- Global Voices n'asusu Igbo - https://ig.globalvoices.org -

A tọrọ ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi ha na Kaduna nke dị obodo Naịjirịa wee gbalaga.

Categories: Sọb -Saharan Afrịka, Naịjiria, Agbamụmbọ dịgitalụ, Agha na ọgbaaghara, Agụmaakwụkwọ, Mgbasaozi ndị Amaala, Ndị Ntorobịa na agbọghọbịa, Ọchịchị

Ụmụ akwụkwọ nọ na  Kaduna Steeti, Naịjirịa. Onye nwetara foto a bụ Jeremy Weate [1], January 15, 2010 site na  Flickr / CC BY 2.0 [2].

Ndị ntoro ji egbe wabidoro ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke dị na Kaduna, ugwu-Hausa Naịjirịa, na ụbọchị ịrị abụọ na anọ nke ọnwa Ọgụstụ, e gbukwara otu onye ma tọrọ ụmụ akwụkwọ anọ otu na onye nkụzi,  ozi a sị na aka ndị ụlọ ọrụ Naịjirịa na-agbasa ozi site n'ikuku bụ SabaraReporters [3].

Ndị ọjị egbe nke bịara na ógbè Damba-Kasaya nke dị na mpaghara Chukun dị na Kaduna Steeti, oge ọ a-akụ elekere isaa na iri anọ na ise nke ụtụtụ, ha ji ụgbọ ọgba tumtum wee gaa ógbè ebe ha gburu otu nwoke aha ya bụ [4]Benjamin Auta, nke bụ onye ọrụ ugbo, ozi a sị na aka ndị Naịjirịa na-agbasa ozi n'ikuku nke aha ya bụ Akwụkwọ Mgbasa ozi Premium Times.

Ndị ọjị egbe ahụ gakwara na ụlọ akwụkwọ Prince Academy Sekọndrị Skuulu, ebe ha tọrọ onyenkuzi aha ya bụ Christianah Madugu na ụmụ akwụkwọ anọ, aha ha gụnyere Favour Danjuma, onye dị afọ itenanị, Miracle Danjuma, onye dị afọ ịrị na atọ, Happy Odoji, onye dị afọ iri na anọ na Ezra Bako, onye dị afọ iri ise.

Nna Happy bụ Isiaka Odoji,  gwara  ndị ụlọ ọrụ Daily Trust [5], na Naịjirịa daily, na ndị ọjị egbe ahụ kwuru na aga enye ha nde naria ịrị na abụọ ( nke pụtara ego dolla puku ịrị ise) tupu ha ahapụ umuazi ahụ ka ha laba  — ego ha agaghị enwe ike ịnwetanwu.

Ụmụaka ahụ a tọrọ na afọ gara aga bụ ndị na-ele ule ikpeazụ nke junio sekọndrị sukuul ha. N'ihi mberede COVID-19, nanị ụmụ akwụkwọ nọ na ngwụcha ụlọ akwụkwọ ka  a gwara bido akwụkwọ.

Ndị fedira gọọmenti na ndị steeti gọọmenti nke Kaduna ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ntọrọ ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi ha.

‘Ihe a dịghị mma na Naịjirịa chaa chaa’

Ndị ji Tuwita, Ndị Kato kwụrụ na nke a gwụrụ mmadụ ike na ala anyị;

Ụbọchị nke tata, ndị ntọrọ ji egbe tọrọ ụmụ akwụkwọ a gwara bido akwụkwọ na Kaduna Steeti. E kwuru na e gburu otu mmadụ, nke bụ obere nwa ntakịrị nwoke ala furu ndụ ya n'ike. A tọrọ ndị ọzọ gbalaga, e nwekwara ike, anyị agaghị anụkwa ụzụ ha ọzọ.

Nke a nwekwara ike igwu mba ọbụla ike…

“Nke a bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na Naịjirịa ” ọ bụ Chima Chigọzie kwụrụ ihe a na Tuwita.

A tọrọ ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na Kaduna, ma gbukwa otu nwatakịrị nwoke na-aga akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ oge ihe a na-eme. Ndụ nwatakịrị ahụ gbabiri n'ike, ụjọ ji ụmụ akwụkwọ na-aga akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ, ihe a kwesiri imetụta ala anyị ma na ọ dịghị etu ahụ makana ọ bụ ihe na-emebu emebu na Naịjirịa.

Jaja katọrọ agwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ihe gbasara enweghị obi ị metere ndị mmadụ ebere ma ọ bụ nwee nwute gbasara ntọrọ a tọrọ ụmụ akwụkwọ:

Ụmụ akwụkwọ ndị nwoke ahụ a tọrọ na Kaduna agaghị enweta enyemaka ndị ụmụaka ụmụnwanyị Chibok nwetara n'ihi, nke mbụ, ha bụ ụmụ nwoke, nke abụọ, ọ bụghị GEJ nọ dịka Onyeịsị ala.

