Ụdịdị okike dị iche iche nọ n'okpuru nrụgide: Nguzogide, obodo, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke isonye

The female gaze, Collage on golden painted wood by Alice Wellinger (2014).Nlele anya nke ụmụnwaanyị, mkpokọta ihe osise e sere n’elu osisi e tere agba ọlaedo, nke Alice Wellinger mere n’afọ (2014) (CC BY-NC-ND 4.0).

Edemede a so n'usoro Ngosipụta nke Global Voices maka ọnwa Juun 2026, nke isiokwu ya bụ “Ụdịdị okike dị iche iche.” Usoro a na-enye nghọta banyere ụdịdị okike dị iche iche na etu e si eyi ha egwu, echebe, ma na-echekwa ha n'akụkụ ụwa dị iche iche. I nwere ike ịkwado mgbasa ozi a site n'inye onyinye ebe a.

Ụdịdị okike aghọọla otu n'ime isi ebe ọgụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-elekwasị anya n'oge anyị a.

N'ofe kọntinent dị iche iche, arụmarụ ụka gbasara njirimara ụdịdị okike, ikike mmadụ nwere n'ahụ ya, mmekọrịta nwoke na nwaanyị, nlekọta ahụike, nhazi ezinaụlọ, agụmakwụkwọ, egwuregwu, na isonye n'ihe gbasara ọhanaeze esitelarị n'akụkụ mkparịtaụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị bịa bụrụ isi ihe a na-atụle n'ime ya. Ma, kama ịgbasa ikike na nchekwa, ọtụtụ gọọment, ụlọ ọrụ dị iche iche, na ndị nwere nnukwu ike na-eji ụdịdị okike eme ihe dị ka ngwa maka nkewa ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihe ihere, njikwa, na ime mpụ.

Taa, ndị nwere ụdịdị okike dị iche iche, ụmụnwaanyị, ndị otu LGBTQ+, na ndị otu ndị ọzọ a na-akpapụ na-eche ihu mbọ na-eto eto a na-agba iji mee ka ụfọdụ akụkụ ndị dị mkpa nke ndụ ha bụrụ mpụ, machibido ikwu ma ọ bụ igosipụta echiche ha, ma ọ bụ belata ikike ha nwere n'akụkụ ndị dị mkpa nke ndụ ha. Ikike inweta nlekọta ahụike nke na-akwado ma na-asọpụrụ njirimara ụdịdị okike mmadụ nọ n'ihe ize ndụ n'ụwa niile. Ọgbaghara ụdịdị okike ka na-aga n'ihu n'ogo dị oke egwu. Ndị otu LGBTQ+ na-eche ịkpa oke na mmekpa ahụ maliteghachiri ọzọ ihu. Ikike ndị e ji nnukwu mgbalị nweta, bụ ndị e chere na ha ga-adịgide ma bụrụ ndị a na-apụghị ịnapụ mmadụ, ka a na-agbagha ugbu a, na-ewepụkwa ha, ma ọ bụ na-egosi ha dị ka ihe na-eyi ọha mmadụ n'onwe ya egwu.

Ọghọm dị na ya na-apụta ìhè n'ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ebe niile anyị bi.

Ọtụtụ ndị otu LGBTQ+ na-ekwu na ha anaghị enwekwazi nchekwa n'etiti igwe mmadụ nke na-akawanye njọ. Gburugburu ebe ọrụ ka na-enwe mmetụta nke enweghị nha anya nke na-emetụta ụmụnwaanyị karịa ndị ọzọ. Ụlọ ọrụ dị iche iche n'akụkụ ụwa niile enwebeghi nchedo zuru oke maka ụdịdị okike dị iche iche. Ka ọ dị ugbu a, ikpo okwu dijitalụ ndị kwere nkwa njikọ na ịkwalite ha aghọọla ebe ndị na-emegiderịta onwe ha: Ebe ndị obodo na ndị otu dị iche iche nwere ike ịhazi onwe ha ma nweta nkwado na ịdị n'otu, ma bụrụkwa ebe mmekpa ahụ, mgbasa ozi ụgha, onyunyo, na mmachi ọlgọridim na-eto ma na-agbasa.

