Ịgba Egwu mnweta udo: Otu ụlọ akwụkwọ si ejikọta Nigeria site na omenala

Students at the Womanhood School of Health Sciences about to do a cultural performance of the Gbagy tribe.

Ụmụ akwụkwọ nọ na Ụlọ Akwụkwọ Womenhood Health Sciences na-akwado ime mmemme omenala nke agbụrụ Gbagy. Foto sitere n'aka Mohammed Ibrahim. A natara ikike ojiji.

Na gbururgburu Naijiria, site n'okporo bekee nke Lagos dị na South West na-ekwo ekwo ruo na obodo ndị dị jụụ nke dị na Steeti Taraba  na North East, ụlọ akwụkwọ na-achọta ụzọ dị mma iji kụọ mkpụrụ nke udo na ịdị n'otu n'etiti ụmụ akwụkwọ ha. kedu Usoro ha ji? Omenala.

Isi ihe dị n'ime mgbanwe a bụ nhụrụche na egwu, ịgba egwu, na ekele ọdịnala nwere ike ime karịa inye ntụrụndụ: kama ha nwere ike iweta ịdị n'otu.

“Otu n'ime ebumnobi anyị bụ isi bụ ikwalite udo,” Nuradeen Bello, onye isi ụlọ akwụkwọ Womenhood School of Health Sciences na Kaduna, Northwest Nigeria, gwara Peace News Network (PNN)”.

Our students come from different tribes and religions. Cultural activities help them see beyond those differences and appreciate each other’s traditions.

Ụmụ akwụkwọ anyị si n’agbụrụ na okpukpe dị iche iche. Ihe omume omenala na-enyere ha aka ịhụ karịa ọdịiche ndị ahụ ma nabata ọdịnala nke ibe ha.

N'ụlọ akwụkwọ ya, ụmụ akwụkwọ si n'ụdị ntọla dị iche iche gụnyere Ndị Kraịst, ndị Alakụba, ndị Gbagi, Hausa, Igbo, Yoruba, ndị Nupe, ndị Kanuri, na Ebira, na-abịakọta ọnụ iji gosi nri, ejiji na emume ọdịnala. Bello kwenyere na usoro a na-agbanye mkpọrọgwụ nkwanye ugwu nke naanị akwụkwọ ọgụgụ enweghị ike inye. Ọ gbakwụnyere:

Some of our students had never even heard the Ebira language before. After participating in our events, they not only heard it, they celebrated it. When there’s unity, peace follows naturally.

Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ anyị anụtụbeghị asụsụ Ebira. Mgbe ha sonyechara na mmemme anyị, ọ bụghị naanị na ha nụrụ ya, ha mere ememe ya. Mgbe e nwere ịdị n'otu, udo na-esochi na-enweghi mgbakasị ahụ.

Bello kwusiri ike na ọmụmụ omenala na-amalite n'oge n'ụlọ akwụkwọ ya. Ọ gbakwụnyere na ka ọ na-erule oge ụmụ akwụkwọ gụchara, ha esonyela ma ọ dịkarịa ala mmemme omenala abụọ ma ọ bụ atọ. Bello kwuru na mmetụta ahụ na-adịgide adịgide, na-akụziri ụmụ akwụkwọ enwem ndidi na ịkwadebe ha maka ibi ndụ udo ebe ọ bụla ha na-aga.

Ọ tụrụ aro na ọ bụrụ na ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ anabata usoro dị otú ahụ, ọ nwere ike ịkwalite ịdị n'otu na enwem ndidi na Nigeria. Ọ sịrị:

All schools should aim to harmonize their activities to include everyone. Every student should be recognized and given a sense of belonging.

Ụlọ akwụkwọ niile kwesịrị ịgbalị ime ka ihe omume ha bụrụ nke ga-anabata onye ọ bụla. Nwa akwụkwọ ọ bụla kwesịrị ka amata ma nye ya nkwado  nsonye.

Ọ gara n'ihu ikwu na nke a ga-eweta nkwekọ na ịdị n'otu n'ụlọ akwụkwọ, na-enyere aka ka udo na-adịwanye n'ihu.

Students at the Womanhood School of Health Sciences about to do a cultural performance.

Ụmụ akwụkwọ nọ n'ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị nke sayensị ahụike na-achọ ime mmemme omenala. Foto sitere n'aka Mohammed Ibrahim. E nyere ikike ojiji.

Omenala dị ka ihe mgbochi na ndịda

Na Lagos, Obialunamma Chidindu, onye nkuzi ụlọ akwụkwọ  Moral Esteem School dị na Abijo, Ibeju-Lekki, ahụla ka ihe ngosi omenala siri dị ike – karịsịa n'oge mmemme nke ya na ndị nne na nna ya si Nigeria gara. Ọ sịrị:

Cultural dance presentations help foster unity. When Yoruba, Hausa, and Igbo dances are performed together, it creates an atmosphere of shared appreciation.

