- Global Voices n'asusu Igbo - https://ig.globalvoices.org -

Otu Ihe karịrị puku mmadụ na Salvador si diee ọnụdụ enweghị mmiri ọṅụnụ na ịkwọ aka oge Kovid-19.

Categories: El Salvodoa, Inwe ikikere nke ndị mmadụ, Mbata na ọpụpụ, Mgbasaozi ndị Amaala, COVID-19

Screenshot from video of news channel EFE on Twitter [1], August 19, 2020.

Otu n'ime ihe kachasị mkpa maka mgbochi ọria KOVIDI-19 bụ regularly washing your hands; [2] mana,imilikiti ndị  Salvadorans na-agba KOVIDI-19 mgba  without reliable access to water [3]. Dika ndị United Nations [4], si kwu, ihe karịrị puku nari  isii mmadu enweghi ike inweta mmiri ọṅụṅụ maọbụ mmiri iji dobe onwe ha na gburugburu ha ọcha n'afọ 2016, ebe ihe karịrị otu nde mmadụ nwere ike ihụ mmiri na adịchaghị ọcha iji mee ihe ndị ọzọ. Site na ozi nta akụkọ reports [5], ọndụ a akala njọ ugbu a e nwere ọrịa zuru ọha.

Otu n'ime ndi nne atọ bụ Rosa Amelia Mendoza, agbara afọ iri anọ na ise bi na Colonia Altavista, n'otu akụkụ obodo San Salvador di ihe dịka kilometa iri na ise enwebeghị mmiri na-agba agba n'ụlọ ya kemgbe ọria nje korona bidoro n'ọnwa Machị n'afọ 2020. Dika o si gwa ndị otu Global Voices na nkata ha kpara n'ekwentị, o siri na mmiri agbabeghị n'ụlọ ya n'ihe karịrị afọ abụọ ugbu a. Dika ọ siri kwu:

“Yo tengo miedo por mi familia, todos nos recomiendan que nos lavemos las manos con regularidad, sólo para asegurarnos de que el virus no nos llegue. Pero, ¿cómo puedo hacer eso si no hay agua para hacerlo? No hay ningún río o pozo cercano al que podamos ir a traer agua, y no tenemos los recursos para pagar un camión cisterna con regularidad. En este momento no estoy trabajando.”

“Egwu ji m ebe ezinaụlọ m nọ, onye ọbụla ma na-ịkwụ aka ugboro ugboro bụ ụzo iji gbochie ibute ọrịa nje a, mana kedụ ka aga esi mee nke a ma ọ bụrụ na ị nweghị mmiri ị ga-eji kwụọ aka? Enweghị mmiri na-ekwo ekwo anyị nwere ike ije kute mmiri, anyị enweghị ego iji kwụọ ndi moto na-ebu mmiri ugboro ugboro. Ugbu a anaghị m arụ ọrụ.”

Akụkọ Mendoza yiri akụkọ puku mmadụ ndị ọzọ nọ n'ọnụ obodo ndị ọzọ nọ n'isi obodo  San Salvador nakwa gburu gburu ya. Obodo dịka Ilopango, Mejicanos, Soyapango [6], Ciudad Delgado, Altavista [7], nakwa akụkụ obodo San Salvador — ebe ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ bi bụ ọkacha metụta. Dika ndi nta akụkọ  EFE [1] News Agency si kwu, Otu n'ime ọnụ obodo ndị a,  Soyapango, kacha nwe ndi bu ọrịa COVID-19 bu nwere ike ife obodo niile.

Enweghị mmiri ọgbugba n'ulọ abụghị ihe ọhụụ mana ọria mere ya ihe dị mkpa ebe ọ bụ na mmiri dị mkpa maka adịmọcha iji gbochie nje a. Onye nta akụkọ Santiago Leiva [8] gwara ndị Global Voices site n'ozi ya wee si:

“El agua es un tema tan oxidado como las cañerías que la sirven ocasionalmente, y es tan profundo, que a pesar de las protestas de calle que se hicieron en el pasado nunca hubo eco en los gobiernos pasados, y sigue siendo un líquido que aún no termina de privilegiar a toda la población.”

“Ihe gbasara mmiri siri ike dika okporo paịpụ mmiri eji eweta mmiri. Nsogbu mmiri ebutela ngaghrị iwe n'oge garar aga mana nke a emụtụtaghị ndị ọchịchị chiburu achi n'obi. Mmiri agazubeghị obodo niile.”

Gịnị kpatara nsogbu enweghị mmiri na Salvadoran ?

Ị nweta mmiri abụghị ikike ruru mmadụ na El Salvador,  obodo a nwekwara risk of drought [9]. N'aka nke ọzọ  lack of water regulation [10]    na mgbanwe urukpuru igwe bụ ihe abụọ kpatara ụkọ mmiri na El Salvador, N'obodo mepere emepe ihe kacha enye ha nsogbu bu enweghị ihe nrite maobu enyemaka site n'aka gọmenti. Ọnụ obodo ndị ahụ akpọrọ aha na mbụ ọnụdụ enweghị mmiri metụtara  si na  Las Pavas processing plant [11], enweta mmiri . Ebe mmiri si apụta bụ ụlọ nchekwa mmịri nke na adịghịzị mma bụ nke ekwesịrị ịgbanwuo maọbụ dozie kemgbe ọtụtụ afọ gara aga site n'ego ndị omebe iwu wepụtara n'afọ 2012 [12], 2016 [13], na 2018 [14]. Erụzubeghị ọru a ruo ugbu a.

