Karịa nkewa Ụzọ abụọ: Omenala dị iche iche n’ụwa gbasara mgbanwe njirimara okike (gender fluidity).

A depiction of a battle from the Hindu epic Mahabharata, between Shikhandi, a character who was born a woman but was turned into a man by a deity, and Kripa, another central figure in the epic.

Ihe osise na-egosi agha sitere n'akwụkwọ akụkọ nsọ ndị Hindu, Mahabharata, n'etiti Shikhandi, onye so na ya bụ akụkọ a mụrụ dị ka nwanyị ma otu chi gbanwere ka ọ bụrụ nwoke, yana Kripa, onye ọzọ bụ isi n'ime akụkọ ahụ. onye ọbụla pụrụ iji eserese a mee ihe ọbụla.

Ederede njịkọ aka a bụ akụkụ nke usoro pụrụ iche nke Global Voices nke ọnwa Juun 2026, nke isiokwu ya bụ “Ụdị Dịgasị Iche nke Njirimara Okike (Gender Diversity).” Usoro a na-enye nghọta banyere ụdị dịgasị iche nke njirimara okike na otu e si eyi ya egwu, otu e si echekwa ya, ma otu e si edobe ya n'akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ị nwere ike ịkwado mbipụta akụkọ a site n'ịnye onyinye ebea.

Ọtụtụ mgbe, a na-eche na mgbanwe ma ọ bụ mgbanwe njirimara okike (gender fluidity) bụ “ihe ọhụrụ” ma ọ bụ ọbụna “ihe sitere n'ọdịda Anyanwụ bịa”. Ma nke bụ eziokwu bụ na ọtụtụ omenala gburugburu ụwa nwere ọdịnala na akụkọ ihe mere eme nke na-agafe nkewa ụzọ abụọ nke okike, ya bụ nwoke na nwanyị.

Ọtụtụ omenala dị tupu ọchịchị ndị mba Europe matara ụdị njirimara okike dị iche iche, nke gụnyere ndị two-spirit n'etiti ọtụtụ agbụrụ amaala dị na North America na First Nations groups, nakwa ndị Torres Strait Islander n'ebe bụ Australia nke oge a, bụ́ ndị na-asọpụrụ brotherboys, sistergirls, na ụdị njirimara okike ndị ọzọ dịgasị iche. Ọtụtụ obodo dị n'agwaetiti Pacific nwekwara ụdị mgbanwe njirimara okike dị iche iche, dịka fiafifine na Niue, fakaleiti na Tonga, vaka sa lewa lewa na Fiji, whakawahine na New Zealand, rae rae na Tahiti, na mahu na Hawaii. N'Africa, ndị ọkà mmụta akụkọ ihe mere eme achọpụtakwala na e nwere akụkọ ihe mere eme bara ụba gbasara njirimara LGBTQ+.

A na-ahụkwa mgbanwe a n'akụkọ ifo, okpukpe dị iche iche, na akụkọ ọdịnala n'ụwa niile. Akụkọ ndị a na-egosi ndị so na ya bụ akụkọ nwere njirimara okike dị mgbagwoju anya, site na ihe ndị na-eke ihe na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị, ruo na chi dịiche iche ndị bụ maka ọmụmụ, ndị nwekọrọ njirimara nwoke na nwanyị ọnụ, ruo na ndị a ma ama n'akụkọ ifo bụ ndị na-emebi usoro nkewa nwoke na nwanyị ma ọ bụ na-agbanwegharị okike ha kpamkpam. N'ọtụtụ ọnọdụ, mgbanwe a abụghị naanị ihe na-eme n'akụkụ; ọ bụ otu n'ime ntọala bụ isi nke akụkọ ifo ndị ahụ.

Otu ọ dị, ka ọchịchị ndị Europe na okpukpe ife otu Chineke gbasara n'ụwa, ọtụtụ n'ime akụkọ ifo ndị a furu efu ma ọ bụ gbanwee ka ndị so na ha bụ akụkọ bụrụ naanị nwoke ma ọ bụ nwanyị, iji kwekọọ n'echiche okpukpe Ndị Kraịst nke Ọdịda Anyanwụ. Dị ka otu ọkà mmụta kwuru, “echiche ha banyere okike ịbụ nwoke maọbụ nwanyị adabaghị mfe n'usoro ndụ obodo ndị ha zutere.”

N'ihi nke a, a kpapụrụ ụdị dịgasị iche nke njirimara okike n'akụkụ, a manyekwara ọtụtụ ndị nwere ụdị njirimara ndị ahụ dịgasị iche iche ibi ndụ na nzuzo ma zoo onwe ha nke ọma. Ọ dị mkpa ịghọta na ụdị dịgasị iche nke njirimara okike apụchaghị n'anya kpamkpam; kama, ọtụtụ mmadụ tufuru ohere igosipụta onwe ha n'ihu ọha n'ihi egwu ịkpagbu ha maọbụ ịkpa ókè.

