Otu AI si eme ka ọchịchị aka ike kawanye njọ n'Afrika

Illustration of a dictator

Ihe osise na-egosi onye ọchịchị aka ike ji nlekọta dijitalụ na njikwa akpaaka eleba anya, buru amụma, ma gbochie ụmụ amaala. Onye sere ihe osise ahụ bụ Khalid Bencherif. A natara ikike ojiji

Sitere n'aka Khalid Bencherif

“Na mkpụrụ ego, na stampụ, n'elu mkpuchi akwụkwọ, n'elu ọkọlọtọ, n'elu akwụkwọ mgbasa ozi, ọbụna n'akwụkwọ mkpuchi siga—ebe niile. Anya na-ele gị anya mgbe niile ma bụrụ olu na-akwado gị  mgbe niile. Ma ị na-ehi ụra maọbụ na ị mụ anya, ma ị na-arụ ọrụ maọbụ na ị na-eri nri, ma ị nọ n'ime ụlọ ma ọ bụ n'èzí, ma ị nọ na-asa ahụ maọbụ dina n'ihe ndina—enweghị ụzọ mgbapụ. Ọ dịghị ihe bụ nke gị, ma e wezụga ntakịrị oghere dị n'ime ụbụrụ gị.” — George Orwell, Puku Itoolu Narị na Iri Asatọ na Anọ.

Orwell enweghị ike ịtụ n'uche na otu ụbọchị, ọbụna obere oghere ahụ dị n'ime okpokoro isi ga-abụkwa ihe a ga-alụ ọgụ maka ijide, karịsịa n'ala nke nrụrụ aka na ọchịchị aka ike ebidola kemgbe ọtụtụ afọ.

Nke a dị oke mkpa karịsịa n'Afrịka, ebe nrụrụ aka, enweghị ntaramahụhụ nye ndị mehiere, na agụụ ndị ọchịchị rụtụrụ ya aka ogologo oge tupu ọgụgụ isi arụpụtara arụputa apụta.

N'otu oge ahụkwa, iji ọgụgụ isi AI na-agbasa ngwa ngwa karịa mmepe iwu na usoro na-echekwa ikike na nnwere onwe mmadụ.

Afrịka na-agbasimbọ ike ịchọ ngwaọrụ ọgụgụ isi e ji akwado ọchịchị nchigbu

N'oge gara aga, ọchịchị aka ike n'Afrịka na-elekwasị anya n'ụlọ mkpọrọ, ndị nzuzo na-ewekọta ozi, ndị uwe ojii nzuzo, na mmegbu ndị mmadụ na-ahụ anya. Taa, ọtụtụ n'ime ngwaọrụ ọchịchị aka ike ahụ na-abịa n'ụdị mmemme kọmputa. A na-eji ego mgbazinye kwụọ ha, a na-eji  asụsụ ekpuchi ha ma mee ka ha dịka mmeputa nke oge a, ma na-ere ha dị ka ụzọ ọhụrụ e si eme ka nchekwa ọha dịkwuo mma.

Nnyocha e bipụtara n'ọnwa Maachị afọ 2026 site n'Ụlọ Ọrụ Nnyocha Mmepe na Ụwa na Otu Mgbasa Ozi Maka Ikike Dijitalụ nke Afrịka bụ Institute of Development Studies (IDS) and the African Digital Rights Network  chọpụtara na gọọmenti iri na otu dị n'Afrịka ejirila ihe karịrị ijeri dọla Amerịka abụọ zụta usoro nlekọta nke ọgụgụ isi na-achịkwa. Naịjirịa naanị ya tinyere ihe karịrị nde dọla Amerịka narị anọ na iri asaa. Ngwaọrụ ndị a gụnyere igwefoto nlekọta nwere onyonyo doro anya nke ukwuu bụ CCTV, ngwaọrụ na-agụ nọmba ụgbọala, usoro mmata ihu mmadụ, usoro njirimara sitere n'ahụ mmadụ, na nnukwu ebe a na-achịkwa ha niile ebe ihe onyonyo sitere n'usoro ndị a na-ezukọta. Ọtụtụ n'ime ngwaọrụ ndị a bụ ụlọ ọrụ na ụlọ akụ ndị China na-eweta maọbụ na-akwado ego ha, ebe akụkụ ndị ọzọ nke usoro ndị a na-esikarị n'aka ụlọ ọrụ ndị Izrel.

