Ihe Na-efunarị Ụwa Mgbe Ọ na-aghọtaghị Ọnọdụ Enweghị ebe onye si dị ka iwu mba si chọọ

A blurred photo of a crowded street.

Foto dị inyogho inyogho nke na-egosi okporo ama nke ndị mmadụ juru na ya. Onyonyoo sitere na Pxhere. (CC0 Public Domain).

Onye dere ya bụ Christy Chitengu

Akụkọ a bụ Christy Chitengu dere ya na The Global Movement Against Statelessness (GMAS). GMAS bụ nke nwere ndịnaya yitere nke Global Voices. Akụkọ a bụ usoro Spotlight series nke Global Voices nke ọnwa Julaị 2026, nke bụ  “Enweghị Steeti.” Usoro a na-enye nkọwa gbasara ọnọdụ enweghị steeti na otu o si anapụ ndị mmadụ ikike nke ngagharị, inweta agụmakwụkwọ, isonye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ị nwere ike ịkwado akụkọ ụdị ndị a ka ọ na-adị site n'inye onyinye ebea.

E nwere oge nke ọtụtụ ndị na-enweghi ebe ha si ka iwu mba si chọọ maara nke ọma.

Ọ na-abịa mgbe mmadụ chọrọ inweta pasụpọọtụ, asambodo ọmụmụ, akwụkwọ ikike ID kaadị nke o ji bụrụ onye mba ahụ maọbụ ihe ọzọ na-egosi na ọ bụ onye mba ahụ. Nye ọtụtụ ndị mmadụ, ihe ndị a bụ akwụkwọ ndị a na-eme kwa ụbọchị, nkọwa gbasara usoro ndụ nke oge a. Nye onye na-enweghị ebe o sonyere ka iwu si chọọ, naanị ntakịrị arịrịọ ahụ nwere ike ighọgharị mkparịta ụka dị oke mgbagwoju anya karịa ka onye ọbụla nwere ike ịtụ anya. 

Ị ga-ahụta onwe gị ebe ị na-akọwa nkọwa.

Ị ga-akọwa sị mba, na ị bụghị onye si mba ọzọ. Mba, na ị bụghị onye gbara ọsọ ndụ n'ezie. Mba, na o nwere ike ịgafebeghị ofe mba na mba. Mba, na e nwere ike inweghị mba ọzọ zọọrọ gị na Ị bụ onye ebe ahụ. Ị ga-akọwa na n'agbanyeghị na o nwere ebe a mụrụ gị, o nwere ebe I toro, na-asụ asụsụ ha, ma sonye n'otu obodo, na onweghị steeti na-ahụta gị dịka nwa afọ. 

Mgbe ahụ, ịdaa jụụ. 

Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ mgbagwoju anya, mgbe ụfọdụ ọ bụrụ ekweghị ekwe. Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ ịchọpụta na onye nọ gị n'ihu anụtụbeghị maka enweghị ebe onye si mbụ chaa chaa.

Dịka onye enweghị steeti metụtara kpọmkwem, esonyela m na mkparịta ụka ndị dị otu a na ndụ m niile. Ha na-ekpughe ihe dị mkpa: N'agbanyeghị na enweghị ebe onye si na-emetụta ọtụtụ nde ndị mmadụ n'ụwa gbaa gburugburu, ọ ka bụkwa nke ọtụtụ ndị na-adịghị ahụ anya. Ọ dị naanị n'echiche ndị mmadụ, nke a na-aghọtahiekarị kwa mgbe nakwa nke a na-atụgwakarị ya na nkwagharị ndị mmadụ si n'otu ebe gaa n'ebe ọzọ, nchụpụ ndị mmadụ n'ebe ha, maọbụ ịbụ ndị gbara ọsọ ndụ. Ọ bụ ezie na okwu ndị a yitewere, enweghị ebe onye si bụ ihe na-eme eme n'ụdị nke ya, nke nwere ihe ndị na-akpata ya iche,  ihe ọ na-akpata, yana akụkọ  nke ya. Mana, ọtụtụ mgbe, ọdịiche ndị a niile bụ nke adịghị esonye na mkparịtaụka na mmata nke ọha mmadụ.

Mgbe Global Movement Against Statelessness na Global Voices bịakọtara ọnụ imepụta ihe ngosi  a, anyị hụkwara ọnọdụ apụtaghị ihe a ọzọ.

Global Voices na-eru ndị mmadụ gamie agami  na gburugburu ebe ndị a na-akparịtaụka gbasara ọnọdụ enweghị ebe onye si. Ndị na-agụ ya gụnyere ndị nta akụkọ, ndị na-eme mkpọsa, ndị ome nnyocha, ndị  ndu obodo, ụmụ akwụkwọ, na ndị mmadụ bụ ndị na-achọ ịghọta ụwa site na ihe ndị ọzọ hụụrụla. Ka anyị malitere ịtụ atụmatụ gbasara njikọ aka a, ọ bịara doo anya na ọ bụ nke mbụ ọtụtụ ndị ga-agụ ya ga-akpọ okwu a bụ ”enweghị ebe onye si ka iwu si chọọ” ihu .

