Naijeria emela mpụ idina mmadu n'ike nsogbu a ga elebara anya ngwa-ngwa.

Triple G: Otu nke a n'akpọ “Girls Go for Greatness” ndi otu ha bi na steetị Legọs na Ogun na nzukọ omụmụ ihe nke akpọrọ “Guard Against Rape” na Legọs na ọnwa abụọ na ụbọchi iri na atọ, na afọ 2016, site CEE Hope na Flickr CC BY 4.0.

Na ọnwa isịị, Naijerịa mere ihe gbasara idina mmadu n'ike okwu di mkpa gọmentị steetị nile ga eleba anya ngwa-ngwa.

Na mbido ọnwa nke isịị, ndi isi ụmụ nwanyị, ndi mpụ idina mmadu n'ike n'ewute mere ngaghari n'iwe ma deegara ndi Nnọchiteanya n'ụlọ nzukọ etiti akwụkwọ na oge erule mgba aga etinye ụchụ ihu na emejupụtara atumatu Iwu 2015 nke a n'akpọ Violence Against Prohibition Person’s Act (VAPP).

Ọ bụ mpụ idina mmadu n'ike di iche iche nke mere na ọnwa ise na isịị kpaliri mmụọ ndi a:  Edinara Barakat Bello  n'ike ma gbụo kwa ya na ụlọ ya; Egbukwara Vera Uwa Omozuwa na ụlọ ụka nọ na Benin, Naijeria; yana nwata nwanyi ọzọ gbara afọ iri an abụọ, onye nke ndi dimkpa iri na otu dinara n'ike na steetị Jigawa, na ndida Nigeria.

Na agbanyeghi ọnọdu di mkpa emere ihe gbasara mpụ idina mmadu n'ike, ihe ọjụọ a na ọmekome ka na ari ibe ya elu, ya mere na ndi ometutara enweghi ikikere ikpọpụ ndi ọjụọ a ikpe. Dika  ndi otu nke a n'akpọ United Nations siri kwuo “otu n'ime ụmụ nwanyi anọ ka ana edina n'ike tupu ha agba afọ iri na asatọ”. Na agbanyeghi, ikpe nile ekpere na ala Naijeria gbasara mpụ idina mmadu n'ike erughi ọnụ ọgugu iri asatọ.

Ndi otu VAPP na agba mbọ ihu na elebara anya na ihe gbasara ahu na akparamaagwa ndi edinara n'ike; ndi ikpe mara n'eme mpụ a ga anara ihe dika afọ iri na anọ na mkpọrọ ma ọbụ mkpọrọ afọ nile na ndu.

Rute ugbua, ọ bụ nani steetị iri na asaa n'ime steeti iri atọ na isịị n'anakwerela imezu iwu VAPP.

Onye na-eso onye isi ala Naijeria bụ Yemi Osinbajo dere na nka mgbasa ozi nke a n'akpọ tuwita:

Udika mpụ idina mmadu n'ike yana imechụ ahu mmadu enweghi ọnọdu n'ala anyi. Akpọrọ omume di otua asi n'ala Naijeria.

Otu okwu ikpe idina mmadu n'ike di elu

Okwu ikpe idina mmadu n'ike mere ọhuru nke mmekụtara onye ọkụ-egwu amara na Naijeria nke aha ejirimara ya bụ D'banj, bụ ihe n'echeta na ọbuladi na emela mpụ gbasara idina mmadu n'ike ihe a ga elebara anya, mpụ a ka were ọnọdụ n'ala anyi.

Na ụbọchi atọ na ọnwa nke isịị, otu nwa nwanyi a n'akpọ Seyitan Babatayo boro onye ọkụ-egwu, nke aha nne na nna gụru ya bụ Oladapo Daniel Oyebanjo ebubo na nka mgbasa ozi na tuwita (nke a n'ewepula na Tuwita). Ọ si na D'banj batara na ụlo oriri ya ma dina ya n'ike.

Seyitan si na okpebiri ikwupụta ihe mere ya maka na ọchọrọ igba D'banj na anwu maka agwa Ihụ abụọ ya isonye na kampeenụ kpọrọ idina mmadu n'ike asi nke a n'akpọ #NoMeansNo

D'banj gọrọ ebubo a ma dee na tuwita:

Aka ya dị ọcha ruo mgbe egosiri na ikpe mara ya…, kwụsi ikpe midia, si mba maka idina mmadu n'ike na imebi ikike mmadu.

