Akụkọ Ọhụrụ Chọpụtara na Trinidad na Tobago kwesịrị imekwu ihe karịa iji kwụsị ịkpa ókè ndị LGBTQ+

Image of a rainbow flag with a fist in front of it, painted in the colours of the Trinidad and Tobago flag, created using Canva Pro elements.

E ji Canva Pro mepụta onyonyoo ngosi a

Nwa obere oge tupu Ọnwa Pride, n'oge mmemme Ụbọchị ncheta mba ụwa megide Mmegide otu Agbụrụ ndị Mmadụ, Mmegide Agbụrụ na Ibe ya na Mmegide Agbụrụ Abụọ (IDAHOBIT) na Mee 17 — ụbọchị ncheta mkpebi nke Òtù Ahụike Mba Ụwa (WHO) nke afọ 1990 iji kachapụ inwe mmekọ nwoke na nwoke maọbụ nwanyị na nwanyị dịka nsogbu uche — òtù civil society organisation CAISO nke dị na Trinidad na  Tobago kesara nchọpụta ha mere site na 2024 Insights from Wholeness and Justice Report.

Otu a na-abụghị nke gọọmentị nwe na-achịkọta akụkọ a kwa afọ nke na adabere na ihe ndị ha na-emere ndị otu LGBTQ+. Ka afọ anọ nke ndapụta nke isiokwu yitere nke a gasịrị, CAISO kwenyere na “enyemaka na-adịgịde adịgide ma gbasakwuo agbasa” ka a chọrọ iji kwụsị ihe ọ kpọrọ “ịkpa oke nke steetị kwadoro,” nke na-eme ka ndị LGBTQ+ “nọrọ n'ọnọdụ iwezuga ha na mmekọrịta ha na mmadụ ibe ha n'ụzọ na-adịghị mma.” Akụkọ ya chọpụtakwara na “ọnọdụ gbalụgbalụ nke usoro mmekọrịta mmadụ na ibe ya” na-enye aka na nkụda nke ahụike uche nke ndị otu a:

For the meaningful and reparative inclusion and protection of LGBTQI+ people in Trinidad and Tobago, attention must be paid to different aspects of their lives that impact community members’ ability to live fully and equally. This includes physical, mental, social and emotional wellbeing, as well as livelihood opportunities. The State is responsible for ensuring the rights of all citizens. Measures need to be taken to ensure LGBTQI+ people can enjoy their rights and freedoms, as with other social groups.

Maka ime ka ha sonye nakwa ichekwa ha n'ụzọ nwere nlụpụta ma bụrụkwa nke na-eweta ndozi nke ndị LGBTQI+ na Trinidad and Tobago, a ga-etinyerịrị uche na ọtụtụ ngalaba nke ndụ ha nke na-emetụta ikike nke ndị otu ahụ ibi ndụ ha n'ozuzu oke nakwa n'ụzọ dị nhatanha ka ndị ọzọ. Nke a gụnyere ọdịmma nke elu ahụ, nke uche, nke mmetụta na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya, nakwa ohere ibi ndụ gasị. Steeti ka ọ dị n'aka ịhụ na ikike ruuru onye ọbụla dị. A ga-enwerịrị ihe ndị a ga-eme iji hụ na ndị LGBTQI+ ga-eri uru ikike niile na nnwere onwe niile dịịrị ha n'ozuzu, dịka ọ dị n'otu ndị ọzọ.

Nsogbu Ndị Na-eche ha Iru

Nsogbu ndị enwetara bụ na ndị ji CAISO mee ihe  n'afọ 2024 kwuru na ha hụtara esemokwu ezinụlọ (pasent iri anọ na anọ; ma nke ezinụlọ ma nke ndị hụrụ onwe ha n'anya), mmechu-ihu na mkparị (pasent iri abụọ na ise), na okwu ndị metụtara inweta ọrụ (pasent itoolu).

