
Onyeịsị ala mba US bụ Donald J. Trump na Onyeịsị ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari. Onye osee fọtọ White House bụ Andrea Hanks sere ya na ụbọchị iri atọ nke ọnwa Eprel na afọ puku abụọ na iri abụọ(public domain).
Mmachi amachiri ndị ndọrọ-ndọrọ ọchịchị nke Naịjiria nke na ahụ maka ọchịchị onye kwuo uche ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị gburugburu e mere na afọ gara aga n'inweta akwụkwọ visa nke ndị mba United Steeti nke ngalaba Steeti ahụ ka ọnwa Septemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri na anọ.
Kaosinadi aha ha ka dị na aka ndị mba US yana na aka ndị ọchịchị Naịjirịa mana ewepụtabeghi aha ha.
Ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Naịjirịa e mere na afọ gara aga na ụbọchị nke ịrị abụọ na itenanị nke ọnwa Febrụwarị, bụ nke e jiri dọọ onyeisi ala bụ Muhammadu Buhari nke otu All Progressives Congress n'iyi ọrụ, ọ jiri nde iri na ise vootu merie. Buhari meriri onye nsonazu yana ya zoro vootu, onye ahụ bụ onye na achụ nta ego ma bụrụkwa osote onyeisi ala chibụrụ Naịjirịa mbụ nke aha ya bụ Atiku Abubakar nke otu Pati ọchịchị onye kwuo uche ya, onye nwetara nde iri na otu vootu.
Read more: #NigeriaDecides2019: Ihe niile ị chọrọ ị mara maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị gburugburu nke Naịjiria
Site n'ihe ngalaba nke Steeti kwụrụ, ha kwuru na ndị ọrụ US katọrọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke afọ puku abụọ na iri na itenanị nke gụnyere mmerụ ahụ, mmaja na wụrụ wụrụ bụ nke mebiri Naịjirịa, nke a gwara ha ka ha gbabido na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ “ka ha kwado ọchịchị onye kwuo uche ya ma wepụ mpụ na aghụghọ na ya bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma meekwa ya n'ụzọ kwụ ọtọ nke agaghị enwe ihe mmerụ ahụ ọbụla”
Agbanyeghị na ihe e kwuru enweghị nkọwa ọbụla etu a ga-esi mara onye aga etinye na akwụkwọ ndị dara ịwụ, mana mkpebi e mere na oge gara gosiri nke a.
Na ụbọchị nke ịrị abụọ na anọ nke ọnwa Jenụwarị na afọ puku abụọ na iri na itenanị, ndị ụlọ ọrụ United States Embassy nke dị na Naịjirịa, kwụrụ na ha ga ele banye anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ekwekoritara na aga-eme mgbe ahụ na onwa Febrụwarị maka ibelata ajọ ihe ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa na-eme nke gụnyere “imerụ ndị mmadụ tupu eme ya, oge a na-eme ya ma ọ bụ emecha ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ”
Ndị otu ụlọ ọrụ US dị na Naịjirịa kwukwara na mmachi akwụkwọ visa ndị kpara ajọ agwa a ga emetụta ha na ndị ezinụlọ ha niile. Ndị otu ụlọ ọrụ nke Ngalaba US Steeti nyere iwu a na ụbọchị ịrị abụọ na atọ nke afọ puku abụọ na iri na itenanị.
Aha na ihere!
Henry Okelue chere na ndebenye edebere aha a enweghị ụrụ ọ bara.
It really does not serve any useful purpose if the identities of those allegedly “slammed” with a visa ban by the US is classified. For all we know it might be nobody.
— HENRY Okelue ?? (@4eyedmonk) September 15, 2020
Ọ nweghịkwa ụrụ ọbara ma ọ bụrụ na ezobere anyị aha ndị ahụ ndị mba US mmachibidoro ikike akwụkwọ visa. Anyị amaghịkwa otu onye n'ime ha.
Cheta kwuru na Tuwita na ọ nwekwara ihe ndị ọzọ sọ mmachi visa:
Good move on the surface, but doesn't really serve its intended purpose as a deterrent without further sanctions.
