
Ndị otu Global Voices na nnọkọ GV na Kathmandu, Nepal, na Disemba 2024. Foto nke Jer Clarke sere. A natara ikike were ya.
Taa, Global Voices na-amalite mkposa oku maka inye onyinye iji nweta USD 250,000 iji mee ka óba ndupụ akụkọ na ntụgharị asụsụ anyị na-aga n'ihu.
Site na mbụ, otu enyemaka na ndị na-enye onyinye ndị ọzọ na akwado Voice Global, na kwa anyị na-ekele maka ego anyị nwetara n'ụzọ ahụ. Mana mbelata enyemaka mba ofesi site n'ọtụtụ gọọmentị na-ebelata ego dịnụ maka otu ndị anaghị enweta uru ego, ebe ndị otu gbasara ikike dijitalụ dị ka nke anyị na-enweta mmetụta maka ya.
Na kwa ọ bụ oge ihe isi ike maka ụlọ ọrụ akụkọ na ndị ntụgharị ugbu a, ebe a na-eji nkanụzụ ọhụrụ ewepụ ndị ọrụ na kwa na-emepụta n'ọtụtụ mgbasa ozi nduhie na-eme ka a na-akpachapụ ezigbo akụkọ. Ọbụna n'oge ihe isi ike a, mmepụta na ndị na-agụ Global Voices na-arị elu, ma ebe ọ bụ na anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ana ụgwọ na kwa jụ igbasa ozi ahịa, nke ahụ apụtaghị na belụsọ ma ndị na-agụ akwụkwọ ha nyere onyinye anyị apụghị ikwụli ụgwọ ọrụ anyị.
Global Voices bụ òtù nhazi arụmọrụ dị ọnụ ala: anyị enweghị ebe ụlọ ọrụ, enweghị ụgwọ ụlọ, yana akụrụngwa ana ahụ anya ole na ole. Anyị na-akwụ ụgwọ maka ngwanjeozi ndị na-anabata ọba ndupụ anyị yana ụgwọ ọrụ nchịkwa ole na ole ndị ọzọ, mana ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ mmefu anyị bụ maka ịkwụ ndị ọrụ anyị ụgwọ. Ọtụtụ onyinye anaghị achọ itinye ego karịa obere pasentị nke ọnụ ego ndị ọrụ, n'ihi na ha chọrọ ịkwụ ụgwọ nye naanị maka ihe omume, mana ụgwọ ndị ọrụ bụ ntọala nke ọrụ anyị niile. Ndị ọrụ anyị na ndị ọrụ afọ ofufo anyị na-enyocha akụkọ, dee na dezie, tụgharịa na ịkwado – na mgbe ụfọdụ, ha na-emekwa ihe eserese ma ọ bụ nhọrọ foto, nkwalite mgbasa ozi ọha na eze, na ndị ọzọ. Nke ahụ bụ ndị anyị na-agbalị ịkwado site n'ego sitere na mgbasa ozi a – otu anyị, ndị na-emepụta akụkọ na edemede, ntụgharị asụsụ, akụkọ nyocha na mkpọ ozi kikuku ị na-ahụ na ọba ndupụ anyị.
Ọ bụrụ na anyị nwere otu dollar maka nlele ibe ozi ọ bụla nke ọba ndupụ ahụ, anyị agaghị achọ ịme mkpọsa! Na kwa ọ bụrụ na nke ọ bụla n'ime dollar ndị ahụ bụ ntinye aka kwa ọnwa, anyị ga-enwe ike ịme atụmatụ ọdịnihu maka ihe omume ogologo oge ma nwezia mbelata nchekasị. Mana anyị maara na ọ bụghị onye ọ bụla nwere ike inye aka maka ọtụtụ ihe dị iche iche, yabụ na anyị nwere ike iche maka ya dị ka dollar ise site na otu ụzọ n'ụzọ ise nke nleta ọba ndupụ kwa ọnwa, ma ọ bụ dollar iri site na otu ụzọ n'ụzọ iri, na kwa eleghị anya, onye na-agụbeghị ihe ọ bụla n'ọnwa a ma kwere na ihe anyị na-eme na-akụbata dollar iri abụọ na ise, na onye ọzọ hụrụ ntụgharị n'anya na-ezibatakwa dollar iri na ise… ị ghọtara echiche a.
Anyị na-atụ anya na i nwere ike ịbụ otu n'ime ndị na-enye aka, ma ọ bụrụ na i nweghị ike ugbu a, anyị nwere olileanya na ị ka na-abịa ma nọrọtụ nwa oge na ọba ndupụ anyị, wee gwa ndị ọzọ banyere ya. Ọbụna karịa ọba ndupụ akụkọ, Global Voices bụ otu ọgbakọ, anyị ga-achọ ka ị bụrụ akụkụ ya. Anyị ga na-ekerịta gbasara mkpọsa oku ahụ yana gbasara Global Voices na àmà nzikọrịta ozi n'ikuku, yabụ biko bipụta ka ndị mmadụ mụtakwuo banyere anyị yana otu ha ga-esi tinye aka. Daalụ maka nkwado gị!






