikọ nchekwa dị n’etiti United States na Republic of Korea (U.S.-ROK) dị ka ihe dị oke mkpa maka nlanarị nke obodo ahụ, n’ihi na mgbe Agha Korea (1950–1953) gasịrị, e kewara Korea gaa na North (nke Soviet Union na-akwado) na South. N’ihi ya, South Korea na-akwadokarị United States ọtụtụ mgbe. N’oge Agha Vietnam (1963–1974) nakwa Agha Iraq (2003–2008), gọọmentị South Korea kwadoro United States site n’iziga ndị agha.

Otú ọ dị, mgbe mgbanwe gaa n’ọchịchị onye kwuo uche ya gasịrị, akụkọ sitere na nnyocha e mere gbasara ndị agha South Korea tinyere aka na mgbukpọ ndị nkịtị Vietnam kpalitere ịtụgharị uche onwe onye na mmegharị maka iwulite udo, 미안해요 베트남 (“Ọ dị m nwute, Vietnam”), n’etiti ngalaba ndị NGO na-aga n’ihu. N’ihi nrụgide ọha mmadụ, gọọmentị South Korea esoghi n'ọgụ n'ụdị ọbụla n'oge Agha Iraq.

N’ịbụ ndị United States na-amanye, ọha obodo South Korea emegidela nke ukwuu itinye ndị agha obodo ahụ n’ihe gbasara Middle East, na-ebido ọtụtụ ngagharị mkpesa na mkpọsa udo kemgbe Eprel. Ugbu a, n’agbanyeghị iyi egwu agha sitere na mmemme ngwa agha nuklia na ngwa agha ogbunigwe nke North Korea na eziokwu bụ na mmechi Strait of Hormuz emetụtala n'ebe ọ dị ukwuu ụzọ obodo ahụ si enweta mmanụ, nnyocha echiche ọha mmadụ dị iche iche e mere gosiri na naanị ole na ole na-adịchaghị ọtụtụ n’ime ndị South Korea ka na-emegide iziga ndị agha na Middle East.  

Dịka ọchịchị Lee kwuru na ọ ga-achọ nkwenye ọha mmadụ tupu e mee mkpebi ahụ, netwọk na-emegide agha ga-aga n’ihu na-arụ ọrụ iji gbochie ịdọrọ obodo ahụ n’agha Iran. A haziri nnukwu mkpokọta ọzọ la ọ bụrụ n'abalị iri na abụọ n'ọnwa Septemba.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.