Las Pavas bụ the only plant  [15] na-enye ọtụtụ obodo mepere emepe mmiri na Salvador. Ma taa, ụlọ mmiri a anaghị ewepụta mmiri dị ọcha ga-ezuru ihe karịrị one million people [16] tụkwasịrị ya uche. Ọ bụrụ na ọ mebiri mgbe ọrị nje korona na-egbu ọtụtụ mmadụ dika o si mebie n'ọnwa January 2020,  [17] ọka ajọgbu ụdele ma sigbuo nkakwụ.

Ebubo na ikpe mpụ na aghụghọ di'etiti ndị na-ahụ maka ịnye ndị obodo mmiri (Administración Nacional de Acueductos y Alcantarillados, or ANDA [18]) dịwara kemgbe  mid-1990s [19]. Carlos Perla, onyeisi ndị ANDA site n'afọ 1994 ruo 2002, enwetala ntaram ahụhụ ka ọ nọchara 15-year jail sentence [20] maka mpụ na aghụghọ. Ugbu a, Frederick Benites,onyeisi otu ANDA n'okpuru ọchịchị Nayib Bukele , informed [21] nnukwu ọkaikpe nke El Salvador maka mpu an aghụghọ nakwa oke imefu ego karịrị nnụkwuru nnụ dọla n'ọtụtụ afọ gara aga.

Ndị na-ahụ maka inye mmiri emeghị maọbụ hazie ya dika atụrụ anya nke ebutela ihe karịrị nde dọla iri atọ na atọ kemgbe afọ iri na ise gara aga.

Ọchichị           Nayib Bukele [25] has claimed [26] na plantị nke  Las Pavas . Plantị na ewepụta mmiri a enwetabeghị ezigbo nkwado na ndozi kemgbe  Francisco Flores chịwara dika onyeisi ala bido n'afọ 1999 rue n'afọ 2004. Onyeisi ala Bukele shared photos [27] ma kọwaa nleghara anya, mpụ na aghụghọ gbagoro afọ iri atọ dewere ụlọ mmiri  Las Pavas n’.onọdụ ọnọ na ya ugbu a.

Site n'eserese foto dika m gwara ha , “Kedụ ka ụdị ihe ga-esi dị? Ị nwere ike itule ụdị enweghị ahụike ha nyere ndị obodo? nwụ umeju mmadụ na ọrịa afọ ọtụtụ ndị mmadụ na-arịa.

Ndapụta n'ike Mmiri dị na kalama dika enyemaka ndi obodo.

Na nkenke, steti site na otu ANDA is distributing bottled water [30] nye ndị ọnụ obodo enweghị mmiri metụtara, ha jikwa ụgbọala na-ebụ mmiri enye ndị obodo mmiri. Gọmenti na-achị achị akpala nkata maka digging new wells [31] iji nye mmiri karia ịchekwube Las Pavas Water plant. Dika website si kwu, ANDA na-agbalịkwa na upgrading [32] Las Pavas site n'ịnweta ngwaọrụ ọhụụ. Nke a bụ otu n'ụzọ ọhụụ National Water Plan [33]“. N'ọnwa Ọgọst na mkpụrụ ụbọchi iri na asatọ, ANDA ziri ozi:

mgbe ụfọdụ ogboro mmiri na ngalaba na-emepụta mmiri di na kalama ga na-enye  Sierra Morena mmiri ọṅụnụ.
Taa anyị nyere mmiri kalama puku iri abụọ na ise.
Anyị ga na-akwado inye mmiri mgbe ụfọdụ.

N'agbanyeghị  nke a ndị obodo Colonia Altavista complained [36] maka nleghara anya. Mendoza, ndị nwetara mmiri di na kalama ka bụ otu n'ime ndi na enwe mmekpa ahụ. Dika o kwuru:

La pipa de agua llega quizás una vez al mes, lo que no es suficiente para sobrevivir todo el mes. Estoy tan frustrada y enojada que estoy considerando dejar El Salvador una vez que termine la pandemia. La única razón por la que no me he ido a los Estados Unidos es que tengo niños pequeños.

Ụgbọala mmiri na-abịa otu ugboro n'ọnwa mana nke a anaghị ezu n'ọnwa. Ọ bụ ihe mgbakasị ahụ na ihe mwute na m na-atule uche ịhapụ  El Salvador ma ọrịa ogbu n'ọha gafee. Naanị ihe kpatara m agabeghị mba Amerika bụ maka aka m ji obere ụmụaka.

N'ọnwa Jenuwarị, President Bukele suggested [37] ịmepegharị 14-year-old debate [38] maka ime ka mmiri ruo onye ọbụla  ma nyefee nlekọta ya n'aka ndị nkịtị nke ga-egbochi ndị iji ego iwere ya . N'ọnwa Septemba n'ụbọchị asaa na asatọ, commission [39] nke ndị nupụisi n'otu ndị omebe iwu bido iguzobe iwu- enwereike n'ọdị n'ihu puku mmadụ ndị Salvadorans ga-enwe mmiri ọṅụnụ na nke ịkwọ aka.