
Ụmụaka na-egwu egwurgwu n'okporo ama Damascus, Syria nke agha mebicharala kpamkpam. onyonyo na-enweghị deeti sitere n'aka Baraa Obied na Pexels.
Onye dere ya bụ Angela Joyce
Ajọ mpụta ihe nke agha ndị na-aga n'ihu n'ụwa anyị, dịka agha na-aga ugbu a na Ukraine, esemokwu dị n'etiti Iran, Israel na United States, ma ọ bụ nnukwu nsogbu chere ndị mmadụ ihu na Gaza, na-ekpughe na a naghị alụ agha naanị n'ọgbọ agha. A na-alụ ya n'okporo ụzọ ọbụla, n'ogige egwuregwu ụlọ akwụkwọ ọbụla, nakwa n'ụlọ ọbụla.
Akụkọ kachasị ọhụrụ gbasara agha nọ n'isi akụkọ mgbasa ozi niile, ma n'azụ ihe ndị ahụ, ọ bụ ndị nkịtị, ọkachasị ụmụaka, ka ahụhụ kachasị emetụta. Nke a pụtara ìhè n'okwu dịka nke nwa dị ọnwa iri abụọ n otu na Gaza onye e kughachịri n'ezinụlọ ya nwere mmerụ ahụ ndị dọkịta kwuru na ọ bụ mmekpa ahụ dịka nke agha nwere ike ịkpata ụdị mmerụ ahụ ahụ. Ụmụaka bi n'ebe agha na-aga n'ihu na-enwe mmetụta na-adịte aka n'akụkụ mmetụta uche, ahụ ike, na mmepe ndụ ha.
Ọ bụ ezie na ụwa niile na-agụkarị ọnụ ọgụgụ ihe mfuhahụ ndị ahụrụ anya — ndụ ndị a tụfuru, ụlọ akwụkwọ ndị e bibiri — ọnyá nke mmerụ uche, ịchụpụ mmadụ n'ebe obibi ya, na ntụkwasị obi e bibiri nwere ike iso ụmụaka na ntolite ha n'ebe agha na-aga n'ihu n'oge ndụ ha niile.
Mmerụ uche: ihe kacha apụta ihe n'oge ndụ niile nke ụmụaka bi n'ebe e nwere agha
Mmerụ uche (trauma) bụ otu n'ime nsogbu kachasị njọ ụmụaka bi n'ebe agha na-aga n'ihu na-eche ihu. Ọ bụ ezie na ụfọdụ mmerụ anụ ahụ nwere ike a gwọọ ma ọ bụ a jịkwaa ha, ọnyá a na-adịghị ahụ anya nke mmerụ uche nwere ike ịdịgide ruo oge ndụ niile nke mmadụ.
N'ụzọ dị mwute, a na-elegharakarị ahụike uche anya, karịsịa n'ebe ime ihe ike juru ebe niile. Ịghọta na idozi mmerụ uche a bụ ụzọ dị mkpa isi nyere ụmụaka ndị a aka inweta ọgwụgwọ ma wughachi ndụ ha.
Na mbawanye, ọtụtụ ndị ọkachamara na-arụ ụka na mmerụ uche nke agha na-akpata kwesịrị ka a mata ma gwọọ ya dịka nnukwu nsogbu ahụike ọha zuru ụwa ọnụ.
Otu ụzọ ndị ọkachamara na-arụ ọrụ gbasara ụmụaka, dịka ndị ọrụ nchekwa ụmụaka, si amata ọnọdụ nwa e tinyere n'aka ha ma kpebie ụdị nkwado kacha mma inye ha bụ site n'inyocha maka (Ahụmahụ Ọjọọ e nwere n'oge Nwata) Adverse Childhood Experiences (ACEs).
Nnyocha ndị a na-agụnye ajụjụ dịka: “Ò nweela mgbe ị na-enweghị nri, mmiri, ma ọ bụ ebe obibi? Ò nweela otu onye ma ọ bụ karịa n'ime ndị na-elekọta gị nwụnahụrụla gị n'ihi ọrịa, ịga mkpọrọ, ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm? Ò nweela mgbe onye ezinụlọ mere gị ihe ike? Ò nweela mgbe onye toro eto metụrụ gị aka n'ụzọ mmekọahụ nke Ị na-achọghị?”
