
“Ihe kacha m mkpa n'akụnụba bụ…Ihiwe azụmahịa m na igosi ụwa akwa m kpara n'aka” Nwanyị Nigeria na Bida, nke Steeti Niger, Naịjirịa. Onye sere photo bụ Gates Foundation. nke enwetara ikike ojiji.
Na Naijiria, ebe ụmụ nwanyị mejupụtara ọkara nde mmadụ 237.5 na ọnụọgụgụ, e mere atụmatụ na nde nwanyị iri abụọ na atọ ndị ọchụnta ego bụ pasentị iri anọ na otu pụtara ihe nke obere azụmaahịa mba ahụ. Nke a gunyere mba ọdịda anyanwụ Afrịka n'etiti mba ndị nwere iri elu nke ụmụ nwanyị na-azụ ahịa kachasị elu n'ụwa niile. Azụmahịa ụmụ nwanyị nwe na-atụnyekwa nkwalite pasentị iri atọ na asaa na GDP mba ahụ, na-akọwapụta oke ọrụ ụmụ nwanyị na-arụ n'ịkwalite uto akụ na ụba Naịjirịa.
N'agbanyeghị ọrụ dị oke mkpa na ike dị egwu nke ụmụ nwanyị na-azụ ahịa na-akpa n'ịkwalite uto akụ na ụba na mpaghara Sub-Saharan Africa, nnyocha nke ụlọ akụ ụwa, na-egosi na azụmahịa ụmụ nwanyị nwe anaghị eme nke ọma ka azụmahịa nke ụmụ nwoke nwe n'ihi ihe mgbochi ndị metụtara ịbụ nwoke ma ọ ịbụ nwanyị.
Gburugburu ụwa, ụmụ nwanyị na-achụnta ego na- enweta obere ego karịa ndị ogbo ha nwoke. Nnyocha na-egosi na nhiwe ụmụ nwanyị na-ejikwa nwetara naanị pasenti 14.5 nke isi ego mba ụwa na 2021, ma pasent 85.5 gaara nhiwe ndị otu ụmụ nwoke na-ejikwa. Ọdịiche a na-apụta ìhè karịa n'ahịa ndị na-eto eto, ebe nhiwe ndị ụmụ nwanyị malitere na-enweta naanị pasenti asaa nke isi ego.
Ihe ịma aka n'ihu na-eche ụmụ nwanyị Naijiria na-achụ nta ego
Nnyocha e mere ndị inyom otu Narị Puku na Naijiria nke Gates Foundation mere gosiri na-enweghị ego ma ọ bụ ngwá ọrụ mmalite dịka isi ihe na-egbochi pasent iri isii nke ụmụ nwanyị imezu ebumnuche nke akụ na ụba ha.
Dị ka mpụtaara nnyocha sitere n'aka ụlọ ọrụ nkà na ụzụ ego nke Nigeria (fintech) Moniepoint, nanị pasent 16.7 nke ụmụ nwanyị na-ejisi ike enweta mbinye ego n'aka ụlọ ọrụ ego ha, n'agbanyeghị data kredit na-egosi na ụmụ nwanyị nwere ọnụ ọgụgụ mbinye ego 2.5 dị ala karịa ụmụ nwoke. Mpụtaara nnyocha a gosiputara okwu ndi di ka kpa oke n'amaghi ama, mmachi obodo na akparamagwa nke metụtara ego, na enweghi mmata dika isi ihe ịma aka ego nke ulo oru umunwanyi na-eche ihu.
Ọtụtụ ụlọ akụ Naijiria na-achọkarị ala ma ọ bụ ihe onwunwe dị ka nchekwa, mana ụkpụrụ omenala dị ka ihe nketa nke na-esi na nna fere nwa nwoke mere na ụmụ nwanyị anaghị enwekarị akụ n'aha ha. Naanị pasentị iri atọ na asaa nke ụmụ nwanyị nọ na Sub-Saharan Africa nwere akaụntụ akụ, ka ọ bụzị ihe onwunwe, nke na-amachi ntozu nbite ego ha.
