Ịnọ n’etiti agbam nkịtị na mpụta ihe: Ahụmahụ ndị LGBTQ+ na Mozambique

A woman lies on the ground, one hand covering her mouth, the other with several condoms in their packets spilling out of it

Foto ndị na-akwado ikike LGBTQIA+ sere na Maputo, Mozambique: 2024. E nwetara ikike tupu e gosipụta ya ebe a.

Na Mozambique, e nweghị iwu na-eme ka ịbụ ndị LGBTQ+ bụrụ arụ ka a na-ewerekarị ya dịka ihe na-egosi nnabata. Otu ọ dị, nye ọtụtụ ndị transgender na ụmụ nwanyị LBQ (lesbian, bisexual, na queer), ihe ha na-ahụ kwa ụbọchị  nwere ihe dị iche iche ọ na-akọwa. N’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ ahụike, n’ebe ọrụ, n’ebe okpukperechi, na n’ebe dijitalụ dị iche iche, ịkpa ókè ka na-emetụta ohere ha nwere inweta ikike ndị ruuru mmadụ, ohere dị iche iche, na isonye n’ihe ọha mmadụ ndị ọzọ na-eme.

Ọ bụ ezie na mkpagbu iwu apụtachaghị ìhè dịka ọ dị n’ụfọdụ mba ndị ọzọ dị n’ógbè ahụ, dịka  Nigeria, ndị nkwado ikike ha na-ekwu na mwepụ n'akụkụ na-arụkarị ọrụ site n’ụzọ ịgbachi nkịtị, ime ka ndị mmadụ ghara ịbụ ndị a na-ahụta, na ileghara ha anya n’usoro ọrụ.

“Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye na-ede banyere anyị, anyị na-aghọ ndị a na-adịghị ahụ anya,” ka Pepetsa Fumo, onye na-akwado ikike ndị Trans nke Transform kwuru. Transform bụ òtù na-arụ ọrụ maka ịmata na nsonye ndị trans n’ọha mmadụ ndị ọzọ na Mozambique.

Ụlọ akwụkwọ dịka ebe Mkpapụ

Nye ọtụtụ ndị na-akwado ikike mmadụ, mkpapụ n'akụkụ na-amalite n’usoro agụmakwụkwọ, ebe usoro ọmụmụ ụlọ akwụkwọ jupụtara nke ukwuu n’echiche metụtara mkpaso agwa dịka omenala ndị si dị, na-ahapụ obere ohere maka mkparịta ụka gbasara nghazi mmekọahụ, njirimara okike, ma ọ bụ ịdị iche iche.

Otu ihe atụ nke mmegide ụlọ ọrụ megide itinye mmadụ niile n’usoro agụmakwụkwọ bụ na ndị ọrụ gọọmentị ewepụla ntụaka ọbụla gbasara nghazi mmekọahụ n’ihe ọmụmụ na akwụkwọ ọgụgụ ụlọ akwụkwọ Mozambique niile. Dị ka ndị na-akwado ikike ha si kwuo, ọnọdụ a na-enye aka n’ịkpọ ụmụ akwụkwọ aha mkparị, imegide ha n’ụzọ na-emetụta ahụike uche ha, na ọnụ ọgụgụ dị elu nke ụmụ akwụkwọ ndị bụ ndị LGBTQ+ ịkwụsị agụmakwụkwọ. Ọtụtụ ndị nkuzi anaghị enweta ọzụzụ zuru oke, ma ọ bụ ha anaghị enweta ọzụzụ ọbụla, gbasara ịdị iche iche nke mmadụ, ikike mmadụ, na nsonye mmadụ niile n’usoro, nke na-egbochi ha ịmepụta ebe mmụta dị nchebe, dịka Pepetsa kwuru n’ajụjụ ọnụ GV gbara ya.

