Ndi ọrụ Wikimedia: Ihe ndi na-ama ndi nkwuchiteọnụ aka n’ihu na-echekwa asụsụ ha ma na-eme ka ọmụma dịrị aka n’ihu

Ọmụmaatụ si n’aka Chuka Ozoadibe na nnọchiteanya Rising Voices

Si n’aka María Alvarez na Tochi Precious gbakwasịrị ọmụmụ ha ụkwụ na mgbasa ozi maka nchekwa ńkànùzù na ima aka n’ihu na nchekwa ịntanetị dịịrị ndi ọhụrụ na “wikimedia Language Communities”: ebe mbasịụkwụ ọmụmụ a bụ Igbo “Wikimedians User Group”. 
E wepụ asụsụ Yoruba, Hausa, na Bekee bụ asụsụ gọọmentị n’ime asụsụ 520 e nwere na Naijieria, asụsụ Igbo bụ asụsụ nke atọ a kacha asụ. N’agbanyeghị na o nwere ndi karịrị nde 29 na mkpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjiria na-asụ ya, UNESCO na-atụ atụmatụ na a ga-akwụsị ị sụ ya n’afọ 2050. Na nzaghachi n’isiokwu a, ndi “Igbo Wikimedians User Group community” na-eme ihe dị iche iche iji chekwa ya site n’ime ka asụsụ a ruo onye ọbụla aka na gburugburu ịntanetị. Otu ọ dị, ọdịmma ndi nkwuchiteọnụ, na-asụ asụsụ Igbo na asụsụ Igbo n’onwe ya chọrọ usoro nchekwa nke ńkànùzù  nke a ga-ahazi ma tinye n’ọrụ.

Kedụ ụdị ọmụma, akụ, enyemaka na ngwa nchekwa nke ńkànùzù  na nchekwa nke onye ndi òtú a nwere? Kedụ ihe na-ama ha aka n’ihu? Kedụ ụdị ịma aka n’ihu ha na-enweta na mpaghara nchekwa ńkànùzù ? Olee òtù ndi òtú a si amụta nchekwa ńkànùzù ? Ihe ndi a bụ ụfọdụ ajụjụ Tochi Precious, onye nkwuchiteọnụ asụsụ Igbo na onye òtú Igbo “Wikimedia User Group” chọpụtara, na-enyocha n’ọmụmụ ihe a “Ịmata Nchekwa Ńkànùzù  na Ịma Aka n’ihu na Nchekwa Ịntanetị nke ndi batara “Wkimedia Language Communities” ọhụrụ: Igbo “Wikimedians User Group” bụ ebe Nlereanya”

Tochi gbara mmadụ atọ bụ ndi òtù a ajụjụ ọnụ iji ghọta ọnọdụ ha ugbua n’ihe gbasara nchekwa ńkànùzù  nke ọma ma tụpụta atụmatụ ndi ga-elekọta ndi nkwuchiteọnụ na-ahụ na asụsụ Igbo dị ndụ. Ịdozi ma mee ka uru ajụjụ na ịma aka n’ihu ndi a pụta ìhè, ọ dị mkpa ịghọta na ọrụ ha n’ebe asụsụ a tụrụ atụmatụ ga-akwụsị n’afọ 30 na-abịa n’ihu dị kpankem kpankem. 

Ndi Igbo Wikimedia

Igbo Wikimedia User Group bụ òtù asụsụ e hiwere n’afọ 2018 nke ihe mejupụtara ya bụ ọtụtụ ndi ọrụobiọma na ndi nkwuchiteọnụ na-echekwa asụsụ Igbo ha na ọnịnọ ya n’ịntanetị. Ọtụtụ ọrụ ha na-arụ gbagidere ụkwụ n’ime ka ihe a na-achọ dịrị site n’ime nsụgharị na itinyeju ihe. Tochi na-akọwa:

“Anyị malitere òtù ngwangwa anyị matara nramahụ dị n’inweta ihe a na-achọ n’asụsụ Igbo, ọzọ kwa, a bụrụ na ọ bụ otu n’ime asụsụ ndi na-achọ ịnwụ anwụ n’ụwa. Ihe anyị chọrọ ime bụ ka ihe ọbụla a chọrọ n’asụsụ Igbo dị mfe mweta. Ọ bụrụ na ọ dịịrị ndi mmadụ mfe inweta ihe ha chọrọ n’asụsụ Igbo, ha a gaghị enwe obi abụọ iji ịntanetị mee ihe dị mma”.