The US Dollar is still the world's reserve currency. Prevent them from accessing USD, and watch their behaviour REALLY begins to change. https://t.co/7shT2P9MpF
— Chxta (@Chxta) September 15, 2020
Mmachi ahụ amaka ma na ọ nweghị mkpụrụ ọ ga-amụta ma ọ bụ na emeghị iwu e tiri.
Ego Dollar US bụ ego mba ụwa niile ji eme ihe. Kwụsị ha ịji ego USD eme ihe ọ bụla ma lele ma akparamagwa ha aga agbanwe. https://t.co/7shT2P9MpF
Temisan Okomi na Ugo kwuru na Tuwita na ụzọ ndị US si eme nchọpụta banyere ya bụ mmachi visa:
This US visa restriction on election riggers; is it those Nigerian courts convict or those the US used drones to monitor?
I'm a bit confused…
— Temisan Okomi (@temiokomi) September 15, 2020
Mmachi ndị mba US machiri ndị mere wụrụ wụrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ebe iweta akwụkwọ ikike visa ; ọ bụ nke ndị ụlọ ikpe Naịjirịa kpebiri ka ọ bụ nke the mba US ji onyonyo na-efe n'elu nwee nyochaa?
Nke a gbara m nghari.
@feathersproject how's the US going to determine the election riggers? I've been wondering since you put am that link. Is it the people the government say are riggers or those they determine are election riggers?
— Ugo (@Hugo_simbaa) September 15, 2020
@feathersproject kedụ ka ndị mba US ga-esi a mara ndị mere wụrụ wụrụ nke a? E chebere maka nke a kemgbe etinyere link ahu. Ọ bụ ndị mmadụ ka ndị gọọmenti sị na ha mee wụrụ wụrụ ka ọ bụ site na aka ndị nọ na ọchịchị ka esi mee wụrụ wụrụ nke a?
Ụlọ Ọrụ SaharaReporters, ndị ji ikuku agbasa ozi, kwuru ma kwụsie ike na mmadụ anọ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa so na ndị amaechibidoro ikike akwụkwọ visa.
Kaosinadi, ndị otu ụlọ ọrụ Global Voices ekweghị ihe ọbụla banyere mkparịta ụka ha na ndị ụlọ ọrụ US Embassy dị na Naịjirịa were na Consulate nke Tuwita.
Ndọrọ ndọrọ ọchịchị e mere na ụzọ na akwughi ọtọ, nke e gburu oge na ya, mmaja na ihe mmerụ ahụ jupụtara.

Igbe Kampen ọnyeịsị ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mere na akụkụ ụzọ na ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febrụwarị na afọ puku abụọ na iri na ịse: Onye sere foto a bụ Clara Sanchiz/RNW na Flickr (CC BY-SA 2.0)
Ụzọ ọzọ aga eji nweta akwụkwọ ebe e dere aha ndị dara iwu a bụ nke a, e nwekwara ike ịhụ ya na nkọwa ndị iri asaa na abụọ nke ndị gọọmenti obere ya na na aka ndị mba ụwa lebara anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke iri na isii nke ndị Naịjirịa kpọrọ site na aka ndị na ahụ maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa nke aha ya bụ Independent National Electoral Kọmishon (INEC).
E gburu ihe dịka mmadụ ịrị anọ na asaa na ụbọchị ịrị abụọ na atọ nke ọnwa Febrụwarị, nke bụ ụbọchị e mere ndọrọ ndọrọ ọchịchị Onyeịsị ala, site n'ihe Ụlọ Ọnọdụ kwụrụ, nke bụ otu jikọtara ndị otu ụlọ ọru na ahụ maka ndị mmadụ ma n'elebakwa anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.
Ihe butere ụfọdụ ọnwụ bụ nsogbu dapụtara n'etiti ndị otu Pati ma ọ bụ ebubo wụrụ wụrụ nke vootu.