Na ụbọchi nke iri abụọ na atọ nke ọnwa isịị, Seyitan mere nkwupụta site na enyemaka onye nnọchite anya iwu ndi akpọrọ “Stand To End Rape” (STER), ikwupụta ihe anya ya hụrụ maka ikpuhe ihe mere ya:

NKWUPỤTA NTA AKỤKỌ: Ụsoro mkpesa ihe-omumu mpụ idina mmadu n'ike nke Ms Seyitan Babatayo mere mgide Mr Oladapo Daniel Oyebanji ka-mgba ọ kọrọ ọha ihe mere ya.

Dị ka nkwupụta ya si kwuo, Seyitan kọrọ ndi uwe-oji ihe mere ya na ụbọchi isịị na ọnwa isịị, mana ọnweghi ihe ha mere gbasara ihe ọ gwara ha. Agbanyeghi, Seyitan si na ndi uwe-oji anọ biara n'ụlọ ya, nwuchie ya n'ezighi akwụkwọ ikikere na ụbọchi nke iri na isịị na ọnwa ahu. Ha jigidere ya abali abụọ.

Mgbe ndi uwe-oji nwuchiri ya, a gala mmepe akaụntụ tuwita Seyitan ma wepusie ebubo ya, ma dee ihe abụọ, nke mbu bụ na ihe okwuru gbasara idina ya n'ike bụ asi, nke abụọ ha dere bụ nkwalite egwu ọhuru D'banj. Ihe amaghi bụ onye banyere n'ime akaụntụ ya.

Mgbe omechara ihe nkwupụta, ndi ọka iwu na ndi akpọrọ netizens, ezoghi ọnụ ikwupụta agwa ọjụọ ndi uwe-oji. Oteghi aka ha kwuchara okwu gbasara agwa ọjụọ a, ndi uwe-oji gaziri kpọ D'banj ikpe ma mmepe akwụkwọ nchọpụta maka ihe mere nụ.

Ihe nkea di ọjụọ. Ndi Uwe-oji Naijeria ga ekperiri @iamdbanj ikpe maka itụrụ ma ikpọchi mmadu (s269/270) ajọ omume nke ikpe nkwụmọtọ (s97), yana ebubo na abụghi eziokwu (s93) n'ime mpụ iwu nke steeti Lagos.                                                                                                                              Na a ga enyekwa ndi Uwe-oji mere ihe a ntaramahuhu.

Ime mpụ ihe aga elebara anya ngwa-ngwa pụtara na ndi uwe-oji kwesiri iji nchisa gbasara idina mmadu n'ike kpọrọ ihe, mana ụmụ nwanyi akọla akụkọ otu ndi uwe-oji; ma nke ụmụ nwoke ma di nwanyi si akwa ha na ndi nnọchite anya iwu dutara ha emu.

Ikwupụta okwu, n'ebute mkpuchi ma ọ bụ mkpọchi

Na Naijeria, ụmụ nwanyi n'eme ngaghari iwe ebe di iche-iche na amuba, ma n'eti mkpu na soshal media ka ejide ma kpe ndi n'eme mpu ndia ikpe. Ma emume ngaghari iwe n'eso etinye ndi nkwado n'ekweghi ka ekpuchie eziokwu na nsogbu.

Na afọ 2019, Fakhrriyyah Hashim weputara hashtagị #ArewaMeToo, ime ka ihe gbasara mmegbu nwanyi na idina mmadu n'ike na ndida Naijeria puta ihe. Arewa bụ ihe a n'akpọ ‘Ndida’ na okwu ndi Awusa. ka ụmụ nwanyi n'agabiga ihe ndi di iche-iche n'ala Naijeria, aghọm nọ na i bụ nwanyi ka njọ na Ndida, ebe eji mkperechi na ihe ọtutu kwenyere emegbu ụmụ nwanyi.

Na ederede tuwita ya, Hashim kwuputere na Abubakar Sadiq Aruwa, onye ndumọdu puru iche ochie nke gọvanọ Kaduna steetị, edinala ma mmetọ ọtutu ụmụ nwanyi. Agbanyeghi ihe nile edere gbasara #ArewaMeToo na tuwita, Aruwa bụ otu nwoke n'ime ndi akacha asopuru were ugwu na Ndida:

Kwa afọ, @MusadiqZ n'achọputa ụmụ nwanyi na enweghi ike ma metọọ ha maka na ọ ma na ha ja bu ụmụ aka n'enweghi ọnụ ọga aghọgbuli ime ihe ọbula ọchọrọ.

