
Ekwentị dijitalụ na-egosi ngwanrọ njem ụgbọala. Foto sitere n'aka Adesewa Olofinko. A naara ikike tupu e gosi ya ebe a.
N'elekere itoolu nke ụtụtụ na Legọs, Naijiria, mgbe okporo ụzọ malitere ịdị jụụ pụọ n'ọsọ ịga ọrụ nke ndị na-aga ọrụ ụtụtụ niile, Vivian emepee laptọọpụ ya.
Njem ịga ọrụ ya bụ naanị nzọụkwụ iri na abụọ ọ ga-eme site n’ebe ndina ya gaa n’ụlọ nke so ya nke nọkwa dịka ọfịs ya. N’ime ya, e nwere nnukwu tebụl weere ohere, nke ejikọtara ya na oche ntụgharị dị mma maka ahụ, kọmputa egwuregwu, mọnịtọ sara mbara, na laptọọpụ abụọ dị obere.
Ọ naghị edebanye aha oge o ji bịa ọrụ, ọ nweghịkwanụ onye nlekọta na-eche ya nche iji hụ mgbe o ji bịa. Kama, e nwere dashbọọdụ nwere ozi Slack sitere n’ụlọ ọrụ ọhụrụ dị na United States nke ọ na-akwado dịka onye njikwa ọrụ, dashbọọdụ ClickUp na-echere ozi ọhụrụ si na Singapore, bọọdụ Trello nwere ọrụ ndị a ga-emecharịrị tupu California eteta, yana ngwanrọ na-enyocha oge ọ nọ ‘na-arụ ọrụ.’
Ọrụ ụbọchị Vivian ga-agafe oge mpaghara ụwa dị iche iche. Ọ ga-aza ozi emailu nke ụlọ ọrụ nke ọ na-ahụtụbeghị isi ụlọ ọrụ ya anya, ma kwurịta maka nsogbu ọkụ ebe ọ bụ na o nwere na inverter dị 3.5 kWh n'ike nke nwere bátrị ndị e debere n’azụ ụzọ ya. Mgbe mgbede na-erula, ọ ga-enwetaru n'ego dollar ihe hà ugboro iri na abụọ ụgwọ ọrụ kacha nta na Naịjiria.
Vivian so akụkụ ọgbọ ọhụrụ na-agbanwe ihe ọrụ yiri n’Afrika — inwere onwe ya, inwe njikọ-ọnụ, ma bụrụ nke gazuru ụwa dum n’enweghị mgbagha.

Vivian Nelson, onye ọrụ na-arụ ọrụ dịpụrụ adịpụ, dịka ọ na-arụ ọrụ site n’ụlọ ọrụ ya dị n’ụlọ ya na Lagos, Naịjiria, n’ọnwa Febụwarị afọ 2026. Foto sitere n'aka Adesewa Olofinko. A naara ikike tupu e gosi ya ebe a.
N’elekere isii nke ụtụtụ, tupu ijiriji ụtụtụ adaa n'Accra, isi obodo Ghana,, Diana Akumkadoa amalite ụgbọala ya ma meghee ngwanrọ njem ụgbọala ya. Ọ na-amalite ọrụ na-eju ọtụtụ ndị mmadụ anya. Ọ bụ ezie na iji ngwa malite njem ụgbọala aghọwo akụkụ ndụ ndị mmadụ a ma ama nke ọma n’ọtụtụ obodo Afrịka, ụmụ nwanyị na-anya ụgbọala ka bụ ihe a na-adịghị ahụkebe n’ụwa niile. Diana na-akọwa oge ịtụnanya ndị njem na-enwe mgbe ha chọpụtara na onye bu ha n'ụgbọala bụ nwanyị. Mgbe ahụ njem ahụ ga- amalite, nke ijuanya ahụ na-agbanwekarị ghọrọ mkparịta ụka.