Mba Afrika iri na otu ewebatala ngwa nlekọta ọrụ buru ibu. Ọnụọgụgụ gbasara nlekota nke AI na-akwado. Site n'aka Institute of Development Studies. A natara ikike ojiji.

Mba Afrika iri na otu ewebatala ngwa nlekọta ọrụ buru ibu. Ọnụọgụgụ gbasara nlekota nke AI na-akwado. Site n'aka Ụlọọrụ Ụlọ Nnyocha Maka Mmepe bụ Institute of Development Studies kwadebere ya. A natara ikike ojiji.

Ihe gọọmenti ọtụtụ mba Afrịka na-ekwukarị bụ na ịzụta ngwaọrụ ndị a dị mkpa iji lụso mpụ ọgụ. Ma n'agbanyeghị nke ahụ, ọnụọgụgụ mpụ anaghị ebelata. Ndị nnyocha nke Ụlọ Nnyocha Maka Mmepe bụ IDS , mgbe ha nyochachara ebe e tinyere igwefoto ndị a n'obodo dị iche iche, hụrụ na e nweghị ihe akaebe siri ike na igwefoto ndị ahụ na-ebelata mpụ. Kama nke ahụ, ihe akaebe na-egosi na a na-etinyekarị igwefoto ndị ahụ n'ógbè ebe ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emegide gọọmenti nọ, ebe e meela ngagharị iwe, nakwa ebe ụlọ mgbasa ozi na-akpatala nsogbu nye ọchịchị nọ.

Usoro nchekwa na nchịkọta ozi nke ọchịchị aka ike n'Afrịka abụghị ihe ọhụrụ, ọ naghịkwa amalite amalite. N'ọtụtụ mba Afrịka, ọchịchị etiti anọwo ogologo oge na-achọ ịnakọta ozi gbasara ụmụ amaala. A na-achịkọtala ndekọ nkwurịta okwu, ndekọ ụtụ isi, ndekọ ego ụlọ akụ, na ndekọ nchịkwa kemgbe ọtụtụ afọ, a na-ejikwa ha eme ihe na-enweghị nnukwu mgbochi iwu, ọbụna n'ebe e dere iwu nchedo ha n'akwụkwọ.

Ihe ọhụrụ batara bụ ịnjịn.  AI na-eme ka faịlụ ndị ahụ, nke e chekwara, bụrụ nnukwu ebe nchekwa a pụrụ ịchọ ma nyochaa ngwa ngwa. Aha mmadụ, mmekọrịta ya na ndị ọzọ, ụzọ ọ na-aga, na akụkọ gbasara azụmahịa ego ya nwere ike ịpụta n'ime obere oge.

Ọbụna KGB, ndị uwe ojii nzuzo nke Soviet Union enweghị ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ga-ezuru iji na-agụ  ndekọ banyere ọtụtụ nde ụmụ amaala kwa ụbọchị, Dị ka Yuval Noah Harari siri kọwaa, uzuzu nke kpuchiri ebe nchekwa ndekọ ndị ahụ n'onwe ya bụ ụdị nnwere onwe. Ma AI ewepụla uzuzu ahụ.

Usoro nlekọta nke ọgụgụ isi AI na-akwado, nke a na-ebubata ugbu a n'obodo dị iche iche n'Afrịka, adịla ọnụ ala karịa n'ihi teknụzụ ọgụgụ isi arụmarụ mepere emepe sitere na China na ngwaọrụ ọgụgụ isi sitere n'Izrel. Nke a bụ n'ihi na usoro ndị a anaghị achọ ịta ọtụtụ mmadụ ahụhụ. Teknụzụ nlekọta nke ọtụtụ mmadụ—igwefoto, ngwanrọ ekwentị, na usoro ịntanetị nke mpaghara—adịghị njikere ijide maọbụ tụọ onye ọ bụla mkpọrọ. Ihe ha chọrọ naanị bụ ka ụmụ amaala mara na ha nọ ya. Mgbe ndị mmadụ matara na a na-ele ha anya, nke ahụ naanị na-eme ka ọtụtụ n'ime ha kwụsị ime ihe ọbụla tupu ọ amalite .