Site na mbunuche ndi a pụtara ìhè, òtù ndi nkwuchiteọnụ ihe na-eji ihe hụtara dịka akụrụngwa nke bụ ngwa ndi Wikipedia, Wikidata, Wikicommons na Wiktionary. Ha na-eji Wikipedia asụgharị ederede ndi nọ anọ n’English Wikipedia ma nwee ọtụtụ ndi na-agụ ya, ma si otu a mee ka ha dịịrị ndi na-asụ Igbo mfe inweta. Site na wikidata bụ ebe a na-echekwa ọmụma ńkànùzù n’ọtụtụ asụsụ, ha na-eme ka ọmụma ńkànùzù dịịrị ndi-asụ Igbo mfe mweta site n’ịkọwa ọmụma ńkànùzù ndi nọ anọ n’ọgbọ Wikidata. A na-eji Wikicommons etinye oyiyi na vidiyo nke metụtara omenala Igbo maọbụ nke gbasara Naịjiria ma gwa ndi mmadụ ka ha kọwaa ya n’asụsụ ha, ka ndi na-asụ asụsụ ahụ nwee ike ịghọta. N’ikpeazụ, ha na-eji wikitionary etinye mkpụrụokwu Igbo na aha ochie ndi a naghịzi aza. Dịka Tochi kwuru, “ihe a bụ maka ime ka ọmụma dịrị ma dịịrị ndi asụsụ nwere ike igbochi inweta ya mfe.”

Ọ bụghị naanị ndi na-asụ Igbo nọ na Naijiria ka ọrụ a ga-abaara uru kama, ndi na-asụ Igbo gburugburu ụwa ga-erite uru na ya. Tochi na-eme ka anyị mara na ndi na-agụ Igbo Wikipedia nọkwa na mba ndi ọzọ, tụmadị Germany na United States tinyere mba ndi ọzọ ebe ndi Igbo bi na asụsụ ndi jikọtara ọnụ site na ụdị mgbalị a.

Ịma aka Nke Ńkànùzù Na-Ebute

Ọrụ a dị mkpa nwekwara ihe ịma aka n’ihu nke ndi nkwuchiteọnụ na-asụ asụsụ na-agabiga. Ihe ọmụmụ kwuru na ọtụtụ ndi mmadụ nọ na Naijiria e nweghị enweta ọmụma zuru banyere òtù ha ga-esi echekwa onwe ha maọbụ ihe ndi ha na-eme n’ịntanetị, ebe ọtụtụ ọrụ nchekwa ńkànùzù anọghị n’asụsụ ndi dị na Naijiria karịrị 500. Na mgbalị ịrụ ọrụ, ndi nkwuchiteọnụ asụsụ na-enwekwa otu ihe ịma aka n’ihu, tụmadị mgbe nkwụsiike ha chọrọ ka ha na-eji ngwa ńkànùzù dịka iji laptọpụ na ekwentị ebipụta maọbụ sụgharịa edemede, na kwa iji ọgbọ Whatsapp na Telegram hazie onwe ha.

“Anyị na-agbalị ịrụ ọrụ ọma a bụ ime ka ọmụma ọbụla a chọrọ n’asụsụ Igbo dịrị, mana enweghị nchekwa na-amakwa anyị aka n’ihu,” ka Tochi kọwara. Òtù ọ dị n’ebe mgbakwasa ụkwụ n’ihe ọmụmụ a, òtù a ọ na-agabiga ihe ịma aka n’ihu na nchekwa ńkànùzù na nchekwa ịntanetị nke gunyere: nzite ozi a chọghị n’ịntanetị, izuru akara njirimara na igwu wayo. Ọzọ kwa, ọtụtụ ndi nkwuchiteọnụ na-esonye n’atụmatụ à, á maghị ma ọlịị maọbụ matụ ihe gbasara òmùmè maọbụ ngwa nchekwa ńkànùzù, ebe ndi ụfọdụ ndi ma maka ya na-eji ya nwere ike iji ya arụ ọrụ maọbụ hapụ ya n’ihi ụgwọ a na-akwụ maka ya. Nke a emeena ka ha bụrụ ndi nwere ike ịdaba na nsogbu.

Igbo Wikimedians User Group bụ ndi na-aba ịnternetị, emepe ntọala na ọgbọ nzikọrịta ozi kwa mgbe kwa mgbe. N’agbanyeghị na ihe mebere ha bụ nwoke na nwaanyị, ọtụtụ ndi nọ n’òtù a bụ ndi ntorobịa na ụmụ nwaanyị  nọ n’agbata afọ 18 ruo na 35 na kwa ndi okenye n’agbata afọ 40 ruo 70. Ha niile bụ ndi gụrụ akwụkwọ. Ọkara n’ime ha na-agụ akwụkwọ n’ogo mahadum na mahadum dị iche iche.

Ọtụtụ ndi òtù a na-eji laptọpụ maọbụ ekwentị aba ịntanetị iji tinye ntụnye ha n’ọrụ Wikimedia ndi a. Òtù nwere òtù na WhatsApp na Telegram ebe ọ na-adịrị ndi òtù a mfe ịkparịtaụka ma mekọta.