Ọ bụ ezie na nnọchite anya ụdị njirimara okike ndị a dị iche iche agbanweela n'akụkọ ihe mere eme nke ọtụtụ omenala, ụdị dịgasị iche a ka na-apụta ìhè n'akụkọ ifo na ọdịnala okpukpe ụfọdụ. N'edemede a e dere n'ịrụkọ ọrụ ọnụ, Global Voices na-enyocha ọdịnala nke nnọchite anya ndị na-abụghị naanị nwoke ma ọ bụ nwanyị (non-binary) n'akụkọ ifo sitere n'akụkụ dị iche iche nke ụwa, gụnyere China, South Asia, Africa, Caribbean, na ọtụtụ mpaghara ndị ọzọ.

Mgbọrọgwụ akụkọ ifo na okpukpe Hindu

Ntọala nkà mmụta okpukpe nke na-akwado mgbanwe na ịdịgasị iche nke njirimara okike ka e gosipụtara nke ọma n'akwụkwọ nsọ na akụkọ ihe mere eme oge ochie nke okpukpe Hindu.

Gouache painting on paper (ca. 1800 AD)

Ngosipụta nke Ardhanarishvara, nke na-anọchi anya ume nwoke na ume nwanyị n'okpukpe Hindu. Ihe osise gouache e sere n'akwụkwọ (ihe dị ka afọ 1800 AD) nke sitere na Ọbanka ndị Britain (British Museum). Onyonyo sitere na Wikipedia. Ọha nwere ikike iji ya (Public Domain).

Chi Hindu a kacha mara amara nke na-egosi mgbanwe njirimara okike bụ Ardhanarishvara (“Onyenwe ha nke bụ Ọkara Nwanyị”), nke na-anọchi anya ngwakọta nke ọdịdị nwoke na nwanyị n'otu ahụ nke chi Hindu Shiva na nwunye ya, chi nwanyị Parvati.

A na-egosi Ardhanarishvara dịka otu onye e kewara n'etiti: Shiva nọ n'akụkụ aka nri, Parvati nọkwa n'akụkụ aka ekpe. Aha ya pụtara “Onyenwe ha nke bụ ọkara nwanyị..” Chi a na-anọchi anya ịdị n'otu na nguzozi nke ume nwoke na ume nwanyị, nke a na-akpọ Purusha na Prakriti, nke na-anọchikwa anya eziokwu kachasị elu nke gafere nkewa ịbụ nwoke na ịbụ nwanyị. Nke a bụ otu n'ime ntọala nkà ihe ọmụma kachasị mkpa nke na-akọwa na njirimara okike bụ ihe na-adị n'usoro sara mbara (spectrum), ọ bụghị naanị nkewa abụọ.

A na-ahụkwa mgbanwe njirimara okike ugboro ugboro n'ọtụtụ akụkọ ifo Hindu. N'akụkọ ifo Hindu “Ramayana,” n'ụbọchị mbụ nke ọsọ ọ gbapụrụ ga zoo nọrọ afọ iri na anọ nke onyenwe ha Rama pụọ na Ayodhya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya — “ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị” — ka ha laghachi n'obodo. Ndị fọdụrụ chere ya ka ọ lọta mechara nweta ngọzi ya, ma e mesịa jikọta ha na mmalite obodo hijra (obodo nwere okike nke atọ karịa ịbụ nwoke na ịbụ nwanyị), nke ka dị na South Asia ruo taa.

N'akụkọ ifo Hindu “Mahabharata,” n'afọ nke iri na atọ nke mbibi ha, onye isi n'akụkọ ahụ, dike Arjuna, gbanwere onwe ya bụrụ Brihannala, “onye nkuzi bụ eunuk nke ịgụ egwu na ịgba egwú,” nye Adaeze Uttarā, nke ọtụtụ ndị odee nke oge a na-akọwa ọrụ a dịka ihe na-anọchi anya okike nke atọ ma ọ bụ ịgafe oke nkewa nwoke na nwanyị. Chi Vishnu na-agbanwekwa bụrụ Mohini, nwanyị mara mma na-adọrọ mmasị, bụ naanị ụdị nwanyị (avatar) ya ma bụrụkwa onye dị mkpa n'ịghọta mgbanwe njirimara okike na otú chi si egosipụta onwe ya n'ụdị dị iche iche.

