- Global Voices n'asusu Igbo - https://ig.globalvoices.org -

Ọ gịnị mere na umụ nwanyị agaghị eso na ndị na-edeba aha alụmdi na nwunye na obodo Bangladesh?

Categories: Saụtụ Eshịa, Bangladesh, Agbamụmbọ dịgitalụ, Inwe ikikere nke ndị mmadụ, Iwu, Mgbasaozi ndị Amaala, Ọchịchị, Okpukpere Chi, Omenala na Nkà dị icheiche, Ụmụ nwaanyị na genda
Image by Dhilruba Akter Surovi from Pixabay [1]

Eserese a sị na aka Dhilruba Akter Surovi [2] nke Pixabay nke e mebere na okpuru ikerekere Pixaba.  [3]

Mkpebi ụlọ ikpe na ụbọchị nke iri nke Jenụwarị na Bangladesh kwuru na ụmụ nwanyị enweghị ike ịbụ ndị na-edebanye aha alụm di na nwunye, nke a makwaara dị ka Qazi na Iwu Alakụba, aghọọla okwu a na-ekwu maka mba a dịka ụmụnwaanyị na ndị na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ jụrụ ajụjụ ihe kpatara mkpebi a.

Otu ụlọ ikpe dị elu nke Dhaka, nke gụnyere nwoke na nwanyị ikpe, nyere mkpebi esemokwu ahụ dapụtara na Iwu Alụmdi na Nwunye nke ndebanye aha nke alụkwaghịm (1974), [4] na-agụpụta ọtụtụ ebubo nke anụ ahụ, mmekọrịta mmadụ na nke bara uru nye ụmụ nwanyị ka a họpụtara ọnọdụ ahụ

Onye wetara ikpe mbụ Ayesha Siddiqua, nwanyị si na obodo Phulbari na mpaghara Dinajpur na Nnọọtu Bangladesh. Na afọ puku abụọ na iri na abụọ, ọ tinyere akwụkwọ maka ọnọdụ onye na-edeba alụmdi na nwunye na obodo ya. Mgbe ọ gbara ajụjụ ọnụ, ezigara ndị ọrụ iwu nza hachi maka ọrụ ahụ ma emesịrị enyeghi ya ọrụ ahụ n'ihi na ọ bụ nwanyị.

Bangladesh: Enyeghi Ayesha Siddiqua ikike ka ndị na Ndeba aha ndị alụmdi na nwunye maka na ọ bụ nwanyị #Islam [5] #Muslims [6] #women [7] https://t.co/P5VBOgM1oz [8] Alakụba agba ọhụrụ pic.twitter.com/3AD11a2Prv [9]

Siddiqua fọrọ ntutu taa na ya agaghị ekwe nke a ma gbagha mkpebi ahụ. O tinyere akwụkwọ na Nnukwu Ụlọ Ikpe na onwa Juun afọ puku abụọ na iri na anọ, na-agbagha mkpebi gọọmentị banyere ọrụ ana enweghị ya n'ihi na ọ bụ nwanyị.

Ihe karịrị afọ isii ka e mesịrị, e nyere ya mkpebi ikpe ikpeazụ na ụbọchị ịrị nke  Jenụwarị afọ puku abụọ na iri abụọ na otu, [11]nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Bangladesh kwuru na ụmụ nwanyị na-enweta ahụ erughị eru n'oge ụfọdụ nke ọnwa, na nkọwa doro anya banyere nsọ nwanyị, nke onye nọ na ya anaghi abanye n’ụlọ alakụba na ụlọ ọrụ okpukpe ndị ọzọ. Ulọikpe ahụ kwukwara na “ebe ọ bụ na alụmdi na nwunye bụ ọrụ okpukpe, nye eziokwu a, ọ gaghị ekwe omume ịrụ ọrụ nke ndị na-edeba alụmdi na nwunye na ụmụ nwanyị na Bangladesh.”

Mkparita Ụka Kpụ Ọkụ N'ọnụ na Soshal Midia .

Mkpebi a ebutela ọtụtụ ngagharị iwe na soshal midia, ọkachasị ebe ọ bụ na edepụtara nsọ dị ka ihe erughị eru, n'etiti ihe ndị ọzọ. Odee na onye ukwe Mujib Mehdy dere na Fazibuuk [12]:

আমার মায়ের মাসিক হয়েছিল বলেই আমার জন্ম সম্ভব হয়েছে; অথচ এই আমিই কিনা মায়ের প্রতি অকৃতজ্ঞতাবশত তাঁর নিকাহ্ রেজিস্ট্রার বা কাজি হবার অধিকারকে খর্ব করলাম স্রেফ মাসিকের দোহাই দিয়ে!

