
Nwoke e kechiri ọnụ ya. Foto si n'aka Valentin Angel Fernandez. A natara ikike tupu e gosi ya ebe a.
Ederede a bụ Dr. Stellah Wairimu Bosire dere ya, bụ onye otu bọọdụ CIVICUS ma bụrụkwa onye isi nke Africa Center for Health Systems and Gender Justice.
Brian Bright Tamuka Kagoro dara n'ọdụ ụgbọelu Jomo Kenyatta International Airport n'ime abalị Mọnde na mbido afọ a na-ejighị ngwa agha, ahịa iwu ọbụla, enweghịkwa atụmatụ ọbụla ịghasa maọbụ tinye ọgbaghara na steeti. O nweghị ihe o ji bịa ma e wezụga echiche ya, nkwenye ya, na ibu arọ o burula afọ iri anọ nke o tinyere n'ịlụ ọgụ maka ikpe ziri ezi.
Dị ka onye ama ama n'ịkwalite Pan-Africanism, ọka iwu gbasara iwu ọchịchị, na onye na-agbachitere ikike mmadụ, Kagoro batara Kenya site n'ụzọ iwu kwadoro. A tụrụ akara n'ime paspọtụ ya, ndị ọrụ nnyocha mbata na ọpụpụ nyochakwara ya. Mana n'oge ọ ka nọ n'ụzọ njem ya, ndị ọrụ gọọmenti kwụsịrị ya, napụ ya ekwentị ya, ma gbochie ya ịkpọtụrụ ndị ọka iwu, ndị enyi ya, maọbụ ndị ọrụ nnọchi anya obodo ya. Ruo awa iri na anọ, National Intelligence Service (NIS) nke Kenya jidere ya n'enyeghị ohere ọ bụla ịkpọtụrụ onye ọbụla n'èzí.
Mgbe ha mechara kwupụta na ọ bụ onye nnochiteanya anya otu bụ persona non grata ma chụpụ ya n'obodo ahụ, ha enyeghị nkọwa ọ bụla, enyeghị ya ohere ka e gee ya ntị n'ụzọ iwu si dị, maọbụ kọwapụta ebubo ọ bụla n'ihu ọha. Ọ bụ ezie na ha ekwughị kpọmkwem ihe “mmejọ” ya bụ, ozi ha chọrọ izipu doro anya: ịkatọ ọchịchị, igosipụta ịdị n'otu nye ụmụ amaala nkịtị, na iche echiche n'ụzọ nke gị bụ ihe dị ize ndụ.
Nke a bụ eziokwu ndị na-agbachitere ikike mmadụ n'Afrịka maara nke ọma. Mmechi nke ohere ndị mmadụ nwere ịrụ ọrụ obodo (civic space) abụghịzi naanị nsogbu ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama na-akatọ ihe gọọmentị adịghị emeta na-eche ihu. Ọ bụrụla ihe iyi egwu a na-ahụ kwa ụbọchị nye ndị ome nnyocha, ndị nta akụkọ, ndị ọka iwu, ndị na-akwado ikike ụmụ nwanyị, na ụmụ amaala nkịtị ndị na-anwa ịjụ ajụjụ maọbụ kwado ndị a na-emegbu emegbu.
Ịgbanwe ókèala ka ha bụrụ ihe mgbochi
Anyị na-ahụ ugbu a omume dị ize ndụ nke na-arịwanye elu n'ófè Afrịka, ebe steeti dị iche iche na-eji ókèala ha eme ngwa agha iji soro ma mechie ọnụ ndị na-akwado ikike mmadụ N'oge gara aga, mmegbu nke gọọmenti na-eme megide ndị mmadụ na-abụkarị n'ime ókèala obodo ha. Taa, ndị ọchịchị aka ike na-eso gọọmentị arụkọ ọrụ mmegbu a site n'ófè ókèala ha, na-eji teknụzụ nlekọta dijitalụ, ịkekọrịta ozi nzuzo, na nchụpụ n'obodo a haziri ahazi achụso ndị na-ekwupụta echiche ha, ọbụna mgbe ha gbapụrụ gbalaa mba ọzọ. Otu Kenya si mesoo Kagoro omume bụ ihe ncheta doro anya na-enweghi ekwem nkwa nchekwa ma ịhapụ obodo gị.