Mmegide a na-arịwanye elu megide ụdị dị iche iche n'ihe gbasara ụdịdị okike abụghị ihe na-eme naanị. O nwere njikọ chiri anya na mmụba nke mmegharị ndị na-akwado ọchịchị aka ike na ụkpụrụ ọdịnaala gabigara oke n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Akụkọ na echiche ndị a na-ahụbu naanị n’ime ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke okpukpe ụfọdụ, na-agbasa ngwa ngwa ugbu a gafee mba na ókèala dị iche iche, wee ghọọ akụkụ nke usoro echiche a na-eji n’ụwa niile emegide otu mmegharị ụmụnwaanyị, ikike ndị LGBTQ+, nkuzi zuru oke gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị, ikpe ziri ezi gbasara ikike mmadụ n’ihe metụtara ịmụ nwa, na mgbalị a na-eme iji gbochie ma ọ bụ belata ime ihe ike metụtara ụdịdị okike. 

Otu n'ime ihe ịmaatụ kacha doo anya bụ otú okwu a bụ “echiche gbasara ụdịdị okike” si gbasaa. Ndị na-arụ ọrụ n’ihe gbasara okpukpe bụ ndị na-akwado echiche ọdịnaala siri ike, tinyere Vatican, bụ ndị mere ka okwu a bụrụ ihe a ma ama na mbụ n’ọgwụgwụ afọ 1990. Kemgbe ahụ, okwu a aghọọla ngwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ike nke a na-eji akọwa nha anya nwoke na nwanyị, ikike gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị, na ikike mmadụ nwere ikpebi ihe gbasara ahụ́ ya dị ka ihe ịma aka n'ihu nye ọdịnaala, ụkpụrụ ezinụlọ, na njirimara mba. Kemgbe a malitere iji okwu a eme ihe n'ọtụtụ mkparịtaụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, a na-eji ya eme ka ikike metụtara nzuzo, ahụike, nnwere onwe ikwupụta echiche, agụmakwụkwọ, na ikike mmadụ nwere ikpebiri onwe ya bụrụ ihe na-adịghị ike, ọkachasị maka ụmụnwaanyị, ụmụagbọghọ, na ndị otu LGBTQ+.

Okwu a aghọọla nke na-enwe mmetụta na ike dị ukwuu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge a. Mgbe Donald Trump, Onye Isi Ala United States, batara n'ọfịs n'ọnwa Jenụwarị 2025, o weputara iwu onyeisi ala nke isiokwu ya bụ “Ịchebe Ụmụnwaanyị site n'echiche ụdịdị okike na ime ka ndị ọchịchị gọọmentị dị n'otu nwee ike iweghachi eziokwu gbasara ihe ndị dị ndụ.” Nke a gosiri etu echiche ndị a si bụrụ akụkụ nke atumatu gọọmenti na mkparịtaụka ọhanaeze.

N'otu oge ahụ, ahaghị nhata ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n'ihe gbasara njirimara ụdịdị okike ka na-adịgide nke ukwuu. N'agbanyeghị ọtụtụ iri afọ nke ọganihu e nwerela, ụmụnwaanyị ka na-eche nnukwu ọghọm ihu n'ihe gbasara ọnọdụ akụnaụba. Nchọpụta dị iche iche na-egosi mgbe niile na ịbụ nne na-ebute nnukwu ntaramahụhụ ego, ebe ego ụmụnwaanyị na-akpata na-agbatukarị nke ukwuu mgbe ha mụsịrị nwa mbụ ha. N'ọtụtụ mba, ụmụnwaanyị ka na-arụ ọrụ a na-akwụ obere ụgwọ, na-arụkwa oke ọrụ nlekọta buru ibu a na-adịghị akwụ ụgwọ. Ha ka na-ezutekwa ihe mgbochi n'ịga n'ihu n'ọrụ ha, n'agbanyeghị na ọtụtụ mgbe ha na-enweta agụmakwụkwọ dị elu karịa ụmụnwoke.