Ọmụmaatụ esemokwu ezinụlọ dịịrị n'ụdị dị iche iche, gụnyere mmechu iru, iwepụ n'ọnọdụ, mkparị nke anụ ahụ, mkparị site n'okwu ọnụ na mkparị site n'ego, na ụdị mmeso omume ọjọọ ndị ọzọ. N'abụghị otu ọ dị n'afọ ndị ọzọ gara aga, ndị mere mkpesa maka ịkpa oke n'ebe ụlọ ọrụ ha achọghị enyemaka n'ụzọ igbaso iwu, n'agbanyeghị ka iwu si kwadoo mkpesa ha, nke ọkara n'ime ha gụnyere ịkwụsị ha ọrụ n'ụzọ na-ezighi ezi, ebe pasent iri asaa na ise n'ime ha bụ maka mmechu iru ha na-ahụ n'ụlọ ọrụ. Mkpebi ha ka o si metụta nke a bụ maka nchegbu metụtara igbo mkpa na-akpa ha kwa ụbọchị, maọbụ maka echiche banyere ọnọdụ nkwagharị ha, nke akụkọ ahụ na-akọ na ọ na- “arụtụ aka na oghere dị n'usoro ikpe ikpe ziri ezi nke Trinidad na Tobago ma na-eme ka mmegbu n'ụzọ akụnụba nke ndị akpapụrụla n'akụkụ dịrị na-aga.”

Dịka o si  bụrụ ihe a ga-elebara anya, pasent ir na anọ nke ndị mmadụ enweela ọgbaghara nke ndị hụrụ onwe ha n'anya, m'ọbụghị na mmekọrịta ha nọ na ya ugbu a, ọ bụru na nke gara aga, ebe pasent iri abụọ na ise n'ime ha kọro na ha ahụla mmechu ihu nakwa/maọbụ mmeso ike nke anụ ahụ na n'ụdị mmekọahụ na-abụghị nke sitere n'ime ụlọ. Pasent iri anọ na atọ nke ndị kọro maka mmeso ike nke anụ ahụ na n'ụdị mmekọahụ kpebiri na ha agaghị agbaso iwu iji nweta enyemaka. N'inyocha data ahụ, CAISO chọpụtara na “enweghị obi isi ike n'ebe usoro nchekwa ndị e nwere nọ na-arụ ọrụ dị oke mkpa n'otu ndị mmadụ si eme mkpebi ma ha a ga-eme ya (nakwa otu ha ga-esi mee ya) bụ ịchọ ụsa mgbe ọbụla ha nwere mmegide.”

Ka ọ dị, ụfọdụ ndị mmadụ chere ọtụtụ nsogbu n'elu nsogbu ihu nke mere ka ọnọdu enweghị enyemaka ha karịkwuo. Enweghị nchekwa nke ego na nke nri nọrọ na pasent iri atọ na itoolu; enweghi ụọ obibi na-adịgịde adịgide, passent iri atọ na isii. Imirikiti ndị mmadụ ruru pasent iri ise na asaa chọrọ nkwado ahụike uche.

Nnyocha nke Nchọpụta ndị e mere

Onye nnọchiteanya CAISO na-ahụ maka mmemme na ime nnyocha bụ Kellog Nkemakolam kọwara na Nnyocha Insights nke e mere n'afọ 2024 na-aga n'ihu igosipụta ịgbasa agbasa nke mgbaghapụ nke steeti na ọdịda ya “ịhụta na ọ bụ ihe dị adị nke ịdị iche iche nke ọdịdị ụdịekere na mgbasa nke jenda, nakwa ahụmihe pụrụ iche nke ndị otu ahụ nke na-esi na ndị ahụ na-apụta.”

Ọ gara n'ihu kwuo na “adịghị njikere nke steeti ịrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ nakwa ịda mba ọrụ ya n'ihe gbasara ọgbaghara nke a na-ahụta n'obodo,” nakwa adịgghị adị nke “usoro ndị e nwere mkpebi itinye n'ọrụ iji dozie nke a site na nhazigharị nke usoro ime iwu na mgbanwe nke usoro ime ihe ụfọdụ,” na-eme ka nhuju anya kwa ụbọchị kwa ụbọchị nke nke ọtụtụ ndị n'otu LGBTQ+ na-adịghị enweta enyemaka  dịrị na-aga.