Tupu chi asa, ọ nọrọlarị ọtụtụ awa na-agbagharị n’okporo ụzọ jupụtara n'ụgbọala ma na-agbasakwa n’enweghị ịdọ onye ọbụla aka ná ntị. N'ụbọchị ụfọdụ, ọ na-anya ụgbọala ruo awa iri na anọ. Ụbọchị ndị ọzọ, ndị njem na-akagbu njem ha ugboro ugboro, nke ga-eme ka o mechie ngwanrọ njem ya ahụ ma laghachi n’ụlọ.
“Ọ na-enye m ohere inwere onwe m”,’ ka Diana kwuru. ‘Ma ọ na-eji ihe ize ndụ nke ya abịa. Ọ bụrụ na ihe mee gị, naanị gị kwụ.”
Nye Diana, ịdị mfe nke ọrụ pụtara na ọ nwere ike hazie oge ọrụ ya ebe ọ dabara n'oge akwụkwọ nwa ya. Ọ pụtakwara na ọ na-egbo mkpa ụgwọ mmanụ ụgbọala, mmezi, na ụgwọ nyiwe nke ngwanrọ ahụ nke nwere ike iru pasent iri atọ kwa njem. Otu ọ dị, ọ na-ekwu na ịnya ụgbọala na-enye ya ohere ‘ịnweta ego n’ụzọ dị ya mma’ mgbe ọ na-agbambo igbo mkpa ibi ndụ n’ụwa na-asaala anya.

Onye na-anya ụgbọala ngwa njem ụgbọala Diana Akumkadoa, ka ọ nọ nke ọma ka e see ya foto na Accra, Ghana. Foto sitere n'aka Adesewa Olofinko. A naara ikike tupu e gosi ya ebe a.
Ọrụ ‘Gig’ n’Afrịka
Ọrụ ‘gig’ n’ịntanet malitere ịbụ ihe a ma ama nke ọma ihe dị ka afọ 2015 n’ihi mgbasa nke iji ekwenti dijitalụ n’Afrịka. Mgbanwe ahụ gbagoro ọsọọsọ nke ukwuu site n’afọ 2020 gawa, mgbe ọrịa mba ụwa COVID-19 mere ka nde ndị mmadụ gbanwee ọrụ ha gaa n’ọrụ dijitalụ dịpụrụ adịpụ.
Ngụkọta sitere na World Bank na-ekwu na ihe karịrị nde ndị Afrịka iri abụọ na otu na-enweta ego ọrụ zuru oke maọbụ n'akụkụ site n’ọrụ ‘gig’, na-akọwa na ogo uto ya dị ihe dị nta ka ọ bụrụ pasent iri na otu kwa afọ, nke karịrị ọtụtụ mpaghara ndị ọzọ. Ụwa niile na-atụ aro na uru ọrụ ‘gig’ n’afọ 2024 bụ ijeri dọla USD556.7, ma na-atụ anya na ọ ga-abawanye ugboro atọ ruo USD 1.8 tiriliọn tupu afọ 2032.
Nnukwu obodo ndị dịka Lagos, Accra, na Nairobi, Kenya aghọwo ebe a maara maka ụdị ọrụ ‘gig’ abụọ — nke ihu na ihu dịka mwegharị na nnyefe ihe, nhazi emume na njem, na ime njem, nakwa nke dijitalụ na-enweghị oke mba na mba dịka ịchọ ihe mma, ahịa dijitalụ, koodu kọmputa, na ọrụ n’ịntanet nye ụlọ ọrụ dị iche iche n’ụwa. Na Naịjiria, pasent iri atọ na ise nke ndị ntorobịa na-arụ ọrụ onwe ha n’ụzọ ụfọdụ.
Ndị na-arụ ọrụ n'Afrịka bụ ndị dị ntorọbịa nke ukwuu, nke ọtụtụ n’ime ha erubeghị afọ iri atọ. Ụmụ nwanyị aghọwo ndị a na-ahụ anya nke mgbanwe a, nke ha na-anọchite anya ihe dị ka pasent iri abụọ na asaa nke ndị ọrụ ‘gig’ n’ịntanetị n’Afrịka.