“Ihe ịma aka ahụ na-amalite n’ime ministri n’onwe ya, nakwa n’ụzọ e si azụ ndị nkuzi ka ha ghara ịkwanyere ịdị iche iche ùgwù”

Ọdịiche ndị a dị n’agụmakwụkwọ na-aga n’ihu ruo n’okenye, na-emetụta ohere inweta ọrụ, nchekwa akụ na ụba, na ikike mmadụ nwere ịkwalite ọnọdụ mmekọrịta nakwa akụ na ụba ya.

Ịlanarị akụ na ụba gafee ọnọdụ mmata 

Adịghị ike na mkpata akụ na ụba aghọwo otu n’ime nchegbu ndị kacha adịgide n’uche ndị na-akwado ikike LGBTQ+. Ọtụtụ ndị Trans na ụmụ nwanyị LBQ na-enwe ihe isi ike n’inweta ọrụ iwu kwadoro, ọzụzụ ọrụ, na ụzọ ndị ọzọ isi nweta ego. Ka e nwere atụmatụ obodo dị iche iche na-enyere ndị mmadụ aka n’akụ na ụba, ha na-eche ihe mgbochi usoro dị ukwuu ihu, gụnyere inweta obere ego nkwado, enweghị ọzụzụ n’ihe gbasara njikwa, na ịdabere n’enyemaka sitere n’èzí. 

“Taa, I nwere ọrụ. Echi, a napụ gị ya. Mgbe ahụ Ị laghachịkwa ọzọ n'izo ezo,” dịka Pepetsa hụtara.

Òtù ndị dị ka Por Ela (By Her) na-agbalị ilebara ihe ịma aka ndị a anya site n’ihọrọ mmalite azụmahịa gbasara ụmụ nwanyị LBQ, nakwa site n’ịkwalite atụmatụ maka nduzi obodo na ịzụlite azụmahịa. Mana nye ndị na-akwado ikike mmadụ, e nweghị ike ikewapụ inye ndị mmadụ ike n’ihe gbasara akụ na ụba pụọ na mbọ sara mbara a na-agba maka inweta ùgwù, nnabata, na ịbụ ụmụ amaala.

Ahụike na oke apụtaghị ihe

Ahụike bụ mpaghara ọzọ ebe ọganihu na mkpapụ n'akụkụ na-adịkọ ọnụ. Ọtụtụ afọ ndị e jiri na-eme mkpọsa emeela ka e nwekwuo nnabata nke obodo ndị Trans na nzaghachi nye HIV na AIDS, mana n’agbanyeghị nke ahụ, ndị na-akwado ikike ha na-ajụkarị ajụjụ gbasara asụsụ a na-eji ekwu maka ha n’iwu na atumatu ọha.

“Abụghị m ‘ndị mmadụ bụ isi a na-elekwasị anya.’ Aha m bụ Darius. Ejikọtakwala m na ụdị nhazi a n'ihi mgbagwoju anya,” ka otu onye a gbara ajụjụ ọnụ kwuru mgbe GV gbara ya ajụjụ ọnụ.

Ọ bụ ezie na ndị trans enwetala nnọchite anya ka ukwuu n’ime ụfọdụ ụlọ ọrụ, ụmụ nwanyị LBQ ka bụ ndị a na-adịghị ekwutekarị maka ha na mkparịta ụka na mmemme ahụike. A na-azụ ọtụtụ ndị ọrụ ahụike ka ha ghọta LGBT ndị bụ isi a na-elekwasị anya na obodo ha, mana ha anaghị enwetakarị ọzụzụ gbasara mkpa pụrụ iche ụmụ nwanyị LBQ nwere. Dị ka ndị na-akwado ikike ha si kwuo, enweghị nnọchiteanya a nwere ezigbo ihe ọ na-akpata. Dịka ọmụmaatụ, a na-edekarị okwu ime ihe ike megide ụmụ nwanyị lesbian naanị dịka ime ihe ike dabere n’okike, na-atụleghị ma nghazi mmekọahụ ha ọ bụ ihe kpatara mwakpo ahụ. 