N'ozuzu, ajụjụ ndị a dị iri. A na-eji ha amata ogo mmerụ uche nwa ahụ nwetarala, ndị ọrụ mmekọrịta mmadụ na ndị ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ na United States na-ejikwa ha ugbu a.
Ọ bụrụ na mmadụ enweela ahụmahụ ACEs atọ ma ọ bụ karịa, ọ na-edowe ya n'ọnọdụ ihe ize ndụ nke ịrịa nsogbu nrụgide mgbe ihe mberede gasịrị (PTSD), ịda mbà n'obi, nchekasị, ịnwa igbu onwe ya, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ọtụtụ ọrịa anụ ahụ, gụnyere kansa, ọbara mgbali elu, na nkụda obi, n'ebe ọ dị ukwuu.
Ihe dị ka otu n'ime mmadụ iri na United States enweela ACEs atọ ma ọ bụ karịa. Nke a dị ala karịa ọnụ ọgụgụ a na-atụ anya ya n'ụwa niile, ebe a na-eme atụmatụ na otu n'ime ụmụaka isii bi ugbu a n'ebe agha na-aga n'ihu, na-enwe ọtụtụ ụdị ahụmahụ ọjọọ ndị a n'otu oge.
Mgbe a na-ekpughe akụkụ buru ibu nke ụmụaka ụwa nye mmerụ uche ugboro ugboro, mmetụta uche si n'agha anaghịzi abụ naanị nsogbu enyemaka mmadụ.
Ọ na-aghọzi nnukwu nsogbu ahụike zuru ụwa ọnụ nke ga-emetụta obodo na ọha mmadụ ruo ọtụtụ iri afọ.
Ọnụọgụ ụmụaka bi n'ebe ihe ike na-aga n'ihu n'ụwa ugbu a
N'akụkụ ụwa niile, ụmụaka ka na-aga n'ihu na-enweta mmetụta dị njọ nke agha.
Na Ukraine, kemgbe agha ahụ malitere, e gbuola ma ọ bụ merụọ ọtụtụ puku ụmụaka ahụ, ebe a chụpụla ọtụtụ nde ndị ọzọ n'ebe obibi ha. Nke a emeela ka ọtụtụ ezinụlọ na-agbasi mbọ ike iwughachi ndụ ha kwa ụbọchị n'etiti ọnọdụ ejighị n'aka ka na-aga n'ihu.
Na West Asia, agha na-adịbeghị anya o mere metụtara Iran agbakwunyela nsogbu na mpaghara ahụ nke dịlarị n'ọnọdụ siri ike. Akụkọ na-egosi na e gbuola ma ọ bụ merụọ ọtụtụ narị ụmụaka ahụ n'oge ịtụ ogbunigwe, ebe mwakpo e mere n'ụlọ akwụkwọ na mpaghara ndị nkịtị bi akpalitela nnukwu nchegbu gbasara ọnọdụ enyemaka mmadụ.
Na Gaza, ọnụ na-ekwuchitere UNICEF, James Elder, akọwala mpaghara ahụ dịka “ebe kacha dị ize ndụ n'ụwa dịka nwatakịrị.” E gbuola ma ọ bụ merụọ iri puku ụmụaka ahụ, ebe ọtụtụ narị puku ndị ọzọ ka a chụpụrụla n'ebe obibi ha ma na-eche ọnọdụ enyemaka mmadụ siri ike ihu ugbu a.
Na Sudan, ọtụtụ nde ụmụaka a hapụla ebe obibi ha n'ihi agha ka na-aga n'ihu. Nke a emeela ka ọtụtụ n'ime ha ghara inwe ohere a pụrụ ịdabere na ya iji nweta nri, agụmakwụkwọ, nlekọta ahụike, ma ọ bụ ebe nchekwa.
Maka ụmụaka bi n'ime nsogbu ndị a, agha abụghị naanị ihe ha na-ahụ na telivishọn. Kama, agha gbara ha gburugburu ma na-achịkwa akụkụ ọ bụla nke ndụ ha.
Mgbake
Ozi ọma dị na ya bụ na ụmụaka nwere ikike pụrụ iche ịlanarị ma gbanwee n'agbanyeghị ihe isi ike ọbụla na-eche ha ihu.
E nwere ụfọdụ ihe na-enye aka ibelata mmetụta mmerụ uche (trauma), nke kachasị mkpa bụ inwe onye na-elekọta ụmụaka nke na-adị mgbe niile, na-akwado ya, ma na-enye ya obi iru ala.