A na-akwadokwa okike nke atọ, nke a na-akpọ “Third Nature” (Tritiya Prakriti), n'akwụkwọ iwu na ọgwụgwọ oge ochie nke Hindu, dịka (Kama Sutra yana Sushruta Samhita). Akwụkwọ ndị a na-ekwu kpọmkwem banyere okike nke atọ, na-akọwa ndị a mụrụ nwekọrọ njirimara nwoke na nwanyị ọnụ, ma ọ bụ ndị na-enwe mmasị mmekọahụ n'ebe ndị otu okike ha nọ, ma na-egosi na ụdị njirimara ndị a bụ akụkụ nkịtị nke ịdị adị mmadụ. 

Mgbanwe njirimara okike n'okpukpe Buddha nke China

Okpukpe Buddha nwekwara ọdịnala nke mgbanwe njirimara okike n'akụkọ ifo ya. Guanshiyin Bodhisattva (觀世音菩薩) maọbụ Guanyin na nkenke, nke pụtara “Bodhisattva (Buddha dị ndụ) nke na-anụ olu nke ụwa,” bụ chi nwere njirimara okike na-agbanwe agbanwe, ma bụrụkwa otu n'ime chi ndị a kacha hụ n'anya n'okpukpe Buddha nke China, Taoism, na okpukpe ọdịnala ndị ọzọ. 

Guanyin dịka ọ dị na mbụ bụ Avalokitesvara, nke bụ Bodhisattva nke a na-ejikọta yana ebere na ọmiiko. N'ime Sutra ndị mbụ nke Buddha (akwụkwọ nsọ), a kọwara Avalokitesvara dịka “nwoke dike” (na Avatamsaka Sutra) ma ọ bụ “nwoke ezi omume” (na Karuṇāpuṇḍarīka Sūtram). Otú ọ dị, dịka Lotus Sutra si kwuo, Bodhisattva enweghị okike a kapịara ọnụ, ebe Avalokitesvara na-apụta n'ụwa ndị dị ndụ n'ụdị iri atọ na abụọ dị iche iche iji kụziere ndị dị ndụ ụzọ mmụta ime mmụọ — site n'ịpụta dịka Buddha maọbụ eze Brahma gaa n'ịbụ nwanyị, nwa agbọghọ, ma ọ bụ ọbụna ihe na-abụghị mmadụ.

A sụgharịrị Sutra ndị gbasara Guanyin Avalokitesvara n'asụsụ China mbụ n'oge ọchịchị Han Dynasty, ebe ihe oyiyi ya malitere ịpụta na China, ọkachasị n'akụkụ Silk Road, n'oge North na South Dynasties.

Ihe oyiyi mbụ ya, nke na-abụkarị n'ụdị “Lotus Guanyin” (持蓮觀音), ka nwere ọdịdị nwoke, dịka obi dị larịị na mgbe ụfọdụ afụ ọnụ. N'oge Tang Dynasty (618–907 CE), mgbe Wu Zetian (624–705 CE) bụ naanị nwanyị chịrị China dịka eze ukwu, kwupụtara na ọ bụ mweghachi nke Maitreya Buddha bụ ihe oyiyi Guanyin, na-adị mgbe ụfọdụ n'ụdị dị iche iche dịka “Guanyin Ihu Iri na Otu” (十一面) nakwa “Guanyi Aka Puku” (千手觀音), malitere igosipụtakọta njirimara nwoke na nwanyị ọnụ na-enwe ihu na ahụ yiri nke nwanyị. Nke a mere ka nkwenkwe sie ike na chi nwanyị a nwere obi ebere ga-anụ ma zaa arịrịọ niile nke ndị kwere ekwe (有求必應).

(Left) Bodhisattva Avalokiteshvara Guanyin. (Right) Chinese shrine to a statue of the Child-giving Guanyin.

(N'aka ekpe): Bodhisattva Avalokitesvara Guanyin CC BY-SA 4.0, site na Wikimedia Commons. (N'aka nri): Ebe nsọ ndị China nwere nye ihe oyiyi Guanyin Onye Na-enye Ụmụ CC BY-SA 4.0, site na Wikimedia Commons.

N'oge Song Dynasty (960–1279 CE), Guanyin weere ọdịdị nwanyị n'ụzọ doro anya. Nke a pụtara ìhè n'ụdị “Water-Moon Guanyin” (水月觀音), nke kwekọrọ na ụdị eserese ọdịnala ndị China, yana ofufe nke “Guanyin Onye Na-enye Ụmụ” (送子觀音) n'etiti ọtụtụ ụmụ nwanyị kwere ekwe.