Ihe ngosi ịgba egwu omenala na-enyere aka ịkwalite ịdị n'otu. Mgbe a na-agbakọ egwu ndị Yoruba, Hausa na Igbo ọnụ, ọ na-eme ka e nwee nnabata zuruoke.

Chidindu kwetara na ya kesara egwu Igbo n'ihe mere n'ụlọ akwụkwọ nso nso a na soshal midia ya n'ihi na o mere ya. Mana o mere ka o doo anya:

It wasn’t just the Igbo culture represented. We had Hausa and Yoruba too. Everyone was celebrated, and all the parents, regardless of tribe, appreciated the diversity.

Ọ bụghị naanị omenala ndị Igbo ka e gosipụtara. Anyị nwekwara nke ndị Hausa na Yoruba. A nabatara mmemme onye ọ bụla, ndị nne na nna niile, n'agbanyeghị agbụrụ, nwere ọṅụ maka ọdidị iche.

O kwenyere na ụlọ akwụkwọ ọ bụla nwere ike ịchọta oge dabaara ya ma a bịa n'ịkwalite omenala, ọ bụrụgodị na ọ bụghị n'oge isi ihe dị ka mmemme ngụsị akwụkwọ. Chidindu kwuru na ụfọdụ ụlọ akwụkwọ na-eme ụbọchị omenala na ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya ma ọ bụ ezumike mba ọzọ ga. Ọ sịrị, “Ihe dị mkpa bụ ebumnuche – ịkpọkọta ndị mmadụ ọnụ site na ahụmịhe nkekọrịta”.

N'ihe banyere mmetụta ụmụ akwụkwọ ha nwere, ọ gbakwụnyere na ịgba egwu abụghị naanị ihe ntụrụndụ, kama ọ na-enyere ha aka ịghọta ibe ha n'agbanyeghị ndịiche agbụrụ. O kwuru, sị: “Ị pụrụ ịhụ ka esi akwalite mmụọ ịdị n'otu ahụ site n'ihe omume ndị dị otú ahụ.

Otu n'ime nnukwu nsogbu na-eche mmemme omenala ihu bụ mmasị e nyere otu agbụrụ ma ọ bụ ọtụtụ agbụrụ n'oge mmemme, nke Chidindu chere na ọ nwere ike ịkpalite iwe  ndị agbụrụ ọzọ nọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ.

Dị ka o si kwuo, ndị nhazi ga-ezere ịme ihe ngosi omenala dị otú ahụ ịbụ nke naanị otu agbụrụ ga-egosi, ka ọ bụrụ nke agbụrụ ndị ọzọ ga-esonye.  o kwuru na “Ndị mmadụ nwere ike ịmalite iche, sị, ‘O, n'agbụrụ a dị mkpa karịa, ọ bụ ya mere e ji egosi ha,” Iji gbochie ihe ịma aka dị otú ahụ, ọ dụrụ ọdụ inwe ihe ngosi sitere na opekata mpe agbụrụ atọ dị iche iche n'ụlọ akwụkwọ ahụ.

Students at the Womanhood School of Health Sciences prepare to do a cultural performance.

Ụmụ akwụkwọ nọ na Ụlọ Akwụkwọ Womenhood of Health Sciences na-akwado ime mmemme ngosi omenala. Foto sitere n'aka Mohammed Ibrahim. E nyere ikike ojiji.

Agbam egwu ịdị n'otu na ụmụaka na-eto eto na Abuja

Mohammed Lawal Abubakar, onye isi otu Cultural and Creative Club na ụlọ akwụkwọ Prịamarị LEA, Zuba dị n’Abuja, isi obodo Naijiria, na-ahazi “Agbam Egwu ịdị n'otu” kwa afọ nke na-achịkọta ụmụ akwụkwọ sitere na agbụrụ dị iche iche na isi obodob a. Abubakar kwuru:

The children are always excited. They learn dances from other tribes and wear traditional outfits. It makes them feel seen and included.

Ụmụaka na-enwe mmasị mgbe niile. Ha na-amụta ịgba egwu site n'aka agbụrụ ndị ọzọ ma na-eyikwa uwe ọdịnala. Ọ na-eme ka ọ dị ha ka a na-ahụ ha ma na-enye ha ohere nsonye.

Ọ gbakwụnyere na mmemme omenala ndị dị otú ahụ na ụlọ akwụkwọ na-akwalite mmepe mba na ịdị n'otu udo site n'ịgba ume ịdị n'otu n'etiti ụmụ amaala, karịsịa mgbe a na-akuziri ụmụaka nke a n'oge.

Nigeria is a country with many ethnic groups, especially in the North. If children are taught to appreciate each other’s cultures, they will grow up respecting one another.

Naijiria bụ Mba nwere ọtụtụ agbụrụ, ọkachasị na ebe ugwu. Ọ bụrụ na a kụziere ụmụaka ka ha jiri omenala ibe ha kpọrọ ihe, ha ga-etolite na-asọpụrụ ibe ha.

