- Global Voices n'asusu Igbo - https://ig.globalvoices.org -

A mara onye bụbu onye isi ala Surinam Dési Bouterse ikpe maka igbu ọchụ nke ugboro abụọ – mana ọ ga -aga ụlọ mkpọrọ?

Categories: Karibịanụ, Sọrịnamụ, Akụkọ Ntọala, Inwe ikikere nke ndị mmadụ, Iwu, Mgbasaozi ndị Amaala, Politiksi, Civic Media Observatory
[1]

Emume ncheta maka ndị e gburu na onwa Disemba na afọ otu pụkụ na narị itenanị na ịrị asatọ na abụọ, nke mere na Fort Zeelandia na Paramaribo, Suriname, n'okpuru ọchịchị ndị agha nke Desi Bouterse. Foto [1] nke Dan Sloan [2] sere na Flickr, CC BY-SA 2.0 [3].

N’afọ pụkụ abụọ na ịrị itenanị, a mara Dési Bouterse, onye bụbu onye isi ala Suriname ikpe afọ ịrị abụọ mgbe ụlọ ikpe ndị agha mara ya ikpe [4]nke ogbugbu nke ndị nnupụisi nke iri ise na afọ ọtụ pụkụ na narị itenanị na ịrị asatọ na abụọ, ihe gbarasara ọchịchịrị na akụkọ mba ọhụrụ na -adịbeghị anya nke a bịara mara dị ka “ogbugbu Disemba”. Na ụbọchị iri na atọ na otu nke ọnwa Ọgọọst n'agbanyeghị mkpesa nke ndị ọka iwu ya rịọrọ, ụlọ ikpe nyekwara Bouterse ikpe ọzọ maka otu aka ya na ogbugbu ndị ahụ.

Bouterse nke dị afọ iri asaa na ise anọghị n'ụlọ ikpe maka ikpe a n'ihi ọrịa. Ka ọ dị ugbu a, ndị ọka ikpe enyebeghị iwu ịtụ mkpọrọ, nke na -egosi na enwere ike ịgaghị ejide Bouterse.  [5]

Ọ bụrụ na nke a emee, ọ gaghị adabara ọtụtụ ndị mmadụ na obere mba  [6]South Amerika na ndị nnọchi anya mba, maka onye ọ bụla – n'agbanyeghị oke iwe na nsoala a gbasara nkọwa onye edemede Surinam Astrid Roemer kọwara [7] Bouterse dị ka “onye anaghị echefu echefu”. – were ya dị ka ihe ọzọ karịa igbu ọchụ nke ikpe mara ya.

Bouterse bu ụzọ bilie n'ọchịchị na ntuli aka ná otu puku na narị itenanị na ịrị asatọ na otu nke setịpụrụ ụda maka oge ọchịchị ndị agha n'oge a na -ebo ya ebubo ọtụtụ mmebi iwu ndị ruuru mmadụ. N'ịgbaso ngagharị iwe na afọ ọtụ pụkụ na narị itenanị na ịrị asatọ, ọtụtụ ọgbụgbu bịara, ndi [8] Amnesty International kwupụtara nke a [9] na òtù ndị ọzọ na -ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ, gụnyere igbu ọchụ na Disemba asaa, asatọ na itenanị na afọ m otu puku na narị itenanị na ịrị na asatọ na abụọ, bụ ebe ndị nta akụkọ mmadụ iri na ịse, ndị ọkà mmụta sayensị na ndị isi otu azụmahịa na -emegide ọchịchị agha Bouterse nke jupụtara ị megide ndị mmadụ, taa ha ahụhụ na  ịgbagbu ha.

N'agbanyeghị  na a mara ya ikpe [10] na afọ puku abụọ na ịrị na itenanị, Bouterse agonari na aka ya adịghị ya [11] involvement, n'agbanyeghị na ọ nakweere ọrụ mkpokọta dịka ọ bụ onye isi gọọmentị n'oge ahụ. Ọbụlagodi n'agbanyeghị nkwenye nke abụọ, ọ ka nwere ike ịrịọkwa arịrịọ [12]. Ndabere nke mgbachitere ya [13] bụ na ogbugbu a bụ akụkụ nke mbọ ya igbochi atụmatụ mbuso agha nke ndị chịburu ha na mba Netherlands, yana mba United States.

Ọbụlagodi na ọ na-ekwu maka nchekasị nke uche, mgbachi COVID-19, yana nsogbu ahụike ndị ọzọ agbanyeghị mkpebi ụlọ ikpe.