Maryam Awaisu; enyi Hashim tinyere ọnu ma mgbasa kwa akụkọ ụmụ nwanyị edinara n'ike na obodo ndi di na Ndida Naijeria, ọtutu ndia bu obere ụmụaka nọ sekọndịrị sukul.

Awaisu, onye aha ya na tuwita bụ “Ice131Queen” dere:

Anyi ga achọrọ ụnụ na ihe nile ụnụ were bia. Aha unu enweghi, ọrụ ụnu. Ekwensu ọdu ogologo biara na udi mmadu, yiri nu akpa-ụkwụ ụnu, maka na #ArewaMeToo ka n'akwado imemina ụnu.

Mgbe emechara nnyocha nke ọma, ebubo megide  @MusadiqZ nọ eba (nke @FakhuusHashim @fatousky @crankysolicitor @KingNelo2 @AmiraYSalisu @AhmadJaafaru @FatimaSalihijo @_AfricanHippie @Ice131Queen na ndi ọzọ mere) etinyere foto ya ebe a. Ọgba! #ArewaMeToo

Ndetu: Ihe nile edere si na ọnu ndi ụmụ nwanyi obere odinara n'ike. Edekọrọ ka-mgbe otu ọnwa. Anyi zoro njirimara ha maka ikpuchite aha ha na aka ndi ọjụọ.

Na nzaghachi, Aruwa weputara na ihe nkwuputa site na onye ọka iwu ya na si na ebubo nile ndia gbasara idina ndi mmadu n'ike bụ okwu immetọ ya.

Na ọnwa nke abụọ n'ụbọchi 19, 2019 ndi Nigerian Special Anti-robbery Squad nọ na Abuja kpọchiri Awaisu maka nsonye ya na otu #ArewaMeToo.

Ndi a n'akpọ Amnesty International mere kwuputa igbachite Awaisu, we si na ndi kpọchiri ya chọrọ imebi aha ya.

While arresting Maryam, the police attempted to gain access to her laptop and mobile phone by force; this is clearly an effort to access the sensitive evidence she and other human rights defenders have been gathering to seek justice for victims of sexual violence.

Mgbe a nọ na akpọchi Maryam, ndi uwe-oji nwara ibanye n'ime igwe lapụtọp na ekwenti ya n'ike; nke a bụ mbọ ịchọta ihe akaebe na mgba-ama yana ndi nchebe ikike mmadu tara ahuhu weta maka ikpe ndi mmetọrọ ahu mmadu ikpe ziri ezi.

emechara kpọputa Awaisu na ụbọchi ọzọ, mgbe igwe ndi mmadu na otu ndi nkwado di iche iche dere ihe ederede na tuwita ka akpọputa ya.

“Ndi isi ga agba mbọ ozugbo-ozugbo na eleghi anya n'azu kpọputa Maryam Aiwasu @Ice131Queen onye nke nani ihe omere bụ ikpuhe eziokwu maka ọdinma na ikikere nke ụmụnwanyi. #FreeMaryamAwaisu #ArewaMeToo @PoliceNG @unwomenafrica @aishambuhari #Nigeria

Nkpọchi Awaisu gosiri ihe ndi na eme kwa ụbọchi banyere ndi uwe-oji idunyere ndi ji ego na ndi nwere okwa di elu ukwu na Naijeria ma gbaso ndi ụmụ nwanyi emegburu azu.

Awaisu si na ọdi ezigbo mkpa imezi ma gbanwe akparama-agwa ndi uwe-oji, okwuru nke a mgbe ya na ndi Global Voices kpara nkata na ụbọchi Iri na isịị:

We’d have to educate the designated law enforcement on what works and what doesn’t since it’s their duty to escalate these issues. There are only so many people activists can reach, so the police need to be taught and they need to be trained.

Anyi ga ekuziri ndi na mmanye iwu ime ihe otu okwesiri ma zikwa ha ihe ndi na ekwesighi-ekwesi, ebe ọ bụ ọrụ ha ikwupụta nsogbu ndia. Okwu ndi nkwupụta ndia anaghi eru mmadu nile nti, ya mere ekwesiri ikuziri ma izu ndi uwe-oji.

Ndi otu dika Mayafi Initiative na enyere ndi mmadu aka na ihe gbasara nkwado iwu na mmekọrita mmadu na steetị ndi nọ na ndida. Ha n'eme ka ọ diri ụmụ nwanyi inweta enyemaka mfe. Mana ọ di ezigbo mkpa ka ndi mebe iwu ga n'iru ime ka ndi omekome ndia hushie anya kwesiri omume ha.

Start the conversation

Authors, please log in »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.