N'ebe dijitalụ: N’etiti inye ike na ịbụ onye nwere ike imerụ ahụ

Nye ọtụtụ obodo ndị LGBTQ+ dị na Mozambique, ikpo okwu dijitalụ aghọwo ngwa ọrụ dị mkpa maka ịhazi, ịchịkọta ndị mmadụ, na ime ka ọha mmadụ mata ihe. Mgbasa ozi mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-enye obodo queer ohere ịkekọrịta ahụmahụ ha, igosi n’ihu ọha etu e si asọpụrụ ikike ruuru ndị mmadụ n’omume, wulite netwọkụ nke ịdị n’otu, ma mee ka olu obodo ha bụrụ nke a na-anụ nke ọma. Otú ọ dị, otu ebe ndị dijitaalụ ahụ na-ekpughekwa ndị na-akwado ikike ha na ndị na-agbachitere ikike mmadụ n’iyi ha egwu n’ịntanetị, nledo anya, na imekwasa ha ihe ike.

Ndị na-akwado ikike ndị queer, ndị trans, na ụmụ nwanyị na-agbachitere ikike ndị ruuru mmadụ na-akọ ahụmahụ nke okwu ịkpọasị, iyi egwu, mkpọsa mgbasa ozi ụgha, na ikpughe mmadụ n’ihu ọha, bụ́ ihe na-eme ka usoro ịkpapụ ndị mmadụ n’akụkụ n'oha obodo pụta ọzọ. Ihe ndị a na-eme n’oge mkparịtaụka gbasara ọchịchị dijitalụ na nchekwa ịntanetị na-aghọ ihe a na-elekwasị anya nke ukwuu na Mozambique. Ọ bụ ezie na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-elekwasịkarị anya n’ịzụlite teknụzụ na nchekwa dijitalụ n’ihu ọha, ndị na-akwado ikike na-arụ ụka na mkparịta ụka ahụ kwesịkwara ịgụnye nnwere onwe ikwu okwu, nzuzo onwe onye, na isonye n’ihe gbasara obodo.

Karịa ihe mgbagwoju anya ahụ

Ahụmahụ ndị trans na ụmụ nwanyị LBQ na Mozambique na-egosi na mkpapụ ndị mmadụ n'akụkụ anaghị adịkarị naanị n’otu akụkụ nke ndụ mmadụ. Ihe mgbochi n’agụmakwụkwọ, enweghị nkwụsi ike n’ihe gbasara akụ na ụba, ahaghị nhata n’inweta enyemaka ahụike, na ime ihe ike n'ọ̀gbọ́ dijitalụ na-akwado ma na-eme ka ibe ha sie ike, na-emepụta usoro adịghị ike nke na-agafe nnọọ okwu gbasara njirimara.

Nye ndị na-akwado ikike mmadụ, nke a bụ karịa ihe niile mkparịta ụka gbasara ịbụ nwa amaala, isonye n’ihe gbasara obodo, na itinye onye ọbụla n’usoro ọchịchị onye kwuo uche ya. Ịmata ma ịnakwere mmadụ dị mkpa, mana nke ahụ ezughị. Ezigbo itinye mmadụ niile n’usoro chọrọ ohere inweta ikike, ohere akụ na ụba, nchekwa, na nnọchiteanya — ma n’ebe gbasara ego ma n’ebe dijitalụ. 

N’ọnọdụ ụwa nke mmegharị ndị na-emegide ikike mmadụ na-aga n’ihu, nledo anya n'ebe ndị dijitalụ na-agbasawanye, ahụmahụ obodo ndị LGBTQ+ na Mozambique na-egosipụta mkpa ọ dị ime ka mkparịta ụka gbasara okike, ịdị iche iche, na ikpe ziri ezi n'ebe dijitalụ bịaruo nso n’eziokwu dị n'ibi ndụ ndị obodo nọ na Global South.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.