N'oge Ming Dynasty (1368–1644 CE), akwụkwọ akụkọ China a ma ama “Journey to the West” (西游记) mere ka oyiyi Guanyin sikwuo ike dịka chi nwanyị nne nke ebere. N'ime akụkọ ahụ, Guanyin n'ụdị nwanyị ya nke “South-Sea Guanyin” ma ọ bụ “Cross-Sea Guanyin” (南海 / 渡觀音) na-edu njem nsọ ahụ site n'ịchịkwa Monkey King, ịkpọrọ onye mọnk ezi omume Tang Sanzang na ndị nche ya niile ka ha sonyere njem ahụ, ma na-enyere ndị njem nsọ aka idozi ọtụtụ nsogbu ha zutere n'ụzọ. Taa, a na-ahụ ihe oyiyi “South-Sea Guangyin” ugboro ugboro n'akụkụ osimiri ndị dị na China.

Mgbanwe njirimara okike tupu oge ọchịchị ndị Europe na Peru na Ecuador

[Ameya Nagarajan sụgharịrị ya]

Ndị Europe mbụ rutere n'ụsọ oke osimiri nke ebe bụ Ecuador nke oge a zutere ụdị mmadụ na-adabaghị n'echiche ha banyere nkewa okike abụọ, ya bụ nwoke na nwanyị. Akụkọ ndị e dere n'oge ọchịchị ndị Europe na-akọ banyere ndị a kpọrọ “enchaquirados” — bụ ndị ntorobịa ndị, dị ka akụkọ ndị ahụ si kwuo, a họpụtara site n'oge ha bụ nwata ka ha rụọ ọrụ emume ọdịnala, kwadoro dịka ụmụ nwanyị ma na-enwe mmekọrịta emume pụrụ iche ha na ndị isi obodo Huancavilca. N'agbanyeghị na e dere akụkọ ndị a site n'echiche nke nkuzi ime omume ọma nke Europe na narị afọ nke iri na isii metụtara n'ebe ọ dị ukwuu, ha ka bụ otu n'ime akwụkwọ akụkọ ihe mere eme a na-ezo aka na ha ugboro ugboro gbasara ụzọ ndị ọzọ e si aghọta njirimara okike n'obodo Ecuador tupu ndị Spain abịa.

A screenshot from La Playa de los Enchaquirados" documentary.

Onyonyo e si na ihe nkiri akụkọ ndụ “La Playa de los Enchaquirados” wepụta. Onyonyo sitere na YouTube trailer.

Kama ịnọgide na-adị naanị n'ime ebe nchekwa akụkọ ihe mere eme, akụkọ banyere enchaquirados alaghachila ndụ ọzọ n'Ecuador nke oge a. Nnyocha ndị ọkà mmụta mere dịka onye ọkà mmụta banyere mmadụ (anthropologist) bụ  Hugo Benavides emeela ka e nyochaa akụkọ a ọzọ n'ụzọ miri emi. N'otu oge ahụ, n'obodo ndị ọkụ azụ Engabao, nke dị na mpaghara Guayas — otu LGBTQ+ họọrọ aha “Los Enchaquirados” iji weghachite akụkụ akụkọ ihe mere eme nke e mere ka ọ bụrụ ihe a na-adịghị ahụ anya ọzọ ruo ogologo oge. E gosipụtara ahụmịhe a n'ihe nkiri akụkọ ndụ “La playa de los enchaquirados” (The Beach of the Enchaquirados n'asụsụsụ bekee), nke na-ejikọta akụkọ oge dịịrị tupu ọchịchị ndị Spain yana mkparịtaụka dị ugbua gbasara njirimara mmadụ, ncheta, na ịdịgasị iche.Ihe dị ọtụtụ narị kilomita n'ebe ndịda, n'etiti mpaghara ugwu Andes, akwụkwọ akụkọ oge ọchịchị ndị Europe dekọkwara ndị ọzọ na-emebi nkewa okike dịka echiche ọdịda anyanwụ si akọwa ya. Otu n'ime ha bụ ndị a kpọrọ

A Quariwarmi Pride flag.

Ọkọlọtọ mpako (Pride flag) nke quariwarmi e mepụtara n'afọ 2016. Onyonyo sitere na Nonbinary Wiki. CC BY-SA 4.0.

Ihe dị ọtụtụ narị kilomita gawa n'ebe ndịda, n'etiti mpaghara ugwu Andes, akwụkwọ akụkọ oge ọchịchị ndị Europe dekọkwara ndị ọzọ na-emebi nkewa okike dịka echiche si ọdịda anyanwụ si akọwa ya. Otu n'ime ha bụ ndị a kpọrọ “quariwarmi,” ndị e jikọtara ha na emume ọdịnala nke alaeze Inca, karịsịa n'ógbè ndị bụ akụkụ Peru taa. Aha a bụ quariwarmi sitere n'ịjikọta okwu Quechua abụọ: “qari” (nwoke) na “warmi” (nwanyị). Nnyocha dị iche iche akọwawokwa ha dịka ndị ọkachamara n'emume ọdịnala, bụ ndị na-arụ ọrụ n'ebe nkewa dị n'etiti nwoke na nwanyị na-esoghị iwu siri ike ma ọ bụ nke na-ekewapụ mmadụ.

