A na-eme ka ndị Palestịn ghara inwe ohere isonye n'akụnaụba dijitalụ

Screenshot from video ‘Gaza’s electricity crisis deepens as Israeli strikes threaten vital solar panels,’ uploaded to YouTube by Al Jazeera English, fair use

Foto sitere na vidiyo ‘Nsogbu ọkụ eletrik na Gaza na-akawanye njọ ka mwakpo ndị Izrel na-eyi ngwa ibe anyanwụ dị mkpa egwu,’ nke Al Jazeera Bekee tinyere na YouTube, ojiji ziri ezi

Sitere n'aka Jalal Abukhater 

Nye ọtụtụ ndị mmadụ n'ụwa gbaa gburugburu, akụnaụba dijitalụ abụghị naanị echiche nkịtị kama ọ bụ eziokwu dị ire a na-ahụ anya nke na-akpuzi ndụ na ọrụ kwa ụbọchị. Ekwuwe maka akụnaụba dijitalụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-eche maka azụmahịa, nchọpụta ọhụrụ, na nkwalite teknụzụ. Mana maka ndị Palestịn, ihe a na-ajụ abụghị ma akụnaụba dijitalụ ọdị ma ọ bụ na ọ dịghị, kama ọ bụ ma a na-ahapụ ha ka ha jiri ya na-eme ihe ma sonye n'ọrụ akụnaụba ụwa n'otu ọnọdụ na ohere hà nhata dịka ndị ọzọ. 

7amleh ka biputara akụkọ ọhụrụ nke isiokwu ya bụ  Nnweta Ndị Palestịn n'Usoro Dijitalụ nke Akụnaụba: Ihe Mgbochi, Oghere Dị na Ya, na Atụmatụ Ewebatara Iji Merie Ha.” Akụkọ ahụ na-egosi etu ndị Palestịn nọ na Palestịn nke oge ochie si eche ije mgbochi ahaziri ahazi ihu n'inweta usoro ịkwụ ụgwọ dijitalụ, ịzụ ahịa n'ịntaneetị na ohere ọrụ ebe dị anya.  Nchọcha a nyochara ihe dị ka ọrụ dijitalụ 30 ndị ama ama site n'ịgbalị imepe akaụntụ, inyocha ma kwadoo akaụntụ ndị ahụ, ma jiri ha rụọ ọrụ n'ọnọdụ ndụ n'ezie, ha daberekwa n'ajụjụ ọnụ na ahụmịhe ndị Palestịn na-eji usoro ndị a kwa ụbọchị a kọọrọ ha mee nchọpụta ahụ.

Mwepu ahaziri n'usoro

Ihe nchọpụta ndị e depụtara n'akụkọ a na-egosikwa na mwepụ ndị Palestịn n'akụnaụba dijitalụ abụghị ihe mere na mgberede ma ọ bụ n'ihi nsogbu teknụzụ; kama, ọ bụ mwepụ a haziri n'usoro.  Nke a dị mkpa n'ihi na akụnaụba dijitalụ bụ otu n'ime ohere ole na ole fọdụrụ nke ndị Palestịn nwere ike isi gbalịa ịgafe ihe mgbochi e tinyere ha n'ijegharị, n'ịchọta ọrụ, na n'inweta ohere dị iche iche n'ihi ọtụtụ afọ nke ọchịchị mmanye na nkewa agbụrụ. Nye ọtụtụ ndị ntorọbịa Palestịn, ọrụ dijitalụ nyere ha ohere na-adịghị ahụkebe: ohere isonyere ndị ọzọ na inwe mmekọrịta n'etiti ha na ndị ọzọ n'ụwa n'enweghị ịgafe ebe a na-enyocha ma na-achịkwa ngagharị mmadụ.

Ma n'ịntanetị, ndị Palestịn ka na-ezute ihe mgbochi. Akụkọ a na-enyocha akụkụ atọ bụ isi nke akụnaụba dijitalụ, ya bụ: nyiwe ịkwụ ụgwọ dijitalụ, ọrụ azụmahịa n'ịntanetị, na nyiwe ọrụ a na-arụ n'ebe dị anya. N'akụkụ atọ ndị a niile, ndị Palestịn na-eche ọtụtụ ihe mgbochi ihu. Ihe mgbochi ndị a sitere n'atụmatụ na iwu nke nyiwe dijitalụ, mgbochi dị na nkwukọrịta ekwentị na ịntanetị, mwepu ha n'usoro ihe gbasara ego, nakwa ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị sara mbara. Ihe ndị a na-egbochikwa ha isonye n'akụnaụba ụwa nke ọma. 