Ụzọ Cindy Sally si gaa n’ọrụ ‘gig’
N’ụlọ ahịa City Galleria Mall dị n’Accra, Cindy Sally na-edu otu ndị ọrụ ego maka ụlọ ọrụ America nke na-arụchara ọrụ ya na Democratic Republic of Congo. ‘Ọfịs’ ya bụ tebụl ọ na-akwụ ụgwọ iji ya arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị mmadụ na-arụkọ ọrụ ọnụ, ebe ọ na-akwụ GHS 200 (ihe dị ka USD 18.50) kwa ụbọchị. Ndị ọrụ ibe ya na-apụta dịka akụkụ anọ n’ihuenyo kọmputa.
N’adịghị ka Diana, Cindy Sally na-enweta ego n’ego mba ọzọ. Ọrụ ụbọchị ya na-amalite mgbe chi sara iji dabaa na mpaghara oge America, ma na-anọkarị ruo mgbede.
Ịrụ ọrụ ‘gig’ mba ụwa ya malitere mgbe ọ hapụrụ ọrụ siri ike n’ụlọ ọrụ mpaghara dị na Ghana, ebe ọ kwuru na ọsọ dị n'ọrụ, enweghị nkwụsi-ike akụ na ụba, na ibu ọrụ dị ukwuu mere ka ọrụ ahụ ghara ịdịgide.
Mgbe ahụ, ọ gbanwere gaa n’ụzọ ọrụ onwe ya n’ịntanet ma malite iwulite ndị ahịa si mba ọzọ site na Upwork. Mgbanwe ahụ mechara nye ya ohere ịnweta ego na dollar mgbe ọ na-ebi n’Accra.

Cindy Sally, onye ọrụ ego dịpụrụ adịpụ, na-edu otu ndị ọrụ mba ụwa site n’Accra, Ghana. Foto sitere n'aka Adesewa Olofinko. A naara ikike tupu e gosi ya ebe a.
Ọrụ ‘gig’ n’ịntanet erula akwụsị akwụsị n’etiti ndị ọrụ dijitalụ Afrịka. Dịka ọ na-edo ụlọ ọrụ dị iche na mba ụwa ahụ iwere ndị ọrụ dịpụrụ adịpụ n'ọrụ, ọgbọ ọhụrụ nke ndị ọkachamara Afrịka na-arụkọ ọrụ ha na ndị otu nọ ebe dị anya dị ọtụtụ puku kilomita, ebe ha ka na-anọ n’ụlọ ha nke ọma
Ihe ọ na-efu n'isonye n'ihe a zuru ụwa ọnụ
Ụlọ ọrụ ‘gig’ dị iche iche na-eme ka ịrụ ọrụ na mba ụwa bụrụ ihe a pụrụ ime, ma ha na-ewerekwa nkebi ego nke ha.
Na saịtị ndị dịka Upwork, ndị na-arụ ọrụ onwe ha nwere ike tufuo pasent iri ruo pasent iri na ise nke ego ha na-enweta n’ụgwọ nyiwe, dịka Faith Abiodun Uwaifo, onye Naịjiria bụ onye enyemaka dijitalụ, kwuru. Ọ gbanwere gaa n’ịrụ ọrụ dịpụrụ adịpụ mgbe ọ nọchara afọ ise n’ọrụ ịbụ onye nta akụkọ.
Ọ na-ajịkwa ọrụ nye ndị ahịa dị na United States, Canada, Thailand, na United Kingdom. Dịka ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ onwe ha ndị ọzọ, ọrụ ụbọchị ya na-abụ site n’elekere atọ nke ehihie ruo elekere itoolu nke mgbede na Naịjiria, iji daba na oge ndị ahịa ya dị na Pacific Standard Time.