Nkọwa dị iche iche gbasara quariwarmi ka na-abụ isiokwu a na-arụrịta ụka n'etiti ndị ọkà mmụta, mana otú ọ dị, ịdị adị ha n'akwụkwọ akụkọ ihe mere eme emeela ka ọtụtụ ndị nchọpụta nyochaa ọzọ otú obodo ndị Andes si ghọta njirimara okike tupu ọchịchị ndị Europe amalite. Ụfọdụ ndị odee na-ekwu na a ghaghị ịghọta quariwarmi n'ime echiche sara mbara nke nguzozi, imekọ ihe ọnụ, na mmekọrịta dị n'etiti ụkpụrụ mmekọrịta mmadụ na nke ime mmụọ.Karịa ihe ndị ọkà mmụta na-ekwu, quariwarmi aghọwo ebe dị mkpa e si aghọta ịdịgasị iche nke ahụmịhe mmadụ nke e dekọrọ n'obodo Andes tupu ndị Spain abịa.

Ndị na-agbanwe ọdịdị mmadụ na mgbanwe njirimara okike n'ime nkà mmụta ụwa nke ndị Yorùbá

Ogologo oge tupu okwu nke oge a a na-akpọ “gender bending” (ịgafe ma ọ bụ ịgbanwe nkewa okike) amalite ịbụ ie a na-anụkarị, ndị Yorùbá oge ochie nke West Africa ekwenyelarị na e nwere mmụọ ndị pụrụ iche ndị nwere ike ịgafe n'etiti ọdịdị nwoke na nke nwanyị. A na-akpọ mmụọ ndị a òrìṣà.

A statue of Oxalá

Ihe oyiyi nke Ọbàtálá dị na Costa do Sauípe, Bahía, Brazil. Onyonyo sitere na Wikimedia Commons. CC BY 3.0.

Otu n'ime òrìṣà ndị a a kacha asọpụrụ bụ Ọbàtálá, onye a na-ewere dịka chi okike n'akụkọ ifo ndị Yorùbá. A na-akọwakarị Ọbàtálá dịka onye na-egosipụta ma njirimara nwoke ma nke nwanyị. A na-ejikọta ya na okike mmadụ site n'ịji ụrọ kpụpụta nwa a ka bu n'afọ nne ya, ma n'akụkụ anụ ahụ ma n'akụkụ ime mmụọ. N'ihi na ike okike a gbasara ma nwoke ma nwanyị n'ọrụ ịmụ nwa, a na-ewere Ọbàtálá dịka onye gafere oke nkewa siri ike dị n'etiti nwoke na nwanyị.

Òrìṣà ọzọ a na-akọkarị ihe gbasara ya site n'ikike mgbanwe bụ Èṣù Ọ̀dàrà. Èṣù, nke ndị ozi si ala ọzọ Ndị Kraịst  sụgharịrị n'ụzọ na-ezighị ezi dịka Ekwensu maọbụ Satan, na-anọchi anya ịdị ọdịdị abụọ yana mgbanwe. N'ihe niile dị adị, e nwere ihe na-emegide ya, ma Èṣù bụ onye na-anọ n'etiti akụkụ abụọ ndị ahụ. N'ihi ọrụ a, a pụrụ ịkọwa Èṣù dịka nwoke ma ọ bụ nwanyị, ogologo ma ọ bụ mkpụmkpụ, nke ọma (àdó aṣure) ma ọ bụ nke ọjọọ (àdó aṣubí).

N'ime Ifá, nke bụ usoro akwụkwọ nsọ na usoro amụma nke okpukpe Yorùbá, e nwere akụkọ na-akọ na Èṣù gbanwere bụrụ nwanyị. A na-ekwu na otu nwoke aha ya bụ Ṣàkòtó, n'ịchọ ọdịmma na chi ọma, chụrụ àjà. Èṣù wee gbanwee bụrụ nwanyị iji nwalee àgwà na ezi omume nwoke ahụ.