Ihe ndị a na-elekwasị anya

Njem ọ bụla maka mgbanwe n'Afrịka na-amalite n'otu ụzọ ahụ. Otu ìgwè mmadụ na-ekpebi na ihe ize ndụ nke ịpụta n'ihu ọha adịkwaghị njọ karịa ihe ize ndụ nke ịgbachi nkịtị. Ha na-ezukọta. Ha na-ebipụta ozi. Foto na vidio ha na-agbasa. Mgbe ụfọdụ, ọchịchị na-adaba. Mgbe ụfọdụ, ọ na-anọgide n'ike. N'ọnọdụ abụọ ahụ, ihe na-ekpebi ihe ga-esi na ya pụta bụ oge ahụ ndị na-amabughị onwe ha ji amata onwe ha, ma ụwa hụkwa ha dịka otu ngagharị.

Ọganihu teknụzụ a agbanweela mkpokọ ahụ site n'isi ya.

Usoro nlekọta nke ọgụgụ isi AI na-akwado abụghị naanị usoro a gbasara n'obodo dum n'enweghị ebumnuche. A haziri ya ka ọ lekwasị anya n'òtù mmadụ e depụtara tupu oge eruo, ndị ahụ bụkwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nnyocha nke Ụlọ Nnyocha Maka Mmepe gosiri na igwefoto na-adịkarị n'ebe ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emegide ọchịchị na-ahazi nzukọ ha, ọ bụghị n'ebe mpụ nkịtị kacha baa ụba.

Mmetụta ya na-amalite tupu ngagharị ọbụla ebido; ọ na-egbochi echiche na mmegide tupu ha amalite. Usoro ịmata ihu mmadụ n'ọdụ ụgbọala adịghị mkpa ijide onye na-ahazi ngagharị. Ihe ọ chọrọ bụ ime ka o doo anya na ịhazi ngagharị agaghịzi abụ ihe a na-eme n'amaghị onye mere ya, nakwa na ịmata onye ahụ nwere ike iwetara ya nnukwu nsogbu.

Dịka ọmụmaatụ, ọ bụrụ na e mere atụmatụ ime ngagharị iwe n'ụbọchị Sọnde ma chọpụta ya n'ụbọchị Satọde site n'ịtụle akara dijitalụ, ozi e bipụtara n'ịntanetị, nyocha mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na ịtụnyere ihu mmadụ, ọtụtụ mgbe ndị uwe ojii agaghịzi achọ ịkwụsị ngagharị ahụ. Ndị haziri ya amarala na a matala ha, ha makwaara ihe ịmata ha nwere ike ịkpata: njide, ebubo n'ụlọ ikpe mgbe e mesịrị, ma ọ bụ ọbụna igbochi ha ịrụ ọrụ gọọmenti. N'ihi ya, ọtụtụ mgbe, ngagharị ahụ anaghịzi eme.

Usoro echiche a na-agbakọta bụrụ otu okirikiri. Ọ bụrụ na ọgụgụ isi arụmarụ kpọọ mmadụ onye nwere ike ịbụ onye na-ahazi ngagharị, a na-ewere akara ahụ dịka ihe akaebe na ngagharị ahụ gaara eme n'ezie. Ya mere, a naghịzi ele onye ahụ anya dịka onye aka ya dị ọcha, n'ihi na ịdọ aka ná ntị nke usoro ahụ n'onwe ya aghọwo ihe akaebe. N'obodo ebe ụlọ ikpe na-adịghị ike, nakwa ebe ndị ọrụ nchekwa na-arụ ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke a na-emepụta usoro na-ewere naanị ebumnuche mmadụ dịka mpụ.