Mmegide ndị mmadụ a n'ófè ókèala na-agbaso otu usoro na-eyi egwu a na-ahụ ugboro ugboro. N'ebe ọdịda anyanwụ Afrịka dịpụrụ adịpụ, anyị hụrụ otu usoro ahụ n'ihe mere Mubarak Bala, onye Naịjirịa na-ede blọgụ ma na-akwado echiche mmadụ (humanist) onye a mara ikpe mkpọrọ afọ iri abụọ na anọ n'okpuru ebubo nkwulu okpukpe naanị n'ihi na o kwupụtara nkwenkwe ya. Ọ bụ ezie na mkpọsa siri ike nke mba ụwa ndị ọzọ mere mechara nye aka ka a tọhapụ ya ka afọ abụọ gasịrị, ahụhụ ọ tara gosiri etu nnwere onwe ikwu okwu si bụrụ nnukwu ihe ize ndụ.
Ọnụọgụgụ na-akwado akụkọ ndị a na-amapụ obi. Dị ka nchọpụta ọhụrụ sitere na CIVICUS Monitor si kwuo, ihe karịrị pasent iri asatọ nke ndị bi na Sub-Saharan Afrịka ugbu a bizi na mba ebe a na-ekenye ohere ịrụ ọrụ obodo dị ka nke “e belatara ebelata” ma ọ bụ nke “e mechiri emechi.” N'ime mba na ókèala dị iri ise a na-enyocha na mpaghara ahụ, iri anọ na anọ na-eche ihu nnukwu mgbochi ma ọ bụ mmechi kpamkpam nke nnwere onwe mmadụ ndị bụ isi. N'ịga n'ihu, nnyocha ahụ gosikwara na ijide ndị nta akụkọ aghọwo ụzọ kachasị eji emechi ọnụ mgbasa ozi nọọrọ onwe ya, ebe ndị ọchịchị n'ime mba iri atọ na atọ na-ejichi ma na-atụ ndị ọrụ mgbasa ozi nga n'afọ gara aga naanị.
Mmegbu ndị a na-eme n'oge ụwa dum kewara uche ya n'etiti ọtụtụ nsogbu. N'ihi agha, nsogbu akụ na ụba, na mgbanwe mmekọrịta ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ụwa, ọtụtụ ndị bụbu ndị mmekọ sitere na mba ụwa dị iche iche etinyela nchebe ikike mmadụ n'ọnọdụ nke abụọ. Gọọmenti ndị na-akpọbu onwe ha ndị na-akwadosi ọchịchị onye kwuo uche ya ike na-etinyewanye uche ha n'azụmahịa mba na mba na nkwekọrịta nchekwa karịa ịkatọ ọchịchị mmegbu n'ụzọ siri ike. Mgbe a hapụrụ ndị na-agbachitere ikike mmadụ naanị ha, ọchịchị aka ike na-anọchizi ohere ndị ahụ.
Enwere ike iji ntachi obi zaghachi nsogbu ndị na-amaghị ókèala
Otú ọ dị, akụkọ ihe mere eme na-egosi na enwere ike iji ntachi obi merie nsogbu ndị a na-amaghị ókèala. Mmegharị obodo n'otu ebe naanị ezughịzi iji chebe ndị na-eme mkpọsa a ma ama pụọ na mmegbu steeti; ọha mmadụ ga-ewulite mmekọrịta na nkwado n'etiti onwe ha gafee ófè ókèala. Nke a bụkwa ihe mere mmalite zuru ụwa ọnụ nke mkpọsa #StandAsMyWitness, nke e mere iji dakọọ ya na Ụbọchị Ncheta Nelson Mandela na mba ụwa, ji bụrụ ezigbo ihe atụ nke otu ụmụ amaala nwere ike isi guzogide mmegbu site n'ịdị n'otu n'ófè mba dị iche iche.