Karịa mgbanwe ọdịdị ahụ, e nwekwara òrìṣà ụmụ nwanyị ndị njirimara ha na-emebi atụmanya ọdịnala banyere ịbụ nwanyị. Ọya, nwunye Ṣàngó yana òrìṣà nke Osimiri Niger (odò Ọya), na-anọchi anya mgbanwe na mmegharị. Nke a na-ejikọta ya na oke ifufe na ifufe siri ike, a na-akọwakwa Ọya dịka onye nwere àgwà ndị a na-ewerekarị dịka nke ụmụ nwoke, dịka ikike ọchịchị, obi ike, na isonye n'agha. A na-ejikọta ike ya na obi siri ike ya na nke atụ, bụ anụmanụ nke mpi ya bụ akara na ihe nnọchianya nke ike ya.

A depiction of Olódùmarè.

Ngosipụta nke Olódùmarè, Onye Okike Kasị Elu nke na-enweghị njirimara okike ịbụ nwoke maọbụ nwanyị n'okpukpe ndị Yorùbá. Onyonyo e si na YouTube wepụta

Ọ̀ṣun bụ òrìṣà nke ọmụmụ, ịma mma, ọgụgụ isi, amamihe na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N'akụkọ banyere okike ụwa, Olódùmarè, Onye Okike Kasị Elu nke na-enweghị njirimara okike ịbụ nwoke maọbụ nwanyị, zitere ndị ozi iri na isii ka ha weta usoro n'ụwa. Ọ̀ṣun bụ naanị nwanyị nọ n'etiti ha. Ndị nwoke ahụ gụpụrụ ya n'ịme mkpebi, nke mere ka ozi ha daa n'ụwa. Mgbe ha laghachikwuuru Olódùmarè ikpesa nsogbu ha, a gwara ha na ha agaghị enwe ihe ịga nke ọma ruo mgbe ha ga-arụkọ ọrụ ha na nwanyị ahụ ha leghaara anya. N'ikpeazụ, Ọ̀ṣun pụtara dịka onye nwere ikike, onye amamihe ya weghachiri nguzozi.

N'ozuzu ya, ọdịnala nsọ nke ndị Yorùbá na-echekwa akụkọ gbasara òrìṣà ndị na-egosipụta mgbanwe, ịdị na-agbanwe agbanwe, na ịgafe ókè n'ụdị dị iche iche. Ncheta akụkọ banyere ha ka na-adị ndụ n'obi na n'echiche nke ndị Yorùbá n'akụkụ ụwa niile.

Onye na-eme Ngosi na Emume Kanival nke na-agafe ókè njirimara okike

Dame Lorraine.

Dame Lorraine, otu n'ime ndị agwa ọchị a kacha mara amara na Carnival. Onyonyo sitere na Flickr. CC BY 2.0.

Otu n'ime ndị agwa ọdịnala a kacha hụ n'anya n'emume Carnival nke Trinidad na Tobago bụ Dame Lorraine, onye bụrụla akụkụ nke emume Carnival ruo ọtụtụ narị afọ. Ruo taa, ihe ngosi mkpaọchị nke agwa a, nke sitere n'ịkwa emo klaasị ndị French nwe ubi  n'oge ọchịchị ndị Europe, ka na-atọ ndị na-ekiri ya ụtọ

A na-amata ya ngwa ngwa site n'obi ya buru ibu na nnukwu ike ya e mepụtara otu ọ ga-abụ ihe ọchị. N'oge gara aga, ọ bụkarị ụmụ nwoke na-eyi uwe ụmụ nwanyị na-eme agwa a. Ebe ọ bụ na ebumnuche ya abụghị ime ka onye na-eme ya yie nwanyị n'ezie, kama ọ bụ iji mee ndị ọchịchị ndị Europe ihe ọchị. Nke a mere ka ụmụ nwoke bụrụ ndị kwesịrị ekwesị maka ịkpa agwa ahụ n'ụzọ dị iche iche.

Ewezuga eziokwu bụ na  ọtụtụ mmọnwụ yana ihe ngosi Carnival ọdịnala n'ime narị afọ nke iri na asatọ na nke iri na itoolu bụ nke ụmụ nwoke na-emekarị, ọdịdị ahụ ha na mmegharị ahụ ha na-eme n'ụzọ a na-eme ka ọ bụrụ ihe ọchị na-eme ka agwa ahụ bụrụ ihe na-atọ ụtọ karịa.

Dame Lorraine.