“E leghị anya, ha e nweena ahụmihe n’ihe gbasara nchekwa ńkànùzù tụmadị mgbe ha na-eji “Whatsapp” na-eme ihe. Ọtụtụ mgbe, ndi ọjọọ ezuru akara njirimara Whatsapp ndi òtù Igbo Wikimedia ma were ya zite ozi a chọghị n’ọgbọ WhatsApp ndi Igbo WIkimedians User group. N’ezie, n’otu oge n’afọ 2021, ndi ọjọọ mịbatara n’ọgbọ Whatsapp mere e ji mepee ọgbọ Telegram n’ihi na e kwenyere na n’ọgbọ Telegram nwere ike ịbụ nkeonwe, nwekwuo nchekwa ma nabatakwuo ọtụtụ ndi mmadụ.”

Ihe ọmụmụ ahụ kpughekwara na ndi nsonye chọpụtara na ọmụma e nwere n’asụsụ Igbo n’ịntanetị banyere nchekwa ńkànùzù dị ntakịrị maọbụ ọ dịghị adị. E nwebeghị onye n’ime ha natara ọmụmụ ọbụla, haziri n’usoro iwu maka nchekwa ńkànùzù. Òtù ọ dị, ha na-agbalị ịhụ na ha chekwara akara njirimara ha iji gbochie ahụmihe ha n’oge gara aga. N’otu mgbe ahụ, Tochi kọwara, “A nabatara na nchekwa ńkànùzù na-agabiga mgbanwe mgbe ọbụla; ya mere, ọ dị mkpa inwetakwu ọmụma nchekwa ńkànùzù na ikwalite ndi òtù a na nchekwa ńkànùzù.”

Ndụmọdụ

Site na nyocha a na ọmụma e nwetara n’ahụmihe òtù ndi a, Tochi na-enye ndụmọdụ ndi a:

  • A ga-enwekwu ụzọ ziri a ga-esi eso ọmụmụ gbasara nchekwa ńkànùzù. A ga-agbanarị ókè asụsụ nka nke nwere ike ịkarị nghọta ndi nsonye ma duo ha ka ha hara itinye ngwa maọbụ ńkànùzù.
  • O kwesịrị ekwesị na-aga ahaziiri Igbo Wikimedians User Group na nke Naijiria niile ihe ọmụmụ n’ụzọ dabara adaba n’okwu nchekwa ńkànùzù. Ọ dị mkpa na anyị ga-asụgharị ngwa ndi dị adị, akwụkwọ ndi ederela ede na akụrụngwa ndi ọzọ nọ n‘ịntanetị n’asụsụ Igbo na asụsụ ndi ọzọ nọ na Naịjiria iji mee ka ọ nọrọ ma dị mfe ka ndi amaghị asụsụ Bekee na asụsụ ndi ọzọ inweta. Nke a ga-enye ezigbo aka n’ihi na Naijiria nwere ọtụtụ asụsụ nke karịrị 500 bụ nke Naijiria.
  • A ga-enwekwu mgbasa ozi banyere Nigerian National Cybersecurity Policy 2004 na nsụgharị n’asụsụ obodo dị iche iche iji mee ka nweta ya dị mfe. Gọọmentị ga-atụle ihaziri ndi mmadụ ọmụmụ ihe kwa mgbe kwa mgbe maka nchekwa na ụkpụrụ òmùmè n’ekwentị e ebutara nke kwesịrị ịmetụta izo ńkànùzù mbugharị iji mee ka o kwesị ntụkwasịobi ebe ọ bụ na ọtụtụ ndi Naijiria na-eji ya arụ ọrụ.

Na mba ebe a na-asụ karịrị 500, ụfọdụ ndi dịka Igbo na-ajụ ịnwụ, ajụjụ ndi a na ndụmọdụ dị oke mkpa ma dị kpankem kpankem. Ọ bụghị naanị ilekọta nchekwa ńkànùzù na nchekwa ndi niile na-asụ asụsụ dị iche iche nke na-eji ngwa ńkànùzù arụ ọrụ, kama ịkwado ndi nkwuchiteọnụ ndi ọrụobiọma na-eme ka ọ dịịrịndi mmadụ mfe inweta ọmụma mgbe ha na-echekwa asụsụ ha. N’ikpeazụ, ọ gbasara ịrụ ọrụ iji kwanyere ndi Igbo ùgwù mgbe ọbụla a ga-echeta han n’ihi na Tochi sị, “asụsụ na-egosi ebe mmadụ si bịa ma na-àgwà   anyị ebe mmadụ na-aga; ọ bụ ihe gbasara omenala. ọ bụ òtù anyị si àgwà  ụmụ anyị onye anyị bụ.” 

Start the conversation

Authors, please log in »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.