Anyị, dịka ndị toro eto, nwere ohere pụrụ iche iji belata ma ọbụla gbanwee ụfọdụ n'ime mmetụta ihe isi ike na nhụjuanya ụmụaka anyị na-enwe.
N'ụzọ dị mwute, ọtụtụ ụmụaka nọ n'ebe agha na-aga abụrụla nke otu ma ọ bụ abụọ n'ime ndị bụ isi na-elekọta ha anwụọla. Nke a na-eme ka ha bụrụ ndị nwere ohere dị ukwuu ịta ahụhụ n'ihi Ahụmahụ Ọjọọ ha nwere n'oge Nwata (ACEs).
Ikike ichefu mkpagbu nke ụmụaka nwere mmerụ uche apụtaghị ịlaghachi n'ọnọdụ ha nọ na mbụ ma ọ bụ “ịlaghachi n'ọnọdụ nkịtị.”
Mgbe ọtụtụ ahụmahụ ọjọọ gbakọtara ọnụ — dịka mfunahụ ụlọ, ihe onwunwe, ndị a hụrụ n'anya, inwe mmerụ ahụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ — ọ na-esi ike ịkọwa ihe a ga-akpọ “ihe dị mma.”
Ọtụtụ ndị ọkachamara n'ịgwọ mmerụ uche ụmụaka kwenyere na ihe nwere ezi uche karịa bụ ka ụmụaka nweta ihe a na-akpọ “ịchọta ihe ndụ pụtara,” Nke a bụ usoro ebe mmadụ na-achọta ihe ọ pụtara site n'ihe ndị ha gabigara, na-amụta otú ahụmahụ ahụ siri gbanwee ya, ma na-achọpụta ụzọ isi gaa n'ihu.
Usoro a na-achọkarị nkwado n'akụkụ ahụike uche, ebe obibi kwụsiri ike, na netwọkụ nkwado sitere n'obodo nke na-enyere ụmụaka aka iwughachi mmetụta nke nchekwa na ịdị n'otu ha.
Ọrụ anyị niile ichekwa oge uto nwata
Ma anyị na-atụle agha ndị a na-ahụ ugbu a ma ọ bụ na-eche echiche banyere otu a ga-esi egbochi agha n'ọdịnihu, otu eziokwu ka doro anya bụ: aghaghị ichekwa ụmụaka pụọ n'ibu dị arọ nke ihe ike.
Ọgbọ tolitere n'etiti agha abụghị ọgbọ furu efu. Site n'inwe ọnọdụ kwụsiri ike, nkwado, na ohere, otu ụmụaka ndị ahụ nwere ike ito bụrụ ndị ndu, ndị na-emepụta echiche ọhụrụ, na ndị na-akwado ụwa jupụtara n'udo. Ma ha enweghị ike ime nke a naanị ha.
Ọrụ onye ọbụla n'ụwa niile abụghị naanị iwughachi ụlọ na akụrụngwa e bibiri, kama ọ bụkwa inyere ụmụaka aka iwughachi mmetụta nchekwa, nkwụsi ike, na olileanya ha.
Ọrụ a abụghị naanị nke gọọmenti na ụlọ ọrụ mba ụwa dị iche iche. Ọ bụkwa ọrụ ndị nkuzi, ndị ọrụ enyemaka mmadụ, ndị ndu obodo, na ụmụ amaala nkịtị.
Ịkwado mgbalị ndị a na-eme iji nye ụmụaka ndị agha metụtara agụmakwụkwọ, nlekọta ahụike uche, na ebe obibi kwụsiri ike; ịkwado iwu na-echebe ndị nkịtị; na ịnọgide na-amata ihe na-eme n'ihe gbasara nsogbu enyemaka mmadụ bụ ụfọdụ ụzọ onye ọ bụla pụrụ isi nye aka hụ na a naghị ahapụ ụmụaka ka ha buru ibu agha naanị ha.
Ihe e ji ama ihe agha na-akpata n'ezie abụghị naanị ụlọ ndị e bibiri ma ọ bụ ala ndị e tufuru. A na-atụ ya site n'oge ịbụ nwata nke ime ihe ike gbanwere, nakwa site n'ọrụ anyị niile nwere ịchekwa ọgbọ ndị na-etolite n'ihe ịma aka agha.