Ihe nchọpụta a sogidere m.

N'otụtụ afọ, ọtụtụ n'ime anyị ndị nọ n'ime ọnọdụ njem enweghị ebe onye si na-elegide anya na nkwuchite-ọnụ, ndozigharị usoro iwu, mkparịta ụka maka ụkpụrụ ọchịchị, na njikwa obodo. Anyị agbaala mbọ ịgbanwe ọtụtụ iwu, imeziwanye usoro inweta ihe ndị ruuru ndị mmadụ, ma na-ama usoro ọchịchị aka ike ndị na-akpapụ ndị mmadụ pụọ na ịbụ ndị mba nke aka ha. N'agbanyeghị nke a, ka anyị na-aga n'ihu, anyị malitekwara inwe echiche maka ihe ihe ndị na-adịghị na mbụ. Anyị na ndị omeiwu, ụlọ ọrụ ndị si mba ọzọ, ndị ọkachamara iwu, na ndị nkwuchite-ọnụ ibe anyị nọ na-ekwu. Anyị nọ na-ekwusara ndi maarala maka okwu ahụ.

Anyị nọ, n'ụzọ dị iche iche, na-ekwunyere ndị mere nchegharị.

Mana kedụ ihe ga-eme mgbe ọtụtụ ndị n'ime ọha mmadụ amaghị na nsogbu dị otu a dị?

Kedụ ka ndị mmadụ ga-esi kwadoo inweta ụsa maka enweghị ebe onye si ma ọ bụrụ na ha anụtụbeghị akụkọ ndị gbasara ya? Kedụ ka ha ga-esi ghọta ịdị ngwa ngwa ya ebe ọ bụ na okwu ahụ n'onwe ya ka zoro ezo? Kedụ ka ha ga-esi nwee ekele maka ihe ịbụ onye mba pụtara nye ndị a na-agọnahụ ya ma ọ bụrụ na ha a nụghị ya n'ọnụ ndị na-enweghị ya?

Ajụjụ ndị a ghọziri ntọala nke ngosi a.

N'obi ya, usoro a bụ ọkpụkpọ-oku. Ọkpụkpọ-oku ichetu ma gee ntị n'olu ndị a na-akpapụkarị n'akụkụ na mkparịtaụka ndị bụ isi. Ọkpụkpọ-oku gafee ka iwu si kọwaa ya n'asụsụ ndị omeiwu ma zute ndị na-ebi n'ọnọdụ a kwa ụbọchị.

N'ihi na a na-ejikarị asụsụ ndị dị n'ụdị teknụzụ, iwu mba, usoro ịbụ ndị nwe obodo, usoro iwu, na usoro ndebanye aha dị iche iche akọwa ọnọdụ enweghị ebe onye si. Akụkụ a niile metụtara dịkwa mkpa. Ha na-emetụta ndụ ndị mmadụ n'ọtụtụ ụzọ dị ịrịba ama. Mana asụsụ iwu naanị ya apụghị ịkọwacha mmetụta ọnọdụ enweghị ebe onye si dị ka . Onweghị ike ịkọwacha n'ozuzu obi iko n'elu sitere na amaghị ma Ị nwekwara ike ịga n'ihu n'agụmakwụkwọ gị. Ọ pụghị ịkọwa nkụda mmụọ na-esi na mgbochi inweta ọtụtụ ihe ndị ruuru mmadụ n'ihi na onye ahụ enweghị ike igosi akwụkwọ ikike ndị ọzọ na-enweghị ihe ọ dị ha ka ya. Ọ pụghị ịkọwa ihe ọ pụtara ịkọwa onye Ị bụ, ihe Ị nwe, na ihe ndị Ị tozuru kwa mgbe kwa mgbe nye ụlọ ọrụ ndị jụrụ ịhụta gị maọbụ mara onye Ị bụ.

Ọ pụkwaghị igosicha ihe ndị na-efunarị mmadụ ndị a na-adịghị anụ maka ha.

Otu ọ na-adị n'ahụ ịgwa gị, n'ihu n'ihu maọbụ site n'ụzọ ọzọ, na I soghị. Ọnọdụ amaghị ihe ọzọ Ị ga-eme nke ga-eso gị baa n'ịbụ okenye. Ibu oke echiche so na ị nọ n'ime usoro ndị e mere n'ebughị gị n'obi. Ahụmihe na-eso ịjụ ọtụtụ ase gbasara obodo gị, ezinụlọ gị, akụkọ ihe mere eme gị, na onye Ị bụ n'ihi ọnọdụ ebe I si nke ọ na-adịghị ihe Ị nwere ike ime maka ya. Kaosinadị, ọ bụrụ na e nwere otu ihe m ji aka na ndị na-agụ ga-amụta site n'usoro a, ọ bụ na ndị nọ n'ọnọdụ enweghị steeti dị ike n'ebe ọ dị ukwuu karịa ihe ịma mgba ha na-eche ihu.

