
Ndị agha Naijirịa nọ na mpaghara northeast nke Naijirịa na-ebuga akụrụngwa, nri na ọtụtụ ndị agha gaa n'ọhịa Sambisa. Onyonyo a sitere n'aka Iniabasi Udosen na Wikimedia Commons. Ikikere ya: CC BY-SA 4.0 Deed.
Ndị bi n'ime obodo Woro na Nuku dị n'okpuru ọchịchị Kaiama nke Steeti Kwara labara ụra n'abalị nke abalị abụọ n'ọnwa Febụwarị, na-atụ anya na echi ya ga-adịkwa ka ụbọchị ndị ọzọ. Mana ọbụghị òtù a ka o si mee. N'elekere ise nke uhuruchi (5:00 pm) n'abalị atọ nke ọnwa Febrụwarị, ndị agha egbe wakporo obodo ha n'ụzọ jọgburu onwe ya, na-eyi ndị obodo ụjọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ awa iri abụọ na anọ, ruo ihe dị ka elekere atọ nke ehihie (3:00 pm) n'ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị. Ndị agha egbe ahụ gburu ihe dị ka ndị obodo narị abụọ, tọrọ ọtụtụ ndị ọzọ, kwatuo ma zuo ngwongwo n'ụlọ ahịa dị iche iche, ma kpọọkwa ọtụtụ ụlọ ọkụ.
Dị ka Amnesty International siri kwuo n'akwụkwọ ozi ha bipụtara na X:
Villagers of the affected Kwara state communities are still searching and finding dead bodies, with hands tied from behind and slit throats. Some were shot while tied at the hands and feet. Gory images show corpses on the streets in pools of blood. Several people were also abducted.
Ndị bị n'ime obodo Kwara state niile o metụtara ka na-achọ ma na-achọta ozu ndị e gburu, ọtụtụ n'ime ha bụ ndị e kekọrọ aka n'azụ ma bere ha olu. A gbakwara ụfọdụ égbè mgbe e kekọrọ aka na ụkwụ ha. Foto ndị jọgburu onwe ha na-egosi ozu ndị ahụ ka ha dina n'okporo ụzọ n'ime ọdọ ọbara. A tọọkwara ọtụtụ ndị ọzọ.
Onye isi ala Naịjirịa, Bola Tinubu, katọrọ mwakpo ndị ahụ site n'akwụkwọ nkwupụta nke Onye Ndụmọdụ Pụrụ Iche nye Onye Isi Ala n'ihe gbasara Mgbasa Ozi bụ, Bayo Onanuga, wepụtara. Ndị ọchịchị kwuru na òtù Boko Haram bụ ndị kpatara mwakpo ahụ. Otu ọ dị, Emir nke Kaiama, Alhaji Muaza Sheu Omar (eze ọdịnala na steeti Kwara Naijirịa), gwara gọvanọ Kwara State na ndị mere mwakpo ahụ bụ ndị òtù na-eso Mahmuda, òtù kewapụrụ na Boko Haram nke pụtara na mpaghara North-Central Naịjirịa n'afọ gara aga. A na-ekwu na ndị òtù Mahmuda na-ekwusa echiche Alakụba siri ike nke na-adịghị nnabata n'echiche ndị ọzọ, ma na-awakpo ndị jụrụ ịgbaso ozizi ha.
E kwenyere na òtù a na-eyi ọha egwu na-ezo n'ime Ogige ntụrụndụ Kainji Lake National Park. Dịka akụkọ siri kwuo, òtù a emeela mwakpo a ma na-egbu ndị mmadụ ugboro ugboro megide obodo ndị dị n'ime ime obodo na steeti Niger yana Naijirịa. E nwekwara akụkọ na Ngalaba na-ahụ Maka Nchekwa Obodo (Department of State Services – DSS) nke Naijirịa jidere onye ndu otu ahụ bụ Abubakar Abba Mahmuda n'afọ 2025. N'agbanyeghị nke ahụ, njide onye ndu ha emeghị ka otu ahụ daa mba. Mwakpo ha ndị na-adịbeghị anya na-egosi na ha na-enwewanye obi ike kwa ụbọchị, ma ọ bụrụ na gọọmenti enyeghị nchekwa zuru oke, òtù ahụ nwere ike ịgbasa mwakpo ya n'ọtụtụ obodo ndị ọzọ dị na mpaghara ahụ.
Ogbugbu ndị Mmadụ n'okpukpu n'okpukpu n'ebe ugwu ọdịda anyanwụ nakwa na mpaghara North-Central nke Naịjirịa
Mwakpo a na-eme n'obodo nta na n'ime obodo dị iche iche na Steeti Kwara yana mpaghara North-Central nke Naịjirịa n'ozuzu abụghị ihe ọhụrụ; ọ na-aga n'ihu kemgbe ọtụtụ afọ. N'afọ 2020, Amnesty International bipụtara akụkọ gbasara mwakpo na ịtọrọ ndị mmadụ e mere n'ọtụtụ obodo dị na mpaghara ahụ. N'afọ 2025, Global Voices kọkwara maka mwakpo n'okpukpu n'okpukpu, ịtọrọ mmadụ na igbu ọchụ ndị obodo dị na North-Central Naịjirịa nọ na-eche ihu.