Akara dijitalụ ndị mmadụ na-ahapụ na-eme ka ndepụta ndị a na-elekwasị anya na-abawanye. Site n'akara ndị mmadụ na-ahapụ n'ịntanetị na nkwurịta okwu nke ọchịchị na-achịkwa, ọchịchị nwere ike iwulite nkọwa zuru ezu banyere nwa amaala ọ bụla, wee nyochaa ya ịchọta ihe na-egosi na onye ahụ enweghị ntụkwasị obi n'ebe ọchịchị nọ. Ọ bụghị naanị ihe onye ahụ mere ka a na-ele anya, kama ihe ndị ọ kwadoro, ndị ọ kpọrọ ma ọ bụ zigara ozi, ebe ekwentị ya nọ n'oge ngagharị, na akara okwu ndị na-emegide ọchịchị ọ kesara.

Otu n'ime ihe nchọpụta kacha sie ike ma na-enye nchegbu n'ime akụkọ nke Kansụl Atlantik bụ njikọta nke ndekọ nchịkwa dị iche iche n'ime otu nnukwu usoro. A na-eji ndekọ ndị e kere mbụ maka ebumnuche dị iche iche wuo ihe yiri ogo ntụkwasị obi nke nwa amaala n'ebe ọchịchị nọ.

Nsonaazụ ya bụ na mmezigharị na-anwụ tupu o too.   CIPESA (the Collaboration on International ICT Policy for East and Southern Africa) bụ Mmekọrịta Maka Atụmatụ Teknụzụ Ozi na Nkwukọrịta Maka Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda Afrịka edekọla otú ụjọ si eme ka ndị mmadụ kwụsị ikwu okwu, ịchịkọta onwe ha, na ịrụ ọrụ mgbasa ozi kwụụrụ onwe ya n'ime mba iri na anọ, ebe e wuru usoro nlekọta dijitalụ na-enweghị nchedo zuru oke nke ikike mmadụ. Nwa amaala nke gaara aga ngagharị iwe, bipụta echiche ya, sonyere otu ma ọ bụ kọmitii, ma ọ bụ tinye mkpesa, ugbu a na-atụle ihe ga-esi na ya pụta ma kpebie ịnọ n'ụlọ.

Site n'Ugwu ruo Ndịda Afrịka, ikuku ọhụrụ nke egwu na nchegbu amalitela ịchịkwa ndụ kwa ụbọchị. Mkpụrụ mgbanwe na-anwụ tupu o puo, ọ bụghị n'ime ụlọ mkpọrọ, kama n'ime ime ụlọ mmadụ, mgbe onye ahụ ghọtara na nchekwa ozi dijitalụ na-echeta ihe niile, nakwa na usoro ọgụgụ isi arụmarụ anaghị ekewa echiche mmadụ kwupụtara na nke o nwere n'ime obi ya.

Nke a bụ ihe usoro ọhụrụ ahụ na-echebe nke ọma. Ọ bụghị naanị ikike ọchịchị nwere ịta mmadụ ahụhụ, kama ikike ime ka ntaramahụhụ ghara ịdịkwa mkpa. Ọkà mmụta Michel Foucault kpọrọ nke a Panọptikọn: usoro e si ahazi ebe onye nọ n'ime ya, n'amaghị ma onye nche nọ n'elu ụlọ nche ma ọ bụ na ọ nọghị, na-amụta ilekọta ma chịkwaa onwe ya.

Ndị jụwara isi

N'agbanyeghị na nlekọta nke AI na-aghọ ngwá ọrụ siri ike n'aka ọchịchị aka ike, e nwere obere mgbalị a na-eme iji guzogide ya. Mgbalị ndị a enweghị ego zuru ezu ma na-agba ọsọ ịchụso usoro ịzụta na iwunye igwefoto na nchekwa ozi dijitalụ nke emechalarị.

Ụfọdụ ndị nta akụkọ na òtù dị iche iche na-edekọ mmebi iwu, na-ebuga ikpe n'ụlọ ikpe iji nwalee iwu, ma na-akpọku ka e nwee iwu na-achịkwa ọgụgụ isi arụmarụ nke na-echekwa ikike mmadụ. Ndị na-arụpụta teknụzụ maka ọdịmma ọha na-eji otu ngwaọrụ ndị ahụ eme ihe n'ụzọ ọzọ: ha na-enyocha eziokwu nke ọdịnaya ọgụgụ isi arụmarụ mepụtara, na-enyocha okwu ịkpọasị, na-elekọta usoro ntuli aka, ma na-enye ndị nta akụkọ na ndị na-alụ ọgụ maka ikike mmadụ ngwaọrụ ọgụgụ isi mepere emepe, dị nchebe ma baa uru.