Amaghị ihe banyere oge a ozugbo nnwere onwe Suriname bịara na mba Netherlands na afọ otu puku na narị itenanị na ịrị asaa na ise. Eziokwu ahụ bụ na akwụkwọ nwere ihe nzuzo steeti gbasara ebubo njikọ Dutch [14] na ngagharị iwe  [14]ga -anọchi na Hague ruo na afọ pụkụ abụọ na ịrị isii, na -eme ka o sie ike ịchọpụta nkwupụta Bouterse. Kedu ụzọ ọ bụla, a marala onye bụbu onye isi ikpe ọzọ. Ọbụlagodi na ọ na-ekwu maka nchekasi uche na mgbachi ọrịa [15]COVID-19, yana nsogbu ahụike ndị ọzọ agbanyeghị mkpebi ụlọ ikpe.

Onye ọka iwu Gerard Spong, onye bụburu onye ikpe na -ekpe ikpe a, buru amuma [16]:

Het rechtsstatelijkse net sluit zich om Bouterse heen. Suriname is not niet klaar met hem.

Usoro ikpe gbara Bouterse chọpụtara ya ụkwụ na ama. Suriname emesibeghi ihe ha chọrọ ime ya.

N'agbanyeghị nke ahụ, n'etiti obodo Surinamese, iwe nke ikpe na -egbu oge amụbaala kemgbe ọtụtụ afọ. Site na ogbako vidiyo, Global Voices gbara Ramon F., nna Surinamese nke ụmụ atọ bi na Netherlands, onye chetara ihe ọ dị ka ibi n'okpuru ọchịchị Bouterse:

I was a small boy when this happened and our family had just arrived in Paramaribo that school year. I remember the chaos at school. My older cousin came to get me and we ran straight home. Nobody had an explanation why our teachers disappeared and why we saw some of them taken away. I am still a young man, in my late 40s, and I don't think this should be forgotten. I will never forget the chaos on the streets and the fear. Our parents later said the cannon shots we had heard were to celebrate my sister's birthday.

Abụ m obere nwa mgbe nke a mere na ezinụlọ anyị, ka bịarutere Paramaribo n'oge ana agu akwụkwọ. Echetara m ọgba aghara dị n'ụlọ akwụkwọ. Nwa nwanne nna m nke okenye bịara ịkpọrọ m wee gbaa ọsọ ozugbo laa. O nweghị onye kọwara ihe kpatara ndị nkuzi anyị ji fuo na ihe kpatara anyị jiri hụ ka akpọpụrụ ụfọdụ n'ime ha. Aka m ka bụ nwa okorobịa, n'agbata afọ ịrị ano na ụma, ma echeghị m na nke a kwesịrị ichefu. Agaghị m echefu ọgba aghara dị n'okporo ámá na egwu ndi ahu. Ndị mụrụ anyị mechara kwuo na mgbọ egbe anyị nụrụ bụ ka anyị ji eme ncheta ọmụmụ nwanne m nwanyị.

Ka ọ dị ugbu a, otu ọgbọ ọhụrụ nke Surinamese etolitela – ọtụtụ n'ime ha na mba ofesi – nwere njikọ na -esighi ike [17]na ogbugbu Disemba. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ọgbọ ha na-ewepụta okwu a n'okporo ámá, [18], ihe ka ọtụtụ na-enwekarị nsogbu maka nsogbu mmekọrịta ọha na eze. Ndị ọzọ, dị ka onye mmeri Dutch Literary Prize bụ [7] Astrid Roemer, na -akwado Bouterse n'ihu ọha maka ọnọdụ ịchọ mma ya.

N'agbanyeghị arụmụka ya gara aga, Bouterse ghọrọ onye isi ochichi onye kwuo uche ya na Suriname mgbe National Democratic Party meriri ntuli aka na afọ puku abụọ na iri. Ọ bụ ọnọdụ ọ nwere n'ụzọ ziri ezi ruo mgbe ọ meriri ntuli aka nke mba na afọ puku abụọ na iri abụọ na onye isi ala ugbu a Chan Santokhi [19].

Agbanyeghị, Bouterse ka ji aka [20] na “aha ya ga -adị na ndepụta ntuli aka onye isi ala ọzọ.” Ndị mba ahụ amaala Suriname, ma n'ụlọ ma na mba ofesi, nwere ike ha agaghị ekwenye.