Dame Lorraine. Onyonyitere na  Flickr. CC BY-NC-ND 2.0

Edemede e bipụtara na Folklife n'afọ 2021 tụrụ aro na omenala nke ụmụ nwoke ịkpa agwa ụmụ nwanyị nwere ike ịbụ nke sitere n'emume ịgba mmọnwụ Gẹlẹdẹ nke ndị Yorùbá na West Africa, nke na-asọpụrụ ọrụ na ike ụmụ nwanyị n'ime obodo. Kaosinadị, onye na-agba egwú na onye na-ekwu maka ọdịbendị nke Trinidad, Sonja Dumas, kwuru na kwuru na “Dame Lorraine mbụ bụ ihe ngosi nke ìgwè ndị Afrịka ndị e nyere nnwere onwe n'oge na-adịbeghị anya, ọ bụghịkwanụ otu onye agwa ma ọ bụ otu ìgwè ndị yi otu ụdị uwe. Ọ bụ ihe ngosi na-akwa ọchịchị ndị Europe emo — n'ụzọ nke ọzọ bụrụkwa ka ndị Afrịka si egosipụta nguzogide ha.”

Dumas kwukwara na eziokwu ahụ bụ na ọ bụ ụmụ nwoke na-eme Dame Lorraine na mbụ bụkwa “otu ihe ọzọ na-egosi ntụgharị ọnọdụ nke emume Carnival,” ebe a na-agbanwekarị ọrụ na usoro ọdịnala. N'ụzọ na-adọrọ mmasị, onye ọkà mmụta banyere mmadụ Daniel J. Crowle kwuru na “ụmụ nwanyị kwa na-eme agwa Dame Lorraine n'ụbọchị  Jamette Carnival,” ma tụọ aro na ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị n'oge ahụ nwere ike ịhọrọ iyi uwe nke okike ọzọ.

Dame Lorraine nwekwara egwu njirimara nke ya, nke a na-akpọkarị mgbe ọ bụla agwa ahụ na-eme ihe ngosi.

N'oge a, ụmụ nwanyị ka ụmụ woke n'ọnụ ọgụ na-eyi uwe Dame Lorraine. Uwe ahụ na-abụkarị uwe ogologo ruo n'ikpere ụkwụ, nwere aka uwe ruo n'ikwo aka, ma na-enwekarị ihe ịchọ mma dịka frills na ihe ịchọ mma ndị ọzọ. Ndị Dame na-ebukarị ofufe aka (fan) na nche anwụ (parasol), ma ọ bụ na-eyi nnukwu okpu mara mma.

Otú ọ dị, ihe na-eme ka agwa a bụrụ ihe pụrụ iche bụ mmegharị ahụ ya. Ọ na-agba egwú n'ụzọ na-atọ ọchị, na-akpali mmasị, ma na-egosipụtakwa nnupụisi, ebe mmegharị akụkụ ahụ ya ndị e mere ka ha buo ibu na-abụ isi ihe na-eme ka ihe ngosi ahụ na-atọ ọchị.

Carnival abụwo ebe e ji ekwu okwu gbasara nsogbu mmekọrịta mmadụ na ibe ya site n'ụzọ ọchị na nka. Ndị agwa dịka Dame Lorraine na-egosi ụzọ amamihe e si agbagha ndị ọchịchị ma nye ndị mmadụ ohere igosipụta onwe ha.

Ụmụ nwanyị ndị bụ dike na-emebi ọrụ ọdịnala e kenyere ha site n'okike

Akụkọ ọdịnala nke Kyrgyzstan jupụtara n'akụkọ banyere ụmụ nwanyị dike bụ ndị jụrụ ịgbaso ọrụ ọdịnala e kenyere ụmụ nwanyị. Akụkọ ndị a ka na-ewu ewu taa n'etiti obodo Kyrgyz dị iche iche gburugburu ụwa. Akụkọ abụọ a kacha mara bụ nke Kyz Saikal (Saikal Nwa Agbọghọ) na Janyl Myrza (Janyl Dike).

Kyz Saikal bụ otu n'ime ndị agwa dị n'akụkọ ifo “Manas,” nke bụ akụkọ ọdịnala a kachasị mara na nke kachasị mkpa na Kyrgyzstan. N'akụkọ ahụ, a kọwara Kyz Saikal dịka dike siri ike ma nwee nkà sitere n'ebo Noighut. Ụdị akụkọ abụọ a kacha mara amara, nke ndị na-akọ ya bụ manaschy (ndị ọkọ akụkọ Manas) bụ Sagymbay Orozbakov na Sayakbay Karalayev kwuru, na-akọwa ịma mma ya, ike ya, nkà ya, na obi ike ya, na-ekwu na o “bu mma agha, ube, na ọta.”

Dịka Orozbakov si kọọ, ọ mara Manas mgba, bụ onye dike bụ isi, ka ha lụọ ọgụ ịnyịnya na ube. O kwere nkwa na ọ ga-enye ndụ ya, nnwere onwe ya, na ịnyịnya ya ma ọ bụrụ na o merie ya; ma ọ bụrụ na ya emerie, a ga-enye ndị obodo ya udo na nnwere onwe. O merụrụ Manas ahụ, Ma otu n'ime ezigbo ndị enyi Manas, aha ya bụ Chubak, batara n'etiti ọgụ ahụ iji zọpụta ya, nke mebiri iwu ọgụ ahụ.