Ma nhata ahụ bụ naanị n'elu ọnụ. Akụrụngwa, ike mgbakọ kọmputa, ozi e ji zụọ ọgụgụ isi arụmarụ, nkwekọrịta ụlọ ọrụ na-eweta teknụzụ, na ndị ọkachamara niile nọ n'aka ọchịchị na ndị na-ebubata teknụzụ si mba ọzọ. Ha adịghị n'aka nwa amaala Afrịka, onye na-agbasi mbọ ike kwa ụbọchị naanị iji nweta nri ga-azụ ya. Ngwa teknụzụ maka ọdịmma ọha nwere ike ịchọpụta ụfọdụ nrụrụ aka, ma ọ gaghị enwe ike ịha nhata na nnukwu ebe nchịkwa nke ọchịchị.

Sentimita ole na ole

Ọchịchị aka ike George Orwell chọrọ nnukwu ministri, agha, na onye nledo n'azụ ọnụ ụzọ ụlọ ọbụla. Ma ụdị ọhụrụ a nke na-apụta n'Afrịka yiri ka ọ chọrọ naanị nkwekọrịta mgbazinye ego iji zụta akụrụngwa ọgụgụ isi arụmarụ, tinyere ndị mmadụ e mere ka ha kwere na ihe niile a bụ maka ọdịmma na ịdị mfe ndụ ha.

Ọkà mmụta akụkọ ihe mere eme Yuval Noah Harari adọla aka ná ntị na ijikọta ihe mmetụta na-achọpụta akara ahụ mmadụ, usoro ịmata ihu na olu, na-eme ka o kwe omume, nke mbụ n'akụkọ ihe mere eme, ka ọchịchị aka ike nwee ike ilekọta ụmụ amaala niile oge niile. O kwukwara na nke a nwere ike ibute ọchịchị aka ike ka njọ karịa ihe ụwa hụrụ na narị afọ nke iri abụọ. A na-atụkarị ịdọ aka ná ntị a aka na China, ma ugbu a China na Izrel amalitela ibupụ ngwaọrụ ndị a n'Afrịka.

Ihe na-atụ ndị mmadụ egwu n'Afrịka abụghị na AI ga-eme ka otu mba bụrụ ọchịchị aka ike ozugbo. Ihe na-enye nchegbu bụ na ọ na-eme ka ọ dị mfe ma dị ọnụ ala ka ọchịchị aka ike gbasaa ikike ya, na-eme ka ike ya too ngwa ngwa karịa mgbe ọ bụla. Nke a na-eme n'oge ọchịchị ndị nrụrụ aka na-achọsi ike ịchịkwa karịa, ebe iwu na ụlọ ọrụ kwesịrị ichekwa ikike ụmụ amaala adịghị ike ma ọ bụ na-adịghịkwa adị.

N'ezie, ọgụgụ isi arụmarụ bụ AI nwere ike ịbụ ụzọ isi weta mmepe na ọdịmma n'Afrịka. Ọ nwere ike ime ka ọrụ ọha dịkwuo mma, kwalite mmepụta echiche ọhụrụ, ma meekwa ka nnwere onwe ikwu okwu bawanye. Ma ọ bụrụ na e nweghị ọchịchị onye kwuo uche ya siri ike na mgbasa ozi nweere onwe ya, ọ nwere ike ịghọ nnukwu ọdachi.

Khalid Bencherif bụ onye nta akụkọ na-arụ ọrụ n'onwe ya, onye si Morocco ma na-ebi na Berlin. Ọ bụ ọkachamara n'ịkọ akụkọ gbasara gburugburu ebe obibi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'Ugwu Afrịka. N'afọ 2022, e nyere ya Nrite Michael Elliott Maka Ọmarịcha Ịkọ Akụkọ Banyere Afrịka, nke Ebe Mba Nile Maka Ndị Nta Akụkọ na-enye. E dere edemede a site n'enyemaka nke mmemme  nrite Michael Elliott nke na-eme emume afọ iri ya.

 

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.