Goodluck Ebele Jonathan (GEJ) bụ onyeisi ala Naịjiria na onwa Eprel afọ puku abụọ na iri na anọ oge ndị agha Boko Haram tọrọ ụmụ akwụkwọ ụmụ nwanyị ndị na agụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ gọọmenti sekọndrị skuulu nke dị na ugwu hausa na obodo Chibok. Nke a mere e jiri wepụta hashtag ụwa niile akpọrọ #KpochiChiyataraAnyiUmunwanyianyi [9] nke kpalitere mụọ karịrị nde mmadụ na ụwa dum.

Na mkpụrụ ụbọchị iri na itenanị nke ọnwa Febrụwarị na afọ puku abụọ na iri na asatọ, ndị Boko Haram  tọrọkwara ụmụ akwụkwọ ụmụ nwaanyị di otu narị na iri [11] na agụ akwụkwọ na ụlo akwụkwọ Kolegi Gọọmentị ụmụaka ụmụ nwaanyị nke Sayensị na Teknụzụ na Dapchi, Yobe Steeti , Ugwu Hausa, Naịjirịa.

Ntọrọ a tọrọ ụmụ akwụkwọ na-agụ akwụkwọ  n'ụlọ akwụkwọ dị na Damba-Kasaya na ndị nkụzi ha bụ ihe butere ihe ụjọ wụrụ ewu.

Naanị ihe dị iche na ajọ ihe mberede a bụ na ndị mere ihe a ụgbụ a abụghị ndị Boko Haram, ha bụ ndị ajọ otu ọjị egbe.

Ị Chọpụta Ndị Omekome nọ na Kaduna

Ajọ akparamagwa ndị omekome ka njọ na steeti ndị hausa di na Naịjirịa, steeti ndị a gụnyere Zamfara, Kaduna, Niger, Sokoto, Kebbi na Katsina.

ACAPS, ndị na echepụta echiche na otu nọrọ onwe na ahụ maka mmadụ na ibe ya kwụrụ na “ [13] iji ngwa ọgụ imerụ ndị ndị mmadụ ahụ bụ aka ọrụ ndị Boko Haram na ugwu hausa”

The banditry violence began as a farmer/herder farmer/herder conflict in 2011 and intensified between 2017 to 2018 to include cattle rustling, kidnapping for ransom, sexual violence and killings. By March 2020, more than 210,000 people have been internally displaced.

Ndị ajọ otu na emerụ ndị mmadụ ahụ bidoro dịka otu ndị na-achị efi na ọgba aghara e nwere na afọ puku abụọ na iri na otu wee rụọ afọ puku abụọ na iri na asatọ nke gụnyere ịzụ ohi efi, ị tọrọ ya, igwaso ya ịkọ n'ike ya na igbu ya. Site na Maachị afọ puku abụọ na iri na abụọ, ọ rụọla narị puku ịrị abụọ na puku ịrị e gbugoro.

Ndụ ndị ime ime obodo nọzi na aka ndị omekome, ndị gbugoro ọ pekata mpe ihe karịrị mmadụ otu puku na otu narị na iri abụọ na isii site na Jenụwarị ruo na ọnwa Juun afọ a na ugwu Hausa, Naịjirịa.

Ndị otu Amnesty mba ụwa niile kwuru na ọ bụ ọgbe dị na sautan Kaduna ka ọ metutakarisiri, ihe dịka mkpụrụ obi mmadụ narị atọ na ịrị isii ka ala furu na ọkara afọ puku abụọ na iri na abụọ.

Ndị mmadụ nọ na otu dikotara ọnụ na Sautan Kaduna na mpaghara Chikun  bụ ebe obibi ụmụ akwụkwọ ahụ a tọrọ, ha ahutula ihe dị etu mbụ nke butere ọnwụ, ọtitọ, ” nke a tinyere ógbè ịrị anọ na ise na ọgbahara. Ihe a bidoro nkemgbe afọ puku abụọ na iri na itenanị “

Ndị Sautan Kaduna na atụ aka ma kwụe na ndị omekome a bụ ndị na achị efi, ha kwukwara na ọ bụ ala n'ese, aka ndị fedira gọọmenti na nke ndị steeti ahụ dịkwa na ya.

Mana Gọvanọ ndị Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai goro agịgọ ma kwuo na ọ nweghị ihe agbasatara ndị e gburu  na izo ala ma ọ bụ ndọrọ-ndọrọ ọchịchị nke sitere na okpukpe.

Ka ọnwa Ọgụstụ dị na mkpụrụ ụbọchị ịrị abụọ na abụọ, Kaduna Steeti gọọmenti kwusịrị ihe akpọrọ curfew na ọlụ bekee bụ nke e mere site elekere isii nke abalị rụọ na elekere isii nke ụtụtụ, nke a bụ nke metụtara ụfọdụ akụkụ steeti ahụ ka e nwere kwusinata mpụ na ndị omekome.

Agbanyeghị, Luka Binniyat, onye  nkwụchite okwu ndị otu dịkọtara ọnụ na Sautan Kaduna nke akpọrọ SOKAPU na aha ịchafo  gosipụtara nwute ya “agụụ so ná egbu anyi n'ihi na anyị  anaghịkwa agazi ọrụ ụgbọ. Ndị  be anyị tọrọ atọ.