A na-egosipụta enweghị nha anya ndị a n'ihe gbasara mgbasa ozi. Ụmụnwaanyị mejupụtara ihe karịrị ọkara nke ndị bi n'ụwa, ma n'agbanyeghị nke ahụ, olu na echiche ha apụtawabeghi nke ukwuu n'akụkọ mgbasa ozi na mkparịtaụka ọhanaeze. N'ihi nke a, mkparịtaụka ọhanaeze gbasara njirimara ụdịdị okike na-adịkarị n'ọnọdụ ebe ndị ịkpa ókè na mwepu na-emetụta nke ukwuu na-abụkarịkwa ndị a na-anụ olu ha nke nta.

Ma n'agbanyeghị nke a niile, nke a abụghị naanị akụkọ banyere mmegide.

N'akụkụ dị iche iche nke ụwa, ndị obodo dị iche iche ka na-aga n'ihu n'ịhazi onwe ha, na-emepụta ihe, ma na-elekọta ibe ha.

Ndị trans na ndị na-abụghị ụdịdị okike ọbụla na-ewulite usoro nkwado n’ofe mba dị iche iche nakwa n’ebe ha gbara ọsọ ndụ. Ndị na-akwado mmekọrịta nwoke na nwanyị na-ama aka n'ihe a na-anaghị ahụ anya ma na-akwado nnwere onwe anụ ahụ. Ndị amaala na obodo dị iche iche na-eweghachi akụkọ ihe mere eme banyere ụdịdị okike dị iche iche dị tupu ọbịbịa ndị ọcha, bụ nke usoro ọchịchị ndị ọcha chọrọ ihichapụ. Ndị na-ese ihe, ndị odee akwụkwọ, ndị ọkachamara n’ihe gbasara teknụzụ, ndị nkuzi, na ndị na-ahazi ihe na-emepụta ebe ndị nwere ụdịdị okike dị iche iche nwere ike ibi n’enweghị egwu ọbụla, kọọ akụkọ nke ha n’onwe ha, ma chepụta ọdịnihu dị iche iche.

Iwulite obodo ka bụ otu n'ime ụzọ kachasị ike e si azaghachi mmegbu na mkpagbu. N'ebe mgbasa ozi dijitalụ, netwọkụ ndị e hiwere site n'aka ndị nkịtị na-ekekọrịta amamihe, akụrụngwa, na nkwado n'etiti onwe ha. N'ime agbataobi na ebe ndị metụtara omenaala, ndị mmadụ ka na-aga n'ihu na-ewulite ụzọ dị iche iche ha si elekọta ibe ha, bụ nke ụlọ ọrụ dị iche iche na-ajụkarị inye. Site n'ọrụ nka, asụsụ, inyere ibe ha aka, ịkọ akụkọ, na imekọ ihe ọnụ, ndị obodo na-eguzogide akụkọ na echiche ndị na-achọ ihichapụ ịdị adị ha.

Isiokwu nke ọnwa a na-akpọ anyị ka anyị nyochaa eziokwu ndị a n’ụzọ zuru ezu, tinyere mgbagwoju anya ha niile: ihe ịma aka nke ndị otu nwere ụdịdị okike dị iche iche na-eche ihu, ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emetụta ndụ ha, na ụzọ dị iche iche nke imegide ihe ndị a na-apụta site na nzaghachi ha.

Karịsịa ugbu a, olu ụmụnwaanyị, ndị nwere ụdịdị okike dị iche iche, otu LGBTQ+, na ndị ọzọ a na-eleda anya ma ọ bụ ekewapụ n’ihi ụdị nhọrọ mmekọahụ ha dị ezigbo mkpa iji ghọta ụwa anyị. Ahụmịhe ha anaghị ekpughe naanị  ọghọm dị na mwepụ na ịkpa oke, kamakwa ohere dị n’ịdị n’otu, iguzosi ike n’agbanyeghị ihe isi ike.

N'oge a a na-eji okwu gbasara ụdịdị okike eme ihe dịka ngwá agha ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ige olu ndị ahụ ntị abụghị naanị ụzọ esi mee ka onye ọ bụla sonye. Ọ bụkwa ihe dị mkpa nke ukwuu maka ịdị adị ọchịchị onye kwuo uche ya.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.