Eleghi anya, Ịkwụ ụgwọ dijitalụ bụ ihe ịmaatụ kacha doo anya. Ndị Palestịn bi na West Bank nke ndị mmadụ nọ nakwa Gaza enwebeghị ohere iji PayPal eme ihe, n'agbanyeghị ọtụtụ afọ nke mbọ na arịrịọ e merela ka ha nweta ohere ahụ ya nakwa n'agbanyeghi na nyiwe ahụ anaghị ana ndị izrel ego, tinyere ndị mbịarambịa bi n'ụzọ megidere iwu n'obodo ndị e wuru na West Bank. Mwepu a na-amanye ndị ọrụ na ndị ọchụnta ego Palestịn na-arụ ọrụ onwe ha ịdabere na ndị na-arụ ọrụ n'etiti na-eri nnukwu ego, na usoro mbufe ego na-abụghị nke iwu kwadoro nke ọma, ma ọ bụ ụzọ ọzọ na-akwụsighi ike, nke na-eripịa akụkụ buru ibu nke ego ha na-akpata.

Maka ọgbọ nke na-adaberewanye n'ọrụ a na-arụ n'ịntanetị, enweghi ohere iji ngwa ọrụ ego ndị dị mkpa bụ nnukwu ọdachi. Onye na-eme grafiks dizaịn na Gaza nwere ike inweta nkwekọrịta ọrụ onwe onye site na nyiwe zuru ụwa ọnụ, ma ka na-enwe nsogbu n'ịnara ụgwọ ya n'udo ma ọ bụ n'oge. N'akwụkwọ maọbụ n'echiche ohere ahụ dị, ma n'ezi ọnọdụ ndụ, a ka na-egbochi ha isonye nke ọma ma rite uru na ya.

Enweghi nha n'akụrụngwa dijitalụ

Enweghi akụrụngwa na-eme ka enweghị nha ndị a ka njọ. Ndị Palestịn anaghị achịkwa ngalaba nkwukọrịta nke ha, ha ka na-echekwa nnukwu mgbochi ihu n'inweta ohere iji ụdọ mgbasa ozi spektrum, n'ịzụlite netwọk nkwukọrịta, na n'ịwulite ma ọ bụ ịzụlite akụrụngwa dijitalụ. Ka ndị Izrel na-erite uru dị n'inweta ịntaneetị 4G na 5G ndị gbagotere agbagote, ọ bụ naanị n'afọ na-adịbeghị anya ka ndị Palestịn nọ na West Bank nwetara ohere pere mpe iji 3G, ebe Gaza anọgideela na-adabere n'akụrụngwa 2G ochie n'ọtụtụ afọ n'ihi mgbochi ndị e tinyere na ya. Ọghọm dị na ya na-abịa ozugbo: njikọ ịntaneetị na-esighi ike na-emetụta ọrụ a na-arụ n'ebe dị anya nakwa mmekọrịta dị n'etiti ndị ọrụ na ndị ha na-arụrụ ọrụ ma na-emebikwa usoro nkwukọrịta, agụmakwụkwọ, na azụmahịa a na-azụ ma na-ere n'ịntanetị.

Na Gaza, Mgbochi ndị a ewuru n'ime usoro ahụ amụbaala ruo n'ókè nke mbibi kpamkpam. Otu akụkọ 7amleh bipụtara n'oge gara aga nke isiokwu ya bụ, Mmetụta Mgbochi E Tinyere na Gaza na Mmebi Akụrụngwa Nkwukọrịta okwu na Akụnaụba Dijitalụ n'Oge Mgbukpọ Ndị Mmadụ,” kọwara etu ebumnuche e ji wakpoo ma mebie akụrụngwa nkwukọrịta okwu na ọkụ eletrik kemgbe Ọktoba nke afọ 2023 siri chụba akụnaụba dijitalụ nke Gaza n'akụkụ ọdịda ya.

Akụkọ Ntụle Mmebi Ngwa Ngwa na Mkpa nke Gaza na West Bank, nke pụtara n'oge na-adịbeghị anya, nke EU na UN bipụtara n'ọnwa Eprel afọ 2026, chọpụtara na pasentị 81 na otu nke netwọk nkwukọrịta okwu nke Gaza emebiela kpamkpam, pasentị 12 mebiri emebi naanị n'akụkụ ụfọdụ, ebe ọ bụ naanị pasentị 7 nwere obere mmebi. Ogo ojiji ịntanetị na Gaza dara site n'ihe karịrị pasentị 80 n'ime naanị ọnwa Ọktoba afọ 2023, ma kemgbe ahụ, ọ laghachibeghị n'ọnọdụ ọ dị na mbụ. 

Nkwado ndụ dijitalụ

Ma n'agbanyeghị mgbukpọ ndị mmadụ, ụnwụ nri, nchụpụ n'ebe obibi ha, na nkwụsị ọkụ eletrik, ndị Palestịn gara n'ihu na-agbalị ịrụ ọrụ. Nchọcha e mere n'oge ụnwụ nri ahụ n'ọnwa Julaị afọ 2024, nke nyochara ihe karịrị ndị ọrụ dijitalụ 180 nọ n'obodo Gaza na n'ofe Gaza Strip, chịkọtara akaebe ndị rara ahụ ichefu. Ndị mmadụ kọwara na ha na-ebute ụzọ ịgbalị inweta laptọọpụ, isi iyi ọkụ eletrik, ma ọ bụ ihe ngosi ịntaneetị karịa ihe ọbụla ọzọ n'ihi na ọrụ dijitalụ na-arụ ọrụ dị ka njikọ ikpeazụ ha na ndụ, ùgwù, na olileanya.