N'ihi na nne m nwere ịhụ nsọ ya ka ọ jiri nwe ike ịmụ m. Ugbu a, ana m agọnahụ ya ikike ịbụ onye Nikah (alụmdi na nwunye Alakụba ọdịnala) na-ekwupụta nsọ nwanyị dị ka erughị eru.

Otu onye ọrụ na-ekwu okwu na ibe Facebook nke Meye [Nwanyị], netwọkụ maka ụmụ nwanyị, kwara mkpebi a ikpe:,

ঘোষণাটিতে পিরিয়ডকে শারীরিক অক্ষমতা বলা হয়েছে, দেখেই বমি পেয়েছিলো। এই যুক্তিতে তাহলে সকল নারী যারা ঘরে থাকেন বা বাইরে কাজ করেন তাদের সবাইকে পিরিয়ড চলাকালীন সময়ে তাদের কাজগুলো থেকে অব্যাহতি দেয়া হবে কারণ তারা শারীরিকভাবে অক্ষম? এই প্রথা তো আগে প্রচলিত ছিলো, এমনকি পিরিয়ডের সময় বাড়ির বাইরে স্থান হতো মেয়েদের। তাহলে কি আমরা পেছনের দিকে হাঁটছিনা?

Ọ fọrọ nke ntakịrị ka m gbụpụ mkpebi ahụ akpọrọ nsọ dị ka erughị eru nke anụ ahụ. Dịka arụmụka a si kwuo, ụmụ nwanyị na-arụ ọrụ n'ụlọ ma ọ bụ n'èzí, a ga-agụpụ ha n'ọrụ ha n'oge ịhụ nsọ, n'ihi na ha nwere orusi?  Arụmụka a jupụtara ebe niile n'oge kita, agbanyeghị, ọbụlagodi n'oge ndị ahụ, a na-ahapụ ụmụ nwanyị ka ha pụọ ​​n'èzí. Ọ bụ na anyị anaghị aga azụ?

Screenshot from the Facebook page Earki [13]

Nseta ihuenyo si na Facebook peeji nke Earki

Ikpe a kpaliri ọtụtụ akaja ịkekọrịta na mgbasa ozi. Ibe akwukwo ndi ozi Earki (egwuregwu) kesara: [13]

নারীজীবনে পিরিয়ড একটি স্বাভাবিক জৈবিক প্রক্রিয়া। পিরিয়ড হওয়া কোনো অস্বাভাবিকতা নয়, বরং না হওয়াটাই অস্বাভাবিক। এই স্বাভাবিকতাকে সাথে নিয়েই নারীরা এগিয়ে যান নিজ নিজ কর্মক্ষেত্রে, অর্জন করেন আকাশচুম্বী সাফল্য, কিংবা টিকে থাকার সংগ্রাম করে চলেন নিরন্তর।

Nsọ ma ọ bụ Ọnwa bụ ezigbo ihe umu nwanyi na ndu ya. Nke a abụghị ihe na-adịghị mma, mana ọ bụ okike. Umụ nwanyị na-aga n'ihu n'akụkụ ọrụ ha dị iche iche na-ebu ọdịiche a, ha na-aga nke ọma, ma ọ bụ na-agbasi mbọ ike n'ụzọ pụrụ iche.

(ntụgharị site na memes)

N'ime ụmụ nwanyị Bangladesh, ha nwere ike:

* jee ozi na ndị agha ma lụọ ọgụ n’oge agha
* bụrụ ndị dọkịta ma rụọ ọrụ
* merie ugwu
* sie nri ma nye ndị ọzọ nri
* na-eje ozi dị ka onye ọrụ ụbọchị
* fee ụgbọ elu
* bụrụ onye na-arụ ọrụ ma ọ bụ ndị ọzọ na-eme egwuregwu
* nwere ike ịnọ n'ọkwá ndị isi na mba ahụ – dị ka Pram Minista, onye isi nke ndị mmegide, Onye isi oche nke nzuko omeiwu, onye ozi ma ọ bụ onye ọka ikpe.

Ma ha enweghị ike ịbụ onye na-edeba aha Qazi / alụmdi na nwunye.

Iwu Alụmdi na Nwunye na Bangladesh

Iwu alụm di na nwunye na Bangladesh – nke a bụ obodo mba dịka iwu  ya sịrị dị [14]- gbadoro ụkwụ na  ngwakọta [15] nke iwu okpukpe na nke obodo. Okpukpe ndị ofufe dịka ndị Alakụba, ndị Hindu, ndị Buddha na ndị otu Kristi na-agbaso usoro dị iche iche [16] nke omume na iwu maka alụmdi na nwunye ha, mana ha ga-enwetara asambodo alụm di na nwunye n'okpuru iwu steeti iji kwado njikọ ha.