Izife ego gafee ókè mba na mba na-ewetakwa ịkwụ ụgwọ ọzọ. Ọbụna ngwaọrụ ndị a chọrọ iji nọgide n'ịdị ike n'ọrụ — dịka ịntanet dị ngwa ngwa, ọrụ ‘cloud’, na nyiwe mmepụta dijitalụ dị iche iche — nwere ụgwọ na-adịgide a ga na-akwụ. Ọ na-echeta mgbe ọ gbanwere site na ‘hotspot’ 3G gaa na ‘router’ 5G iji chekwaa ọrụ ya: “Ụfọdụ ndị ahịa agaghị ele gị anya ma ọ bụrụ na ihe njikọ gị adịghị ike.”
N’agbanyeghị ihe isi ike ndị ahụ, ọ kọwara ahụmịhe ahụ dịka nke na-agbanwe ndụ. Ịrụkọ ọrụ ya na ndị ahịa n’ụwa niile, ka o kwuru, agbanweela ụzọ o si eche echiche banyere ọrụ n’onwe ya.
Faith kọwara nrụgide uche nke na-esi n'ọrụ n’udi nyiwe, dịka nkịtị a ga-agba gị mgbe I zigachara arịrịọ ọrụ, ibu nke nnyocha na-adịghị mma, na nghọta na ụfọdụ ndị ahịa na-eji adreesị IP Naịjiria n'udi aghụghọ maọbụ ohi.
“Oge ụfọdụ, Ị ga-enwe mmetụta dị ka ị na-alụ ọgụ megide echiche ndị mmadụ banyere ebe I si tupu ịmalite ọrụ,” ka o kwuru

Faith Abiodun Uwaifo bụ onye enyemaka dijitalụ, na-arụ ọrụ site na Lagos, Naịjiria. Foto sitere n'aka Adesewa Olofinko. A naara ikike tupu e gosi ya ebe a.
Iji belata ihe ize ndụ nke enweghị nkwụsi ike ọrụ, ọ na-azụ obere ahịa mmepụta nri, nke bụ ụzọ mgbasa mkpata ego a na-ahụkarị n’etiti ndị ọrụ ‘gig’ ndị maara na ego dijitalụ nwere ike ịgbanwe ngwa ngwa.
Ụmụ nwanyị, ọrụ, na ọdịnihu na-enweghị ókè mba na mba
Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ n'Afrịka abawanyela site na nde mmadụ narị abụọ na iri asatọ na atọ (283 million) n’afọ 1960 ruo ihe karịrị otu ijeri mmadụ na nari nde ise (1.5 billion) taa, nke a na-atụkwa anya ya na ọ ga-eru ijeri mmadụ abụọ na narị nde ise (2.5 billion) na-eru afọ 2050. Kwa afọ, a na-atụ aro na ihe dị ka nde ndị ntorobịa iri na-achọ ọrụ, nke karịrị ọtụtụ ugboro ọrụ dị adị.
Ruo ọtụtụ afọ, ohere akụnaụba na-enwe njikọ ọtụtụ oge yana nkwagharị (ya bụ na ọ bụ naanị mgbe mmadụ kwagharịrị gaa mba ofesi ka ọ na-enweta ọrụ dị mma). Taa, nde mmadụ ndị Afrịka na-emikpu onwe ha ozugbo n’azụmahịa ụwa site n’ụlọ ha ma na-ewuru onwe ha ịrụ ọrụ dị mma gafee kontinenti dị iche iche.
Nye ụmụ nwanyị karịsịa, ọrụ ‘gig’ na-enye ohere ịbanye n’enweghị ịnata ikike pụrụ iche. Ọ na-enye ịdị mfe na ohere ịbanye n’ahịa ụwa dị iche iche nke n'oge gara aga yiri ihe na-adịghị ekwe omume.
Ọrụ ịkọ akụkọ a nwetara nkwado sitere na Africa No Filter.