Ndị na-arụ ọrụ onwe ha na-ezukọta n'ebe ọrụ nkekọrịta ndị e ji akụrụngwa anyanwụ rụọ nwa oge ka ha kwalite ike ngwaọrụ ha ma nwee ohere iji mgbaàmà ịntanetị na-adịghị ike ruo awa ole na ole kwa ụbọchị. Ndị ọzọ na-aga ebe dị anya ịchọ njikọ ịntanetị ka ha wee zipu ọrụ ha ma ọ bụ zaghachi ndị ahịa ha tupu mgbaàmà ahụ efunahụ ha ọzọ.

Otu ihe ga-edo anya bụ na e kwesịghị ịkọwa ndidi na nkwụdosi ike a n'ụzọ ga-eme ka ọ yie ihe na-adọrọ mmasị ma ọ bụ nke kwesịrị ịmasị mmadụ. Ọ na-egosi enweghị ụzọ ọzọ. Tupu Ọktoba afọ 2023, ọrụ a na-arụ n'ebe dị anya aghọọlarị ụzọ mgbapụta dị oke mkpa nye akụnaụba Gaza. Puku kwụrụ puku ndị Palestịn na-eji nyiwe dịka Upwork na Fiverr arụ ọrụ onwe ha n'ihe gbasara programịn, dizaịn, ntụgharị asụsụ, na azụmahịa dijitalụ. Ngalaba nkanụzụ ozi na nkwukọrịta (ICT) nke Palestịn nyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ puku itoolu ọrụ n'ime ụlọ ọrụ dị ihe dị ka 700 ma nye ihe ruru pasentị 4 n'ime mkpokọta uru akụnaụba (GDP) nke Palestịn. Nye ọtụtụ ndị ntorobịa Palestịn na-eche ihe mgbochi njegharị na enweghị ọrụ ihu, ọrụ dijitalụ ghọrọ otu n'ime naanị ụzọ ole na ole ha nwere ike isi nweta ego ma nyere ndụ ha aka. 

Ma a na-atụ anya ka ndị Palestịn soro asọmpi n'ahịa akụnaụba dijitalụ zuru ụwa ọnụ, ebe a na-ajụ inye ha ohere nha anya n'akụrụngwa dijitalụ, ohere nha anya n'ọrụ ịkwụ ụgwọ dijitalụ, nnwere onwe njegharị, na ọbụladị inweta ọkụ eletrik na-adịgide adịgide.

Ọnụ ahịa nke ọrụ

Mkparịtaụka gbasara ikike dijitalụ nke ndị Palestịn na-elekwasịkarị anya na mmachi a na-etinye n'ịntanetị na nnwere onwe ikwu okwu n'ịntanetị. Ihe ndị ahụ ka dị oke mkpa. Ma ikike dijitalụ bụkwa ikike akụnaụba. Ha na-ekpebi ndị ga-enwe ike ịrụ ọrụ, ịzụ ahịa, iwulite azụmahịa, ịnata ụgwọ, na ịkpata ego e ji ebi ndụ. Ka ọtụtụ akụkụ nke ụwa na-aga n'ihu ịga n'ịntaneetị, a na-ahụwanye na ịnapụ mmadụ ohere iji nyiwe dijitalụ eme ihe pụtara ịnapụkwa ya ohere isonye n'ọrụ na ndụ akụnaụba. 

Ụlọọrụ nkanụzụ apụghị ịga n'ihu na-ewere mwepu ndị Palestịn dị ka okwu na-adịghị oke mkpa ma ọ bụ dị ka ihe mwute na-esite n'ihe a na-akpọ “ọnọdụ mgbagwoju anya.” Atụmatụ na iwu nyiwe dijitalụ na-enwe ọdịdị ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ha na-anapụ otu ìgwè mmadụ ohere iji ha eme ihe n'usoro, ebe ha na-ekwe ka ìgwè mmadụ ọzọ bi n'otu mpaghara ahụ n'okpuru otu ọchịchị nwee ohere ahụ. Akụrụngwa dijitalụ na-adị ka ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe a na-ajụ ndị bi na mpaghara ọzọ ikike ịchịkwa netwọk ha na-adabere na ya maka nlanarị ha. Nyere ndị Palestịn, ohere iji teknụzụ na nyiwe dijitalụ eme ihe bụ n'ikpeazụ okwu gbasara ikike ha nwere isonye n'ọrụ akụnaụba na ndụ ọha mmadụ nke oge a n'usoro nha anya na ndị ọzọ.

Jalal Abukhater bụ onye njikwa atụmatụ na 7amleh,  The Arab Center for the Advancement of Social Media. Ọrụ ya gbadoro ụkwụ n'ikike dijitalụ nke ndị Palestain, nkanụzụ na ikike mmadụ, ịza ajụjụ nke ụlọ ọrụ, onyunyo, igwe omekammadụ, na etu akụrụngwa dijitalụ si ejikọta usoro ọchịchị ike na ọgbaghara

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.