Maka ndị Alakụba, ndị Qazi na-arụ ọrụ dị ka “Nikah Registira”, ọ bụ ndị ndị gọọmentị ka ọ dịrị ihọpụta ha [16]ka debanye alụmdi na nwunye n'okpuru Iwu Alụmdi na Nwunye na Mgba Ọha (Ndebanye aha) nke 1974, na Alụmdi na Nwunye  Ala na Mgbawa (Iwu), 1975.

Mohammed Badrul Islam, onye Bangladesh onye nechere onwe ya echiche, na-ajụ mmachi gọọmentị machibidoro ụmụ nwanyị ịbụ Qazi na otu n'ime tuwiti ya:

Mmemme alụmdi na nwunye na ịdenye aha alụmdi na nwunye bụ ọrụ abụọ dị iche iche. Onyeịsị okpukpe ka ọ dịrị ịgba ndụ alụmdi na nwunye ọ bụla ma ọ bụ ndị okenye na-eji iwu okpukpe dị iche iche eme ihe, mana a na-edebanye aha ahụ dịka iwu steeti si kwuo. Di na nwunye ahụ ga-edejupụta fọm ma debanye aha ha n’akwụkwọ. Kedu ka nsọ nwanyị ga – esi gbochie nke a.

Ọ dịkwa mkpa ịmata ihe dị iche na ọrụ Qazi na Bangladesh, ebe okwu a nwere ike inwe nghọta dị iche gafee mba Alakụba. Na Islam, okwu a bụ Qazi na-apụtakarị onye ọka ikpe ma ọ bụ onye ọka ikpe na ụlọ ikpe Sharia nwere ikike ikpe dị ukwuu. Agbanyeghị, na Bangladesh, Qazi bụ naanị onye na-edeba aha, onye anaghị arụ ọrụ ikpe ndị ọzọ dịka iwu ochie nke Islam.

Iftekhar Jamil, onye Okpukpe Alakụba,  na-enwusi  [19] ike na nkwenkwe a ma ama na ụmụ nwanyị enweghị ike ịbụ Qazi na Bangladesh dị ka ụlọ akwụkwọ okpukpe Alakụba nke echiche, na Nhota Ihe  atu nke ọdịnala ndị Alakụba nke na-enye ụmụ nwanyị ohere ije ozi dị ka Qazi:

নারীরা কি কাজি হতে পারেন? হানাফি মাজহাব মতে হুদুদ-কিসাস বা ফৌজদারি অংশ ছাড়া বাকি বিভাগে হতে পারেন। ইমাম তবারির মতে সব বিভাগেই হতে পারেন।

রেজিস্ট্রির লেখক বা রাষ্ট্রীয় এজেন্ট যাই বলেন না কেন, একজন মহিলার এই দায়িত্ব পালন করতে কোন বাঁধা দেখি না। নারীরা এসব দায়িত্ব পালন করলে পর্দা রক্ষা করতে হবে, সেটা তো সবাই জানেন। পাশাপাশি পিরিয়ড থাকুক বা না থাকুক মসজিদের বাইরে থেকেই দায়িত্ব পালন করতে পারেন।

Nwanyị enwere ike ịbụ Qazi? Site na ntụzịaka sitere na ụlọ akwụkwọ Hanafi nke Islam [imirikiti ndị Bangladesh bụ Sunni na ha na-agbaso Hanafi Islamic jurisprudence], nwanyị nwere ike ịbụ Qazi belụsọ ọ bụ onye ọka ikpe na ekpe mpụ. Dị ka Imam Al-Tabari si kwuo, ụmụ nwanyị nwekwara ike ịrụ ọrụ dị ka Qazi maka usoro mpụ.

Ihe ọbụla ị kpọrọ Qazi na Bangladesh – ‘onye na-edebanye alụmdi na nwunye’ ma ọ bụ ‘onye ọrụ steeti’, ahụghị m ihe mgbochi ọ bụla nwanyị na-arụ ọrụ a. A na-enye ya na nwanyị kwesiri ịdị obi umeala ma soro Purdah ma ọ bụrụ na ha arụ ọrụ ndị a. Ọbụna n'oge nke ịhụ nsọ, ha nwere ike ịrụ ọrụ ha na mpụga ụlọ Alakụba n'ihi na nwaanyị nọ na nsọ anaghị abata n'ụlọ Alakụba.

Ka ọ dị ugbu a, Ayesha Siddiqua etinyela akwụkwọ mkpegharị maka mkpebi ụlọ ikpe ukwu ahụ wee wuo iyi [20]na ọ ga-anọgide na-alụ ọgụ megide mkpebi na-egbochi ya imezu nrọ ya.