Mwakpo ndị a agaalakwa n'ihu n'afọ 2026. Naanị n'ụbọchị atọ n'ọnwa Febrụwarị 2026, e mere mwakpo atọ, na-egbu mmadụ n'akụkụ dị iche iche nke Naịjirịa. E wezụga mwakpo Kaiama, ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ohi nwere ngwa agha gburu mmadụ iri na itoolu n'obodo Doma dị na mpaghara Tafoki nke okpuru ọchịchị Faskari dị na Katsina State. N'otu ụbọchị ahụ kwa, ndị ohi nwere ngwa agha gbukwara otu onye uwe ojii na mmadụ anọ ndị ọzọ bi n'obodo Abande dị n'okpuru ọchịchị Kwande nke Benue State. N'abalị iri na asatọ ọnwa Jenụwarị, 2026, ọnụọgụgụ ngụkọta otu narị na iri isii na atọ ndị na-ekpe ekpere ka a tọọrọ n'ime ụka abụọ n'oge ofufe n'ụbọchị Sọnde na Kaduna state.
Ihe kpatara mwakpo Nso Nso a na Kaiama
Gọvanọ Steeti Kwara, Alhaji Abdulrahman Abdulrazaq, tinyere ndị isi ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gọọmenti, gara njem nkasị obi n'obodo Woro n'ụbọchị Tọọzde, Febụwarị 5. O kwuru na e gburu ndị Alakụba iri asaa na ise (75) n'ihi na ha jụrụ ịnakwere echiche okpukpe ndị na-eme ihe ike. Mgbe ọ na-ekwu okwu n'obí Emir nke Kaiama, gọvanọ ahụ kwuru:
We are very sad. We are here today to commiserate with your Royal Highness over the death of 75 of your subjects. May Allah grant them Al-jannah Firdaus. Your Emirate is versatile and from the information we have been getting, these victims were massacred because they refused to succumb to a strange Islamic doctrine… This is different from what we used to see, where subjects were being kidnapped for ransom. This was a pure massacre. We commiserate with you.
“Anyị nwere nnukwu mwute. Anyị bịara taa ịkasi Onye Eze anyị obi n'ihi ọnwụ ụmụ amaala gị dị iri asaa na ise. Ka Allah nye ha Al-jannah Firdaus. Site n'ihe ọmụma anyị nwetara, e gburu ndị a n'ihi na ha jụrụ ịnakwere ozizi Alakụba a na-amaghị bụ nke na-akwalite ime ihe ike… Nke a dị iche na ihe anyị na-ahụbu, nke bụ ntọrọ ndị mmadụ maka iji ego gbapụta ha. Nke a bụ ogbugbu n'ike kpamkpam. Anyị so gị eru uju”
Gọvanọ ahụ kwuru na enweghị nchekwa siri ike isochi n'ihi na ọ gafere ókè Kwara state ma gbasaa ruo obodo ndị gbara Kainji National Park dị na Niger State gburugburu. O kwere nkwa ime ka nchekwa sie ike n'ógbè ahụ ma guzobe kọmitii mmadụ asaa iji nye ndị mwakpo ahụ metụtara enyemaka mmadụ
Onye isi ala Naịjirịa Bola Ahmed Tinubu nyekwara iwu ka e ziga òtù ndị agha (battalion) gaa na Kaiama. Dị ka akwụkwọ nkwupụta ọnụ na-ekwuchitere Onye Isi Ala, Bayo Onanuga, si kwuo:
It’s commendable that the community members, even though Muslims, refused to be conscripted into a weird belief that promoted violence over peace and dialogue.
“Ọ bụ ihe kwesịrị ịja mma na ndị obodo ahụ, n'agbanyeghị na ha bụ ndị Alakụba, jụrụ isonye n'okwukwe a na-amaghị nke na-akwalite ikpa ike karịa udo na inwekọ mkparịta ụka.”.
Ihe ndị na-akpata ọdịda nchekwa Naịjirịa
Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa na òtù ndị na-agbachitere ikike mmadụ ekwuola na ihe kpatara mwakpo ndị a bụ enweghị nchekwa nke ọma n'ókèala mba na mba, usoro nchekwa na-adị naanị mgbe nsogbu bilitere, na mgbasa nke òtù ndị na-eme ihe ike sitere n'ebe ndị ọzọ.
Otu Amnesty International tara gọọmentị ụta maka “nnukwu ọdịda nchekwa” n'ime obodo ndị dị n'ime ime mpaghara mgbago ugwu Naịjirịa. Dị ka nchọpụta ha si gosi, òtù a na-eyi ọha egwu ahụ anọwo na-ezigara obodo ndị dị na Kaiama akwụkwọ ịdọ aka ná ntị n'ụdị akwụkwọ ozi nakwa n'ụdị mpempe akwụkwọ mgbasa ozi ruo ihe karịrị ọnwa ise, ọbụna ruo izu abụọ tupu mwakpo ahụ. N'akwụkwọ ha bipụtara na X Amnesty kwuru na gọọmenti elegharala obodo ndị dị n'ime ime anya, nke mere ka ha bụrụ ndị na-adịghị echebe onwe ha pụọ n'aka ndị na-eyi ọha egwu. Ha kpọrọ ndị ọchịchị Naịjirịa òkù ka ha mee nnyocha zuru oke banyere mwakpo ahụ ma mee ihe ndị ọzọ iji chebe ndụ ndị bi na mpaghara ahụ.
Ugbu a, gọọmenti na-arụ ọrụ iji nyere ndị mwakpo ahụ metụtara aka ma weghachite udo na usoro n'ógbè ahụ. Onye isi ala amalitela ọrụ nchekwa a kpọrọ Operation Savanna Shield ma nye ndị agha ọhụrụ e zigara mpaghara ahụ iwu ka ”ha kwụsị ndị na-eyi ọha egwu na-eme omume obi ọjọọ ma chebe obodo ndị na-enweghị ike ichebe onwe ha”.