Dịka Karalayev si kọọ, Manas na Kyz Saikal lụrụ ọgụ ugboro abụọ, onye ọ bụla meriri otu ọgụ. Mgbe Manas mechara merie n'ikpeazụ, ọ rịọrọ Kyz Saikal ka ọ lụọ ya. Ma Kyz Saikal jụrụ arịrịọ ahụ, sị na ọ ga-abụ nwunye ya naanị n'ụwa nke mmụọ, ebe Manas enweelarị nwunye.

N'afọ 2016, BBC tinyere Kyz Saikal n'ime ndepụta ya nke ụmụ nwanyị otu narị kacha nwee mmetụta ma bụrụkwa ndị na-akpali mmụọ ndị mmadụ n'ụwa, ma meekwa  obere ihe nkiri akụkọ ndụ gbasara ya.. 

A sceenshot of a 2015 movie about .

Onye na-eme ihe nkiri na-egosipụta Janyl Myrza. SOnyonyo e wepụtara na trailer nke ihe nkiri afọ 2015, “Жаныл Мырза” (Dear Sir)

Iji masa Kyz Saikal aka n'akụkọ ama ama, maọbụ eleghị anya ọbụna gafere ya n'ịma ama bụkwa onye a ma ama Janyl Myrza. A maara Janyl Myrza dịka nwanyị dike nwere obi ike, onye ọkachamara n'ịnya ịnyịnya, na onye na-agba ụta na-enweghị atụ. A kọwara akụkọ ndụ ya nke ọma n'abụ ogologo nke nwere otu aha ahụ, nke Tenti Adysheva dere dabere n'akụkọ ọdịnala e ji ọnụ kọọ nke na-agafe site n'ọgbọ ruo n'ọgbọ. Ebe ọ bụ naanị nwa a mụrụ mgbe e chere ogologo oge inweta nwa n'ezinụlọ ya, nna ya zụlitere ya ka ọ bụrụ onye ndu ebo Noighut. Dị ka akụkọ ọdịnala si kwuo, ọ chebere ndị obodo ya nke ọma megide mwakpo ndị Kalmyk. 

Ndụ ya gbanwere n'ụzọ dị mwute mgbe o gburu otu dike aha ya bụ Tulku na ndị ya mgbe ha wakporo obodo ya ma zuo ìgwè ịnyịnya, n'ihi na ọ jụrụ arịrịọ Tulku ka ọ lụọ ya. Ndị otu ebo Tulku mechara bọọrọ ya ọbọ site n'ịkpọrọ Janyl Myrza n'ike ma nye ya ka ọ bụrụ nwunye otu okenye aha ya bụ Kalmatay.

Ma Janyl Myrza ekweghị ịnakwere ọnọdụ ahụ. N'ikpeazụ, ọ gbapụrụ n'alụmdi na nwunye ahụ, na-eyi egwu na ọ ga-eji ụta gbuo onye ọbụla ga-anwa iso ya. Ndụ ya kwụsịrị n'obodo nna nna ya dị na Kakshaal, ebe ọ hụrụ naanị ịtọgbọrọ n'efu yana mbibi mgbe ọ laghachiri.

Dịka Kyz Saikal, Janyl Myrza rụrụ ọrụ ndị a na-ewerekarị dịka ọrụ ụmụ nwoke, ma n'otu oge ahụ na-ekpebi ụzọ ndụ nke ya n'onwe ya, na-ajụ ịbụ naanị onye na-ekiri ihe. Akụkọ ha abụọ na-egosi otú ụmụ nwanyị si agbaji ókè e tinyere n'okike na iwu mmekọrịta mmadụ n'ime obodo Kyrgyz.

Na mgbakwunye na ihe atụ ndị a, e nwere ọtụtụ narị ihe atụ ndị yiri ha n'ebe dị iche iche n'ụwa na n'oge dị iche iche nke akụkọ ihe mere eme. Ọ bụ ezie na e nweela mgbalị a haziri ahazi kemgbe ogologo oge iji kpochapụ ịdịgasị iche nke njirimara okike — ma ụfọdụ n'ime mgbalị ndị ahụ ka na-aga n'ihu ruo taa — eziokwu ahụ bụ na ọ ka dị ndụ na-egosi na ọ bụ akụkụ na-adịgide adịgide, nke a na-apụghị ịgọnarị, nke ahụmịhe ndụ mmadụ.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.