Anyị ahụla, ma n'ọrụ anyị ma na ndụ anyị n'otu n'otu, otú mmegharị ọha si akwado ndị mmadụ mgbe ụlọ ọrụ ndị kwesịrị ichebe ha gharịpụrụ ha. Mgbe ụfọdụ, ihe na-echebe ome mkpọsa e jichiri ejichi abụghị iwu ụlọikpe ma ọ bụ nkwupụta gọọmenti, kama ọ bụ ịmara na ndị ọzọ na-ele anya, na-edekọ ihe na-eme, na-ekwu okwu, na-ahazi mkpọsa, ma na-ajụ ikwe ka akụkọ ha fuo. Ịhazigharị ọrụ n'ófè ókèala na-eweta nrụgide site na mkpọsa nkwuchite-ọnụ, ime ka ụmụ amaala sonye, ịkparịta ụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ime ka ọchịchị tụfuo aha ọma. Ịdị n'otu n'ófè mba na mba na-echetara gọọmenti na ụwa na-ele ha anya. Ọ na-enye aka hụ na a naghị echefu ndị e jidere, na-ebelata ihe ize ndụ nke ha inweta nnukwu mmekpa ahụ, ịnwụ anwụ maọbụ ifu efu n'enweghị nkọwa, na ịtụ mkpọrọ na-enweghị njedebe. Iwu mba ụwa na-akwado mgbalị ndị a. N'okpuru nkwekọrịta ndị dịka the International Covenant on Civil and Political Rights, amachibidoro njide mmadụ n'enweghị ihe kpatara ya, nke na-enye mmegharị ụwa ohere na ngwá ọrụ iwu kwadoro iji mee ka gọọmenti soro iwu.
Mkpọsa a na-eweta ozi olileanya dị mkpa n'oge ọnọdụ siri ike. Ọ na-echetara anyị na mkpokọta nkwado nke mba ụwa dị iche iche na-arụ ọrụ n'ezie—nke bụ eziokwu pụtara ihe site na ntọhapụ mmadụ iri atọ na otu bụ ndị na-agbachitere ikike mmadụ n'ụwa niile, bụ ndị e jidere ma hapụ n'ọchịchịrị, ma mesịa nwere onwe ha n'ihi na mmegharị ụwa jụrụ ikwe ka e chefuo ha.
Otu ọ dị, ka ịdị n'otu a wee nọgide na-arụ ọrụ nke ọma, ọ ga-agbanwekwa. Ezi ịdị n'otu n'ófè ókèala dị iche iche enweghị ike ịga n'ihu naanị n'usoro ndị ọchịchị ochie dowere ma ọ bụ n'usoro mkpebi ga-esite na ndị isi gbadaa na ndị ala. Ọ chọrọ “usoro ihe ọmụma dị iche iche” (ecology of knowledge)—ịghọta n'eziokwu na echiche na atụmatụ kacha baa uru na-esi n'aka ọha ndị mmadụ n'obodo yana mmegharị ndị sitere n'ala ala n'ime obodo nke ndị nọ n'ihu n'ọgụ a apụta.
Ịgbachitere ikike mmadụ n'Afrịka na n'ófè mba ndị ọzọ nke Global South ga-amalite site n'ige ndị mmadụ ntị nke ọma. Anyị ga-amata na ọgụ onye ọ bụla n'otu n'otu n'ime anyị na-alụ maka ikpe ziri ezi jikọtara ọnụ n'ebe ọ dị ukwuu. Ndị na-agbachitere ikike mmadụ abụghị ihe iyi egwu nye nchekwa mba; ha bụ ogidi dị mkpa na-ejikọ obodo anyị ọnụ, ma bụrụkwa ahịrị nchebe anyị nke anyị enweghị ike ịhapụ n'enweghị nchebe.