O kwusiri ike na ebumnobi a bụ ịkụziri ụmụaka nkwekọrịta ibe ha iji nyere aka n'ịkwalite ịdị n'udo, na-agbakwa ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ ume ka ha na-eme omume ọma dị otú ahụ iji gosi ụmụ akwụkwọ ha na nke a ga-enye aka kwalite udo n'obodo ha.

Ka o si hụta ya, egwu abụghị naanị ihe na-atọ ụtọ, ha bụ maka ịkwalitea njirimara mba. Abubakar kọwara na:

These events help children understand one another and develop empathy early. This is where peace starts on the playground, not just at peace summits.

Ihe omume ndị a na-enyere ụmụaka aka ịghọta ibe ha na ịzụlite ọmịiko n'oge. Nke a bụ ebe udo na-amalite n'ọgbọ egwuregwu, ọ bụghị naanị na nnọkọ udo.

O kwuru na nnabata enwetarala n'enye ọṅụ. O kwuru na mgbe o webatara echiche a n'ụlọ akwụkwọ ya, onye ọ bụla nabatara ya.

The children look forward to it, and as teachers, we are happy about it because it undeniably builds mutual understanding, which contributes to peace in the country.

Ụmụntakịrị na-atụ anya ya, dị ka ndị nkuzi, anyị nwere obi ụtọ maka ya n'ihi na ọ bụ ezie na ọ na-ewulite nghọta, nke na-enye aka n'udo na mba ahụ.

Nwusike njirimara na Northeast

Na steeti Taraba, Suleiman Muhammad Adamu, onye isi ụlọ akwụkwọ Albayan, kwughachiri otu ihe ahụ. Ọ sịrị:

We organize cultural celebrations so that students can understand and appreciate their traditions and those of their peers.

Anyị na-ahazi ememe omenala ka ụmụ akwụkwọ nwee ike ịghọta ma nabata omenala ha na nke ndị ọgbọ ha.

Ka Adamu si hụ ya, ọ bụghị naanị igosi egwu agbụrụ; Ọ bụ maka ịjikwa njirimara na ịkwalite mpako. Ọ sịrị na:

Many children have little exposure to cultures outside their own. These events deepen their understanding and spark curiosity about others.

Ọtụtụ ụmụaka anaghị enwe ohere ịhụ omenala ndị na-abụghị nke ha. Ihe omume ndị a na-eme ka nghọta ha bawanye ma kpalite ọchịchọ ịmata ihe gbasara ndị ọzọ.

Ihe kacha achọrọ izipụta: Inwe Udo na-agaghị akwụsị na Klassị

Onye isi ọrụ  Prince Charles Dickson, onye ndu otu na Tattaunawa Roundtable Initiative (TRICentre) na Jos, na-ahụ mmetụta dị egwu. Dị ka onye kwenyere na inwe mkparịtaụka na ụzọ ndị dị mma idozi esemokwu, ọ kwenyere na okwu omenala dị ka ịgba egwú bụ ngwá ọrụ dị ike nke ọgwụgwọ, agụmakwụkwọ, na mgbochi ihe mgbochi, karịsịa n'etiti ndị na-eto eto.

Ọ kọwara echiche nke iji egwu ọdịnala na ụlọ akwụkwọ dị ka ihe eji eme udo na Naijiria dị ka nke nwere mpụta ihe. Ọ kọwara na:

Dance, rooted in local heritage and identity becomes more than performance, it becomes shared memory, emotional release, and communal affirmation.

Ịgba egwu, gbanyere mkpọrọgwụ na ihe nketa mpaghara na njirimara na-aghọ karịa arụmọrụ, ọ na-aghọ ebe nchekwa nkekọrịta, ntọhapụ nke mmetụta uche, na nkwenye obodo.

Ọ gbakwụnyekwara:

When embedded into school curricula or extracurricular activities, it not only celebrates diversity but also teaches tolerance, empathy, and coexistence in a way that is non-threatening and joyful.

Mgbe etinyere ya na usoro ọmụmụ ihe ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ, ọ bụghị naanị na ọ ga-akwalite ụtọ ọdịdị iche kamakwa ọ ga-akụzi ndidi, ọmịiko, na ibikọ ọnụ n'ụzọ na-adịghị ebute iyi egwu na nwezuga ọṅụ.

N'obodo ndị dị iche iche dị ka Nigeria, ebe esemokwu agbụrụ na okpukpe adịla ogologo oge, akụkọ ndị a sitere na klaasị na gburugburu mba ahụ bụ mgbanwe dị jụụ. Ha na-egosi na ịkwalite udo nwere ike ịmalite site n'abụ, nzọụkwụ na efere nri ọdịnala na-ekekọrịta.

Dị ka Bello si kwuo ya, “Anyị anaghị akụziri ụmụ akwụkwọ anyị ịgafe n'ule, kama anyị na-akụziri ha ibikọ ọnụ.”

Start the conversation

Authors, please banye »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.