A bịa na ọgbaghara ezinụlọ onye ọkaiwu obodo bụ Donielle Jones rụtụrụ aka na ebe ọ bụ na iwu Domestic Violence (Amendment) Act nke afọ 2020 nke mba ahụ nyere ohere dị iche iche maka inweta enyemaka site n'ịgbaso iwu site n'usoro Protection Order applications, ọtụtụ ndị enweghị ọnụnụ-ọkụ n'obi ịgbaso ya:

[P]eople dependent on those perpetrating violence are vulnerable to increased insecurities if they were to disrupt these relationships by instituting legal action. This was especially the case with young people and working-class people in domestic [relationships] where financial responsibilities were significantly intertwined, or where there was substantial imbalance in income and/or access to resources.

 

[N]dị na-adabere na ndị na-akpata ọgbaghara nọ n'ọnọdụ enweghị nchekwa n'ebe ọ dị elu ma ọ bụrụ na gaara etinye ọdachi na mmekọrịta ndị a site n'ịgbaso usoro iwu. Nke a bụ kpọmkwem ka ọ dịịrị ndị na-eto eto na ndị na-arụ ọrụ na [mmekọrịta] ezinụlọ dị iche iche ebe nwere njikọ ibu ọrụ mmefu ego nke ukwuu ma ọ bụ ebe e nwere enweghị nguzozi dị ukwuu na mkpata ego na/maọbụ inwe eb e si akpata ego.

Ime ka ihe ịma aka mgba ndị a dị mgbagwoju anya karịa bụ eziokwu bụ na mgbe ụfọdụ ha na-adị enwe njikọ miri emi ebe ọ dị ukwuu. Ndị otu LGBTQ+ bụ ndị nwere mmetụta ọjọọ nke ọgba aghara maọbụ ịkpa oke n'ụlọ ọrụ ha, dịka ọmụmaatụ, na-adịkwa adị ka ọ na-dị mfe hanwa inwe nsogbu nri, ihe isi ike nke ego na enweghị ndịgịde nke ebe obibi. Onye ọrụ obodo, Rae Alibey, kọwara na ụdị ịkpa oke a hazịrị n'ụdị a na-enye aka iweta mmeso omume ịkpa oke nke ọtụtụ ndị na-ahụ, nke dabere na ụdịekere ha n'ezie, maọbụ ka ha si hụta onwe ha.

Ikike ngalaba otu dị Iche Iche

Dịka o si metụta isiokwu nke afọ 2025 nke IDAHOBIT “Ikike ngalaba otu dị Iche Iche,” onye isi nchịkwa nke CAISO bụ Angelique V. Nixon mere ka ọ pụta ihe na, ịrụ ọrụ maka inweta ike ziri ezi na ịdị nhatanha nke mmadụ na ibe ya, “na ọdịiche ndị dịgasị n'etiti anyị dị mkpa ma bụrụkwa nke a ga-elebarịrị anya na ndọlị maka nnwere onwe.”

N'ihi ya, ọ ga-amasị otu NGO ahụ ịhụ mgbanwe ndị a ga-eme na iwu Equal Opportunity Act  nke Trinidad and Tobago nke na-ekwu maka mwepụ nke echuche dị iche banyere ụdịekere na ntinye nke otu LGBTQ+ n'okpuru nchekwa ya, na-ekwu na ọ bụ “otu mgbanwe dị ịrịba ama ma nweekwa mpụtara dị ukwuu nke gọọmentị nwere ike iwebata iji malite doziwe ọtụtụ oghere na ọgbụgba nkịtị dị iche iche dị n'usoro ime iwu na usoro ndị ọzọ.”

Na mgbakwunye n'ụdị mgbanwe n'usoro omeiwu dị ka nke a, akụkọ Insights Report nke afọ 2024 rịọkwara maka ọrụ ọhaneze gụnyere onye ọbụla ma gbasakwuo agbasa, ya na ihe nchekwa nke agụmakwụkwọ na nke ọzụzụ nke ga-enye aka ichekwa ikike nke ndị LGBTQ+ ma nyekwa usoro iji zaghachị mkpesa ha ma ọ bụrụ na ọgbaghara maọbụ ịkpa oke adị.

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.