Ụmụ nwanyị ndị ọchụnta ego, ọkachasị n'ime ime obodo, anaghị enwekarị ndebanye aha azụmahịa ma ọ bụ ndekọ ego, nke bụ isi ihe achọrọ maka mgbazinye ego ụlọ akụ. Akụkọ sitere na Businessday na-akọwapụta na pasentị iri itoolu na asatọ nke ụmụ nwanyị Naijiria esonyeghi na ahaịa mbite na nnata ego, n'ihi obere agụmakwụkwọ gbasara njikwa ego yana usoro ntinye akwụkwọ dị mgbagwoju anya nke na-adabara ndị nwoke nweworo ohere mmepe anya usoro dị amaara.
Ihe o jiri dị mkpa imechi oghere Ntinye ego
Ịnye ego ụmụ nwanyị ndị ọchụnta ego na Naijiria na nke nwoke dị oke mkpa maka ọtụtụ ebumnuche akụ na ụba, mmekọrịta ọha na eze na mmepe. Nnyocha sitere na Gates Foundation na-eme ka ọ pụta ìhè na ụmụ nwanyị na-etinyehachi ego ha na-enweta na ahụike na agụmakwụkwọ ezinụlọ, na-emepụta mmetụta dị egwu nke na-ebelata ịda ogbenye nke ọtụtụ akụkụ. Ịnye ụmụ nwanyị ego na-akwalite ụlọ ọrụ ha na ikike ime mkpebi. Ọ na-enyere ụmụ nwanyị aka inweta nnwere onwe nweta ego, ịzụ ụmụ ha, na ịma aka ụkpụrụ ndị nna ochie nke enweghi ohere ihe nketa, ma na abara uru n'obodo niile uru nke ukwuu. Imechi oghere ego ijeri USD 1.7 maka ụmụ nwanyị nwere ike ịgbakwụnye ihe ruru ijeri USD isii na GDP zuru ụwa ọnụ.
Ọ bụ ezie na ihe ịma aka nke itinye ego na azụmaahịa ụmụ nwanyị nwe bụ okwu zuru ụwa ọnụ, otu ndị na-akwado nkwado na-agba mbọ ịkwalite nkwado ha na-akwado ndị inyom na-azụ ahịa na Nigeria.
N'ikwu okwu na webinar nke akpọrọ “Nkwalite akụ na ụba ụmụ nwanyị” nke Gatefield haziri, onye ọchụnta ego Naijiria na onye na-akwado akụ na ụba ụmụ nwanyị, Fifehan Osikanlu, kwuru na
While access to financial and digital resources is essential, it is not enough — true empowerment requires financial literacy, digital skills, and policies that meet women where they are. We must move beyond inclusion to ownership, investment, and leadership, ensuring women not only participate in economies but also drive and shape them. This is about power, autonomy, and legacy — transforming families, communities, mindsets, and economies.
Ọ bụ ezie na ịnweta ngwa ihe gbasara ego na dijitalụ dị mkpa, mana ozuchaghi oke – ezi nkwado na-atụ anya onwunwe mmuta gbasara ego, nka dijitalụ, na atumatu na-ezute ụmụ nwanyị ebe ha nọ. Anyị ga-agafe agba nke nsonye gaa na nke onwunwe, itinye ego na nduzi, na-ahụ na ụmụ nwanyị anaghị-ekere òkè naanị na akụ na ụba kamakwa na-awado ma na-ejikwa ha. Nke a bụ gbasara ike, nnwere onwe, na ihe nketa – na-agbanwe ezinaụlọ, obodo, echiche, na akụ na ụba.
Ọ bụ ezie na gọọmentị Naijiria emeela nzọụkwụ agamnihu site na ebumnuche ego ezubere iche, mmekorita, na nkwado amụma iji kwalite ohere nnweta ego nye ụmụ nwanyị na-achụ nta ego, ime ka mbọ ndị a na-edozi ihe mgbochi usoro na-anọgide ịdị oke mkpa maka ịkwalite uto akụ na ụba ha.