Ndị otu ụlọ ọrụ ndi European Union (EU) bụ ndị na-eleba anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ala Naịjirịa site na ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị rụọ na ụbọchị nke asaa nke ọnwa Eprel na afọ puku abụọ na ịrị na itenanị, bụ otu ndị so wee lebanye anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke afọ puku abụọ na ịrị na itenanị
Ndị otu ụlọ ọrụ EU electoral observer mission kwupụtara na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị Naịjirịa mere jupụtara n'ihe mmerụ ahụ ya na mmaja ndị bịara ịtụ vootu na usa nchọpụta ha na Julaị afọ puku abụọ na iri na itenanị “Ndị ọrụ nchekwa ndụ na akụnụba nke Naịjiria bụ nke ha na ebo ebubo na ha na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị gwụkoro na otu akpa nke a mere ha ji soro ná emerụ ndị mmadụ ahụ.
Ndị nlebanye anya EU bịara oge ana-ekpokota akwụkwọ akara e jiri zoo vootu wetara akụkọ mmaja nke e kwụrụ na ọ sịna aka ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ INEC nke metụtara steeti iri abụọ. ” ndị nlebanye anya EU nke e tinyere na Abuja, nke bụ ịsị ala, ya na steeti ịrị atọ na isii nke Naịjiria.
Usa ndị EU nyere nchọpụta nke ha ndị otu ụlọ ọrụ Nigeria International Election Observation Mission gụnyere National Democratic Institute (NDI) ya na International Republican Institute (IRI), ma ndị nọ na mba US, otu na abụghị otú Pati, na ndị ọrụ akwụ sonyere.
Ndị nyochaa ụlọ ọrụ NDI/IRI kwụrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke afọ puku abụọ na iri na itenanị bụ nke wụrụ wụrụ jupụtara “ ndị otu Pati esighi ụzọ kwụ ọtọ wee mee họpụta ndị nnọchitere anya ha”. Nke a butere nkewa na otu Pati ndị a ma butekwa esemokwu mmerụ ahụ n'etiti Pati na Pati, esemokwu a malitere sị na aka ndị tụrụ vootu.
Ndị otu NDI/IRI kwukwara na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke akpụrụ ihu bụ nke ana amaghị ọkwa ya n'oge maka izo ọkwa Onyeịsị ala na ọkwá ndị omebe iwu bụ nke e kwuru na ọ ga adịzi na ụbọchị iri atọ nke onwa Febrụwarị, e kwuru nke a mgbe ọ fọdụrụ obere awa aga eji bido atụ m vootu na ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị, nke a mere ka mmụọ ndị mmadụ jụọ oyi.
Ihe na ekpọnyere ha aja n'ụkwụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke jupụtara na imerụ ndị mmadụ ahụ bụ na ha ma na ọ nwere iwu ji ha na ha agaghị ata ahụhụ ihe ha metara.
Great to hear that the U.S. has imposed visa ban on Nigerian politicians responsible for undermining our democracy.
It’s pivotal that Europe follows suit.
A ban by Europe will hurt even more as their kids study in Europe and it’s their prime destination for holiday & medicals.
— Bulama Bukarti (@bulamabukarti) September 15, 2020
Obi dị m ụtọ na ndị mba U.S. amachiela ndị na emebi ọchịchị onye kwuo uche ya na ala Naịjirịa
Ọ ga ákákwa mma ma ndị mba Europe sorokwa ha
Ọ ga aka wute ha n'ihi na ụmụaka ha na-agụ akwụkwọ na mba Europe ma bụrụkwazie ebe ezumike ha ya na ebe ha na-aga ụlọ ọgụ.
Ọ nweghị ihe ka wute ndị na-achi Naịjirịa karịa mmachi njem ha na ndị ezinụlọ ha. Ndị mba US nwekwara ike iji nke a mee ka ndị mmadụ na-akwụba aka ọtọ ma mee ka ndị ọchịchị mezue ya.
Mana ha emebeghi nke a.
Ọ ga aka mma ma ọ bụrụ na e wepụta aha ndị ọmmekọome a merụrụ ndị mmadụ ahụ, maja a ndị bịara ịtụ vootu, ma mee wụrụ wụrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị wee menye ha ihere n'ihu, nke a ga-adịrị gaba n'ihu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ana akwadobe na Edo ya na Ondo steeti.