Kwa mgbe kwa mgbe, akụkọ banyere obodo ndị a na-akpapụ n'akụkụ na-elekwasị anya karịa n'ịta ahụhụ. Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ịhụta na enwere ekpeghị ikpe ziri ezi, ọ dịkwa mkpa n'otu aka ahụ ihụta ụlọ ọrụ gasị. N'ụwa niile, ndị na-enweghị ebe ha si na-ahazi, na-akpọ oku, na-ekepụta, eduzi, ma na-ekwuchite-ọnụ ndị ọzọ. Ha na-ewulite nhazi-ga, akwado ibe ha, edekọ akụkọ ihe mere eme ha, ma na-eche usoro ndị na-akpapụ ha n'akụkụ aka mgba. 

Nke a bụ ihe m ji anya m hụ site na Global Movement Against Statelessness.

N'ime afọ ndị na-adịbeghị anya, e nweela m ohere inwe mmekọrịta mụ na ndị na-eme mkpọsa yana ndị ndu si na mpaghara dị iche iche ndị ahụmihe ha dị iche iche ha nwere maka enweghị ebe onye si abụrụla nke e nyere ọdịdị dị mma site na akụkọ ihe mere eme dị iche, omenala, na ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche. Ụfọdụ bi na mba ebe ụfọdụ iwu mba na-akwado ịkpa oke na-aga n'ihu igbochi ọtụtụ obodo n'ozuzu inweta ikike ịbụ ụmụ afọ. Ndị ọzọ na-agafe n'ime ihe nketa nke ọchịchị nchigbu, ọgbaghara, ịnọchi steeti, maọbụ iwezuga usoro nchịkwa. Ọnọdụ ha dịcha iche iche, mana akụkọ ha nwere otu isiokwu nke inwe nnagide, ugwu, na inwe mkpebi.

Ugboro ugboro, ihe na-aba m ahụ abụghị ihe na-efunarị ndị na-enweghị steeti, kama site na ihe ha na-aga n'ihu na-ewu n'agbanyeghị ọtụtụ ọdachi dị ha n'ihu.

Ihe ngosi a na-egosipụta eziokwu ahụ.

Akụkọ ndị a kọrọ ebe a metụtara ọtụtụ mba, mpaghara yana ahụmihe. Ha na-eleba anya n'ọtụtụ usoro dịgasị iche iche ndị na-ekepụta ma na-eme ka enweghị ebe onye si na-adịgide adịgide, mana ha na-emekwa ka a hụ nke ọma mmụọ nkepụta na nkwudosike sitere na obodo ndị o metụtara apụta. Ha na-egosipụta na enweghị steeti abụghị okwu nọtere aka maọbụ nọọrọ onwe ya. E kekọtara ya na okwu ndị metụtara ihe onye bụ, ihe onwunwe, ikike mmadụ, teknụzụ, ọchịchị, na ike. Ọ na-asị anyị ka anyị lekwasị anya na onye a na-ahuta, onye a na-akpapụ, na onye na-adị eso n'ozuzu na ihe a na-eme n'obodo. 

Ihe ndị a abụghị ajụjụ nnyocha uche.

Ha na-enyeaka ịchịkwa ọdịdị ndụ nke ọtụtụ nde ndị mmadụ kwa ụbọchị.

Dika Ị na-agụ Spotlight a, a na m agba gị ume ka I were obi ọcha na inwe ọnụnụ-ọkụ n'obi. Ụfọdụ nwere ike gbaghaa ihe ndị e chepụtara echepụta. Ndị ọzọ nwere ike kpughee ihe ndị dị adị Ị na-ahụtụbeghị mbụ, Ọtụtụ ga-echetara anyị na n'azụ mkparịtaụka ọbụla gbasara ịbụ nwa amaala, ndebanye aha, na ọnọdụ iwu bụ ndị mmadụ ndị na-achọ otu ihe ahụ ọtụtụ ndị ọzọ chọrọ: nchekwa, inwe ugwu, inwe ohere, ịhụta mbọ ha na-agba, nakwa inwe ebe ha ga-akpọ nke ha. 

Naanị ime ka a mara na ọ dị agaghị ebi ọnọdụ enweghị ebe a gụnyere onye. Mana apụtaghị ihe ga-enye ya ohere ịnọgide ruo ezigbote ogologo oge.

Nrụtuaka a bụ obere mbọ a gbara igbanwe nke ahụ. Ọbụghị maka ikwu maka ndị na-enweghị ebe a gunyere ha, mana ikepụtara ndị na-enweghị ebe ha so ohere yana ndị nwere njikọ maọbụ mmetụta chiri anya n'ebe obodo ndị o metụtara dị ikwuru onwe ha.

N'ihi na nghọta na-amalite site n'ige ntị

Ma eleghị anya, site n'akụkọ ndị a , ọtụtụ ndị ọzọ ga-aghọta na enweghị ebe onye si abụghị naanị enweghị ikike nwa amaala, Ọ bụ ajụjụ gbasara ịbụ mmadụ, inwe ihe onwunwe, yana ma ụwa ọ dị njikere ịhụta ndị mmadụ dịka ha si hụta onwe ha.

Na nhụta ahụ ka mgbanwe ga-esi malite.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.